-
Ụwa Ọhụrụ Ahụ—Ị̀ Ga-ebi na Ya?Ụlọ Nche—2000 | Eprel 15
-
-
6. Gịnị ka amụma nke anọ nke kpọtụrụ “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ” aha na-ekwu na ọ ga-eme?
6 Ka anyị nyochaa ugbu a ebe fọdụrụnụ okwu ahụ bụ́ “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ” pụtara, n’Aịsaịa 66:22-24: “Dị ka eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ, nke Mụ onwe m na-eme, ga na-eguzo n’ihu m, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta), otú a ka mkpụrụ unu na aha unu ga na-eguzo. Ọ ga-erukwa, na site n’otu ọnwa ọhụrụ ruo ọnwa ọhụrụ ọzọ, na site n’otu ụbọchị izu ike ruo ụbọchị izu ike ọzọ, anụ ahụ nile, bụ́ mmadụ, ga-abịa ịkpọ isiala n’ihu m, ka Jehova sịrị. Ha ga-apụkwa, lekwasị ozu nile nke ndị na-ejehie ejehie megide m: n’ihi na ikpuru ha agaghị anwụ, ọkụ ha agaghị anyụkwa; ha ga-abụkwara anụ ahụ nile ihe ịsọ oyi.”
7. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji kwubie na Aịsaịa 66:22-24 ga-emezu n’ọdịnihu?
7 Amụma a mezuru n’etiti ndị Juu bụ́ ndị birighachiiri n’ala ha, ma a ga-enwe mmezu ya ọzọ. Nke ahụ aghaghị ịbụ ogologo oge mgbe e desịrị akwụkwọ ozi nke abụọ nke Pita na akwụkwọ Mkpughe, n’ihi na ha zoro aka ‘n’eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ’ a ga-enwe n’ọdịnihu. Anyị pụrụ ịtụ anya mmezu ahụ dị ebube na nke zuru ezu n’ime usoro ihe ọhụrụ. Tụlee ọnọdụ ụfọdụ ndị anyị pụrụ ịtụ anya ịnụ ụtọ ha.
-
-
Ụwa Ọhụrụ Ahụ—Ị̀ Ga-ebi na Ya?Ụlọ Nche—2000 | Eprel 15
-
-
10. N’ihi gịnị ka ị pụrụ iji nwee obi ike na ndị na-emebi iwu agaghị emebi ụwa ọhụrụ ahụ n’ụzọ na-adịgide adịgide?
10 Aịsaịa 66:24 na-emesi anyị obi ike na ọ dịghị mgbe udo na ezi omume nke ụwa ọhụrụ ahụ ga-adị n’ihe ize ndụ. Ndị ajọ mmadụ agaghị emebi ya. Cheta na 2 Pita 3:7 na-ekwu na “ụbọchị nke ikpe na ịla n’iyi nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke” dị n’ihu anyị. Ndị ga-anwụ bụ ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke. Ọ dịghị ihe ọjọọ ga-adakwasị ndị aka ha dị ọcha, n’adịghị ka ihe na-eme n’agha ụmụ mmadụ, bụ́ ebe ọnụ ọgụgụ ndị nkịtị na-anwụnụ na-akarị nke ndị agha na-anwụnụ. Onyeikpe Ukwu ahụ na-emesi anyị obi ike na ụbọchị ya ga-abụ ụbọchị ịla n’iyi nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke.
11. Gịnị ka Aịsaịa na-egosi na ọ ga-abụ ọdịnihu nke ndị na-emegide Chineke na ofufe ya?
11 Ndị ezi omume lanarịrịnụ ga-ahụ na okwu amụma Chineke bụ eziokwu. Amaokwu nke 24 na-ebu amụma na “ozu nile nke ndị na-ejehie ejehie megide” Jehova ga-abụ ihe àmà nke ikpe ya. Otú Aịsaịa si kọwaa ya n’ezoghị ọnụ pụrụ iyi ihe na-awụ akpata oyi n’ahụ. Ma ọ bụ ihe mere eme. N’azụ mgbidi Jerusalem, e nwere ebe a na-ekpofu ahịhịa na, mgbe ụfọdụ, ebe a na-atụba ozu ndị omekome e gburu egbu bụ́ ndị e weere na ha ekwesịghị ka e lizie ha elizie.a N’ebe ahụ, ikpuru na ọkụ na-ere ebe ahụ na-eripịa ma ahịhịa ma ozu ndị ahụ n’egbughị oge. Ihe àmà na-egosi na okwu ihe atụ Aịsaịa ji mee ihe na-akọwa otú ikpe Jehova megide ndị mmehie si bụrụ nke a na-apụghị ịgbanwe agbanwe.
-