-
Akwụkwọ AmụmaAkwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile
-
-
Babilọn oge ochie ghọrọ “ọla alaeze nile.” (Aịsaịa 13:19, The New American Bible) Obodo a gbasapụrụ agbasapụ nọziri anọzi n’ụzọ ahịa sitere Persian Gulf gaa Osimiri Mediterranean, na-eje ozi dị ka ebe ndọba ihe azụmahịa maka ahịa nke ma elu ala ma elu mmiri n’agbata Ebe Ọwụwa Anyanwụ na Ebe Ọdịda Anyanwụ.
Ka ọ na-erule narị afọ nke asaa T.O.A., Babilọn bụ isi obodo yiri ka a pụghị imeri ya emeri nke Alaeze Ukwu Babilọn. Obodo ahụ nọ n’akụkụ abụọ nke Osimiri Yufretis, e jikwa mmiri osimiri ahụ wuo ékpè miri emi na njikọ nke ọwa mmiri. Tụkwasị na nke a, e ji nnukwute usoro mgbidi gbara mkpị, nke a gbakwụnyere ọtụtụ ụlọ elu nchebe, chebe obodo ahụ. Ka a sịkwa ihe mere o ji yie ndị bi na ya ka ha nọ ná nchebe.
Ka o sina dị, na narị afọ nke asatọ T.O.A., tupu Babilọn etoruo ebube ya, Aịsaịa onye amụma buru amụma na ‘a ga-ewere azịza mkpochapụ zachapụ’ Babilọn. (Aịsaịa 13:19; 14:22, 23) Aịsaịa kọwakwara kpọmkwem ụzọ Babilọn ga-esi daa. Ndị mwakpo ya ‘ga-atakọ’ osimiri ya—isi iyi nke ihe nchebe ya yiri ékpè—na-etinye obodo ahụ n’ihe ize ndụ. Ọbụna na Aịsaịa nyere aha onye mmeri ya—“Saịrọs,” eze ukwu nke Peasia, “onye a ga-emeghesị ọnụ ụzọ ámá n’ihu ya, ọ dịghịkwa ụzọ a ga-emechi.”—Aịsaịa 44:27–45:2, The New English Bible.
-
-
Akwụkwọ AmụmaAkwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile
-
-
“Ọ Gaghị Abụ Ebe Obibi Ọzọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi”
Gịnị ga-eme Babilọn ma ọdịda ya gasịa? Aịsaịa buru amụma, sị: “Ọ gaghị abụ ebe obibi ọzọ ruo mgbe ebighị ebi; a gaghị ebikwa n’ime ya ruo ọgbọ nile: onye Arebia agaghị amakwa ụlọikwuu ya n’ebe ahụ; ndị ọzụzụ atụrụ agaghị emekwa ka atụrụ ha makpuo n’ebe ahụ.” (Aịsaịa 13:20) Ọ pụrụ iyiwo ihe ijuanya, ka a ghara ikwuwe oké okwu, ikwu na n’ọdịnihu obodo dị otú a nọ n’ọnọdụ ọma agaghị abụkwa ebe obibi ruo mgbe ebighị ebi. À pụrụ idewo okwu Aịsaịa mgbe o kirisịworo Babilọn tọgbọrọ n’efu?
Mgbe mmeri Saịrọs gasịrị, Babilọn mmadụ bi—ọ bụ ezie na ọ bụ nke na-adịchaghị ike—dịgidere ruo ọtụtụ narị afọ. Cheta na Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ gụnyere otu akwụkwọ Aịsaịa zuru ezu nke e gosiri na ọ dị eri narị afọ nke abụọ T.O.A. N’ihe dị ka n’oge a na-edepụtaghachi akwụkwọ mpịakọta ahụ, ndị Parthia weghaara Babilọn. Na narị afọ mbụ O.A., e nwere ógbè ndị Juu na Babilọn, Pita so dee Bible letakwara ebe ahụ. (1 Pita 5:13) N’oge ahụ, Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ nke Aịsaịa adịworị eri ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ narị afọ abụọ. Ya mere, ka ọ na-erule narị afọ mbụ O.A., Babilọn atọgbọrọbeghị n’efu kpam kpam, ma e dezuwo akwụkwọ Aịsaịa ogologo oge tupu mgbe ahụ.a
Dị ka e buru n’amụma, Babilọn mesịrị ghọọ “obo ihe obo ihe.” (Jeremaịa 51:37) Dị ka ọkà mmụta bụ́ onye Hibru bụ́ Jerome (narị afọ nke anọ O.A.) kwuru, ka ọ na-erule ụbọchị ya Babilọn bụ ebe ịchụ nta bụ́ ebe “ụdị anụ ọhịa nile” na-awagharị.9 Babilọn ka tọgbọ n’efu ruo taa.
Aịsaịa anọgideghị ndụ ruo ịhụ ka Babilọn na-enweghị onye obibi. Ma mkpọmkpọ ebe nke obodo ahụ dịbu ike, ihe dị ka kilomita 80 n’ebe ndịda Baghdad, n’Iraq nke oge a, na-agba akaebe n’ekwughị okwu nye mmezu nke okwu ya: “Ọ gaghị abụ ebe obibi ọzọ ruo mgbe ebighị ebi.” Mwughachi ọ bụla nke Babilọn dị ka ihe ndọrọ ndị njem nleta pụrụ ịrata ndị ọbịa, ma “ụmụ na ụmụ ụmụ” Babilọn efunyụwo anya.—Aịsaịa 13:20; 14:22, 23.
Ya mere Aịsaịa onye amụma ekwughị okwu ọdịnihu na-edoghị anya a pụrụ ime ka o kwekọọ n’ihe ọ bụla mere n’ọdịnihu. O degharịghịkwanụ akụkọ ihe mere eme iji mee ka o yie amụma. Chee banyere ya: Onye aghụghọ ọ̀ ga-anwa anwa “ibu amụma” ihe ọ na-agaghị enwe nchịkwa ọ bụla na ya—na Babilọn dị ike agaghị enwekwa onye obibi ọzọ ruo mgbe ebighị ebi?
-