Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ip-1 isi 4 p. 37-48
  • E Bulie Ụlọ Jehova Elu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • E Bulie Ụlọ Jehova Elu
  • Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mba Ndị Na-eruba n’Ofufe Dị Ọcha
  • Ugwu A Ga-anọ na Ya Fee Ofufe
  • Ibuli Ofufe Dị Ọcha Elu
  • E Bulie Ofufe Elu ná Ndụ Ndị Mmadụ
  • Ndị A Kụziiri Ụzọ Jehova
  • Mma Agha Ịghọ Mma Ogè
  • Ịgbaso Ụzọ Nile nke Udo
  • Ọdịnihu Udo
  • “Ka Anyị Gbagoo n’Ugwu Jehova”
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ (2016)
  • Nzọpụta na Ịṅụrị Ọṅụ n’Oge Ọchịchị Mesaịa
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
  • Ìhè nke Dịịrị Mba Nile
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ II
  • Ezi Ofufe Agbasaa n’Ụwa Nile
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ II
Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
ip-1 isi 4 p. 37-48

Isi nke Anọ

E Bulie Ụlọ Jehova Elu

Aịsaịa 2:1-5

1, 2. Olee okwu ndị e dekwasịrị n’otu mgbidi dị n’ihe owuwu nke òtù Mba Ndị Dị n’Otu, oleekwa ebe e si nweta ha?

“HA GA-AKPỤGHARỊ mma agha ha ka ha bụrụ mma ogè. Ube ha kwa ka ha bụrụ mma ịkwa osisi: mba agaghị ebuli mma agha imegide mba. Nke ha ji amụtakwanụ agha ọzọ.” E dekwasịrị okwu ndị a n’ahụ otu mgbidi dị n’ihe owuwu òtù Mba Ndị Dị n’Otu dị na New York City. Ruo ọtụtụ iri afọ a mataghị ebe e si nweta ihe ahụ e hotara. Ebe ebumnobi nke òtù UN bụ ịrụ ọrụ iji weta udo n’ụwa nile, ọ dị mfe ikwubi na ọ bụ ndị guzobere òtù UN, na 1945, kwuru ihe ahụ e hotara.

2 Otú ọ dị, na 1975 e jiri chịsụl kanye aha bụ́ Aịsaịa ná mgbidi ahụ n’okpuru ihe ahụ e hotara. O doziri anya na okwu ndị ahụ abụghị n’oge a ka e kwuru ha. N’ezie, e dekọrọ ha dị ka amụma ihe karịrị afọ 2,700 gara aga n’ebe bụ́ ugbu a isi nke 2 nke akwụkwọ Aịsaịa. Ruo ọtụtụ narị afọ iri ndị hụrụ udo n’anya atụgharịwo uche n’otú na mgbe ihe ndị Aịsaịa buru n’amụma ga-ewere ọnọdụ. Ọ dịkwaghị mkpa ịnọ ná mgbagwoju anya. Taa anyị ji anya anyị na-ahụ mmezu dị ịrịba ama nke amụma ochie a.

3. Olee ndị bụ mba ndị ahụ na-akpụgharị mma agha ha ịghọ mma ogè?

3 Olee ndị bụ mba ndị ahụ kpụgharịrị mma agha ha ịghọ mma ogè? N’ezie, ha abụghị mba ndọrọ ndọrọ ọchịchị na gọọmenti ndị nke oge a. Ruo ugbu a mba ndị a akpụpụtawo mma agha, ma ọ bụ ngwá agha, maka iji lụọ agha nakwa iji chekwaa “udo” n’ike. N’ezie, ihe a na-emekarị abụrụwo mba nile ịkpụgharị mma ogè ha ịghọ mma agha! Amụma Aịsaịa na-emezu n’etiti ndị nnọchiteanya sitere ná mba nile, bụ́ ndị na-efe Jehova, bụ́ “Chineke nke udo,” ofufe.—Ndị Filipaị 4:9.

Mba Ndị Na-eruba n’Ofufe Dị Ọcha

4, 5. Gịnị ka amaokwu ndị mbụ nke Aịsaịa isi nke 2 na-ebu amụma ya, gịnịkwa na-emesi ya ike na a pụrụ ịdabere n’okwu ndị ahụ?

4 Aịsaịa isi nke 2 ji okwu ndị a malite: “Okwu nke Aịsaịa nwa Emọz hụrụ banyere Juda na Jerusalem. Ọ ga-erukwa n’ikpeazụ nke ụbọchị ndị a, na ugwu nke ụlọ Jehova ga na-eguzosi ike n’elu ugwu nile, a ga-ebulikwa ya elu karịa ugwu nta nile; mba nile ga-eruba n’ime ya dị ka osimiri.”—Aịsaịa 2:1, 2.

5 Rịba ama na ihe Aịsaịa buru n’amụma abụghị ịkọ nkọ efu. A gwara Aịsaịa ka o dekọọ ihe ndị ‘na-aghaghị ime’ (NW)—n’aghaghị agha. Ihe ọ bụla Jehova zubere aghaghị ‘ịga nke ọma.’ (Aịsaịa 55:11) Dị ka ihe àmà gosiri, iji mesie ndabere a pụrụ ịdabere ná nkwa ya ike, Chineke kpaliri Maịka onye amụma, bụ́ onye ya na Aịsaịa dịkọrọ ndụ, idetu amụma ahụ e depụtara n’Aịsaịa 2:2-4 n’akwụkwọ ya.—Maịka 4:1-3.

6. Olee mgbe amụma Aịsaịa mezuru?

6 Olee mgbe a gaje imezu amụma Aịsaịa? “N’ikpeazụ nke ụbọchị ndị a.” New International Version na-agụ, sị: “Na mgbe ikpeazụ.” Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst buru n’amụma ihe dị iche iche a ga-eji mata oge a. Agha, ala ọma jijiji, ajọ ọrịa na-efe efe, ụnwụ nri, na “oge dị oké egwu” socha n’ime ha.a (2 Timoti 3:1-5; Luk 21:10, 11) Mmezu nke amụma ndị dị otú ahụ na-enye ihe àmà bara ụba na anyị na-ebi “n’ikpeazụ nke ụbọchị ndị a,” mgbe ikpeazụ nke usoro ihe nke ụwa dị ugbu a. Mgbe ahụ, n’ụzọ ezi uche dị na ya, anyị ga-atụ anya ịhụ ka e mezuru n’oge anyị ihe ndị Aịsaịa buru n’amụma.

Ugwu A Ga-anọ na Ya Fee Ofufe

7. Olee nkọwa amụma nke Aịsaịa na-enye?

7 N’okwu ole na ole, Aịsaịa na-enye nkọwa doro anya nke bụ amụma. Anyị na-ahụ ugwu dị elu, nke ụlọ dị ebube, bụ́ ụlọ nsọ Jehova, dị n’elu elu ya. Ugwu a dị elu karịa ugwu nile dị ya gburugburu. Ma, ọ dịghị emenye mmadụ ụjọ; ọ na-adọrọ adọrọ. Ọ na-agụsi ndị si ná mba dị iche iche agụụ ike ịrịgo n’ugwu nke ụlọ Jehova; ha na-eruba n’ime ya. Ọ dị mfe iji anya nke uche hụ nke a, ma gịnị ka ọ pụtara?

8. (a) Olee ihe e jikọtara ya na ugwu n’oge Aịsaịa? (b) Gịnị ka mba dị iche iche iruba ‘n’ugwu nke ụlọ Jehova’ na-ese onyinyo ya?

8 N’oge Aịsaịa, a na-ejikọtakarị ugwu na ofufe. Dị ka ihe atụ, ha bụ ebe ndị a nọ kpeere arụsị na ebe e wuru ụlọ nsọ nke chi ụgha dị iche iche. (Deuterọnọmi 12:2; Jeremaịa 3:6) Otú ọ dị, ụlọ, ma ọ bụ ụlọ nsọ Jehova dị n’elu elu Ugwu Moraịa, nke dị na Jerusalem. Ndị Israel kwesịrị ntụkwasị obi na-aga Jerusalem ugboro atọ n’afọ ma na-arịgo Ugwu Moraịa iji fee ezi Chineke ahụ ofufe. (Deuterọnọmi 16:16) Ya mere mba dị iche iche iruba ‘n’ugwu nke ụlọ Jehova’ na-ese onyinyo nchịkọbata nke ọtụtụ ndị n’ezi ofufe.

9. Gịnị ka “ugwu nke ụlọ Jehova” na-anọchite anya ya?

9 Otú ọ dị, taa, ndị Chineke adịghị ezukọta n’ugwu nkịtị nke nwere ụlọ nsọ e ji okwute wuo. Ndị agha Rom bibiri ụlọ nsọ Jehova dị na Jerusalem na 70 O.A. E wezụga nke ahụ, Pọl onyeozi mere ka o doo anya na ụlọ nsọ ahụ dị na Jerusalem na ụlọikwuu dị tupu nke ahụ bụcha onyinyo. Ha nọchitere anya ihe ka ukwuu ga-ewere ọnọdụ n’ụzọ ime mmụọ, ‘ezi ụlọikwuu ahụ, nke Onyenwe anyị mara, ọ bụghị mmadụ.’ (Ndị Hibru 8:2) Ụlọikwuu ime mmụọ ahụ bụ ndokwa maka ịbịakwute Jehova n’ofufe na-adabere n’àjà mgbapụta Jisọs Kraịst. (Ndị Hibru 9:2-10, 23) N’ikwekọ na nke a, “ugwu nke ụlọ Jehova” nke e hotara n’Aịsaịa 2:2 na-anọchite anya ofufe dị ọcha e buliri elu nke Jehova n’oge anyị. Ndị na-anakwere ofufe dị ọcha adịghị ezukọta n’otu ebe ọ bụla; ha na-ezukọta n’ịdị n’otu nke ofufe.

Ibuli Ofufe Dị Ọcha Elu

10, 11. N’echiche dị aṅaa ka e buliworo ofufe Jehova elu n’oge anyị?

10 Onye amụma ahụ na-ekwu na “ugwu nke ụlọ Jehova,” ma ọ bụ ofufe dị ọcha, “ga na-eguzosi ike n’elu ugwu nile” na “a ga-ebulikwa ya elu karịa ugwu nta nile.” Ogologo oge tupu oge Aịsaịa, Eze Devid bugotere igbe ọgbụgba ndụ ahụ n’elu Ugwu Zaịọn nke dị na Jerusalem, bụ́ nke ji mita 760 dị elu karịa ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị elu nke oké osimiri. N’ebe ahụ ka igbe ahụ dịgidere ruo mgbe e bufere ya n’ụlọukwu ahụ e wusịworo nke dị n’elu Ugwu Moraịa. (2 Samuel 5:7; 6:14-19; 2 Ihe E Mere 3:1; 5:1-10) Ya mere, ka ọ na-erule n’oge Aịsaịa, e buliworị igbe ahụ dị nsọ elu n’ụzọ nkịtị ma debe ya n’ụlọ nsọ ahụ, n’ebe dị elu karịa ọtụtụ ugwu nta ndị gbara ya gburugburu bụ́ ndị e ji eme ihe maka ofufe ụgha.

11 Otú ọ dị, n’ụzọ ime mmụọ, o nweghị mgbe ofufe Jehova na-adịghị elu karịa omume okpukpe nke ndị na-efe chi ụgha. Otú ọ dị, n’oge anyị, Jehova ebuliwo ofufe ya elu nke ukwuu, karịa ụdị ofufe nile na-adịghị ọcha, ee, karịa nnọọ “ugwu nta nile” na ‘elu ugwu nile.’ N’ụzọ dị aṅaa? N’ụzọ bụ́ isi site ná nchịkọta nke ndị chọrọ ife ya ofufe “n’ime mmụọ na eziokwu.”—Jọn 4:23.

12. Olee ndị bụ “ụmụ alaeze eluigwe,” nchịkọta dịkwa aṅaa werewooro ọnọdụ?

12 Kraịst Jisọs zoro aka ‘n’ọgwụgwụ oge a’ dị ka oge owuwe ihe ubi mgbe ndị mmụọ ozi ga-achịkọpụta “ụmụ alaeze eluigwe”—ndị nwere olileanya nke iso Jisọs chịa n’ebube nke eluigwe. (Matiu 13:36-43) Kemgbe 1919, Jehova enyewo ‘ndị fọdụrụ’ n’ime ụmụ ndị a ike isoro ndị mmụọ ozi kere òkè n’ọrụ owuwe ihe ubi ahụ. (Mkpughe 12:17) N’ihi ya, iji malite, a chịkọtara “ụmụ alaeze eluigwe” ahụ, bụ́ ụmụnna Jisọs ndị e tere mmanụ. Mgbe ahụzi, ha na-ekere òkè n’ọrụ ịchịkọbata ndị ọzọ.

13. N’ụzọ dị aṅaa ka Jehova siworo gọzie ihe fọdụrụnụ e tere mmanụ?

13 N’oge owuwe ihe ubi a, Jehova enyeworo ihe fọdụrụnụ ahụ e tere mmanụ aka n’ụzọ na-aga n’ihu n’ihu ịghọta na iji Okwu ya, bụ́ Bible, mee ihe. Nke a kwa atụnyewo ụtụ n’ibuli ofufe dị ọcha elu. Ọ bụ ezie na “ọchịchịrị na-ekpuchi ụwa, oké ọchịchịrị na-ekpuchikwa ndị nile dị iche iche,” ndị e tere mmanụ na-enwu dị ka “ndị na-enye ìhè” n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ, ebe Jehova sachaworo ma nụchaa ha. (Aịsaịa 60:2; Ndị Filipaị 2:15) N’ịbụ ndị ‘jupụtara ná mmazu nke ihe Ọ na-achọ n’ime amamihe na nghọta nile nke Mmụọ Nsọ,’ ndị a e ji mmụọ nsọ tee mmanụ ‘na-enwupụ dị ka anyanwụ n’alaeze nke Nna ha.’—Ndị Kọlọsi 1:9.

14, 15. Tụkwasị n’ịchịkọta “ụmụ alaeze eluigwe” ahụ, olee nchịkọta ọzọ werewooro ọnọdụ, oleekwa otú Hagaị si buo nke a n’amụma?

14 Ọzọkwa, ndị ọzọ erubawo ‘n’ugwu nke ụlọ Jehova.’ N’ịbụ ndị Jisọs kpọrọ “atụrụ ọzọ” ya, ndị a nwere olileanya ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi na paradaịs elu ala. (Jọn 10:16; Mkpughe 21:3, 4) Malite n’afọ ndị 1930, ha pụtara na puku na puku, e mesịa na narị puku na narị puku, ugbu a kwa na nde na nde! N’ọhụụ e nyere Jọn onyeozi, a kọwara ha dị ka “oké ìgwè mmadụ, nke onye ọ bụla na-apụghị ịgụta ọnụ, ndị si ná mba nile ọ bụla, na ebo nile, na ndị nile, na asụsụ nile, pụta.”—Mkpughe 7:9.

15 Hagaị onye amụma buru amụma banyere mpụta nke oké ìgwè mmadụ a. O dere, sị: “Otú a ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị: Ọ fọdụrụ otu ugboro, nwa mgbe nta ka ọ bụ, Mụ onwe m gaje ime ka eluigwe na ụwa na oké osimiri na ala kpọrọ nkụ mee mkpatụ; M ga-emekwa ka mba nile mee mkpatụ, ihe a na-achọsi ike nke mba nile [ndị na-esonyere ndị Kraịst e tere mmanụ n’ofufe dị ọcha] ga-abịakwa, M ga-emejukwa ụlọ a n’ebube, ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị.” (Hagaị 2:6, 7) Ịdị adị nke “oké ìgwè mmadụ” a ka na-amụba amụba na ndị ibe ha e tere mmanụ na-ebuli, ee, na-eme ka ofufe dị ọcha a na-efe n’ụlọ Jehova dị ebube. Ọ dịtụbeghị mgbe e dekọrọ na ọtụtụ mmadụ buru ibu otú a dị n’otu n’ofufe nke ezi Chineke ahụ, nke a na-ewetakwara Jehova na Eze ya o mere ka ọ nọkwasị n’ocheeze, bụ́ Jisọs Kraịst, otuto. Eze Solomọn dere, sị: “N’ụba nke ndị ọ bụla ka ịma mma eze dị.”—Ilu 14:28.

E Bulie Ofufe Elu ná Ndụ Ndị Mmadụ

16-18. Mgbanwe dịgasị aṅaa ka ụfọdụ ndị meworo iji fee Jehova ofufe n’ụzọ ọ na-anakwere?

16 Jehova kwesịrị ịnara otuto nile maka mbuli e buliri ofufe dị ọcha elu n’oge anyị. Ma, ọ bụụrụ ndị na-abịakwute ya ihe ùgwù ikere òkè n’ọrụ a. Dị nnọọ ka ọ chọrọ mgbalị iji rịa ugwu, otú a kwa ọ chọrọ mgbalị iji mụta ma bie ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ ezi omume Chineke. Dị ka ndị Kraịst na narị afọ mbụ, ndị ohu Chineke taa ahapụwo ụzọ ndụ na omume ndị ha na ezi ofufe na-ekwekọghị. Ndị na-akwa iko, ndị na-ekpere arụsị, ndị ohi, ndị anyaukwu, ndị na-aṅụbiga mmanya ókè, na ndị ọzọ agbanwewo ụzọ ha ma bụrụ ndị a “sachara” n’anya Chineke.—1 Ndị Kọrint 6:9-11.

17 Otu ihe atụ bụ ahụmahụ nke otu nwata nwanyị nke dere, sị: “Ọ dị mgbe m furu efu ma ghara inwe olileanya. Ebiri m ndụ nke ime omume rụrụ arụ na ịṅụbiga mmanya ókè. Arịara m ọrịa mmekọahụ dị iche iche. Erekwara m ọgwụ ọjọọ, ajụghịkwa m ase ma ọlị.” Mgbe ọ malitesịrị ịmụ Bible, o mere mgbanwe ndị buru ibu iji kwekọọ n’ụkpụrụ Chineke. Ugbu a ọ na-ekwu, sị: “Enwere m udo nke uche, ùgwù onwe onye, olileanya maka ọdịnihu, ezinụlọ bụ́ ezinụlọ n’ezie, nke kasịkwa ha nile mma, mụ na Nna anyị, bụ́ Jehova, nwere mmekọrịta.”

18 Ọbụna mgbe e nwetasịrị nguzo dị mma n’ihu Jehova, mmadụ nile aghaghị ịnọgide na-ebuli ofufe dị ọcha elu site n’ịdị na-edebe ya n’ọnọdụ mbụ ná ndụ ha. Ọtụtụ puku afọ gara aga, site n’ọnụ Aịsaịa, Jehova kwupụtara obi ike o nwere na a ga-enwe oké ìgwè mmadụ taa ndị ọ na-agụsi agụụ ike ime ofufe ya ihe kasị mkpa ná ndụ ha. Ì so na ha?

Ndị A Kụziiri Ụzọ Jehova

19, 20. Gịnị ka a na-akụziri ndị Chineke, n’olee ebe kwa?

19 Aịsaịa na-agwakwu anyị ihe banyere ndị na-anabata ofufe dị ọcha taa. Ọ na-asị: “Ọtụtụ ndị dị iche iche ga-ejekwa, sị, Bịanụ, ka anyị rịgoruo ugwu Jehova, ruo ụlọ Chineke nke Jekọb; Ọ ga-ezikwa anyị ụzọ Ya ụfọdụ, anyị ga-ejekwa ije n’okporo ụzọ Ya nile: n’ihi na Zaịọn ka iwu ga-esi pụta, okwu Jehova ga-esikwa na Jerusalem pụta.”—Aịsaịa 2:3.

20 Jehova adịghị ahapụ ndị ya ka ha na-awagharị dị ka atụrụ kpafuru akpafu. Site na Bible na mbipụta ndị dabeere na Bible, ọ na-akụziri ha “iwu” ya na “okwu” ya ka ha wee mụta ụzọ ya nile. Ihe ọmụma a na-akwadebe ha ‘ije ije n’okporo ụzọ Ya nile.’ Site n’obi jupụtara n’ekele na n’ikwekọ ná ntụzi Chineke, ha na-agwarịta ibe ha banyere ụzọ nile nke Jehova. Ha na-ezukọta ná mgbakọ ndị buru ibu na n’ìgwè ndị dị nta karị—n’Ụlọ Nzukọ Alaeze na n’ebe obibi ndị mmadụ—iji gee ntị ma mụta ụzọ nile nke Chineke. (Deuterọnọmi 31:12, 13) N’ụzọ dị otú a ha na-eṅomi ihe nlereanya nke ndị Kraịst oge mbụ, bụ́ ndị zukọtara iji gbarịta ibe ha ume ma kpasurịta ibe ha ijupụta ‘n’ịhụnanya na ọrụ ọma dị iche iche.’—Ndị Hibru 10:24, 25.

21. N’ọrụ dị aṅaa ka ndị ohu Jehova na-ekere òkè na ya?

21 Ha na-akpọ ndị ọzọ òkù ‘ịrịgo’ n’ofufe e buliri elu nke Jehova Chineke. Lee nnọọ ka nke a si kwekọọ n’iwu Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya kpọmkwem tupu ọ rịgoro n’eluigwe! Ọ sịrị ha: “Ya mere, gaanụ, mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptism baa n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ: na-ezi ha ka ha debe ihe nile, ka ha hà, bụ nke M nyere unu n’iwu.” (Matiu 28:19, 20) Site n’enyemaka Chineke, Ndịàmà Jehova ji nrubeisi na-aga n’ụwa nile, na-ezi ihe ma na-eme ndị na-eso ụzọ, na-eme ha baptism.

Mma Agha Ịghọ Mma Ogè

22, 23. Gịnị ka Aịsaịa 2:4 na-ebu amụma ya, gịnịkwa ka otu onyeisi òtù UN kwuru banyere ya?

22 Anyị abịarute ugbu a n’amaokwu na-esonụ, nke e dekwasịrị akụkụ ya ụfọdụ ná mgbidi dị n’ihe owuwu nke òtù UN. Aịsaịa na-ede, sị: “Ọ ga-ekpekwa ikpe n’etiti mba nile, doziekwara ọtụtụ ndị dị iche iche okwu ha: ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha nile ka ha bụrụ mma ogè, na ube ha nile ka ha bụrụ mma ịkwa osisi: mba agaghị ebuli mma agha megide mba, ha agaghị amụtakwa agha ọzọ.”—Aịsaịa 2:4.

23 Imezu nke a agaghị abụ obere ọrụ. Federico Mayor, bụ́ ọga kpata kpata nke Òtù Mmụta, Sayensị, na Ọdịbendị nke Mba Ndị Dị n’Otu, kwuru n’otu oge, sị: “Ajọ ihe nile agha na-akpata, ndị anyị na-ahụ ugbu a site ná ngwá ọrụ ndị na-ewepụta ụda olu na onyinyo, eyighị ka ha ga-enwe ike ịkwụsị mmụba nke òtù ndị agha buru ibu ndị e guzobeworo ma na-elekọta eri ọtụtụ narị afọ. Ọgbọ ndị dị ugbu a nwere ọrụ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nke na-agaghị ekwe omume, nke e kwuru n’ime Bible, nke bụ ‘ịkpụgharị mma agha ha nile ka ha bụrụ mma ogè’ na ịgbanwe site n’inwe ọchịchọ ịlụ agha—nke a zụliteworo eri oge a na-amaghị ama—gaa n’ịchọ udo. Imezu nke a ga-abụ ihe kasị mma, nke kasị enye ùgwù nke ‘ụmụ mmadụ nọ gburugburu ụwa’ pụrụ imezu, nakwa ihe nketa kasị mma anyị ga-ahapụrụ ụmụ anyị.”

24, 25. N’ahụ ole ndị ka ihe ndị Aịsaịa kwuru na-emezu, ọ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa?

24 Mba nile n’ozuzu ha apụghị imezu ebumnobi a magburu onwe ya ma ọlị. Ọ karịrị ha nnọọ. Ọ bụ ndị mmadụ si n’ọtụtụ mba, bụ́ ndị dị n’otu n’ofufe dị ọcha, na-emezu ihe Aịsaịa kwuru. Jehova ‘edoziworo ha okwu’ ha. Ọ kụziworo ndị ya iso ibe ha biri n’udo. N’eziokwu, n’ime ụwa nke kewasịrị ekewasị na nke ịkpọasị jupụtara, n’ụzọ ihe atụ ha ‘akpụgharịwo mma agha ha nile ka ha bụrụ mma ogè na ube ha nile ka ha bụrụ mma ịkwa osisi.’ N’ụzọ dị aṅaa?

25 Otu bụ na ha adịghị adụnyere akụkụ ọ bụla úkwù n’agha nke mba dị iche iche. Ntakịrị oge tupu Jisọs anwụọ, ndị ji ngwá agha bịara ijide ya. Mgbe Pita jiri mma agha ya mee ihe iji chebe Onyenwe ya, Jisọs sịrị ya: “Mịghachi mma agha gị n’ọnọdụ ya: n’ihi na mmadụ nile ndị weere mma agha ga-ala n’iyi site ná mma agha.” (Matiu 26:52) Kemgbe ahụ, ụmụazụ Jisọs akpụgharịwo mma agha ha nile ịghọ mma ogè, ha akwụsịwokwa iji ngwá agha eme ihe iji gbuo mmadụ ibe ha nakwa ịkwado ọrụ agha n’ụzọ ndị ọzọ. Ha ‘na-agbaso udo n’ebe mmadụ nile nọ.’—Ndị Hibru 12:14.

Ịgbaso Ụzọ Nile nke Udo

26, 27. Olee otú ndị Chineke si ‘achọ udo ma na-agbaso ya’? Nye ihe atụ.

26 Udo ndị Chineke nwere karịrị nnọọ ịjụ ikere òkè n’ịlụ agha. Ọ bụ ezie na ha nọ n’ihe karịrị ala 230 ma site n’ọtụtụ mba na asụsụ na ọdịbendị, ha na ibe ha na-adị n’udo. Okwu Jisọs na-enwe mmezu ya nke oge a n’ahụ ha, bụ́ onye gwara ndị na-eso ụzọ ya na narị afọ mbụ, sị: “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ọ bụrụ na unu enwerịta ịhụnanya n’ebe ibe unu nọ.” (Jọn 13:35) Ndị Kraịst taa bụ ndị “na-eme ka mmadụ na ibe ha dị n’udo.” (Matiu 5:9) Ha ‘na-achọ udo ma na-agbaso ya.’ (1 Pita 3:11) Jehova, bụ́ “Chineke nke udo,” na-akwado ha.—Ndị Rom 15:33.

27 E nwere ihe atụ ndị dị ịrịba ama banyere ndị mụtaworo ịbụ ndị na-eme ka mmadụ na ibe ha dị n’udo. Otu nwa okorobịa na-ede banyere mgbe ọ bụ nwata, sị: “Ahụmahụ siri ike mere ka m mụta ụzọ isi na-azọ onwe m. O mere ka m na-eme ihe ike ma na-ewe iwe banyere ndụ. M na-alụ ọgụ mgbe nile. Kwa ụbọchị, m ga-alụso nwatakịrị ọzọ dị iche nọ n’ógbè anyị ọgụ, mgbe ụfọdụ m na-eji ọkpọ, mgbe ụfọdụ m na-eji okwute ma ọ bụ karama. Etolitere m ghọọ onye na-eme nnọọ ihe ike.” Otú ọ dị, ka e mesịrị ọ ṅara ntị n’òkù ahụ a na-akpọ ịrịgoru “ugwu nke ụlọ Jehova.” Ọ mụtara ụzọ nile nke Chineke ma ghọọ ohu Chineke na-eme udo.

28. Gịnị ka ndị Kraịst pụrụ ime iji gbasoo udo?

28 Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị ohu Jehova emeghị ihe ike otú ahụ mgbe ha na-etolite. N’agbanyeghị nke ahụ, ọbụna n’ụmụ obere ihe—omume obiọma, mgbaghara, na inwe mmetụta ọmịiko—ha na-agbalịsi ike ime ka ha na ndị ọzọ na-adị n’udo. Ọ bụ ezie na ha bụ ndị na-ezughị okè, ha na-agbalị itinye n’ọrụ ndụmọdụ Bible bụ́ “na-anagiderịtanụ ibe unu, werekwanụ amara gbaghara onwe unu, a sị na onye ọ bụla nwere ihe ịta onye ọ bụla ụta.”—Ndị Kọlọsi 3:13.

Ọdịnihu Udo

29, 30. Olileanya dị aṅaa ka e nwere maka ụwa?

29 Jehova emewo ihe dị ebube “n’ikpeazụ nke ụbọchị ndị a.” O siwo ná mba nile chịkọpụta ndị chọrọ ijere ya ozi. O ziwo ha ije ije n’ụzọ ya nile, ụzọ nile nke udo. Ndị a bụ ndị ga-alanarị “oké mkpagbu” ahụ ma banye n’ime ụwa ọhụrụ nke udo ebe agha na-agaghị adịkwa ruo mgbe ebighị ebi.—Mkpughe 7:14.

30 Mma agha—ngwá agha—agaghị adịkwa. Onye ọbụ abụ ahụ dere banyere oge ahụ, sị: “Jeenụ, hụ ọrụ nile nke Jehova, Onye doworo ihe ijuanya dị iche iche n’ụwa, na-eme ka agha nile kwụsị ruo nsọtụ ụwa; Ọ na-agbaji ụta, gbupịakwa ube; Ọ na-esure ụgbọala nile n’ọkụ.” (Abụ Ọma 46:8, 9) N’ihi atụmanya dị otú ahụ, agbamume na-esonụ nke Aịsaịa nyere dabara adaba taa dịkwa ka ọ dabara n’oge o dere ya: “Ụlọ Jekọb, bịanụ, ka anyị jegharịa n’ìhè Jehova.” (Aịsaịa 2:5) Ee, ka ìhè Jehova na-achasa n’okporo ụzọ anyị ugbu a, anyị ga-ejekwa ije n’ụzọ ya ruo mgbe nile ebighị ebi.—Maịka 4:5.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Lee akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, isi nke 11, “Ndị A Bụ Mgbe Ikpeazụ!,” nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya