Ọnụnọ nke Mesaịa ahụ na Ọchịchị Ya
“Jisọs nke a, onye a napụrụ n’ebe unu nọ rịgoo n’eluigwe, ga-abịa n’otu aka ahụ dị ka unu kiriri ya ka ọ na-aga n’eluigwe.”—ỌRỤ 1:11.
1, 2. (a) Olee ụzọ ndị mmụọ ozi abụọ si kasie ndị ozi Jisọs obi mgbe ọ rịgoro n’eluigwe? (b) Ajụjụ ndị dị aṅaa ka e welitere site n’olileanya nke nlaghachi Kraịst?
NDỊ ikom 11 guzo n’ebe ọwụwa anyanwụ nke mkpọda Ugwu Olive, na-eleli anya gaa n’urukpuru. Nanị n’ime nwa oge gara aga, Jisọs Kraịst esiwo n’etiti ha bilie, ụdịdị ya na-apụ n’anya ruo mgbe igwe ojii kpuchiri ya. N’afọ nile ha na ya nọ, ndị ikom ndị a ahụwo ka Jisọs nyere ihe àmà bara ụba na ọ bụ Mesaịa ahụ; ha anagidewo ọbụna obi mgbawa nke ọnwụ ya na oké mkpali ọṅụ nke mbilite n’ọnwụ ya. Ugbu a, ọ lawo.
2 Mmụọ ozi abụọ pụtara na mberede wee gwa ha okwu ndị a na-akasi obi, sị: “Ndị ikom nke Galili, gịnị mere unu na-eguzo na-ele anya n’eluigwe? Jisọs nke a, onye a napụrụ n’ebe unu nọ rịgoo n’eluigwe, ga-abịa n’otu aka ahụ dị ka unu kiriri ya ka ọ na-aga n’eluigwe.” (Ọrụ 1:11) Lee ka o si bụrụ ihe na-emesi obi ike—nrịgo Jisọs gaa n’eluigwe apụtaghị na ọ dịghịkwa ihe jikọrọ ya na ụwa na ihe a kpọrọ mmadụ! N’ụzọ megidere nke ahụ, Jisọs ga-abịa ọzọ. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na okwu ndị a mere ka ndị ozi ahụ jupụta n’olileanya. Ọtụtụ nde ndị mmadụ taa na-ewerekwa nkwa nke nlaghachi Kraịst n’ihe dị oké mkpa. Ụfọdụ na-ekwu banyere ya dị ka “Ọbịbịa nke Ugbo Abụọ” ma ọ bụ “Ịbịa Ọzọ.” Otú ọ dị, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nwere mgbagwoju anya banyere ihe nlaghachi Kraịst pụtara n’ezie. N’ụzọ dị aṅaa ka Kraịst na-alaghachi? Olee mgbe? Oleekwa ụzọ nke a si emetụta ndụ anyị n’oge a?
Ụzọ Kraịst Ga-esi Laghachi
3. Gịnị ka ọtụtụ mmadụ kwere banyere nlaghachi Kraịst?
3 Dị ka akwụkwọ ahụ bụ́ An Evangelical Christology si kwuo, “ọbịbịa nke ugbo abụọ ma ọ bụ nlaghachi nke Kraịst (parousia) na-eguzobe alaeze Chineke, n’ikpeazụ, n’ihu mmadụ nile, nakwa ruo mgbe nile ebighị ebi.” Ọ bụ nkwenkwe nke e nwere n’ebe nile na nlaghachị Kraịst ga-eme n’anya mmadụ nile, bụrụ nke onye ọ bụla bi ná mbara elu ala ga-ahụ n’ụzọ nkịtị. Iji kwadoo echiche nke a, ọtụtụ na-arụtụ aka gaa ná Mkpughe 1:7, bụ́ nke na-agụ, sị: “Lee, ọ na-abịa, ya na igwe ojii; anya nile ọ bụla ga-ahụzukwa ya, ndị ahụ ga-ahụkwa ya, bụ́ ndị mara ya ube.” Ma amaokwu nke a ọ̀ bụ nke a ga-aghọta n’ụzọ nkịtị?
4, 5. (a) Olee ụzọ anyị si mara na a gaghị ewere ihe Mkpughe 1:7 pụtara n’echiche nkịtị? (b) Olee ụzọ okwu Jisọs n’onwe ya si mesie nghọta nke a ike?
4 Cheta, e nyefere akwụkwọ Mkpughe “n’ihe àmà.” (Mkpughe 1:1, NW) Mgbe ahụ, ihe odide nke a aghaghị ịbụ ihe atụ; e kwuwerị, olee ụzọ “ndị mara ya ube” pụrụ isi hụ nlaghachi Kraịst? Ha anwụworị n’ihe dị ka 20 narị afọ! Ọzọkwa, ndị mmụọ ozi ahụ kwuru na Kraịst ga-alaghachi “n’otu aka ahụ” dị ka o si laa. Ọ dị mma, olee otú o si laa? Ọ̀ bụ ka ọtụtụ nde nọ na-ekiri ya? Ee e, nanị mmadụ ole na ole kwesịrị ntụkwasị obi hụrụ ihe omume ahụ. Mgbe ndị mmụọ ozi ahụ gwakwara ha okwu, ndị ozi ahụ hà nọ na-ekiri ọlịla Kraịst n’ụzọ nkịtị ruo mgbe o ruru eluigwe? Ee e, igwe ojii ekpuchiwo Jisọs pụọ n’ọhụhụ ụzọ ha. Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, ọ ghaghị ịbanyeworị n’eluigwe nke ndị bụ mmụọ dị ka onye bụ mmụọ, nke anya mmadụ na-adịghị ahụ. (1 Ndị Kọrint 15:50) Ya mere, ya karịsịa, ndị ozi ahụ hụrụ nanị mmalite nke ọlịla Jisọs; ha apụghị ikiri ọgwụgwụ ya, nlaghachi ya gaa n’ọnụnọ eluigwe nke Nna ya, bụ́ Jehova. Nke a ka ha pụrụ nanị ịghọta site n’anya nke okwukwe ha.—Jọn 20:17.
5 Bible na-akụzi na Jisọs ga-alaghachi n’ụzọ yiri nke ahụ kpọmkwem. Jisọs n’onwe ya kwuru n’oge na-adịghị anya tupu ọnwụ ya, sị: ‘Ọ fọdụrụ nwa oge, ụwa agaghị ahụkwa m.’ (Jọn 14:19) O kwukwara na “alaeze Chineke adịghị abịa n’ụzọ a na-ahụ anya nke ọma.” (Luk 17:20, NW) Mgbe ahụ, n’echiche dị aṅaa ka ‘anya nile ga-ahụ ya’? Iji zaa nke ahụ, ọ dị mkpa ka anyị buru ụzọ ghọta n’ụzọ doro anya okwu nke Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya ji mee ihe n’ihe banyere nlaghachi ya.
6. (a) N’ihi gịnị ka okwu ndị dị ka “nlaghachi,” “mbịarute,” “ịbịa ọzọ,” na “ọbịbịa” na-ejighị bụrụ nsụgharị zuru ezu nke okwu Grik ahụ bụ́ pa·rou·siʹa? (b) Gịnị na-egosi na pa·rou·siʹa, ma ọ bụ “ọnụnọ,” na-adị anya karịa ihe ọ bụla a na-eme nwa oge?
6 Ihe bụ eziokwu bụ, Kraịst na-eme ihe karịrị nnọọ “nlaghachi.” Okwu ahụ, dị ka “ọbịbịa,” “mbịarute,” ma ọ bụ “ịbịa ọzọ,” pụtara otu ihe omume e mere n’ime oge dị mkpirikpi. Ma okwu Grik nke Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya ji mee ihe pụtara ihe karịrị nke ahụ. Okwu ahụ bụ pa·rou·siʹa, nke pụtara n’ụzọ nkịtị “ịnọnyere” ma ọ bụ “ọnụnọ.” Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ndị ọkà mmụta kwetara na okwu nke a metụtara ọ bụghị nanị mbịarute nkịtị kamakwa ịnọrọ gaa n’ihu—dị ka mgbe onye eze bịara leta Obodo. Ọnụnọ nke a abụghị ihe e mere n’ime nwa oge; ọ bụ ọgbọ pụrụ iche, oge nke a kara akara. Na Matiu 24:37-39, (NW), Jisọs sịrị na “ọnụnọ [pa·rou·siʹa] nke Nwa nke mmadụ” ga-adị ka “ụbọchị Noa” nke gwụsịrị n’Iju Mmiri ahụ. Noa na-ewu ugbo ahụ ma na-adọ ndị ajọ omume aka ná ntị ruo ọtụtụ iri afọ tupu Iju Mmiri ahụ abịa wee kpochapụ usoro ụwa ahụ rụrụ arụ. Mgbe ahụ, n’otu aka ahụ, ọnụnọ Kraịst nke a na-adịghị ahụ anya na-adịru ogologo oge nke iri afọ ụfọdụ tupu ọ bịa ná ngwụsị n’oké mbibi.
7. (a) Gịnị na-egosi na pa·rou·siʹa ahụ abụghị nke anya mmadụ na-ahụ? (b) Olee ụzọ, ọ̀ bụkwa olee mgbe ka akụkụ akwụkwọ nsọ ndị na-akọwa nlaghachi Kraịst dị ka nke “anya nile ọ bụla” ga-ahụ ga-emezu?
7 Ihe ịrụ ụka adịghị ya na pa·rou·siʹa abụghị nke anya mmadụ na-ahụ n’ụzọ nkịtị. Ọ bụrụ na ọ bụ, n’ihi gịnị ka Jisọs ga-eji wepụta oge dị ukwuu, dị ka anyị ga-ahụ, inye ndị na-eso ụzọ ya ihe ịrịba ama iji nyere ha aka ịghọta ọnụnọ nke a?a Otú ọ dị, mgbe Kraịst bịara ibibi usoro ụwa Setan, eziokwu nke ọnụnọ ya ga-apụta ìhè nke ukwuu nye mmadụ nile. Ọ bụ mgbe ahụ ka “anya mmadụ nile ọ bụla ga-ahụzukwa ya.” Ọbụna ndị mmegide Jisọs ga-enwe ike ịghọta, n’ihere ha, na ọchịchị Kraịst bụ ezie.—Lee Matiu 24:30; 2 Ndị Tesalonaịka 2:8; Mkpughe 1:5, 6.
Olee Mgbe Ọ Malitere?
8. Ihe omume dị aṅaa na-aka mmalite nke ọnụnọ Kraịst akara, oleekwa ebe nke a weere ọnọdụ?
8 Ọnụnọ nke Mesaịa ahụ malitere site n’ihe omume nke na-emezu isiokwu na-apụta mgbe mgbe nke amụma nile metụtara Mesaịa ahụ. E chiri ya echichi dị ka Eze n’eluigwe. (2 Samuel 7:12-16; Aịsaịa 9:6, 7; Ezikiel 21:26, 27) Jisọs n’onwe ya gosiri na ọnụnọ ya ga-enwe ihe jikọrọ ya na ịchịisi ya. N’ọtụtụ ihe atụ, o ji onwe ya tụnyere onyenwenụ nke hapụrụ ezinụlọ ya na ndị ohu ya wee pụọ, na-eme njem ruo ogologo oge gaa ‘n’ala dị anya’ bụ́ ebe ọ ‘naara alaeze.’ O nyere ihe atụ dị otú ahụ dị ka akụkụ nke azịza ya nye ajụjụ ndị ozi ya jụrụ banyere mgbe pa·rou·siʹa ya ga-amalite; o nyekwara ọzọ n’ihi na “ha na-eche na alaeze Chineke gaje ịpụta ìhè ngwa ngwa.” (Luk 19:11, 12, 15; Matiu 24:3; 25:14, 19) Ya mere, n’oge ọ nọ n’elu ala dị ka mmadụ, ochichi eze ya ka bụ nke dị anya, nke ga-ewere ọnọdụ ‘n’ala dị anya’ nke eluigwe. Olee mgbe ọ ga-eme?
9, 10. Ihe àmà dị aṅaa ka e nwere na Kraịst na-achị ugbu a n’eluigwe, oleekwa mgbe ọ malitere ọchịchị ya?
9 Mgbe ndị na-eso ụzọ Jisọs jụrụ ya, sị: “Gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke ọnụnọ gị na nke ọgwụgwụ usoro ihe nke a?” Jisọs zaghachiri site n’inye ha nkọwa sara mbara nke oge ọdịnihu ahụ. (Matiu, isi nke 24, NW; Mak, isi nke 13; Luk, isi nke 21; leekwa 2 Timoti 3:1-5; Mkpughe, isi nke 6.) Ihe ịrịba ama nke a ghọrọ nkọwa zuru ezu nke ọgbọ nọ ná nsogbu. Ọ bụ oge a kara akara site n’agha ụwa nile, ịrị elu nke imempụ, ndakpọ ndụ ezinụlọ, ntiwapụ nke ọrịa, ụnwụ nri, na ala ọma jijiji—ọ bụghị dị ka nsogbu dị n’ógbè kama ọgba aghara ndị na-emetụta ụwa nile. Nke a ọ̀ na-ada ka ihe ị nụtụworo? Ụbọchị ọ bụla nke na-agabiga na-emesi ya ike na narị afọ nke 20 kwekọrọ n’ụzọ zuru okè ná nkọwa nke Jisọs.
10 Ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme kwetara na 1914 bụ oge oké mgbanwe n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ, afọ dị oké mkpa nke ọtụtụ n’ime nsogbu ndị a mesịrị malite isi ike nchịkwa, na-arị elu n’ọ̀tụ̀tụ̀ zuru ụwa ọnụ. Ee, ihe omume ụwa ndị a na-ahụ anya bụ́ ndị na-emezu amụma Bible na-arụtụcha aka gaa na 1914 dị ka afọ mgbe Jisọs malitere ịchị dị ka Eze n’eluigwe. Ọzọkwa, otu amụma dị na Daniel isi nke 4 na-enye ihe àmà ọgụgụ oge nke na-eduga anyị n’otu afọ ahụ kpọmkwem—1914—dị ka oge mgbe Eze Jehova họpụtara ga-amalite ọchịchị ya.b
N’ihi Gịnị Ka O Ji Bụrụ Oge Nsogbu?
11, 12. (a) N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe siiri ụfọdụ ike ikweta na Kraịst na-achị ugbu a n’eluigwe? (b) Olee ụzọ anyị pụrụ isi mee ihe atụ nke ihe weere ọnọdụ mgbe e chisịrị Jisọs echichi dị ka Eze?
11 Otú ọ dị, ụfọdụ na-eche, sị, ‘N’ihi gịnị ka ụwa ji jupụta ná nsogbu ma ọ bụrụ na Mesaịa ahụ na-achị achị n’eluigwe? Ọ̀ bụ na ọchịchị ya adịghị irè?’ Otu ihe atụ pụrụ inye aka. E nwere mba nke ajọ onye isi ala na-achị. O guzobewo usoro rụrụ arụ nke nwere mmetụta dị ike gaa n’akụkụ ọ bụla nke ala ahụ. Ma e nwere ntụliaka ọchịchị; ezigbo mmadụ wee merie. Ugbu a, gịnị ga-eme? Dị ka ọ dị n’ala ụfọdụ nwere ọchịchị onye kwuo uche ya, oge mgbanwe nke ọnwa ole na ole na-ewere ọnọdụ tupu onye isi ala ọhụrụ abanye n’ọkwá. Olee otú ndị ikom abụọ ahụ ga-esi na-eme omume n’oge dị otú ahụ? Nke ezigbo mmadụ ahụ ọ̀ ga-amalite ozugbo itikpọsị na imebisị ajọ ihe nile nke onye ahụ bu ya ụzọ kpatara na gburugburu mba ahụ? Kama nke ahụ, ọ́ gaghị ebu ụzọ tụkwasị uche n’isi obodo ahụ, na-eguzobe òtù ndị omeiwu ọhụrụ, na-enyekwa ndị ajọ enyi na ndị omekome na-akwado onye isi ala mbụ ahụ akwụkwọ ụla? N’ụzọ dị otú ahụ, mgbe ọ batazuru n’ike ọchịchị, ọ pụrụ ịnọ n’ọkwá ọchịchị dị ọcha, nke dị irè wee na-arụ ọrụ. Banyere onye isi ala ahụ rụrụ arụ, ọ́ gaghị eji ohere ahụ dị mkpirikpi nke o nwere ịnọ n’ọkwá mee ihe ikpokọrọ uru nile e nwetara n’ụzọ na-ezighị ezi nke ọ pụrụ inweta tupu a napụ ya ike nile?
12 N’otu ụzọ ahụ, o yiri pa·rou·siʹa nke Kraịst. Mkpughe 12:7-12 na-egosi na mgbe e mere Kraịst Eze n’eluigwe, o bu ụzọ tụdaa Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya pụọ n’eluigwe, si otú a na-ehicha ebe gọọmenti Ya dị. Ebe ọ bụ na o nwetawo mmeri nke a ọ nọworo na-echere eri ogologo oge, olee otú Setan si eme omume n’ime “nwa oge” ahụ tupu Kraịst ewegharazuo ike ọchịchị n’ebe a n’elu ala? Dị ka onye isi ala ahụ rụrụ arụ, ọ na-agbalị inweta ihe nile ọ pụrụ inweta n’usoro ihe ochie nke a. Ihe bụ nsogbu ya abụghị ego; ihe ọ chọrọ bụ ndụ ụmụ mmadụ. Ọ chọrọ iwezụga ọtụtụ ndị mmadụ n’ebe Jehova na Eze Ya na-achị achị nọ ruo n’ókè ọ pụrụ ime.
13. Olee ụzọ Akwụkwọ Nsọ si gosi na mmalite nke ọchịchị Kraịst ga-abụ oge nsogbu n’ebe a n’elu ala?
13 Mgbe ahụ, ka a sịkwa ihe mere na mmalite nke ọchịchị Mesaịa ahụ pụtara oge ‘ahụhụ dịrị ụwa.’ (Mkpughe 12:12) N’otu aka ahụ, Abụ Ọma 110:1, 2, 6 na-egosi na Mesaịa ahụ malitere ọchịchị ‘n’etiti ndị iro ya.’ Ọ bụ nanị mgbe e mesịrị ka o kpochapụrụ “mba nile” kpam kpam, tinyere akụkụ ọ bụla nke usoro ihe rụrụ arụ nke Setan, gaa n’adịghị adị!
Mgbe Mesaịa Na-achị Ụwa
14. Gịnị ka Mesaịa ahụ ga-enwe ike ime mgbe o bibisịrị ajọ usoro ihe nke Setan?
14 Mgbe o bibisịrị usoro ihe Setan na ndị nile na-akwado ya, Eze ahụ bụ́ Mesaịa, Jisọs Kraịst, ga-emesị nọrọ n’ọnọdụ imezu amụma Bible ndị dị ebube bụ́ ndị na-akọwa Ọchịchị Narị Afọ Iri ya. Aịsaịa 11:1-10 na-enyere anyị aka ịhụ ụdị onye ọchịchị Mesaịa ahụ ga-abụ. Amaokwu nke 2 na-agwa anyị na ọ ga-enwe “mmụọ nke Jehova . . . , bụ́ mmụọ nke amamihe na nghọta, mmụọ nke ndụmọdụ na ịdị ike.”
15. Gịnị ka ‘mmụọ ịdị ike’ ga-apụta n’ọchịchị nke Mesaịa ahụ?
15 Tụlee ihe ‘mmụọ nke ịdị ike’ ga-apụta n’ọchịchị Jisọs. Mgbe ọ nọrọ n’elu ala, o nwere ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke ịdị ike site n’aka Jehova, na-enye ya ike ịrụ ọrụ ebube. O gosipụtakwara ọchịchọ sitere n’ala ala obi inyere ndị mmadụ aka, na-asị, “Ana m achọ.” (Matiu 8:3) Ma ọrụ ebube ya nile nke ụbọchị ndị ahụ bụ nanị onyinyo nke ihe ọ gaje ime mgbe ọ na-achị site n’eluigwe. Jisọs ga-arụ ọrụ ebube n’ọ̀tụ̀tụ̀ zuru ụwa ọnụ! A ga-agwọ ndị ọrịa, ndị kpuru ìsì, ndị ntị chiri, ndị nwere ọrụsị, na ndị ngwụrọ ruo mgbe nile. (Aịsaịa 35:5, 6) Ihe oriri bara ụba, nke e kesara nke ọma, ga-akwụsị agụụ ruo mgbe ebighị ebi. (Abụ Ọma 72:16) Gịnị banyere ọtụtụ nde ndị ahụ a na-apụghị ịgụta ọnụ nọ n’ime ili ndị Chineke ga-enwe obi ụtọ icheta? “Ịdị ike” Jisọs ga-agụnye inwe ike ime ka ha si n’ọnwụ bilie, na-enye ha ohere nke ịdị ndụ ebighị ebi na Paradaịs! (Jọn 5:28, 29) Ma, ọbụna site n’inwe ịdị ike ndị a nile, Eze ahụ bụ́ Mesaịa ga-anọgide na-adị umeala n’obi n’ụzọ zuru ezu. Ihe “na-atọ ya ụtọ bụ egwu Jehova.”—Aịsaịa 11:3.
16. Ụdị Onye Ikpe dị aṅaa ka Eze ahụ bụ́ Mesaịa ga-abụ, oleekwa ụzọ nke ahụ ga-esi dị iche n’ihe ndekọ nke ndị ikpe bụ́ mmadụ?
16 Eze nke a ga-abụkwa Onye Ikpe zuru okè. “Ọ bụghịkwa dị ka anya ya abụọ si ahụ ka ọ ga-ekpe ikpe, ọ bụghịkwa dị ka ntị ya abụọ si anụ ka ọ ga-aba mba.” Olee onye ikpe bụ́ mmadụ, n’oge gara aga ma ọ bụ n’oge ugbu a, nke a pụrụ ịkọwa n’ụzọ dị otú ahụ? Ọbụna onye nwere uche pụrụ ikpe ikpe nanị site n’ihe ọ na-ahụ na ihe ọ na-anụ, na-eji amamihe ma ọ bụ nghọta ọ bụla ọ pụrụ inwe na-eme ihe. Otú a, ndị ikpe na ndị ọkà ikpe nke ụwa ochie nke a pụrụ ịbụ ndị e tigharịrị anya ma ọ bụ gbagwojuo anya site n’arụmụka nduhie, ntigharị anya ụlọikpe, ma ọ bụ ihe àmà na-emegide onwe ya. Ọtụtụ mgbe, ọ bụ nanị ndị bara ọgaranya na ndị dị ike bụ ndị pụrụ ịkwụ ụgwọ maka ikpechitere ha ikpe, n’ezie na-azụrụ ikpe ziri ezi. Ọ bụghị otú ahụ ka ọ dị n’okpuru Onye Ikpe ahụ bụ́ Mesaịa! Ọ na-agụ ihe dị n’obi. Ọ dịghị ihe ọ na-apụghị ịchọpụta. Ikpe ziri ezi, nke e mere ka ọ dị nro site n’ịhụnanya na ebere, agaghị abụ nke a pụrụ iji ego zụta. Ọ ga-adị mgbe nile.—Aịsaịa 11:3-5.
Ụzọ Ọchịchị Ya Si Emetụta Gị
17, 18. (a) Onyinyo dị aṅaa na-akpali akpali nke ọdịnihu ihe a kpọrọ mmadụ ka e sere n’Aịsaịa 11:6-9? (b) Ònye ka amụma nke a metụtara n’ụzọ bụ isi, n’ihi gịnịkwa ka o ji dị otú ahụ? (c) Olee ụzọ amụma nke a ga-esi nwee mmezu nkịtị?
17 N’ụzọ kwere nghọta, ọchịchị nke Mesaịa ahụ nwere mmetụta miri emi n’ahụ ndị ọ na-achị. Ọ na-agbanwe ndị mmadụ. Aịsaịa 11:6-9 na-egosi kpọmkwem ókè mgbanwe ndị dị otú ahụ ruru. Amụma nke a na-ese onyinyo nke anụ ndị dị ize ndụ, ndị na-atagbu atagbu—bear, wolf, agụ, ọdụm, ajụala—n’etiti anụ ụlọ ndị na-adịghị emerụ ahụ na ọbụna ụmụaka. Ma anụ ndị ahụ na-atagbu atagbu abụghị ihe ize ndụ! N’ihi gịnị? Amaokwu nke 9 na-aza, sị: “Ha agaghị eme ihe ọjọọ, ha agaghị ebibikwa, n’ugwu nsọ m nile: n’ihi na ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa, dị ka mmiri si ekpuchi oké osimiri.”
18 Otú ọ dị, “ihe ọmụma Jehova” apụghị inwe mmetụta ọ bụla n’ahụ anụmahụ nkịtị; otú a, amaokwu ndị a aghaghị ịdị na-ekwu banyere ndị mmadụ n’ụzọ bụ isi. Ọchịchị nke Mesaịa ahụ na-ahụ maka otu ihe omume nkụzi zuru ụwa ọnụ, nke na-akụziri ndị mmadụ banyere Jehova na ụzọ ya nile, na-akụziri mmadụ nile imeso mmadụ ibe ha omume n’ịhụnanya, nsọpụrụ, na nkwanye ùgwù. N’ime Paradaịs na-abịanụ, Mesaịa ahụ ga-ebuli ihe a kpọrọ mmadụ n’ụzọ ọrụ ebube gaa n’izu okè anụ ahụ na nke omume. Àgwà ntagbu, nke yiri omume anụmanụ, bụ́ nke na-emebi ọdịdị mmadụ na-ezughị okè, agaghị adịkwa. N’echiche nkịtị, ihe a kpọrọ mmadụ ga-esokwa ụmụ anụmanụ nọrọ n’udo—n’ikpeazụ!—Tụlee Jenesis 1:28.
19. Olee ụzọ ọchịchị nke Mesaịa ahụ si emetụta ndụ ndị mmadụ n’ụbọchị ikpeazụ ndị a?
19 Otú ọ dị, cheta na Mesaịa ahụ na-achị achị ugbu a. Ọbụna ugbu a, ndị ahụ Alaeze ya ga-achị na-amụ ka e si ebikọ n’udo, na-emezu Aịsaịa 11:6-9 n’otu echiche. Ọzọkwa, ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 80 afọ, Jisọs anọwo na-emezu Aịsaịa 11:10: “Ọ ga-erukwa, n’ụbọchị ahụ, na mkpọrọgwụ Jesi, nke na-eguzo ịbụ ọkọlọtọ ndị nile dị iche iche, ya ka mba nile ga-ajụ ase; ebe izu ike ya ga-abụkwa ebube.” Ndị sitere ná mba nile na-echigharịkwuru Mesaịa ahụ. N’ihi gịnị? N’ihi na kemgbe ọ malitere ịchị, ọ nọwo “na-eguzo ịbụ ọkọlọtọ.” Ọ nọwo na-eme ka a mata ọnụnọ ya n’ụwa nile site n’oké ihe omume nkụzi ahụ a kọwara n’elu. N’ezie, Jisọs buru amụma na ọrụ nkwusa zuru ụwa ọnụ ga-abụ otu ihe ịrịba ama pụrụ iche nke ọnụnọ ya tupu ọgwụgwụ nke usoro ihe ochie nke a.—Matiu 24:14.
20. Àgwà dị aṅaa ka ndị nile ọchịchị Mesaịa ahụ ga-achị kwesịrị izere, n’ihi gịnịkwa?
20 Ya mere, ọnụnọ Kraịst n’ike Ọchịchị abụghị nkụzi ọnụ nke dịwagara iche, nke bụ nanị isiokwu nke nrụrịta ụka ọgụgụ isi n’etiti ndị ọkà mmụta okpukpe. Ọchịchị ya na-emetụta ma na-agbanwe ndụ a na-adị n’ebe a n’elu ala, dị nnọọ ka Aịsaịa buru n’amụma na ọ ga-eme. Jisọs eduruwo ọtụtụ nde ndị Alaeze ya ga-achị pụọ n’usoro ihe ụwa nke a rụrụ arụ. Ị̀ bụ onye dị otú ahụ nke ọ ga-achị? Mgbe ahụ, na-eje ozi site n’ịnụ ọkụ n’obi na ọṅụ nile nke kwesịrị Onye Ọchịchị anyị! N’ikwu eziokwu, ọ bụ nnọọ ihe dị mfe ịda mbà, isonye n’iti mkpu nkatọ nke ụwa: “Olee ebe nkwa nke ọnụnọ ya dị?” (2 Pita 3:4, NW) Ma dị ka Jisọs n’onwe ya kwuru, “onye weere ntachi obi nọgide ruo ọgwụgwụ ihe nile, onye ahụ ka a ga-azọpụta.”—Matiu 24:13.
21. Olee ụzọ anyị nile pụrụ isi mụbaa nghọta anyị nwere banyere olileanya Mesaịa ahụ?
21 Ụbọchị ọ bụla na-agafe na-eweta anyị nso karị n’oké ụbọchị ahụ mgbe Jehova ga-eduzi Ọkpara Ya ime ka ọnụnọ ya pụta ìhè n’ihu ụwa nile. Ekwela ka olileanya i nwere n’ụbọchị ahụ gbaa ọchịchịrị. Na-atụgharị uche n’ịbụ Mesaịa nke Jisọs nakwa n’àgwà ya nile dị ka Eze na-achị achị. Na-echekwa echiche miri emi banyere Jehova Chineke, bụ́ onye guzobere na onye chepụtara oké olileanya Mesaịa ahụ e depụtara na Bible. Ka ị na-eme nke ahụ, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị ga-anọgide na-enwe mmetụta dị ka Pọl onyeozi nwere mgbe o dere, sị: “A! omimi nke akụ nke amamihe na nke ihe ọmụma kwa nke Chineke!”—Ndị Rom 11:33.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Laa azụ n’afọ 1864, onye ọkà mmụta okpukpe bụ́ R. Govett kwupụtara ya otú a, sị: “Nke a yiri m ihe e kwubiri nke ọma. Inye ihe ịrịba ama nke Ọnụnọ ahụ na-egosi na ọ bụ ihe nzuzo. Ihe ịrịba ama adịghị mkpa iji mee ka anyị mara maka ọnụnọ nke ihe anyị na-ahụ.”
b Maka nkọwa zuru ezu, lee akwụkwọ ahụ bụ́ “Ka Alaeze Gị Bịa,” peji nke 133-139.
Olee Ụzọ Ị Ga-esi Zaa?
◻ N’ụzọ dị aṅaa ka Kraịst ga-esi laghachi?
◻ Olee ụzọ anyị si mara na pa·rou·siʹa nke Kraịst bụ nke a na-adịghị ahụ anya, nke na-adịrukwa ogologo oge buru ibu?
◻ Olee mgbe ọnụnọ nke Kraịst malitere, oleekwa ụzọ anyị si mara nke a?
◻ Ụdị Onye Ọchịchị eluigwe dị aṅaa ka Mesaịa ahụ bụ?
◻ N’ụzọ ndị dị aṅaa ka ọchịchị nke Kraịst si emetụta ndụ ndị ọ ga-achị?
[Foto dị na peeji nke 15]
Olileanya nke na Jisọs ga-alaghachi pụtara oké ihe nye ndị ozi ya kwesịrị ntụkwasị obi
[Foto dị na peeji nke 17]
Site n’ịchị achị n’eluigwe, Jisọs ga-arụ ọrụ ebube n’ọ̀tụ̀tụ̀ zuru ụwa ọnụ
[Ebe E Si Nweta Foto]
Ụwa: Dabere na foto nke NASA