Ọnọdụ Kwesịrị Ekwesị nke Ofufe Jehova ná Ndụ Anyị
“Kwa ụbọchị ka m ga-agọzi Gị; m ga-etokwa aha Gị ruo mgbe nile ebighị ebi.”—ABỤ ỌMA 145:2.
1. N’ihe banyere ofufe, gịnị ka Jehova na-achọ?
“MỤ ONWE m, bụ́ Jehova Chineke gị, bụ Chineke ekworo.” (Ọpụpụ 20:5) Mosis nụrụ nkwupụta okwu ahụ site n’ọnụ Jehova, o mesịkwara kwughachi ya mgbe ọ na-agwa mba Israel okwu. (Deuterọnọmi 5:9) E nweghị ihe ịrụ ụka ọ bụla n’uche Mosis na Jehova Chineke tụrụ anya ka ndị ohu Ya na-efe Ya ofufe n’ụzọ a na-ekewaghị ekewa.
2, 3. (a) Gịnị mesiri ndị Israel obi ike na ihe mere n’ebe dị nso n’Ugwu Saịnaị pụrụ iche? (b) Ajụjụ ndị dị aṅaa ka anyị ga-enyocha banyere ofufe nke ndị Israel na nke ndị ohu Chineke taa?
2 N’ịbụ ndị nọ nso n’Ugwu Saịnaị, ndị Israel na “ọtụtụ ndị gwara ọgwa” so ha hapụ Ijipt ji anya ha hụ otu ihe pụrụ iche. (Ọpụpụ 12:38) O yighị ofufe nke chi nile nke Ijipt, bụ́ ndị e mechuworo ihu ugbu a site n’ihe otiti iri ndị ahụ. Ka Jehova gosipụtara ọnụnọ ya nye Mosis, ihe omume ndị na-akpali egwu weere ọnọdụ: égbè eluigwe, àmụ̀mà, na ụda na-adachi ntị nke opi bụ́ nke mere ka ogige ahụ maa jijiji. Ọkụ na anwụrụ ọkụ sochiri ka ugwu ahụ dum mara jijiji. (Ọpụpụ 19:16-20; Ndị Hibru 12:18-21) Ọ bụrụ na onye Israel ọ bụla chọkwuru ihe àmà nke na-egosi na ihe na-emenụ pụrụ iche, nke ahụ ga-abịa n’isi nso. N’oge na-adịghị anya, Mosis rịdatara n’elu ugwu ahụ mgbe ọ natasịrị mbadamba nke abụọ nke iwu Chineke. Dị ka ihe ndekọ sitere n’ike mmụọ nsọ si kwuo, “akpụkpọ ihu [Mosis] nwupụtara ìhè; [ndị ahụ] wee tụọ egwu ịbịaru ya nso.” N’ezie, nke ahụ bụ ahụmahụ a na-agaghị echefu echefu, nke karịrị ike mmadụ!—Ọpụpụ 34:30.
3 Nye mba ihe atụ ahụ nke Chineke, e nweghị ihe ịrụ ụka ọ bụla banyere ọnọdụ nke ofufe Jehova nọ na ya. Ọ bụ Onye Mgbapụta ha. Ndụ ha dị ya n’aka. Ọ bụkwa Onye Na-enye ha iwu. Ma hà debere ofufe Jehova n’ọnọdụ mbụ? Gịnịkwa banyere ndị ohu Chineke n’oge a? Ọnọdụ dị aṅaa ka ofufe Jehova nwere ná ndụ ha?—Ndị Rom 15:4.
Ofufe Israel Fere Jehova
4. Gịnị bụ usoro nhazi nke ogige Israel n’oge njem ọzara ha, gịnịkwa dị n’etiti ogige ahụ?
4 Ọ bụrụ na i siworị n’elu lee ogige Israel n’ọzara ahụ, gịnị ka ị ga-ahụworị? Usoro ụlọ ntú dị ọtụtụ, ma dị n’usoro nke bụ ebe obibi nke ihe dị ka nde mmadụ atọ ma ọ bụ karịa, ndị a haziri n’ìgwè n’ìgwè gaa ná nkewa ebo atọ n’ebe ugwu, ndịda, ọwụwa anyanwụ, na ọdịda anyanwụ. N’ilerukwu anya nso, ị gaara ahụwokwa ìgwè ọzọ a haziri ahazi nke dị nso karị n’etiti ogige ahụ. Usoro ụlọ ntú ndị a dị nta karị bụ ebe obibi nke ezinụlọ nile nke ebo Livaị. Kpọmkwem n’etiti ogige ahụ, n’otu ebe e kewapụrụ iche site n’ákwà ngebichi, e nwere otu ihe a rụrụ arụ pụrụ iche. Nke a bụ “ụlọ ikwuu nzute,” ma ọ bụ ụlọ nsọ, bụ́ nke ndị Israel nwere “obi amamihe” wuworo dị ka ụkpụrụ Jehova si dị.—Ọnụ Ọgụgụ 1:52, 53; 2:3, 10, 17, 18, 25; Ọpụpụ 35:10.
5. Nzube dị aṅaa ka ụlọ ikwuu mezuru n’Israel?
5 Na nke ọ bụla n’ihe dị ka ogige 40 n’oge ha nọ na njem ọzara ha, Israel wuru ụlọ ikwuu, o wee ghọọ ebe nlekwasị anya nke ogige ha. (Ọnụ Ọgụgụ, isi nke 33) N’ụzọ dabara nke ọma, Bible na-akọwa Jehova dị ka onye bi n’etiti ndị ya kpọmkwem n’etiti ogige ha. Ebube ya jupụtara ụlọ ikwuu ahụ. (Ọpụpụ 29:43-46; 40:34; Ọnụ Ọgụgụ 5:3; 11:20; 16:3) Akwụkwọ bụ́ Our Living Bible na-ekwu, sị: “Ụlọ nsọ mbugharị nke a bụ ihe dị oké mkpa, ebe ọ bụ na o mere ka ebo ndị ahụ nwee ebe ha na-ezukọ maka okpukpe. O si otú a mee ka ha dị n’otu n’ogologo afọ ndị ahụ ha wagharịrị n’ọzara ma mee ka o kwe omume ha imekọ ihe ọnụ.” Karịa nke ahụ, ụlọ ikwuu ahụ ghọrọ ihe ncheta mgbe nile nke na ofufe ndị Israel na-efe Onye Okike ha dị mkpa ná ndụ ha.
6, 7. Ihe owuwu dị aṅaa maka ofufe dochiri ụlọ ikwuu ahụ, oleekwa ụzọ o si jeere mba Israel ozi?
6 Mgbe ndị Israel bịarutesịrị n’Ala Nkwa ahụ, ụlọ ikwuu nọgidere na-abụ ebe nlekwasị anya nke ofufe Israel. (Joshua 18:1; 1 Samuel 1:3) Mgbe oge na-aga, Eze Devid mere atụmatụ iwu ihe owuwu na-adịgide adịgide. Nke a ghọrọ ụlọ nsọ ahụ, nke nwa ya bụ́ Solomọn mesịrị wuo. (2 Samuel 7:1-10) N’oge ememe nraranye ya, igwe ojii dara iji gosi nnakwere Jehova nakweere ụlọ ahụ. “N’ezie ewuworo m Gị ụlọ obibi,” ka Solomọn kpere n’ekpere, “bụ́ ọnọdụ guzosiri ike ebe Ị ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi.” (1 Ndị Eze 8:12, 13; 2 Ihe Emere 6:2) Ụlọ nsọ ahụ e wuru ọhụrụ ghọrọ ugbu a ogige bụ isi maka ofufe nke mba ahụ.
7 Ugbo atọ n’afọ, ndị ikom nile nke Israel gara na Jerusalem ịnọ n’ememe ọṅụ ndị a na-eme n’ụlọ nsọ ahụ n’obi ekele maka ngọzi Chineke. N’ụzọ kwesịrị ekwesị, a kpọrọ oge nnọkọrịta ndị a “mgbe [“ememe,” NW] nile a kara aka nke Jehova,” na-elekwasị anya n’ofufe Chineke. (Levitikọs 23:2, 4) Ndị inyom ji ofufe kpọrọ ihe gara, tinyere ndị ọzọ so n’ezinụlọ.—1 Samuel 1:3-7; Luk 2:41-44.
8. Olee otú Abụ Ọma 84:1-12 si gbaa àmà banyere ịdị mkpa nke ofufe Jehova?
8 Onye ọbụ abụ ahụ nwere ike mmụọ nsọ kwupụtara n’ụzọ dị werewere ụzọ e si lee ofufe anya dị ka ihe dị mkpa ná ndụ ha. “Lee ka ebe obibi Gị nile si bụrụ ebe a hụrụ n’anya nke ukwuu, Jehova nke usuu nile nke ndị agha!” ka ụmụ Kora bụrụ n’abụ. N’ezie ha adịghị eto ụlọ nkịtị otuto. Kama nke ahụ, ha weliri olu ha elu n’otuto nye Jehova Chineke, na-ekwupụta, sị: “Obi m na anụ ahụ m na-etiku Chineke dị ndụ mkpu ọṅụ.” Ozi ndị Livaị wetaara ha obi ụtọ dị ukwuu. “Ndị ihe na-agara nke ọma ka ndị bi n’ụlọ Gị bụ,” ka ha kpọsara. “Ha ga-anọ na-eto Gị.” N’ezie, ndị Israel nile pụrụ ịbụ abụ, sị: “Onye ihe na-agara nke ọma ka mmadụ ahụ bụ nke ike o nwere dị na Gị; ụzọ nile a tụliri atụli . . . dị ha n’obi . . . Ha na-esi n’ike jeruo ike, a na-eme ka Chineke hụ onye ọ bụla n’ime ha n’ime Zaịọn.” Ọ bụ ezie na njem onye Israel gaa Jerusalem pụrụ ịdịworị ogologo ma na-agwụ ike, ọ na-enwetaghachi ume ya mgbe o rutere n’isi obodo ahụ. Obi ya jupụtara n’ọṅụ ka ọ na-eto ihe ùgwù o nwere ife Jehova: “N’ihi na otu ụbọchị n’ogige Gị nile dị mma karị [otu puku ụbọchị] n’ebe ọzọ. Ahọpụtawo m iguzo ná mbata ụzọ n’ụlọ Chineke m, karịa ibi n’ụlọ ikwuu nile nke mmebi iwu. . . . Jehova nke usuu nile nke ndị agha, onye ihe na-agara nke ọma ka mmadụ ahụ bụ nke na-atụkwasị obi na Gị.” Nkwupụta ndị dị otú ahụ na-ekpughe ọnọdụ mbụ nke ndị Israel ahụ nyere ofufe Jehova.—Abụ Ọma 84:1-12.
9. Gịnị mere mba Israel mgbe ọ dara idebe ofufe Jehova n’ọnọdụ mbụ?
9 N’ụzọ dị mwute, Israel dara n’idebe ezi ofufe n’ọnọdụ mbụ. Ha kwere ka ofufe nke chi ụgha dị iche iche mebie ịnụ ọkụ n’obi ha nye Jehova. Dị ka ihe si na ya pụta, Jehova gbahapụrụ ha n’aka ndị iro ha, na-ekwere ka a dọkpụrụ ha n’agha laa Babilọn. Mgbe e weghachiri ha n’ala ha mgbe 70 afọ gasịrị, Jehova nyere Israel agbamume ndị na-akpali akpali site n’ọnụ ndị amụma bụ́ Hagaị, Zekaraịa, na Malakaị. Onye nchụàjà bụ́ Ezra na Onye Ọchịchị bụ́ Nehemaịa kpaliri ndị Chineke iwughachi ụlọ ahụ na iguzobeghachi ezi ofufe n’ebe ahụ. Ma ka ọtụtụ narị afọ gafere, ezi ofufe ghọrọ ọzọ ihe nọ n’ọnọdụ dị ala ná mba ahụ.
Ịnụ Ọkụ n’Obi Maka Ezi Ofufe na Narị Afọ Mbụ
10, 11. Olee ọnọdụ ofufe Jehova nwere ná ndụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi mgbe Jisọs nọ n’elu ala?
10 N’oge Jehova kara aka, Mesaịa pụtara. Ndị kwesịrị ntụkwasị obi nọ na-ele Jehova anya maka nzọpụta. (Luk 2:25; 3:15) Ihe ndekọ Oziọma Luk kọwara Ana nke dị 84 afọ n’ụzọ doro anya dị ka nwanyị di ya nwụrụ “onye na-apụghị n’ụlọ Chineke, ma o weere obubu ọnụ na arịrịọ na-ekpere Chineke abalị na ehihie.”—Luk 2:37.
11 “Ihe oriri m,” ka Jisọs kwuru, “bụ ka M na-eme ihe Onye zitere na-achọ, ka M rụzuokwa ọrụ Ya.” (Jọn 4:34) Cheta otú Jisọs si mee omume mgbe ọ bịakwutere ndị ahụ na-agbanwe ego n’ụlọ nsọ ahụ. O kpuru table ha ihu n’ala tinyekwara oche nile nke ndị ahịa ahụ na-ere nduru. Mak na-akọ, sị: “[Jisọs ekweghịkwa] ka onye ọ bụla buru ihe gabiga n’etiti ụlọ ukwu Chineke. O wee zie ihe, sị ha, É deghị ya n’akwụkwọ nsọ, sị, A ga-akpọ ụlọ m ụlọ ekpere mba nile? ma unu onwe unu emewo ya ọ́gbà ndị na-apụnara mmadụ ihe.” (Mak 11:15-17) Ee, Jisọs ekweghịdị ka onye ọ bụla soro ụzọ azụ ụlọ gafere ogige mbara ụlọ nsọ ahụ mgbe onye ahụ na-ebu ụmụ arịa gaa n’akụkụ ọzọ nke obodo ahụ. Omume Jisọs mesighachiri ndụmọdụ o nyere na mbụ ike: “Ma burunụ ụzọ chọọ alaeze Ya, na ezi omume [Chineke].” (Matiu 6:33) Jisọs hapụụrụ anyị ihe nlereanya mara mma n’inye Jehova ofufe ya zuru ezu. O tinyere ihe o kwusara n’omume n’ezie.—1 Pita 2:21.
12. Olee otú ndị na-eso ụzọ Jisọs si gosipụta ọnọdụ mbụ nke ha nyere ofufe Jehova?
12 Jisọs setịpụkwara ihe nlereanya maka ndị na-eso ụzọ ya ịgbaso site n’ụzọ o si rụzuo ọrụ ya ịtọhapụ ndị Juu e wedara ala, ma bụrụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi, pụọ n’ibu arọ nke ememe nile nke okpukpe ụgha. (Luk 4:18) Ná nrubeisi nye iwu Jisọs ime ndị na-eso ụzọ na ime ha baptism, ndị Kraịst oge mbụ ji obi ike kpọsaa uche Jehova n’ihe metụtara Onyenwe ha e si n’ọnwụ kpọlite. Jehova nwere obi ụtọ n’ọnọdụ mbụ ha nyere ofufe Ya. Otú a, ndị mmụọ ozi Chineke n’onwe ha tọhapụrụ ndị ozi bụ́ Pita na Jọn n’ụzọ ọrụ ebube site n’ụlọ mkpọrọ ma nye ha iwu, sị: “Gaanụ, guzo, gwakwa ndị Juu n’ụlọ ukwu Chineke okwu nile nke Ndụ a.” N’ịbụ ndị obi siri ike ọzọ, ha rubere isi. Kwa ụbọchị, ma n’ụlọ nsọ Jerusalem ma site n’ụlọ ruo n’ụlọ “ha adịghị ahapụ izi ihe na izisa ozi ọma Jisọs, na Ọ bụ Kraịst.”—Ọrụ 1:8; 4:29, 30; 5:20, 42; Matiu 28:19, 20.
13, 14. (a) Kemgbe oge ndị Kraịst mbụ, gịnị ka Setan nwaworo ime ndị ohu Chineke? (b) Gịnị ka ndị ohu Chineke na-ekwesị ntụkwasị obi nọgideworo na-eme?
13 Ka mmegide nye nkwusa ha na-amụba, Chineke duziri ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi idetu ndụmọdụ bịara n’oge ya. “Na-atụkwasịnụ Ya nchegbu nile unu na-echegbu onwe unu, n’ihi na ihe nile banyere unu na-emetụ Ya n’obi,” ka Pita dere n’oge na-adịghị anya mgbe 60 O.A. gasịrị. “Nweenụ anya udo, na-echenụ nche: onye ahụ nke na-ekuru unu gaa ikpe, bụ́ ekwensu, dị ka ọdụm na-agbọ ụja, ọ na-ejegharị, na-achọ onye ọ ga-elomi: ma na-eguzogidenụ ya, n’ihi na unu dị ike n’okwukwe unu, ebe unu matara na a na-emezu otu ahụhụ ahụ n’ahụ ndị bụ òtù ụmụnna unu ndị nọ n’ụwa.” N’ezie ndị Kraịst oge mbụ chọtara mmesi obi ike n’okwu ndị ahụ. Ha maara na mgbe ha taworo ahụhụ ruo nwa oge, Chineke ga-eweta ọzụzụ ha ná ngwụsị. (1 Pita 5:7-10) Na mgbe ikpeazụ ndị ahụ nke usoro ihe ndị Juu, ezi ndị Kraịst buliri ofufe Jehova nke mara mma elu gaa n’ọ̀tụ̀tụ̀ ọhụrụ.—Ndị Kọlọsi 1:23.
14 Dị ka Pọl onyeozi buworo n’amụma, ndapụ n’ezi ofufe, isi n’ezi ofufe pụọ, weere ọnọdụ. (Ọrụ 20:29, 30; 2 Ndị Tesalọnaịka 2:3) Akaebe ndị e nwere n’afọ iri ndị ikpeazụ nke narị afọ mbụ kwakọbara ihe àmà na-egosi nke a. (1 Jọn 2:18, 19) Setan nwere ihe ịga nke ọma n’ịkụnye ndị Kraịst adịgboroja n’etiti nke ezigbo, na-eme ka o sie ike ịmata ọdịiche dị n’etiti “ata” ndị ahụ na ndị Kraịst yiri ọka. Otú o sina dị, mgbe ọtụtụ narị afọ na-agafe, ndị ụfọdụ debere ofufe Chineke n’ọnọdụ mbụ, ọbụna na-etinye ndụ ha n’ihe ize ndụ. Ma ọ bụghị ruo n’iri afọ ndị ikpeazụ ahụ nke “oge nke mba ọzọ” ka Chineke chịkọtara ndị ohu ya ọzọ gaa n’ezi ofufe e buliri elu.—Matiu 13:24-30, 36-43; Luk 21:24.
E Bulie Ofufe Jehova Elu n’Oge A
15. Kemgbe 1919, olee otú amụma ndị dị n’Aịsaịa 2:2-4 na Maịka 4:1-4 siworo mezuo?
15 Na 1919, Jehova mere ka ihe fọdụrụ ná ndị e tere mmanụ dị ike ịrụ ọrụ ịgba àmà zuru ụwa ọnụ nke chọrọ obi ike bụ́ nke weliworo ofufe nke ezi Chineke ahụ elu. Site ná nnubata nke “atụrụ ọzọ” ihe atụ ahụ malite na 1935 gaa n’ihu, ìgwè mmadụ ndị na-arịgo n’ụzọ ime mmụọ ‘n’ugwu nke ụlọ Jehova’ anọwo na-amụba. N’ime afọ ije ozi 1993, 4,709,889 Ndịàmà Jehova nyere ya otuto site n’ịkpọ ndị ọzọ òkù ka ha sonye n’ofufe ya e buliri elu. Lee ọdịiche nke a mere ka e nwee n’ọnọdụ ime mmụọ dara ada nke “ugwu nta” ịrọ òtù nke alaeze ụwa nke okpukpe ụgha, karịsịa na Krisendọm!—Jọn 10:16; Aịsaịa 2:2-4; Maịka 4:1-4.
16. Gịnị ka ọ dị mkpa ka ndị ohu Chineke nile mee n’ihi ihe e buru n’amụma n’Aịsaịa 2:10-22?
16 Ndị òtù okpukpe ụgha na-ele chọọchị na katidral ha na ọbụna ndị ụkọchukwu ha anya dị ka ndị “dịkwa elu,” na-enye ha ùtú aha na otuto ndị na-ada oké ụda. Ma rịba ama ihe Aịsaịa buru n’amụma: “A ghaghị ime anya mpako nke mmadụ ka ha dị ala, a ghaghịkwa iruda mbuli elu nke ndị nile n’ala, a ghaghịkwa ime ka Jehova, nanị Ya, dị elu n’ụbọchị ahụ.” Olee mgbe nke a ga-abụ? N’oge mkpagbu ukwu na-eru oké nso mgbe “ihe efu ha, ha nile aghaghị ịgasị.” N’iburu n’uche oké ịdị nso nke oge ahụ na-akpali egwu, ọ dị mkpa ndị nile na-ejere Chineke ozi inyocha nke ọma ọnọdụ ofufe Jehova nwere ná ndụ ha.—Aịsaịa 2:10-22.
17. Olee otú ndị ohu Jehova taa si egosipụta ọnọdụ mbụ nke ha na-enye ofufe Jehova?
17 Dị ka òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ, a maara Ndịàmà Jehova nke ọma maka ịnụ ọkụ n’obi ha n’ikwusa Alaeze ahụ. Ofufe ha abụghị nanị iji mezuo iwu n’ụzọ okpukpe, nke a na-eme ruo otu hour ma ọ bụ karịa kwa izu. Ee e, ọ bụ ụzọ ndụ ha dum. (Abụ Ọma 145:2) N’ezie, n’afọ gara aga ihe karịrị 620,000 Ndịàmà haziri ihe omume ha iji kere òkè n’ozi oge nile nke ndị Kraịst. Ndị ọzọ adịghị eleghara ofufe Jehova anya n’ezie. Ọ na-apụta ìhè nke ọma ma ná mkparịta ụka ha kwa ụbọchị ma ná nkwusa ihu ọha ha, ọbụna ma a sị na ibu ọrụ ezinụlọ ha emee ka ọ dị mkpa ha ịrụsi ọrụ ike n’ọrụ ego ha.
18, 19. Kọọ ihe atụ nke agbamume ndị ị nataworo site n’ịgụ akụkọ ndụ nke Ndịàmà.
18 Akụkọ nke ndụ Ndịàmà e bipụtaworo n’Ụlọ Nche na-eme ka a ghọta ụzọ ụmụnna nwoke na nwanyị dị iche iche siworo debe ofufe Jehova n’ọnọdụ mbụ ná ndụ ha. Otu nwanna nwanyị raara ndụ ya nye Jehova n’oge ọ dị afọ isii setịpụrụ ozi ala ọzọ dị ka ihe mgbaru ọsọ ya. Unu ụmụnna nwoke na nwanyị na-eto eto, olee ihe mgbaru ọsọ unu pụrụ ịhọrọ nke ga-enyere unu aka idebe ofufe Jehova n’ọnọdụ mbụ ná ndụ unu?—Lee isiokwu bụ́ “Ịchụso Ihe Mgbaru Ọsọ nke M Setịpụrụ Mgbe M Dị Afọ Isii,” nke dị n’Ụlọ Nche nke March 1, 1992, peji nke 26-30.
19 Otu nwanna nwanyị meworo agadi nke di ya nwụworo na-enye ezi ihe nlereanya ọzọ banyere idebe ofufe Jehova n’ọnọdụ ya kwesịrị ekwesị. O nwetara agbamume dị ukwuu iji tachie obi site n’aka ndị o nyewooro aka ịmụta eziokwu ahụ. Ha bụ “ezinụlọ” ya. (Mak 3:31-35) Ọ bụrụ na ị chọta onwe gị n’ọnọdụ ndị yiri nke ahụ, ị̀ ga-anakwere nkwado na enyemaka nke ndị ka na-eto eto nọ n’ọgbakọ? (Biko rịba ama ụzọ Nwanna Nwanyị Winifred Remmie si kọwaa onwe ya na “Azara M Òkù n’Oge Owuwe Ihe Ubi,” nke e bipụtara n’Ụlọ Nche nke July 1, 1992, peji nke 21-23.) Unu ndị na-eje ozi oge nile, gosipụtanụ na ofufe Jehova nọ n’ezie n’ọnọdụ mbụ ná ndụ unu site n’iji obi umeala na-eje ozi ebe e kenyere unu, na-adị njikere ịnọ n’okpuru nduzi ọchịchị Chineke. (Biko rịba ama ihe nlereanya nke Nwanna Roy Ryan, dị ka a kọrọ ya n’isiokwu bụ́ “Ịrapagidesi Ike ná Nzukọ Chineke,” nke dị n’Ụlọ Nche nke December 1, 1991, peji nke 24-27.) Cheta na mgbe anyị debere ofufe Jehova n’ọnọdụ mbụ, anyị na-enwe mmesi obi ike na ọ ga-elekọta anyị. Ọ dịghị mkpa anyị ichegbu onwe anyị banyere ebe ihe ndị dị mkpa ná ndụ ga-esi bịa. Ahụmahụ nke Nwanna Nwanyị Olive na Sonia Springate na-eme ihe atụ nke a.—Lee isiokwu ahụ bụ́ “Anyị Ebuwo Ụzọ Chọọ Alaeze Ahụ,” nke dị n’Ụlọ Nche nke February 1, 1994, peji nke 20-25.
20. Ajụjụ ndị dị aṅaa dị mkpa ka anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị ugbu a?
20 Mgbe ahụ, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịjụ onwe anyị n’otu n’otu ajụjụ ụfọdụ na-abami n’obi? Ọnọdụ dị aṅaa ka ofufe Jehova nwere ná ndụ anyị? Àna m emezu nraranye m ime uche Chineke ruo ókè ike kwere m? N’akụkụ dị aṅaa nke ndụ ka m pụrụ imeziwanye? Ntụle e chemiri echemi nke isiokwu na-esonụ ga-ewepụta ohere a ga-eji tụgharịa uche n’ụzọ anyị si eji ihe ndị anyị nwere eme ihe n’ikwekọ n’ihe anyị họọrọ idebe n’ọnọdụ mbụ ná ndụ—ofufe nke Eze Onyenwe anyị Jehova, Nna anyị nke na-ahụ n’anya.—Eklisiastis 12:13; 2 Ndị Kọrint 13:5.
Ná Ntụleghachi
◻ N’ihe banyere ofufe, gịnị ka Jehova na-achọ?
◻ Banyere gịnị ka ụlọ ikwuu ahụ jere ozi dị ka ihe ncheta?
◻ Na narị afọ mbụ O.A., olee ndị bụ ihe nlereanya pụrụ iche nke ịnụ ọkụ n’obi maka ezi ofufe, n’ụzọ dịkwa aṅaa?
◻ Kemgbe 1919, olee otú e siworo bulie ofufe Jehova elu?