Isi nke Iri Abụọ
Jehova Bụ Eze
1, 2. (a) Ònye ga-enweta oké iwe Jehova? (b) À ga-ahapụ inye Juda ntaramahụhụ, oleekwa otú anyị si mara?
BABILỌN, Filistia, Moab, Siria, Etiopia, Ijipt, Edọm, Taịa, Asiria—ga-enwetacha oké iwe Jehova. Aịsaịa ebuola amụma banyere ọdachi ga-adakwasị mba na obodo ndị a na-enweghị omume enyi. Otú ọ dị, gịnị banyere Juda? À ga-ahapụ inye ndị bi na Juda ntaramahụhụ maka mmehie ha? Akụkọ ihe mere eme na-aza ee e n’ụzọ dara ụda!
2 Tụlee ihe mere Sameria, bụ́ isi obodo nke alaeze ebo iri nke Israel. Mba ahụ edebeghị ọgbụgba ndụ ya na Chineke. O wezụgaghị onwe ya n’omume rụrụ arụ nke mba ndị gbara ya gburugburu. Kama nke ahụ, ndị bi na Sameria “mekwara ihe ọjọọ dị iche iche ịkpasu Jehova iwe . . . Jehova wee wesa Israel iwe nke ukwuu, si n’ihu Ya wezụga ha.” N’ịbụ ndị e wepụrụ n’ala ha n’ike, “Israel si n’elu ala ha jee biri n’Asiria.” (2 Ndị Eze 17:9–12, 16–18, 23; Hosea 4:12–14) Ihe mere Israel na-agba àmà ihe ọjọọ ga-adakwasị alaeze ya na ya bụ nwanne, bụ́ Juda.
Aịsaịa Ebuo Amụma Banyere Mbibi nke Juda
3. (a) N’ihi gịnị ka Jehova ji hapụ alaeze ebo abụọ nke Juda? (b) Gịnị ka Jehova kpebisiri ike ime?
3 Ndị eze ụfọdụ nke Juda kwesịrị ntụkwasị obi, ma ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ekwesịghị. Ọbụna mgbe e nwere eze kwesịrị ntụkwasị obi, dị ka Jotam, ndị ahụ ahapụchaghị ofufe ụgha. (2 Ndị Eze 15:32–35) Ajọ omume Juda ruru n’ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu n’oge ọchịchị Eze Manase ahụ kwafuru ọbara nke ukwuu, bụ́ onye, dị ka akụkọ ọdịnala ndị Juu gosiri, gburu onye amụma kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Aịsaịa site n’inye iwu ka a kwọwaa ya. (Tụlee Ndị Hibru 11:37.) Ajọ eze a “wee mee ka Juda na ndị bi na Jerusalem sihie ụzọ, ime ihe ọjọọ karịa mba ọzọ, bụ́ ndị Jehova kpochapụrụ n’ihu ụmụ Israel.” (2 Ihe E Mere 33:9) N’oge ọchịchị Manase, e merụrụ ala ahụ ọbụna karịa mgbe ndị Kenean na-achị ya. N’ihi ya, Jehova kwuru, sị: “Lee, M na-eme ka ihe ọjọọ bịakwasị Jerusalem na Juda, nke ntị abụọ nke onye ọ bụla na-anụ ga-azụ̀ wuruwuru. . . . M ga-ehichakwa Jerusalem dị ka mmadụ si ehicha ọkwa, na-ehicha ya, [na-ekpuwe] ya ihu. M ga-ahapụkwa ndị fọdụrụ nke ihe nketa m, nye ha n’aka ndị iro ha; ha ga-aghọkwara ndị iro ha nile ihe nlụta n’agha na ihe ha na-anara n’ike; n’ihi na ha emewo ihe jọrọ njọ n’anya m, ha na-akpasukwa m iwe.”—2 Ndị Eze 21:11–15.
4. Gịnị ka Jehova ga-eme Juda, oleekwa otú e si mezuo amụma a?
4 Dị ka ọkwa e kpuwere ihu, nke ga-eme ka ihe nile dị n’ime ya wụfuo, a ga-eme ka ala ahụ ghara inwe mmadụ ga-ebi ya. Ntọgbọrọ n’efu a na-abịanụ nke Juda na Jerusalem ghọghachiri isiokwu nke amụma Aịsaịa buru. Ọ malitere ikwu, sị: “Lee, Jehova na-agbaba ụwa ọtọ, Ọ na-emekwa ka ọ tọgbọrọ n’efu, Ọ [na-ekpuwekwa] ya ihu, mee ka ndị bi n’ime ya gbasaa.” (Aịsaịa 24:1) E mezuru amụma a mgbe ndị agha Babilọn na-eme mwakpo bibiri Jerusalem na ụlọukwu ya n’okpuru Eze Nebukadneza nakwa mgbe e ji mma agha, ụnwụ, na ọrịa na-efe efe gbuo ọtụtụ n’ime ndị bi na Juda. A kpụụrụ ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị Juu lanarịrịnụ gaa Babilọn, mmadụ ole na ole a hapụrụ gbagakwara Ijipt. E si otú a bibie ala Juda, meekwa ka ọ bụrụ nke mmadụ na-ebighị na ya ma ọlị. Ọbụna anụ ụlọ afọdụghị. Ala ahụ mmadụ na-ebikwaghị na ya ghọrọ ọzara na mkpọmkpọ ebe nke na-akpata obi ilu, nke ọ bụ nanị anụ ọhịa na anụ ufe bi na ya.
5. Ọ̀ dị onye a ga-agụpụ n’ikpe Jehova? Kọwaa.
5 Ọ̀ dị onye nọ na Juda nke a ga-emenyere n’oge ikpe ahụ na-abịanụ? Aịsaịa na-aza, sị: “Ọ ga-erukwa, na ka o si dịrị ndị ọ bụla, otú a ka ọ ga-adịrị onye nchụàjà; dị ka o si dịrị ohu, otú a ka ọ ga-adịrị onye nwe ya; dị ka o si dịrị nwanyị na-eje ozi, otú a ka ọ ga-adịrị nwanyị nwe ya; dị ka o si dịrị onye na-ego ego, otú a ka ọ ga-adịrị onye na-ere ere; dị ka o si dịrị onye mbinye, otú a ka ọ ga-adịrị onye mbite; dị ka o si dịrị onye na-anara ụma, otú a ka ọ ga-adịrị onye na-enye ya ụma. A ga-agbabasị ụwa ọtọ, lụtasịa ya n’agha; n’ihi na Jehova ekwuwo okwu a.” (Aịsaịa 24:2, 3) Akụ̀ na ụba na ihe ùgwù ije ozi n’ụlọukwu agaghị eme ka e nwee ọdịiche. Ọ dịghị onye a ga-agụpụ. E merụwo ala ahụ nke na a ghaghị ime ka onye ọ bụla lanarịrịnụ—ndị nchụàjà, ndị ohu na ndị nwe ha, ndị na-ego ego na ndị na-ere ere—jee biri n’ala ọzọ.
6. N’ihi gịnị ka Jehova ji kwụsị ịgọzi ala ahụ?
6 Ka e wee ghara inwe nghọtahie ọ bụla, Aịsaịa kọwara otú ọdachi a na-abịanụ ga-aharu, kọwaakwa ihe kpatara ya, sị: “Ụwa eruwo újú kpọnwụọ, elu ụwa dum mmadụ bi atalatawo kpọnwụọkwa, ndị dị elu nke ndị ụwa atalatawo. E merụwokwa ụwa n’okpuru ndị bi ya; n’ihi na ha agabigawo iwu nile, gbanwee ụkpụrụ, mebie ọgbụgba ndụ ebighị ebi. N’ihi nke a ka ọgbụgba iyi ripịaworo ụwa, e wee maa ndị bi n’ime ya ikpe: n’ihi nke a ka ndị bi n’ụwa reworo ọkụ, mmadụ ole na ole wee fọdụ.” (Aịsaịa 24:4–6) Mgbe e nyere ndị Israel ala Kenean, ha hụrụ na ọ bụ “ala nke mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru n’ime ya.” (Deuterọnọmi 27:3) Ma, ha nọgidere na-adabere ná ngọzi Jehova. Ọ bụrụ na ha ejiri ikwesị ntụkwasị obi debe ụkpụrụ ya na iwu ya nile, ala ahụ “[ga-emekwa] ihe omume ya,” ma ọ bụrụ na ha eleghara iwu ya anya, mgbalị ha na-eme ịkọ ala ahụ ‘ga-abụ n’efu,’ ala ahụ “agaghị [emekwa] ihe omume ya.” (Levitikọs 26:3–5, 14, 15, 20) Ọbụbụ ọnụ Jehova ‘ga-eripịa ala ahụ.’ (Deuterọnọmi 28:15–20, 38–42, 62, 63) Ugbu a Juda aghaghị ịtụ anya inweta ọbụbụ ọnụ ahụ.
7. Olee otú ọgbụgba ndụ Iwu ahụ ga-esi bụrụ ngọzi nye ndị Israel?
7 Ihe dị ka afọ 800 tupu oge Aịsaịa, ndị Israel ji obi ha soro Jehova gbaa ndụ ma kweta ịgbaso ya. (Ọpụpụ 24:3–8) Ihe ndị dị n’ọgbụgba ndụ Iwu ahụ kwuru na ọ bụrụ na ha erube isi n’iwu Jehova, ha ga-enweta ngọzi ya n’ụba, ma ọ bụrụ na ha emebie ọgbụgba ndụ ahụ, ha agaghị enweta ngọzi ya, ndị iro ha ga-adọrọ ha n’agha. (Ọpụpụ 19:5, 6; Deuterọnọmi 28:1–68) Ọgbụgba ndụ Iwu a, nke e nyere site n’aka Mosis, ga-adị irè ruo mgbe a na-akapịghị ọnụ. Ọ ga-echebe ndị Israel ruo mgbe Mesaịa bịara.—Ndị Galetia 3:19, 24.
8. (a) Olee otú ndị ahụ siworo “gabiga iwu” ma “gbanwee ụkpụrụ”? (b) N’ụzọ dịgasị aṅaa ka “ndị dị elu” ga-esi bụrụ ndị mbụ ‘ga-akpọnwụ’?
8 Ma ndị ahụ ‘emebiwo ọgbụgba ndụ ebịghị ebi’ ahụ. Ha agabigawo iwu Chineke nyere, na-eleghara ha anya. Ha ‘agbanwewo ụkpụrụ ahụ,’ na-agbaso iwu ndị dị iche ná ndị nke Jehova nyere. (Ọpụpụ 22:25; Ezikiel 22:12) N’ihi ya, a ga-ewepụ ndị ahụ n’ala ahụ. A gaghị eme ebere n’ikpe ahụ na-abịanụ. Ndị ga-eso ná ndị mbụ ‘ga-akpọnwụ’ n’ihi nkwụsị Jehova ga-akwụsị ichebe ha na igosi ha ihu ọma ya bụ “ndị dị elu,” ndị a maara aha ha. Iji mezuo nke a, ka mbibi Jerusalem na-eru nso, ndị Ijipt bu ụzọ mee ndị eze Juda ndị nọ n’okpuru ha, e mesịa ndị Babilọn emee ha. Ka e mesịrị, Eze Jehoịakin na ndị ọzọ si n’ezinụlọ eze so ná ndị mbụ a kpụụrụ gaa Babilọn.—2 Ihe E Mere 36:4, 9, 10.
Ịṅụrị Ọṅụ Adịkwaghị n’Ala Ahụ
9, 10. (a) Olee òkè ọrụ ugbo na-ekere n’Israel? (b) Gịnị ka onye ọ bụla ‘ibi n’okpuru osisi vine ya na n’okpuru osisi fig ya’ pụtara?
9 Mba Israel bụ ndị ọrụ ugbo. Malite n’oge ndị Israel bara n’Ala Nkwa ahụ, ha malitere ịkọ ugbo na ịzụ ụmụ anụ. N’ihi ya, ịrụ ọrụ ugbo nwere ọnọdụ dị mkpa n’iwu ahụ e nyere Israel. E nyere iwu na a ga-edeberịrị izu ike maka ala ahụ n’afọ nke asaa ọ bụla iji mee ka ala ahụ nwetaghachi ike imepụta nri. (Ọpụpụ 23:10, 11; Levitikọs 25:3–7) Ememe atọ e nyere mba ahụ iwu ime kwa afọ bụ ndị a haziri ikwekọ n’oge ọrụ ugbo.—Ọpụpụ 23:14–16.
10 Ubi vine juru ebe nile n’ala ahụ. Akwụkwọ Nsọ gụnyere mmanya, bụ́ ihe a na-enweta site na vine, n’onyinye sitere n’aka Chineke, nke “na-eme ka obi mmadụ ṅụrịa.” (Abụ Ọma 104:15) Onye ọ bụla ‘ibi n’okpuru osisi vine ya na n’okpuru osisi fig ya,’ na-egosi ịba ụba, udo, na ịnọ ná ntụkwasị obi n’ọchịchị ezi omume Chineke. (1 Ndị Eze 4:25; Maịka 4:4) A na-ewere oge mkpụrụ vine mere nke ọma dị ka ngọzi na ihe a ga-abụrụ abụ, ṅụrịkwaara ọṅụ. (Ndị Ikpe 9:27; Jeremaịa 25:30) Ihe megidere nke ahụ bụkwa eziokwu. Mgbe osisi vine kpọnwụrụ ma ọ bụ ghara ịmị mkpụrụ, ubi vine aghọọkwa ebe tọgbọrọ n’efu nke jupụtara n’ogwu, ọ bụ ihe àmà na-egosi na Jehova akwụsịwo inye ngọzi ya—oge oké iru újú.
11, 12. (a) Olee otú Aịsaịa si kọwaa ọnọdụ ndị ga-adị n’ihi ikpe Jehova? (b) Olee olileanya dị njọ Aịsaịa kọwara?
11 Mgbe ahụ, n’ụzọ kwesịrị ekwesị, Aịsaịa jiri ubi vine na mkpụrụ ha kọwaa ọnọdụ ndị ga-adị n’ihi Jehova ịkwụsị ịgọzi ala ahụ: “Mmanya vine ọhụrụ eruwo újú, osisi vine atalatawo, ndị nile nke na-aṅụrị ọṅụ n’obi ezewo ume. Obi ụtọ nke [ịgba] nile akwụsịwo, mkpọtụ nke ndị na-aṅụrị ọṅụ agha agwụwo obi ụtọ nke ụbọ akwara akwụsịwo. Ha agaghị eji abụ ṅụọ mmanya vine; ihe ọṅụṅụ nke na-aba n’anya ga-adị ndị na-aṅụ ya ilu. E tipịawo obodo nke ihe tọgbọrọ n’efu: e mechiwo ụlọ nile ọ bụla, ka mmadụ wee ghara ịbata. Iti mkpu dị n’èzí nile n’ihi mmanya vine ahụ; ọṅụ nile agbachiwo, e mewo ka obi ụtọ nke ụwa jee biri n’ala ọzọ. Nke fọdụrụ n’obodo bụ ebe tọgbọrọ n’efu, ọ bụkwa ntikpọ ka e ji tie ọnụ ụzọ ámá.”—Aịsaịa 24:7–12.
12 Ịgba na ụbọ akwara bụ ihe ndị na-enye obi ụtọ e ji eto Jehova, ndị e jikwa egosi ọṅụ. (2 Ihe E Mere 29:25; Abụ Ọma 81:2) A gaghị anụ egwu ha n’oge ntaramahụhụ a sitere n’aka Chineke. A gaghị enwe owuwe ihe ubi na-enye obi ụtọ nke mkpụrụ vine. A gaghị enwe mkpọtụ obi ụtọ n’ime Jerusalem ahụ e bibiworo, n’ihi na “ntikpọ ka e ji tie” ọnụ ụzọ ámá ya, ‘mechiekwa’ ụlọ nile dị n’ime ya ka mmadụ ghara ịbata. Lee olileanya dị njọ nke ahụ bụ nye ndị bi n’ala na-eme nri!
Ihe Fọdụrụ “Ga-eti Mkpu Ọṅụ”
13, 14. (a) Olee iwu Jehova nyegasịrị banyere iwe ihe ubi? (b) Olee otú Aịsaịa si jiri iwu maka iwe ihe ubi mee ka o doo anya na ụfọdụ ga-alanarị ikpe Jehova? (ch) Ọ bụ ezie na oge ule jọrọ njọ na-abịa, gịnị ka ndị Juu kwesịrị ntụkwasị obi pụrụ ijide n’aka?
13 Iji ghọrọ mkpụrụ olive, ndị Israel na-akụ osisi ndị ahụ ihe ka mkpụrụ ha dasịsịa. Dị ka Iwu Chineke si dị, a machibidoro ha ịgaghachi n’alaka osisi ndị ahụ iji ghọrọ mkpụrụ olive ndị fọdụrụ. Ha ekwesịghịkwa ịchịkọta mkpụrụ vine fọdụrụ mgbe ha weresịịrị ihe ubi vine ha. A ga-ahapụ ihe fọdụrụ mgbe e weresịịrị ihe ubi ka ndị ogbenye—“ọbịa, na nwa mgbei, na nwanyị di ya nwụrụ”—tụtụkọta ha. (Deuterọnọmi 24:19–21) N’iji iwu ndị a maara nke ọma eme ihe, Aịsaịa mere ka eziokwu ahụ na-akasi obi bụ́ na a ga-enwe ndị ga-alanarị ikpe Jehova na-abịanụ doo anya: “Otú a ka ọ ga-adị n’etiti ụwa n’etiti ndị nile, dị ka ntisịsị nke osisi olive, dị ka mkpụrụ nke fọdụrụ ịtụtụkọ, mgbe ọghụghọ mkpụrụ vine gwụsịworo. Ndị ahụ ga-ebuli olu ha, ha ga-eti mkpu ọṅụ; n’ihi mbili elu Jehova ha ga-esi n’oké osimiri tisie mkpu ọṅụ ike. N’ihi nke a sọpụrụnụ Jehova n’ala ìhè nile, sọpụrụnụ aha Jehova, bụ́ Chineke Israel, n’ala nile nke dị oké osimiri gburugburu. Site ná nsọtụ ụwa ka anyị nụworo abụ ọma dị iche iche, ịma mma dịịrị onye ezi omume.”—Aịsaịa 24:13–16a.
14 Dị nnọọ ka mkpụrụ si afọdụ n’osisi ma ọ bụ na vine mgbe owuwe ihe ubi gasịrị, otú a ka a ga-enwe ndị ga-afọdụ mgbe Jehova mezusịrị ihe o kpere n’ikpe—“mkpụrụ nke fọdụrụ ịtụtụkọ, mgbe ọghụghọ mkpụrụ vine gwụsịworo.” Dị ka e dekọrọ n’amaokwu nke 6, onye amụma ahụ ekwuolarị banyere ndị a, na-ekwu na “mmadụ ole na ole [afọdụwo].” Ma, ọ bụ ezie na ha dị ole na ole, a ga-enwe ndị ga-alanarị mbibi nke Jerusalem na Juda, e mesịakwa, ihe fọdụrụnụ ga-esi ná ndọrọ n’agha lọta ibijughachi ala ahụ. (Aịsaịa 4:2, 3; 14:1–5) Ọ bụ ezie na ndị obi ha ziri ezi ga-enwe oge ule jọrọ njọ, ha pụrụ ijide n’aka na a ga-enwe mgbapụta na ọṅụ n’ọdịnihu. Ndị lanarịrị ga-ahụ ka okwu amụma Jehova na-emezu, ha ga-aghọtakwa na Aịsaịa bụrịị ezi onye amụma Chineke. Ha ga-enwe ọṅụ dị ukwuu ka ha na-ahụ mmezu nke amụma mweghachi ndị ahụ. Site n’ebe ọ bụla ha gbasara gaa—ma ọ bụ n’àgwàetiti Mediterranean ndị dị n’Ọdịda Anyanwụ, Babilọn dị “n’ala ìhè” (Ọwụwa Anyanwụ), ma ọ bụ n’ebe ọ bụla ọzọ dị anya—ha ga-eto Chineke n’ihi na e chebewo ha, ha ga-abụkwa abụ, sị: “Ịma mma dịịrị onye ezi omume”!
E nweghị Mgbapụ n’Ikpe Jehova
15, 16. (a)Olee otú ihe ga-eme ndị obodo Aịsaịa dị ya? (b) Gịnị ga-adakwasị ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi bi n’ala ahụ?
15 Otú ọ dị, ka ọ dịgodị ugbu a, oge erubeghị maka ịṅụrị ọṅụ. Aịsaịa kpọghachitere ndị ya na ha dịkọrọ ndụ n’ọnọdụ dị mgbe ahụ, na-ekwu, sị: “M wee sị, Ọtịta ahụ dịịrị m, ọtịta ahụ dịịrị m, ahụhụ dịịrị m! ndị nghọgbu aghọgbuwo; ee, ihe nghọgbu ka ndị nghọgbu jiworo ịghọgbu. Oké egwu na olulu na igbudu na-adịkwasị gị, gị onye bi n’ụwa. Ọ ga-erukwa, na onye ahụ nke na-agbanahụ olu oké egwu ahụ ga-adaba n’olulu ahụ; ọzọ, onye ahụ nke na-arịgopụta n’etiti olulu ahụ, a ga-ejide ya n’igbudu ahụ: n’ihi na windo nile nke dị n’elu ka e megheworo, ntọala nile nke ụwa ewee mee mkpatụ. A nyajisịwo ụwa, e mebisịwo ụwa, e wezụgasịwo ụwa n’ọnọdụ ya. Ụwa ga-aṅagharị nke ukwuu dị ka onye ṅụbigaworo mmanya ókè, ọ ga-adagharị dị ka ụlọ ọnọdụ abalị; njehie ya ga-adịkwa arọ n’ahụ ya, o wee daa, ghara ibilikwa ọzọ.”—Aịsaịa 24:16b–20.
16 Aịsaịa na-enwe oké mwute n’ihi ihe ga-adakwasị ndị ya. Ọnọdụ gbara ya gburugburu na-eme ka ọ na-enwe mmetụta nke ọrịa na ahụhụ. Ndị nghọgbu juru ebe nile ma na-akpatara ndị bi n’ala ahụ oké egwu. Mgbe Jehova kwụsịrị ichebe ya, ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi bi na Juda ga-anọ n’oké egwu ma n’ehihie ma n’abalị. Ha agaghị eji ndụ ha n’aka. Ha agaghị agbanahụ ọdachi ga-adakwasị ha n’ihi ịhapụ iwu Jehova na ileghara amamihe Chineke anya. (Ilu 1:24–27) Ọdachi ga-abịa ọ bụ ezie na ndị nghọgbu nọ n’ala ahụ, n’ịgbalị ime ka ndị ahụ kweta na ihe nile ga-adị mma, ji okwu ụgha na aghụghọ duru ha na-aga ná mbibi. (Jeremaịa 27:9–15) Ndị iro si ebe ọzọ ga-abata kwakọrọ ihe ha ma dọrọ ha n’agha. Ihe a nile na-enye Aịsaịa nsogbu n’obi nke ukwuu.
17. (a) N’ihi gịnị ka mgbapụ na-agaghị eji kwe omume? (b) Mgbe a tọhapụrụ ike nke ikpe Jehova site n’eluigwe, gịnị ga-eme ala ahụ?
17 Ma, onye amụma ahụ aghaghị ịkpọsa na e nweghị mgbapụ dịnụ. Ebe ọ bụla ndị mmadụ gbagara, a ga-ejide ha. Ụfọdụ pụrụ ịgbanahụ otu ọdachi, ma ha ga-adaba n’ọzọ—a gaghị enwe ebe nchebe. Ọ ga-adị nnọọ ka anụmanụ a na-achụ ọsọ nke gbanahụrụ ịdanye n’olulu, ma e mesịa mata ya n’ọnyà. (Tụlee Emọs 5:18, 19.) A ga-esi n’eluigwe tọhapụ ike nke ikpe Jehova, ọ ga-emekwa ka ntọala nke ụwa maa jijiji. Dị ka onye mmanya na-egbu, ala ahụ ga-aṅagharị ma daa, n’ihi oké mmehie ya, ọ gaghịkwa enwe ike ibili ọzọ. (Emọs 5:2) Ikpe Jehova enweghị mkpegharị. Mbibi ga-abịakwasị ala ahụ, a ga-alakwa ya n’iyi kpam kpam.
Jehova Ga-achị n’Ebube
18, 19. (a) Na gịnị ka “usuu ndị agha nke ebe dị elu” pụrụ ịdị na-ezo aka, oleekwa otú e si chịkọta ndị a “n’ụlọ mkpọrọ”? (b) Ma eleghị anya, olee otú a ga-esi leta “usuu ndị agha nke ebe dị elu . . . mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị”? (ch) Olee otú Jehova ga-esi leta “ndị eze nke ụwa”?
18 Ugbu a amụma Aịsaịa gụnyere ọtụtụ ihe karị, na-ezo aka ná mmezu ikpeazụ nke nzube Jehova: “Ọ ga-erukwa, n’ụbọchị ahụ, na Jehova ga-ewere mmehie nke usuu ndị agha nke ebe dị elu leta ha n’ebe dị elu, Ọ ga-ewerekwa mmehie nke ndị eze nke ụwa leta ha n’elu ụwa. E wee chịkọta ha, dị ka e si achịkọta ndị mkpọrọ n’olulu, a ga-emechibidokwa ha n’ụlọ mkpọrọ, mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị a ga-eleta ha. Ọnwa ga-enwekwa ihu ihere, ihere ga-emekwa anyanwụ; n’ihi na Jehova nke usuu nile nke ndị agha aghọwo eze n’ugwu Zaịọn, na n’ime Jerusalem, ọ bụkwa n’ihu ndị okenye Ya ka nsọpụrụ ga-adị.”—Aịsaịa 24:21–23.
19 “Usuu ndị agha nke ebe dị elu” pụrụ izo aka ná ndị mmụọ ọjọọ bụ́ “ndị onwe ụwa nke ọchịchịrị a, . . . ndị agha mmụọ nke ajọ ihe n’ebe dị n’eluigwe.” (Ndị Efesọs 6:12) Ndị a enwewo mmetụta dị ike n’ebe ike ọchịchị ụwa dị iche iche dị. (Daniel 10:13, 20; 1 Jọn 5:19) Nzube ha bụ ịdọpụ ụmụ mmadụ n’ebe Jehova na ofufe ya dị ọcha nọ. Lee ka o si gaara ha nnọọ nke ọma ịraba Israel n’ime omume rụrụ arụ nke mba ndị gbara ha gburugburu na-eme wee si otú a kwesị inweta ikpe Chineke. Ma Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya aghaghị ịza ajụjụ n’ihu Chineke mgbe ọ ga-eleta ha na ndị ọchịchị ụwa n’ikpeazụ, bụ́ “ndị eze nke ụwa . . . n’elu ụwa,” ndị ha kpaliworo imegide Chineke na imebi iwu ya. (Mkpughe 16:13, 14) N’ụzọ ihe atụ, Aịsaịa kwuru na a ga-achịkọta ha ma ‘mechibido ha n’ụlọ mkpọrọ.’ “Mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị,” ikekwe mgbe a ga-atọhapụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya (ma ọ bụghị “ndị eze nke ụwa . . . n’elu ụwa”) ruo nwa oge ná ngwụsị nke Ọchịchị Puku Afọ nke Jisọs Kraịst, Chineke ga-enye ha ntaramahụhụ ikpeazụ kwesịrị ha.—Mkpughe 20:3, 7–10.
20. Ma n’oge ochie ma n’oge a, n’ụzọ dị aṅaa, ọ bụkwa ole mgbe ka Jehova ‘ghọrọ eze’?
20 Ya mere akụkụ a nke amụma Aịsaịa nyere ndị Juu mmesi obi ike magburu onwe ya. N’oge nke Jehova, ọ ga-eme ka Babilọn oge ochie daa ma weghachi ndị Juu n’ala nna ha. Na 537 T.O.A., mgbe o si otú a gosipụta ike ya na ọbụbụeze ya n’ihi ndị ya, n’ezie a pụrụ ịgwa ha, sị: “Chineke [unu] bụ eze!” (Aịsaịa 52:7) N’oge a, Jehova ‘ghọrọ eze’ na 1914 mgbe o chiri Jisọs Kraịst Eze n’Alaeze eluigwe Ya. (Abụ Ọma 96:10) Ọ ‘ghọkwara eze’ na 1919 mgbe o gosiri ike nke ọbụbụeze ya site n’ịtọhapụ Israel ime mmụọ n’agbụ nke Babilọn Ukwu ahụ.
21. (a) Olee otú ‘a ga-esi menye ọnwa na anyanwụ ihere’? (b) Òkù dị aṅaa na-ada ụda ga-enwe mmezu ya kasị ukwuu?
21 Jehova ‘ga-aghọkwa eze’ ọzọ mgbe ọ ga-ebibi Babilọn Ukwu ahụ na akụkụ ndị ọzọ nke ajọ usoro ihe a. (Zekaraịa 14:9; Mkpughe 19:1, 2, 19–21) Mgbe nke ahụ gasịrị, ọchịchị Alaeze Jehova ga-adị nnọọ ebube nke na ma ọnwa gbazuru agbazu n’abalị ma anyanwụ na-achasi ike n’etiti ehihie agaghị eru ka ya n’ebube. (Tụlee Mkpughe 22:5.) Ihere ga-eme ha, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, iji onwe ha tụnyere Jehova nke usuu nile nke ndị agha, onye dị ebube. Jehova ga-abụ ọkaaka. Ike ya na ebube ya dị ka onye pụrụ ime ihe nile ga-edo mmadụ nile anya. (Mkpughe 4:8–11; 5:13, 14) Lee atụmanya magburu onwe ya ọ bụ! N’oge ahụ, òkù ahụ dị n’Abụ Ọma 97:1 ga-ada ụda n’ụwa nile ná mmezu ya kasị ukwuu: “Jehova bụ eze; ka ụwa tegharịa egwu ọṅụ; ka ala bara ụba nke dị oké osimiri gburugburu ṅụrịa.”
[Foto dị na peeji nke 262]
A gaghị anụkwa ụda egwu na ịṅụrị ọṅụ n’ala ahụ
[Foto dị na peeji nke 265]
Ụfọdụ ga-alanarị ikpe Jehova, dị nnọọ ka mkpụrụ na-afọdụ n’osisi mgbe e weresịịrị ihe ubi
[Foto dị na peeji nke 267]
Aịsaịa na-enwe oké mwute n’ihi ihe ga-adakwasị ndị obodo ya
[Foto dị na peeji nke 269]
Ma anyanwụ ma ọnwa adịghị nke ga-eru ka Jehova n’ịdị ebube