Isi 20
Ezinụlọ Mmadụ Nwere Obi Ụtọ n’Okpuru Ịbụ Nna nke Dị Ọhụrụ
1. N’ihi gịnị ka okwu banyere ịbụ nna ọhụrụ ji bụrụ nnọọ ozi ọma nye ezinụlọ ụmụ mmadụ?
MGBE Amagedọn gasịrị, ịbụ nna nke abụọ na-echere ihe nile a kpọrọ mmadụ. Nke ahụ n’ezie bụ ozi ọma! Ịbụ nna ahụ nke dị ọhụrụ na-eme ka o kwe omume inwe ndụ ebighị ebi n’izu okè mmadụ n’ime paradaịs zuru ụwa ọnụ, n’ihi na Nna ọhụrụ ahụ nke ezinụlọ mmadụ bụ onye na-adịghị anwụ anwụ n’onwe ya. O nwere ike nke inye ndị o kuchiworo dị ka ụmụ ya nke elu ala ndụ zuru okè.
2. N’ihi gịnị ka ịbụ nna ọhụrụ ji dịrị mkpa?
2 Ịbụ nna nke dị ọhụrụ dị mkpa n’ihi na ihe a kpọrọ mmadụ tụfuru ịbụ nna ya nke mbụ, ịbụ nna nke Onye Okike mmadụ. Usoro ọmụmụ nke sitere na Jisọs laa azụ ruo nwoke mbụ, bụ́ Adam, na-agwụsị site n’inye anyị ndepụta nke a: “Kenan, nwa Enos, nwa Set, nwa Adam, nwa Chineke.”—Luk 3:37, 38.
3. Ruo n’okè hà aṅaa ka ntụfu ihe nile a kpọrọ mmadụ tụfuru ịbụ nna nke Jehova Chineke bụụrụ ha ihe ọdachi?
3 Ntụfu nke mmadụ tụfuru ịbụ nna nke Jehova Chineke ghọọrọ ihe nile a kpọrọ mmadụ ihe ọdachi. Ụmụ Adam ketara ọmụma ikpe nke ọnwụ. E depụtara okwu ahụ n’ụzọ pụtara ìhè ná Ndị Rom 5:12: “Mmehie si n’aka otu mmadụ baa n’ụwa, dị ka ọnwụ si n’aka mmehie baakwa; ọnwụ wee si otú a gabiga ruo mmadụ nile, n’ihi na mmadụ nile mehiere.” “Otu mmadụ” ahụ bụ Adam, n’ihi ya ịkpacharakwa anya mee mmehie, ọ tụfuru ịbụ nna nke Onye Okike ya, bụ́ Jehova.
4. N’okpuru ịbụ nna nke onye ka Adam na ihe a kpọrọ mmadụ banyere?
4 N’okpuru ịbụ nna nke ònye ka Adam banyere mgbe ahụ? N’okpuru ịbụ nna nke ònye ka o webara ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ? Ọ ga-abụ ịbụ nna nke onye ahụ nwere ike n’ahụ ya ịpụ n’ezinụlọ nke ndị ikom nile na-erube isi nke Chineke n’eluigwe na n’ala. Ọ bụ ịbụ nna nke onye ahụ ghara ụgha mbụ, Setan bụ Ekwensu. Olee otú onye mmegide ahụ nke Jehova si mee nke a?
5. (a) Ihe ọrụ dị aṅaa ka Setan bụ Ekwensu jiri mee ihe iduhie nwunye Adam inupụrụ Chineke isi? (b) N’ihi gịnị, ọ̀ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa ka Adam si bụrụ ya kpatara ụzọ ime ihe nke ọ gbasoro?
5 Ná 2 Ndị Kọrint 11:3 Pọl onyeozi na-ekpughe okwu ahụ, na-ede sị: “Agwọ ahụ weere aghụghọ ya ghọgbuo Iv.” N’ụzọ aghụghọ, Setan jiri agwọ mee ihe n’Iden ịghara Iv ụgha mbụ ahụ, bụ́ onye na-atụdịghị anya ya, jiri ụgha na-akpọ Jehova Chineke onye ụgha. (Jenesis 3:1-7; Jọn 8:44) Adam agbazighị nwunye ya olu. Ọ jụghị isoro ya rie wee si otú a mezie ọnọdụ ahụ. Omume ọjọọ ọ kpachaara anya mee rabara ya n’aka Agwọ ahụ. N’idebe ụta ahụ n’ebe o kwesịrị ịdị, 1 Timoti 2:14 na-ekwu, sị: “Ọ bụghịkwa Adam ka a ghọrọ aghụghọ, ma ebe a ghọgburu nwanyị ọ bụ nwanyị ahụ ka a hụworo na ọ nọ n’ime njehie.”
Onye ahụ nke Ịbụ Nna Kwesịrị
6, 7. Ịbụ nna dị aṅaa ka Jisọs gosiri na a pụrụ inye ya, oleekwa otú amụma Bible si kwupụta nke a kpọmkwem?
6 N’ịjụ ife “chi nke oge a,” Jisọs gosiri na ya bụ Onye e kwesịrị inye ịbụ nna nke abụọ nke ezinụlọ mmadụ. (2 Ndị Kọrint 4:4; Matiu 4:1-11; Luk 4:1-13) Site n’ọmụmụ a mụrụ ya dị ka mmadụ na 2 T.O.A., ọ bụ ya bụ Onye amụma Aịsaịa 9:6 mezuru n’ebe ọ nọ:
7 “N’ihi na a mụworo anyị otu nwa, otu nwa nwoke ka e nyeworo anyị; ịbụ onye isi ga-adịkwasịkwa n’ubu ya: a ga-akpọkwa aha ya Onye Ebube, Onye Ndụmọdụ, Chineke nke Bụ Dike, Nna nke Bụ Nna Mgbe Nile Ebighị Ebi, Onyeisi Udo.” Ya mere “Onyeisi Udo” ahụ nwere ọrụ ọzọ dị mkpa ọ ga-arụrụ ihe a kpọrọ mmadụ—ya bụ nke ịbụrụ ya “Nna nke Bụ Nna mgbe Nile Ebighị Ebi.”
8. N’ihi gịnị ka e jiri nye Jisọs ike ime ihe iji bụrụ “Nna nke Bụ Nna Mgbe Nile Ebighị Ebi” nye ihe a kpọrọ mmadụ, oleekwa otú Pọl onyeozi si gosi na nke a bụ eziokwu?
8 Ọkpara Chineke gaje ịbụ “Nna nke Bụ Nna Mgbe Nile Ebighị Ebi” nye ezinụlọ nke a nke ụmụ mmadụ, nke ọ bụ n’ihi ya ka ọ tọgbọrọ ndụ mmadụ ya zuru okè n’àjà. Ọ bụ nnọọ dị ka onyeozi bụ Pọl dere, sị: “N’ihi na a sị na ọha mmadụ nwụrụ site na ndahie nke otu onye ahụ, amara Chineke, na onyinye ahụ nke dị n’ime amara nke otu mmadụ, Jisọs Kraịst, babigara ókè karị hie nne ruo ọha mmadụ. Ya mere otú a, dị ka ikpe ahụ sitere n’otu ndahie bịa ruo mmadụ nile iwetara ha amamikpe; ọbụna otú a ka onyinye amara ahụ sitere n’otu ọrụ ezi omume bịa ruo mmadụ nile ịgụ ha ná ndị ezi omume ka ha nata ndụ.”—Ndị Rom 5:15, 18.
9. Olee otú Jisọs si bụrụ Adam nke abụọ nye ihe a kpọrọ mmadụ, ma ọ̀ bụ site n’ógbè dị aṅaa ka ọ na-eme ihe dị ka Nna nke ihe a kpọrọ mmadụ?
9 Otú a, e nwere ịha nhata zuru okè nke okwu ndị a dị mkpa. Onye ahụ dahiere ‘otu ndahie’ bụ nwoke mbụ ahụ n’elu ala, bụ́ Adam. Onye rụrụ ‘otu ọrụ ezi omume’ ahụ bụ nanị nwoke ọzọ ahụ zuru okè, bụ́ Jisọs. Nke a nyere ohere ya ịghọ “Nna nke Bụ Nna Mgbe Nile Ebighị Ebi” nke ụmụ nke Adam ahụ mehiere emehie. N’ụzọ dị otú a ọ ghọrọ Adam nke abụọ n’ebe ezinụlọ mmadụ dị. Ọchụchụ àjà nke ndụ mmadụ ya zuru okè na ochiche nke o chere ikike ahụ o nwere ịdị ndụ dị ka mmadụ n’ihu Onye Ikpe Ukwu ahụ n’eluigwe mere ka ọ bụrụ ihe na-ekweghị omume ya ije ozi n’ebe a n’elu ala dị ka nna mgbe nile ebighị ebi nke ihe a kpọrọ mmadụ. Mgbe a kpọlitere ya n’ọnwụ, e mere ka ọ laghachi n’ógbè nke ndị bụ mmụọ, e wee bulie ya elu gaa n’aka nri nke Onye Mere ka o si n’ọnwụ bilie. N’ihi ya e dere, sị: “Otú a ka e dewokwara ya n’akwụkwọ, sị, Mmadụ mbụ, bụ́ Adam, ghọrọ mkpụrụ obi dị ndụ. Adam ikpeazụ ghọrọ mmụọ nke na-enye ndụ.” (1 Ndị Kọrint 15:45) Nna ọhụrụ nke kuchiri ihe a kpọrọ mmadụ ga-enye ya mmalite kasị mma nke a pụrụ inwe ná ndụ.
Ndị Mmadụ Mbụ E Kere Eke A Bụụrụ Nna
10. Olee ndị bụ ụmụ mmadụ mbụ e kere eke nke Nna nkuchi nke a ghọọrọ nna?
10 “Nna nke Bụ Nna Mgbe Nile Ebighị Ebi” ahụ, bụ́ Eze ahụ bụ Jisọs Kraịst, ga-egosi ndị bụ ndị mbụ nke ọ bụụrụ nna. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’ichebe ndụ ọtụtụ nde ndị dị ndụ ugbu a, bụ́ ndị raara ndụ ha nye ya, gabiga ‘oké mkpagbu’ ahụ. Ha bụ “oké ìgwè mmadụ” ahụ nke “atụrụ ọzọ” ahụ.—Mkpughe 7:9, 14.
11. Ohere elu ala dị aṅaa na-echere ndị yiri atụrụ lanarịrị ‘oké mkpagbụ ahụ’?
11 Nke na-enweghị ihe a ga-eji tụnyere ya bụ ohere elu ala nke e setipụrụ n’ihu “oké ìgwè mmadụ” ahụ mgbe ‘oké mkpagbu ukwu’ ahụ gasịrị. Dị ka a kọwara ya dị ka akụkụ nke “ihe ịrịba ama” nke “ọgwụgwụ oge a,” a ga-ebipụ ụmụ ewu ihe atụ ahụ nke ilu Jisọs n’ịdị ndụ n’elu ala nke a, nke ga-apụtara ha mbibi ebighị ebi. Ma ọ bụghị otú a ka ọ ga-adịrị “oké ìgwè mmadụ” ahụ nke ndị ahụ yiri atụrụ, bụ́ ndị jiri ịhụnanya na iguzosi ike n’ihe meere ihe fọdụrụ ahụ nke “ụmụnna” ime mmụọ nke Kraịst bụ ndị ka nọ n’elu ala ebe a ihe ọma. (Matiu 25:31-46) Nchebe nke “atụrụ” dị otú ahụ gabiga ruo n’akụkụ nke ọzọ nke ‘oké mkpagbu’ ahụ ma banye n’ime Ọchịchị Narị Afọ Iri ahụ nke “Onyeisi Udo” ahụ e buru n’amụma ga-eme ka o kwe ndị lanarịrịnụ mee ịbanye ná ngọzi nile nke ókèala Alaeze ahụ. Ha ga-abụ ndị nọ n’elu ala nke “Onyeisi Udo” ahụ ga-achị.
12. Okwu ndị dị aṅaa nke Jisọs banyere mbilite n’ọnwụ ahụ na-egosi na e setipụụrụ ndị ga-aba n’ókèala elu ụwa nke Alaeze ahụ ndụ na-adịghị agwụ agwụ?
12 N’oge ahụ a ga-emezu okwu ndị ahụ Jisọs kwuru tupu ọ kpọlite Lazarọs site ná ndị nwụrụ anwụ n’ebe ndị ahụ ga-abanye n’ókèala elu ụwa nke Alaeze ahụ nọ. O kwuru, sị: “Mụ onwe m bụ mbilite n’ọnwụ na ndụ: onye na-ekwere na mụ, ọbụna ma a sị na ọ nwụrụ anwụ, ọ ga-adị ndụ ọzọ: ọzọ, onye ọ bụla nke na-adị ndụ, nke na-ekwerekwa na mụ, ọ gaghị anwụ ma ọlị.” (Jọn 11:25, 26) N’ihi nrubeisi ha nye ya, ha ga-erute ndụ mmadụ zuru okè n’ókèala elu ala nke Eze ahụ. Ọbụna onye ome ihe ọjọọ ahụ nwere ọmịiko, onye nwụrụ n’akụkụ Jisọs na Kalvarị, ga-enwe ihu ọma nke inwe ohere nke ịbanye na Paradaịs ahụ. (Luk 23:43) Jisọs ga-emezucha ihe nile aha ya ahụ bụ “Nna nke Bụ Nna Mgbe Nile Ebighị Ebi” pụtara.
Olileanya Obi Ụtọ Maka Ndị Nwụrụ Anwụ
13. Mbilite n’ọnwụ nke ụmụ mmadụ nwụrụ anwụ ga-eme ka o kwe omume ịhụ mmadụ ndị dị aṅaa a ma ama nke oge ochie n’ókèala elu ụwa nke Alaeze ahụ?
13 Jisọs, nwa Abraham nke kasị pụta ìhè, kwuru na a ga-ahụ nna nna ya nke a, nwa ya bụ Aịsak, na nwa nwa ya bụ Jekọb n’ókèala elu ụwa nke Alaeze Chineke. (Matiu 22:31, 32) A ga-eme ka nke a kwe omume site ná mbilite n’ọnwụ. Dị ka Jisọs kwuru, mmadụ nile ndị nwụrụ anwụ, ndị nọ n’ili ncheta, ga-anụ olu nke Ọkpara Chineke ma pụta. Ọdịnihu ha mgbe nke a gasịrị ga-adabere n’ụzọ ime ihe nke ha ga-agbaso.—Jọn 5:28, 29; Mkpughe 20:12-15.
14. Gịnị ka a na-aghaghị ime tupu oge eruo n’ihi ndị ahụ gaje inweta mbilite n’ọnwụ nke elu ala, olee ndị ga-abụ ndị nke mbụ ga-ekere òkè n’ime nkwadebe ndị a?
14 A ga-eme nkwadebe ndị dị ukwuu maka ndị nke ihe a kpọrọ mmadụ a ga-esi n’ili kpọlite gaa ná ndụ elu ala n’okpuru Alaeze nke “Nna nke Bụ Nna Mgbe Nile Ebighị Ebi.” Ndị mbụ ga-eme nkwadebe ndị a dị iche iche bụ ndị lanarịrị “agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Nile” n’Amagedọn. (Mkpughe 16:14, 16) Ọ dị ihe ga-abụ ọnụ ọgụgụ nke “oké ìgwè mmadụ” ahụ nke “atụrụ ọzọ” nke “Onyeisi Udo” ahụ n’oge ahụ, anyị amaghị ugbu a, ma a ga-enwe ọnụ ọgụgụ zuru ezu maka ọrụ ahụ.
15. Ọtụtụ ndị ga-eje ozi n’ọkwá dị aṅaa pụrụ iche n’okpuru Nna nkuchi nke ihe a kpọrọ mmadụ?
15 Ọ bụ “Onyeisi Udo” nke a ka a gwara ihe dị n’Abụ Ọma nke 45 dị ka Eze, ebe ọ ga-abụkwara ihe a kpọrọ mmadụ “Nna nke Bụ Nna Mgbe Nile Ebighị Ebi,” abụ ọma nke a na-agwa ya, sị: “Ụmụ gị ga-anọchi anya nna gị hà, ị ga-edo ha ndị isi n’ụwa nile.” (Abụ Ọma 45:16) Ma ọbụna tupu mbilite n’ọnwụ nke ndị “nna” ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, ndị ikom bụ́ ndị òtù nke “oké ìgwè mmadụ” ahụ lanarịrị Amagedọn ga-abụworị ndị a họpụtara ịrụ ọrụ dị ka ndị isi. Ọtụtụ puku nke ndị a gaje ịlanarị Amagedọn na-eje ozi ka ọ dị ugbu a dị ka ndị okenye n’ihe karịrị 75,000 ọgbakọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova, na-elekọta ọdịmma ime mmụọ nke ọgbakọ ha dị iche iche.
16. (a) N’okpuru nduzi nke ndị isi, ndị ahụ lanarịrị Amagedọn ga-eje ozi n’ọrụ dị aṅaa? (b) Ajụjụ ndị dị aṅaa na-ebilite n’ihe banyere usoro ndị nwụrụ anwụ ga-eso bịaghachi?
16 N’okpuru nduzi nke ndị isi, ndị ahụ lanarịrị Amagedọn ga-eji ịnụ ọkụ n’obi mekọọ ihe ọnụ n’ije ozi ha. Kpọmkwem ihe ga-abụ ntụziaka nke “ndị isi n’ụwa nile” ga-anata n’aka “Onyeisi Udo” ahụ nke eluigwe bụ nke a ka ga-ahụ, na-eme ka ndị ibe ha nile lanarịrị Amagedọn nwee ahụmahụ na-akpali akpali. Cheedị echiche banyere uwe nile a ga-akwadebe igbokwasị ndị nwụrụ anwụ na-alọghachi n’ụdị ejiji kwesịrị ekwesị! Cheedị echiche banyere nri nile a ga-eme ka e nwee ma ọ bụ kwakọba! Ọ ga-adịkwa mkpa ka e nwee ụlọ ndị dị adị. Lee oge na-akpali akpali nke ahụ ga-abụrụ ndị nile na-ekere òkè n’ọrụ nkwadebe ihe nke a! Olee ndị ga-ebu ụzọ bịaghachi? Hà ga-abịaghachi n’usoro a sụgharịrị isi nke otú ha si banye n’ime ili ncheta? À ga-akwụghachi Ebel onye e gburu n’ihi okwukwe ya, na Ịnọk onye Chineke wepụrụ, tinyere Noa, Abraham, Aịsak, Jekọb, na ndị amụma nile kwesịrị ntụkwasị obi, ụgwọ n’ụzọ pụrụ iche site n’ime ka ha buru ụzọ si n’ọnwụ bilite?
17. Ònye ga-ekpebi usoro nke ndị nwụrụ anwụ ga-eso bịaghachi ná ndụ n’elu ala, ùtú aha dị aṅaa e buru n’amụma banyere ya na-egosi ike o nwere ibu ibu ọrụ ya nile?
17 “Onyeisi Udo” ahụ maara, ọ ga-ekpebikwa nke a. Ọ ga-erukwa eru n’ụzọ zuru ezu maka ibu ọrụ ya nile dị ka Nna ọhụrụ nke ihe a kpọrọ mmadụ a gbapụtara agbapụta. Ùtú aha ya ọzọ e buru n’amụma bụ “Chineke nke Bụ Dike.” Nke ahụ na-egosi na ọ ga-abụ Onye dike nke siri ike. Ngosipụta nke ịbụ chi ya ga-adị ike n’ihi na ọ ga-akpọlite ndị nile a gbapụtara agbapụta nwụrụ anwụ, na-echeta aha ha n’otu n’otu na ụdị mmadụ ha bụ. (Jọn 5:28, 29; Ọrụ 10:42) O nwere nnọọ ike zuru okè imezi ihe nile Setan bụ Ekwensu mebiworo n’ime 6,000 afọ gaworo aga nke ịdị adị mmadụ.
18. (a) Olee otú e si mee ka mkpa ọ dị Adam ịbụ nna ochie nke Jisọs Kraịst bụrụ ihe e gbochiri? (b) Olee otú e si nyere Jisọs aka ịghọ nna nke abụọ nke ụmụ Adam?
18 Adam mbụ ahụ nyefere ụmụ ya nile ọmụma ikpe nke ọnwụ. Adam ọ̀ ghọrọ nna ochie nke mmadụ ahụ bụ Jisọs Kraịst? Ee e, Jisọs enweghị nna nke bụ mmadụ kama e si na nwa agbọghọ na-amaghị nwoke mụọ ya, onye e mere ka ọ tụrụ ime site n’ike ndụ ya nke Chineke bufere site n’ógbè ndị mmụọ. Otú a Adam ahụ bụ onye mmehie aghọghị nna ochie nke Ọkpara elu ala ahụ nke Chineke. Otú ọ dị, Adam nke abụọ aghọwo mmụọ nke na-enye ndụ. N’ọkwá nke a ọ pụrụ imezu amụma Aịsaịa wee ghọọ “Nna nke Bụ Nna Mgbe Nile Ebighị Ebi” nye ụmụ Adam nke mbụ ahụ, bụ́ ndị ọ zụrụghachiiri ma kuchie maka nzube nke inye ha ndụ mmadụ zuru okè n’elu ala paradaịs.
19. Ná mmekọrịta ọhụrụ dị aṅaa nke agbụrụ mmadụ ka Jehova Chineke ga-abata, atụmatụ dịkwa aṅaa nke Setan bụ Ekwensu ka ọ ga-esi otú a mebie?
19 N’ụzọ dị otú ahụ Nna eluigwe nke Jisọs Kraịst ga-aghọ Nna Ochie nke eluigwe nke ezinụlọ mmadụ a gbapụtaworo. N’ihi nke a ezinụlọ mmadụ ga-aba ná mmekọrịta dị ọhụrụ nke ha na Onye Okike nke eluigwe na ala. Ọ dịghị mgbe o yitụdịrị na Jehova ga-ada ná nzube mbụ ya. Otú a Jehova ga-emebiworị ajọ atụmatụ asọpụrụghị Chineke nke Setan bụ Ekwensu tụrụ. A ga-eme ka ezinụlọ ụmụ mmadụ dum bụ́ nke a zụrụghachiiri nwee ihe ọmụma nke eziokwu nke a. Lee ụbọchị dị ebube ọ ga-abụ mgbe Jisọs Kraịst weghaara ịbụ nna nke ezinụlọ ụmụ mmadụ iji wee zụọ ihe a kpọrọ mmadụ n’ime Paradaịs e weghachiri n’elu ala!
[Foto ndị dị na peeji nke 164, 165]
Kraịst, n’ike nke eze, na-aghọ “Nna nke Bụ Nna Mgbe Nile Ebighị Ebi” nye ndị ahụ nile nke ọ na-ekuchi