-
Jehova Bụ EzeAmụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
-
-
13, 14. (a) Olee iwu Jehova nyegasịrị banyere iwe ihe ubi? (b) Olee otú Aịsaịa si jiri iwu maka iwe ihe ubi mee ka o doo anya na ụfọdụ ga-alanarị ikpe Jehova? (ch) Ọ bụ ezie na oge ule jọrọ njọ na-abịa, gịnị ka ndị Juu kwesịrị ntụkwasị obi pụrụ ijide n’aka?
13 Iji ghọrọ mkpụrụ olive, ndị Israel na-akụ osisi ndị ahụ ihe ka mkpụrụ ha dasịsịa. Dị ka Iwu Chineke si dị, a machibidoro ha ịgaghachi n’alaka osisi ndị ahụ iji ghọrọ mkpụrụ olive ndị fọdụrụ. Ha ekwesịghịkwa ịchịkọta mkpụrụ vine fọdụrụ mgbe ha weresịịrị ihe ubi vine ha. A ga-ahapụ ihe fọdụrụ mgbe e weresịịrị ihe ubi ka ndị ogbenye—“ọbịa, na nwa mgbei, na nwanyị di ya nwụrụ”—tụtụkọta ha. (Deuterọnọmi 24:19–21) N’iji iwu ndị a maara nke ọma eme ihe, Aịsaịa mere ka eziokwu ahụ na-akasi obi bụ́ na a ga-enwe ndị ga-alanarị ikpe Jehova na-abịanụ doo anya: “Otú a ka ọ ga-adị n’etiti ụwa n’etiti ndị nile, dị ka ntisịsị nke osisi olive, dị ka mkpụrụ nke fọdụrụ ịtụtụkọ, mgbe ọghụghọ mkpụrụ vine gwụsịworo. Ndị ahụ ga-ebuli olu ha, ha ga-eti mkpu ọṅụ; n’ihi mbili elu Jehova ha ga-esi n’oké osimiri tisie mkpu ọṅụ ike. N’ihi nke a sọpụrụnụ Jehova n’ala ìhè nile, sọpụrụnụ aha Jehova, bụ́ Chineke Israel, n’ala nile nke dị oké osimiri gburugburu. Site ná nsọtụ ụwa ka anyị nụworo abụ ọma dị iche iche, ịma mma dịịrị onye ezi omume.”—Aịsaịa 24:13–16a.
14 Dị nnọọ ka mkpụrụ si afọdụ n’osisi ma ọ bụ na vine mgbe owuwe ihe ubi gasịrị, otú a ka a ga-enwe ndị ga-afọdụ mgbe Jehova mezusịrị ihe o kpere n’ikpe—“mkpụrụ nke fọdụrụ ịtụtụkọ, mgbe ọghụghọ mkpụrụ vine gwụsịworo.” Dị ka e dekọrọ n’amaokwu nke 6, onye amụma ahụ ekwuolarị banyere ndị a, na-ekwu na “mmadụ ole na ole [afọdụwo].” Ma, ọ bụ ezie na ha dị ole na ole, a ga-enwe ndị ga-alanarị mbibi nke Jerusalem na Juda, e mesịakwa, ihe fọdụrụnụ ga-esi ná ndọrọ n’agha lọta ibijughachi ala ahụ. (Aịsaịa 4:2, 3; 14:1–5) Ọ bụ ezie na ndị obi ha ziri ezi ga-enwe oge ule jọrọ njọ, ha pụrụ ijide n’aka na a ga-enwe mgbapụta na ọṅụ n’ọdịnihu. Ndị lanarịrị ga-ahụ ka okwu amụma Jehova na-emezu, ha ga-aghọtakwa na Aịsaịa bụrịị ezi onye amụma Chineke. Ha ga-enwe ọṅụ dị ukwuu ka ha na-ahụ mmezu nke amụma mweghachi ndị ahụ. Site n’ebe ọ bụla ha gbasara gaa—ma ọ bụ n’àgwàetiti Mediterranean ndị dị n’Ọdịda Anyanwụ, Babilọn dị “n’ala ìhè” (Ọwụwa Anyanwụ), ma ọ bụ n’ebe ọ bụla ọzọ dị anya—ha ga-eto Chineke n’ihi na e chebewo ha, ha ga-abụkwa abụ, sị: “Ịma mma dịịrị onye ezi omume”!
-
-
Jehova Bụ EzeAmụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
-
-
[Foto dị na peeji nke 265]
Ụfọdụ ga-alanarị ikpe Jehova, dị nnọọ ka mkpụrụ na-afọdụ n’osisi mgbe e weresịịrị ihe ubi
-