Isi nke Iri Abụọ na Otu
Aka Jehova Adị Elu
1. N’ihi gịnị ka Aịsaịa ji nwee ekele maka Jehova?
AỊSAỊA nwere ịhụnanya dị omimi n’ebe Jehova nọ ma nwee obi ụtọ ito ya. O tiri mkpu, sị: “Jehova, Chineke m ka Ị bụ; m ga-eme ka Ị dị elu, m ga-ekele aha Gị.” Gịnị nyeere onye amụma ahụ aka inwe ezi ekele dị otú ahụ maka Onye Okike ya? Otu ihe gbara ọkpụrụkpụ bụ ihe ọ maara banyere Jehova na ọrụ ya. Ihe ndị ọzọ Aịsaịa kwuru na-ekpughe nke a: “N’ihi na I mewo ihe ebube, bụ́ ndụmọdụ dị iche iche site na mgbe dị anya gara aga, n’ikwesị ntụkwasị obi na eziokwu.” (Aịsaịa 25:1) Dị ka Joshua onye bu ya ụzọ, Aịsaịa maara na Jehova bụ onye na-ekwesị ntụkwasị obi na onye a pụrụ ịdabere n’ebe ọ nọ nakwa na “ndụmọdụ” ya nile—ihe ndị o zubere—ga-emezu.—Joshua 23:14.
2. Ndụmọdụ dị aṅaa nke Jehova ka Aịsaịa kwupụtara ugbu a, gịnịkwa ka ọ pụrụ ịbụ ya ka a na-enye ndụmọdụ a?
2 Ndụmọdụ Jehova gụnyere okwu ikpe ya megide ndị iro Israel. Aịsaịa kwupụtara otu n’ime ha ugbu a, sị: “I mewo ka obodo ghọọ obo ihe; I mewo ka obodo e wusiri ike ghọọ ebe dara ada: I mewo ka ụlọ elu nke ndị ala ọzọ ghara ịbụ obodo; ruo mgbe ebighị ebi a gaghị ewu ya.” (Aịsaịa 25:2) Olee obodo a a na-akpọghị aha? Ọ pụrụ ịbụ na Aịsaịa na-ezo aka na A nke Moab—ọ dịla anya Moab na-ebuso ndị Chineke iro.a Ma ọ bụ ọ pụrụ ịdị na-ezo aka n’obodo ọzọ siri ike karị—Babilọn.—Aịsaịa 15:1; Zefanaịa 2:8, 9.
3. N’ụzọ dị aṅaa ka ndị iro Jehova ga-esi too ya?
3 Olee otú ndị iro Jehova ga-esi meghachi omume mgbe e mezuru ndụmọdụ ya megide obodo ha siri ike? “Ndị dị ike [ga-eto] Gị, obodo nke ndị mba ndị na-eme ka mmadụ maa jijiji ga-atụ egwu Gị.” (Aịsaịa 25:3) A pụrụ ịghọta ihe mere ndị iro nke Chineke onye pụrụ ime ihe nile ga-eji tụọ ya egwu. Otú ọ dị, olee otú ha ga-esi too ya? Hà ga-ahapụ chi ụgha ha bịa fewe ofufe dị ọcha? O siri ike! Kama nke ahụ, dị ka Fero na Nebukadneza, ha ga-eto Jehova mgbe a manyere ha ịmata oké ịdị ukwuu ya.—Ọpụpụ 10:16, 17; 12:30–33; Daniel 4:37.
4. Olee “obodo nke ndị mba ndị na-eme ka mmadụ maa jijiji” nke dị taa, oleekwa otú ọbụna ya onwe ya na-aghaghị isi too Jehova?
4 Taa, “obodo nke ndị mba ndị na-eme ka mmadụ maa jijiji” bụ “obodo ukwu ahụ, nke nwere alaeze na-achị ndị eze ụwa,” nke bụ́, “Babilọn Ukwu ahụ,” bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha. (Mkpughe 17:5, 18) Akụkụ bụ́ isi n’alaeze a bụ Krisendọm. Olee otú ndị ndú okpukpe Krisendọm si eto Jehova? Ọ bụ site n’iji obi ilu kweta ihe ndị dị ebube ọ rụzuworo n’ihi Ndịàmà ya. Karịsịa na 1919 mgbe Jehova weghachiri ndị ohu ya n’ịrụsi ọrụ ike ka a tọhapụsịrị ha n’ojiji Babilọn Ukwu ahu ji ha n’ụzọ ime mmụọ, ndị ndú a ‘tụrụ egwu, wee nye Chineke nke eluigwe otuto.’—Mkpughe 11:13.b
5. Olee otú Jehova ga-esi chebe ndị nwere obi ike zuru ezu n’ebe ọ nọ?
5 Ọ bụ ezie na mgbe ndị iro ya lere ya anya ọ na-emenye ha ụjọ, Jehova bụ ebe mgbaba nye ndị dị nwayọọ n’obi na ndị dị umeala n’obi bụ́ ndị chọrọ ijere ya ozi. Ndị okpukpe na ndị ọchịchị dị aka ike pụrụ ime ihe ọ bụla iji mebie okwukwe nke ndị na-efe ezi ofufe, ma ha ga-ada n’ihi na ndị a nwere obi ike zuru ezu n’ebe Jehova nọ. N’ikpeazụ, ọ ga-ebibi ndị na-emegide ya n’ụzọ dị mfe, dị ka a ga-asị na o ji igwe ojii kpuchie oké anwụ na-acha n’ọzara ma ọ bụ jiri mgbidi gbochie ike nke oké mmiri ozuzo.—Gụọ Aịsaịa 25:4, 5.
‘Oké Oriri Nye Ndị Nile Dị Iche Iche’
6, 7. (a) Ụdị oriri dị aṅaa ka Jehova na-akpọ, ọ bụkwa maka ole ndị? (b) Gịnị ka oké oriri ahụ Aịsaịa buru amụma ya na-ese onyinyo ya?
6 Dị ka nna na-ahụ n’anya, ọ bụghị nanị na Jehova na-echebe ụmụ ya kama ọ na-azụkwa ha, karịsịa n’ụzọ ime mmụọ. Mgbe ọ tọhapụsịrị ndị ya na 1919, o meere ha oké oriri mmeri, nri ime mmụọ bara ụba: “Ọ bụkwa n’ugwu a ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha ga-emere ndị nile dị iche iche oké oriri nke ihe mara abụba, bụ́ oké oriri nke ezi mmanya vine doro edo, nke ihe mara abụba jupụtara n’ụmị, nke mmanya vine doro edo a zara nke ọma.”—Aịsaịa 25:6.
7 E mere oké oriri ahụ “n’ugwu” Jehova. Gịnị bụ ugwu a? Ọ bụ “ugwu nke ụlọ Jehova,” bụ́ ebe mba nile na-eruba “n’ikpeazụ nke ụbọchị ndị a.” Ọ bụ ‘ugwu nsọ’ Jehova, bụ́ ebe ndị na-efe ya, bụ́ ndị na-ekwesị ntụkwasị obi, na-adịghị eme ihe ọjọọ, ha adịghị ebibikwa. (Aịsaịa 2:2; 11:9) Ọ bụ n’ebe a dị elu a na-anọ efe ofufe ka Jehova meere ndị kwesịrị ntụkwasị obi oké oriri ya. Ihe ime mmụọ mara mma ndị e nwere ugbu a n’ụba na-ese onyinyo ihe ọma a na-ahụ anya ndị a ga-enwe mgbe Alaeze Chineke ghọrọ nanị ọchịchị ga na-achị ihe a kpọrọ mmadụ. Mgbe ahụ, agụụ agaghị adịkwa ọzọ. “Ka ọtụtụ ọka dị n’ala n’elu ugwu nile.”—Abụ Ọma 72:8, 16.
8, 9. (a) Olee nnukwute ndị iro abụọ nke ihe a kpọrọ mmadụ ndị a ga-ewepụ? Kọwaa. (b) Gịnị ka Chineke ga-eme iji wepụ ịta ụta nke ndị ya?
8 Ndị na-ekere òkè ugbu a n’oriri ime mmụọ ahụ Chineke kpọrọ nwere olileanya dị ebube. Gee ntị n’ihe ọzọ Aịsaịa kwuru. N’iji mmehie na ọnwụ tụnyere “ihe mfụchi” ma ọ bụ “ihe mkpuchi” na-akpachi ume, o kwuru, sị: “N’ugwu a ka [Jehova] ga-eloda ihu ihe mfụchi ahụ e ji afụchi ndị nile dị iche iche, na ihe mkpuchi ahụ e ji ekpuchi mba nile. O lodawo ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi; Onyenwe anyị Jehova ga-ehichapụkwa anya mmiri n’ihu nile.”—Aịsaịa 25:7, 8a.
9 Ee, mmehie na ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ! (Mkpughe 21:3, 4) Ọzọkwa, a ga-ewepụ ịta ụta ụgha ahụ ndị ohu Jehova nọworo na-edi kemgbe ọtụtụ puku afọ. “Ịta ụta nke ndị Ya ka Ọ ga-ewezụgakwa n’elu ụwa nile: n’ihi na Jehova ekwuwo ya.” (Aịsaịa 25:8b) Olee otú nke a ga-esi mee? Jehova ga-ewepụ isi iyi nke ịta ụta ahụ, bụ́ Setan na mkpụrụ ya. (Mkpughe 20:1–3) Ka a sịkwa ihe mere a ga-eji kpalie ndị Chineke iti, sị: “Lee, Chineke anyị ka Nke a bụ; anyị elewo anya Ya, Ọ ga-azọpụtakwa anyị: Nke a bụ Jehova; anyị elewo anya Ya, ka anyị tegharịa egwú ọṅụ ṅụrịakwa ná nzọpụta Ya.”—Aịsaịa 25:9.
E Wedaa Ndị Mpako Ala
10, 11. Olee mmeso siri ike Jehova debeere Moab?
10 Jehova na-azọpụta ndị dị umeala n’obi so ná ndị ya. Otú ọ dị, ndị agbata obi Israel, bụ́ Moab, dị mpako, Jehova kpọkwara mpako asị. (Ilu 16:18) N’ihi ya, a ga-eweda Moab ala. “Aka Jehova ga-anọgide n’ugwu a, e wee zọda Moab n’ọnọdụ ya, dị ka e si azọda okporo ọka n’ime mmiri nke olulu ikpo nsị anụ. Ọ ga-agbasakwa aka ya abụọ n’etiti ya, dị ka onye na-egwu mmiri si agbasa aka ya igwu mmiri: ma Ọ ga-eme ka mpako ya dị ala, ya na ọrụ aghụghọ nile nke aka ya abụọ. Ọzọ, ebe e wusiri ike nke ụlọ elu nke mgbidi gị nile ka O budaworo, mee ka ọ dị ala, mee ka ọ daruo ala, ọbụna ruo ájá.”—Aịsaịa 25:10–12.
11 Aka Jehova “ga-anọgide” n’ugwu Moab. Gịnị ka ọ ga-arụpụta? A ga-eti Moab dị mpako ihe ma zọọ ya ụkwụ dị ka “olulu ikpo nsị anụ.” N’oge Aịsaịa, a na-eji ụkwụ azọkọta okporo ọka na ikpo nsị anụ ịghọ nri ala; ya mere Aịsaịa na-ebu amụma na a ga-eweda Moab ala, n’agbanyeghị mgbidi ya dị elu, ndị yiri ka ọ dịghị ihe ga-eme ha.
12. N’ihi gịnị ka e ji kpọọ Moab aha iche maka ịgwa ya okwu ikpe Jehova?
12 N’ihi gịnị ka Jehova ji kpọọ Moab aha iche maka ndụmọdụ dị otú ahụ dị ike? Ndị Moab bụ ụmụ Lọt, bụ́ nwa nwanne Abraham, onye na-efekwa Jehova. N’ihi ya, ọ bụghị nanị na ha na mba ha na Chineke nọ n’ọgbụgba ndụ bụ ndị agbata obi, kamakwa ha bụ ndị ikwu ha. N’agbanyeghị nke a, ha amalitewo ife chi ụgha ma gosipụta ajọ ibu iro n’ebe Israel nọ. Ihe dakwasịrị ha kwesịrị ha. Na nke a, Moab yiri ndị iro nke ndị ohu Jehova taa. O yiri Krisendọm karịsịa, bụ́ nke na-azọrọ na ya malitere n’ọgbakọ ndị Kraịst narị afọ mbụ ma bụrụ, dị ka anyị hụrụ ná mmalite, akụkụ bụ́ isi nke Babilọn Ukwu ahụ.
Abụ Nzọpụta
13, 14. Olee “obodo siri ike” ndị Chineke nwere taa, oleekwa ndị a na-ekwe ka ha baa n’ime ya?
13 Olee banyere ndị Chineke? N’ịbụ ndị obi dị ụtọ inwe ihu ọma na nchebe Jehova, ha na-eweli olu ha elu n’ịbụ abụ. “N’ụbọchị ahụ ka a ga-abụ abụ a n’ala Juda: Obodo siri ike ka anyị nwere; nzọpụta ka Ọ ga-edo ka ọ bụrụ mgbidi ya nile na ekpe ya. Megheenụ ọnụ ụzọ ámá nile, ka mba nke na-eme ezi omume nke na-edebe ikwesị ntụkwasị obi nile wee baa n’ime.” (Aịsaịa 26:1, 2) Ọ bụ ezie na obi abụọ adịghị ya na okwu ndị a mezuru n’oge ochie, ha nwekwara mmezu doro anya taa. “Mba [Jehova] nke na-eme ezi omume” nwere nzukọ siri ike, nke yiri obodo. Lee ihe na-akpata ọṅụ, na-akpata ịbụ abụ, ọ bụ!
14 Ụdị ndị dị aṅaa na-abata ‘n’obodo’ a? Abụ ahụ zara ya: “Ị na-echebe onye e meworo ka [echiche] uche ya dabere na Gị [Chineke], o wee na-adịzu n’udo: n’ihi na ọ bụ Gị ka ọ na-atụkwasị obi. Tụkwasịnụ obi na Jehova ruo mgbe nile ebighị ebi: n’ihi na Ja Jehova bụ oké nkume nke mgbe nile ebighị ebi.” (Aịsaịa 26:3, 4) “Echiche uche” nke Jehova na-akwado bụ ọchịchọ irube isi n’ụkpụrụ ezi omume ya na ịtụkwasị obi n’ebe ọ nọ, ọ bụghị n’ebe usoro azụmahịa, ọchịchị, na okpukpe nke ụwa a dị, bụ́ ndị na-adagharị adagharị. “Ja Jehova” agwụla Oké Nkume nchebe a pụrụ ịdabere na ya. Ndị tụkwasịrị Jehova obi kpam kpam na-enweta nchebe ya ma “na-adịzu n’udo.”—Ilu 3:5, 6; Ndị Filipaị 4:6, 7.
15. Olee otú e siworo budaa “obodo dị elu” taa, n’ụzọ dịkwa aṅaa ka ‘ụkwụ nke ndị e wedara n’ala’ si azọda ya?
15 Lee ka o si dị iche n’ihe na-eme ndị iro nke ndị Chineke! “O budawo ndị bi n’elu, bụ́ obodo dị elu: Ọ na-eme ka ọ dị ala, Ọ na-eme ka ọ dị ala ọbụna ruo ala: Ọ na-eme ka ọ daruo ájá. Ụkwụ ga-azọda ya; bụ́ ụkwụ abụọ nke onye e wedara n’ala, ha na nzọụkwụ nke ndị na-enweghị ike.” (Aịsaịa 26:5, 6) Ọzọkwa, n’ebe a, Aịsaịa pụrụ ịdị na-ezo aka ‘n’obodo dị elu’ dị na Moab, ma ọ bụ ọ pụrụ ịbụ na o bu n’uche obodo ọzọ, dị ka Babilọn, bụ́ nke dị elu n’ezie ná mpako. Nke ọ bụla ọ bụ, Jehova emewo ka nkata kpudo ‘obodo ahụ dị elu,’ ndị ya ‘na-enweghị ike na ndị e wedara n’ala’ na-azọdakwa ya. Taa, amụma a kwesịrị nnọọ Babilọn Ukwu ahụ, karịsịa Krisendọm. Na 1919, a manyere ‘obodo a dị elu’ ịtọhapụ ndị Jehova—ọdịda na-eme ihere—ha, n’aka nke ọzọ, na-azọdakwa ndị jibu ha eji. (Mkpughe 14:8) N’ụzọ dị aṅaa? Site n’ịkpọsa n’ihu ọha ịbọ ọ́bọ̀ na-abịanụ nke Jehova n’ahụ ya.—Mkpughe 8:7–12; 9:14–19.
Ịchọ Ezi Omume na Ihe “Ncheta” Jehova
16. Ezi ihe nlereanya dị aṅaa nke nraranye ka Aịsaịa setịpụrụ?
16 Mgbe abụ mmeri a gasịrị, Aịsaịa kpughere ịdị omimi nke nraranye ya na ụgwọ ọrụ dị n’ijere Chineke nke ezi omume ozi. (Gụọ Aịsaịa 26:7-9.) Onye amụma ahụ bụ ezi ihe nlereanya ‘n’ile anya Jehova’ na n’inwe agụụ siri ike maka“aha” na ihe “ncheta” Jehova. Gịnị bụ ihe ncheta Jehova? Ọpụpụ 3:15 na-ekwu, sị: “Jehova . . . bụ aha m ruo mgbe ebighị ebi, nke a bụkwa ihe ncheta m ruo ọgbọ nile.” Aịsaịa ji aha Jehova na ihe nile ọ pụtara kpọrọ ihe, gụnyere ụkpụrụ ezi omume na ụzọ Ya. Ndị zụlitere ịhụnanya dị otú ahụ maka Jehova ji n’aka inweta ngọzi ya.— Abụ Ọma 5:8; 25:4, 5; 135:13; Hosea 12:5.
17. Olee ihe ùgwù ndị a na-agaghị enye ndị ajọ omume?
17 Otú ọ dị, ọ bụghị mmadụ nile hụrụ Jehova na ụkpụrụ ya dị elu n’anya. (Gụọ Aịsaịa 26:10.) Ndị ajọ omume, ọbụna mgbe a kpọrọ ha òkù, na-eji ịgba isi akwara jụ ịmụta ezi omume iji banye “n’ala nke izi ezi,” ala nke ndị ohu Jehova ziri ezi n’omume na n’ụzọ ime mmụọ bi na ya. N’ihi ya, ndị ajọ omume ‘agaghị ahụ ịdị elu nke Jehova.’ Ha agaghị adị ndụ wee nụ ụtọ ngọzi ndị ga-abịara ihe a kpọrọ mmadụ mgbe e dosịworo aha Jehova nsọ. Ọbụna n’ime ụwa ọhụrụ ahụ, mgbe ụwa nile ga-aghọ ‘ala nke izi ezi,’ ụfọdụ nwere ike ghara ịnabata ebere ịhụnanya Jehova. A gaghị ede aha mmadụ ndị dị otú ahụ n’akwụkwọ nke ndụ.—Aịsaịa 65:20; Mkpughe 20:12, 15.
18. N’ụzọ dị aṅaa ka ụfọdụ ndị nọ n’oge Aịsaịa si jiri aka ha họrọ ikpu ìsì, oleekwa mgbe a ga-amanye ha ‘ịhụ’ Jehova?
18 “Jehova, e buliwo aka Gị, ma ha adịghị ahụ: ha ga-ahụ ekworo Ị na-ekworo ndị Gị, ihere ewee mee ha; ọzọ, ọkụ nke ndị na-emegide Gị ga-erichapụ ha.” (Aịsaịa 26:11) N’oge Aịsaịa, aka Jehova egosiwo na e buliwo ya elu mgbe Jehova chebere ndị ya site n’imegide ndị iro ha. Ma ihe ka n’ọnụ ọgụgụ aghọtabeghị nke a. N’ikpeazụ, a ga-amanye ndị dị otú ahụ ji aka ha họrọ ikpu ìsì n’ụzọ ime mmụọ ‘ịhụ,’ ma ọ bụ ịmara na Jehova dị, mgbe ọkụ nke ekworo ya ga-eripịa ha. (Zefanaịa 1:18) Chineke mesịrị gwa Ezikiel, sị: “Ha [ga-amata] na Mụ onwe m bụ Jehova.”—Ezikiel 38:23.
“Onye Jehova Hụrụ n’Anya Ka Ọ Na-ezi Ihe Site n’Inye Ya Ahụhụ”
19, 20. N’ihi gịnị, n’ụzọ dịkwa aṅaa ka Jehova siworo nye ndị ya ahụhụ, oleekwa ndị inye ahụhụ dị otú ahụ bawooro uru?
19 Aịsaịa maara na udo na ọganihu ọ bụla ụmụ amaala ibe ya nwere bụ n’ihi ngọzi Jehova. “Jehova, Ị ga-edoro anyị udo: n’ihi na ọ bụkwa ọrụ nile nke anyị ka Ị rụwooro anyị.” (Aịsaịa 26:12) N’agbanyeghị nke a, n’agbanyeghịkwa na Jehova enyewo ndị ya ohere ịghọ “alaeze ndị nchụàjà, na mba dị nsọ,” Juda nwere akụkọ dị mma na nke dị njọ. (Ọpụpụ 19:6) Ugboro ugboro, ndị ya chigharịrị gaa n’ofufe nke chi ụgha. N’ihi ya, e nyere ha ahụhụ ugboro ugboro. Otú ọ dị, ahụhụ dị otú ahụ bụ ihe àmà nke ịhụnanya Jehova n’ihi na “onye [Jehova] hụrụ n’anya ka Ọ na-ezi ihe site n’inye ya ahụhụ.”—Ndị Hibru 12:6.
20 Ọtụtụ mgbe, Jehova na-enye ndị ya ahụhụ site n’ikwe ka mba ndị ọzọ, “ndị nwenụ ọzọ,” chịa ha. (Gụọ Aịsaịa 26:13.) Na 607 T.O.A., o kwere ka ndị Babilọn mee ka ha jee biri n’ala ọzọ. Nke a ọ̀ baara ha uru? N’onwe ya, ahụhụ adịghị abara mmadụ uru. Otú ọ dị, ọ bụrụ na onye tara ahụhụ ahụ amụta ihe site n’ihe merenụ, chegharịa, ma fee nanị Jehova, mgbe ahụ, ọ na-abara ya uru. (Deuterọnọmi 4:25–31) Ọ̀ dị ndị Juu gosiri nchegharị dị ka Chineke si chọọ? Ee! Aịsaịa na-ekwu n’ụzọ amụma, sị: “Ọ bụ nanị site na Gị ka anyị ga-ehota aha Gị.” Mgbe ha si n’ije biri n’ala ọzọ lọta na 537 T.O.A., ọ dị mkpa ọtụtụ mgbe inye ndị Juu ahụhụ maka mmehie ndị ọzọ, ma ọ dịghị mgbe ha dabara ọzọ n’ife chi nkume.
21. Gịnị ga-eme ndị megburu ndị Chineke?
21 Gịnị banyere ndị ji ndị Juda? “Ndị na-adịghị ndụ adịghị ebili: n’ihi nke a ka I letaworo ha wee kpochapụ ha, mee ka ncheta nile ndị dịịrị ha laa n’iyi.” (Aịsaịa 26:14) Babilọn ga-ata ahụhụ maka mmekpọ ọnụ o mekpọrọ mba Jehova họpụtara. Jehova ga-eji ndị Midia na ndị Peasia bibie Babilọn dị mpako ma tọhapụ ndị ya e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ. A ga-eme ka obodo ukwu ahụ, bụ́ Babilọn, ghara ịdị ike, dị nnọọ ka onye nwụrụ anwụ. N’ikpeazụ, ọ ga-akwụsị ịdị adị.
22. N’oge a, olee otú e siworo gọzie ndị Chineke?
22 Ná mmezu nke oge a, a tọhapụrụ ihe fọdụrụ n’Israel ime mmụọ ahụ e mere ka ha dị ọcha site na Babilọn Ukwu ahụ ma weghachi ha n’ozi Jehova na 1919. N’ịbụ ndị nwetara ume ọhụrụ, ndị Kraịst e tere mmanụ mikpuru onwe ha n’ọrụ nkwusa ha. (Matiu 24:14) N’aka nke ya, Jehova ejiriwo mmụba gọzie ha, ọbụna na-akpọbata oké ìgwè mmadụ nke “atụrụ ọzọ” iso ha na-eje ozi. (Jọn 10:16) “Ị tụkwasịwo mmadụ ná mba nke a, Jehova, Ị tụkwasịwo mmadụ ná mba nke a; Ị natawo nsọpụrụ: I mewo ka nsọtụ nile nke ala dị anya. Jehova, n’ahụhụ ka ha letaworo Gị, ha takwuru ntakwu n’ekpere nke ukwuu mgbe ịdọ aka ná ntị Gị ruru ha ahụ.”—Aịsaịa 26:15, 16.
‘Ha Ga-ebili’
23. (a) Ngosipụta dị aṅaa dị ịrịba ama nke ike Jehova weere ọnọdụ na 537 T.O.A.? (b) Ngosipụta dị aṅaa yiri ya weere ọnọdụ na 1919 O.A.?
23 Aịsaịa laghachiri n’ọnọdụ Juda nọ na ya mgbe a ka ji ya eji na Babilọn. O ji mba ahụ tụnyere nwanyị ime na-eme, bụ́ onye na-enweghị ike ịmụ nwa n’enwetaghị enyemaka. (Gụọ Aịsaịa 26:17, 18.) Enyemaka ahụ bịara na 537 T.O.A., ndị Jehova laghachikwara n’ala nna ha, nwee oké mmasị iwughachi ụlọukwu ahụ na iweghachi ezi ofufe. Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, a kpọlitere mba ahụ n’ọnwụ. “Ndị Gị ndị nwụrụ anwụ ga-adị ndụ; ozu m nile ga-ebili. Tetanụ, tie mkpu ọṅụ, unu ndị bi n’ájá: n’ihi na igirigi nke ìhè nile ka igirigi Gị bụ, ala ga-amụpụtakwa ndị na-adịghị ndụ.” (Aịsaịa 26:19) Lee ngosipụta nke ike Jehova ọ bụ! Ọzọkwa, lee oké ngosipụta e nwere mgbe e mezuru okwu ndị a n’ụzọ ime mmụọ na 1919! (Mkpughe 11:7–11) Leekwa ka anyị si na-atụ anya oge a ga-emezu okwu ndị a n’ụzọ nkịtị n’ime ụwa ọhụrụ ahụ, ndị nwụrụ anwụ ‘ga-anụ olu Jisọs, pụtakwa’ site n’ili ncheta!—Jọn 5:28, 29.
24, 25. (a) Olee otú ndị Juu nọ na 539 T.O.A. pụrụ isiworị rube isi n’iwu Jehova bụ́ ka ha zobe onwe ha? (b) Gịnị ka ‘ime ụlọ’ pụrụ izo aka na ya n’oge a, àgwà dịkwa aṅaa ka anyị na-aghaghị ịzụlite n’ebe ihe ndị a dị?
24 Otú ọ dị, ọ bụrụ na ndị kwesịrị ntụkwasị obi ga-enweta ngọzi ime mmụọ ndị e kwere ná nkwa site n’ọnụ Aịsaịa, ha aghaghị irube isi n’iwu Jehova: “Bịa, ndị m, bata n’ime ụlọ gị nile, mechibido ụzọ gị nile n’azụ gị: zobe onwe gị nanị otu ntabi anya nta, ruo mgbe oké iwe ga-agabiga. N’ihi na, lee, Jehova na-esi n’ọnọdụ Ya apụta iji ajọ omume nke ndị bi n’ụwa leta ha: ọzọ, ala ga-ekpughe ọbara ya, ọ gaghị ekpuchikwa ndị ya e gburu egbu ọzọ.” (Aịsaịa 26:20, 21; tụlee Zefanaịa 1:14.) Ọ pụrụ ịbụ na amaokwu ndị a nwere mmezu mbụ mgbe ndị Midia na ndị Peasia, bụ́ ndị Eze Saịrọs du, meriri Babilọn na 539 T.O.A. Dị ka onye Gris na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Xenophon si kwuo, mgbe Saịrọs banyere Babilọn, o nyere iwu ka mmadụ nile nọrọ n’ime ụlọ ha n’ihi na o nyere ndị agha ịnyịnya ya “iwu ka ha gbuo onye ọ bụla ha hụrụ n’èzí.” Taa, a pụrụ ijikọta n’ụzọ chiri anya ‘ime ụlọ’ dị n’amụma a na ọtụtụ iri puku ọgbakọ ndị Jehova n’ụwa nile. Ọgbakọ ndị dị otú ahụ ga-anọgide na-arụ ọrụ dị mkpa ná ndụ anyị, ọbụna gabiga “oké mkpagbu” ahụ. (Mkpughe 7:14) Lee ka o si dị mkpa ka anyị nọgide na-enwe àgwà ziri ezi n’ebe ọgbakọ dị ma soro ya na-akpachi anya!—Ndị Hibru 10:24, 25.
25 N’isi nso, ụwa Setan ga-abịa ná njedebe. Anyị amabeghị otú Jehova ga-esi chebe ndị ya n’oge ahụ dị egwu. (Zefanaịa 2:3) Otú ọ dị, anyị maara na nlanarị anyị ga-adabere n’okwukwe anyị nwere n’ebe Jehova nọ nakwa ná nguzosi ike n’ihe na nrubeisi anyị nye ya.
26. Gịnị bụ “leviathan” n’oge Aịsaịa na n’oge anyị, gịnịkwa ga-eme ‘anụ a nke dị n’oké osimiri’?
26 N’ilega anya n’oge ahụ, Aịsaịa buru amụma, sị: “N’ụbọchị ahụ Jehova ga-ewere mma agha Ya dị arọ dị ukwuu dị ike ji mmehie ha leta leviathan, bụ́ agwọ na-agba ọsọ, na leviathan, bụ́ agwọ gbagọrọ agbagọ; Ọ ga-egbukwa ogologo anụ ahụ nke dị n’oké osimiri.” (Aịsaịa 27:1) Ná mmezu mbụ ya, “leviathan” na-ezo aka ná mba dị iche iche ebe ndị a chụgara Israel, dị ka Babilọn, Ijipt, na Asiria. Mba ndị a apụghị igbochi ndị Jehova ịlaghachi n’ala ha n’oge kwesịrị ekwesị. Otú ọ dị, ònye bụ leviathan nke oge a? O yiri ka ọ bụ Setan—“agwọ ochie ahụ”—na ajọ usoro ihe ya dị n’elu ala ebe a, bụ́ ihe o ji alụso Israel ime mmụọ ọgụ. (Mkpughe 12:9, 10; 13:14, 16, 17; 18:24) “Leviathan” kwụsịrị ijide ndị Chineke na 1919, n’isi nso kwa, ọ ga-apụ n’anya kpam kpam mgbe Jehova “ga-egbukwa ogologo anụ ahụ nke dị n’oké osimiri” n’ezie. Ka ọ dịgodị, ọ dịghị ihe ọ bụla “leviathan” ga-anwa ime ndị Jehova nke ga-enwe ezi ihe ịga nke ọma.—Aịsaịa 54:17.
“Ubi Vine nke Mmanya Na-asụ Ụfụfụ”
27, 28. (a) Gịnị ka ubi vine Jehova jiworo mejuo ụwa dum? (b) Olee otú Jehova si echebe ubi vine ya?
27 Ugbu a Aịsaịa ji abụ ọzọ kọwaa n’ụzọ mara mma otú ndị Jehova nweere onwe ha ga-esi mịa mkpụrụ n’ụba: “N’ụbọchị ahụ: Otu ubi vine nke mmanya vine na-asụ ụfụfụ, tienụ mkpu ọṅụ banyere ya. Mụ onwe m, Jehova, bụ onye nche ya; na mgbe nile ọ bụla dịkasịrị nta ka M na-ede ya mmiri: ka onye ọ bụla wee ghara iji ihe ọjọọ leta ya, abalị na ehihie ka M na-eche ya.” (Aịsaịa 27:2, 3) Ihe fọdụrụ n’Israel ime mmụọ na ndị ibe ha na-arụsị ọrụ ike ejiriwo ihe omume ime mmụọ mejupụta ụwa n’ezie. Lee ka o si bụrụ ihe a ga-aṅụrịrị ọṅụ—ihe a ga-abụrụ abụ! Ekele nile na-agara Jehova, onye ji ịhụnanya na-elekọta ubi vine ya.—Tụlee Jọn 15:1–8.
28 N’ezie, ọṅụ anọchiwo iwe Jehova were ná mmalite! “Ọnụma adịghị n’ime m: ọ ga-adị m nnọọ mma ma ogwu na uké ga-emegide m n’agha! M ga-awakwu ha, M ga-esurekọta ha n’otu. Ma ọ bụ, ya jide ebe m siri ike, ọ ga-eme ka Mụ na ya dị n’udo; ee, ọ ga-eme ka Mụ na ya dị n’udo.” (Aịsaịa 27:4, 5) Iji hụ na ubi vine ya nọgidere na-ewepụta “mmanya na-asụ ụfụfụ” n’ụba, Jehova na-egwepịa ma na-erepịa, dị ka o ji ọkụ, ihe ọ bụla yiri ahịhịa nke ga-emetọ ubi vine ya. N’ihi ya, ka onye ọ bụla ghara itinye ọdịmma nke ọgbakọ ndị Kraịst n’ihe ize ndụ! Kama nke ahụ, ka mmadụ nile ‘jide ebe siri ike nke Jehova,’ na-achọ ihu ọma na nchebe ya. Site n’ime otú ahụ, ha na-eme ka ha na Chineke dị n’udo—ihe dị oké mkpa nke na Aịsaịa kwuru ya ugboro abụọ. Gịnị ka ọ ga-arụpụta? “N’ọdịnihu Jekọb ga-agba mkpọrọgwụ: Israel ga-agbawa okooko dị ka osisi, maa ifuru: ha wee mejuo ihu elu ụwa dum mmadụ bi n’ihe omume.” (Aịsaịa 27:6)c Lee ka mmezu amaokwu a si bụrụ ihe àmà magburu onwe ya nke ike Jehova! Kemgbe 1919, ndị Kraịst e tere mmanụ emejuwo ụwa “n’ihe omume,” bụ́ nri ime mmụọ na-edozi ahụ. N’ihi ya, ọtụtụ nde atụrụ ọzọ na-eguzosi ike n’ihe esonyeworo ha, ha na ha “na-efekwa [Chineke] ofufe ehihie na abalị.” (Mkpughe 7:15) N’ime ụwa rụrụ arụ, ndị a ji ọṅụ na-agbasosi ụkpụrụ ya dị elu ike. Jehova nọgidekwara jiri mmụba na-agọzi ha. Ka anyị ghara ichefu mgbe ọ bụla oké ihe ùgwù nke ikere òkè “n’ihe omume” ahụ na iso ndị ọzọ na-ekerịta ya site ná mkpu otuto nke anyị!
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ma eleghị anya aha ahụ bụ́ A pụtara “Obodo.”
c A tụlere Aịsaịa 27:7-13 n’igbe dị na peji nke 285.
Igbe dị na peeji nke 85]
Otu “Opi Ike Ukwu” Akpọsaa Nnwere Onwe
Na 607 T.O.A., ihe mgbu Juda mụbara mgbe Jehova jiri ihe otiti nke ije biri n’ala ọzọ nye mba ya na-enupụ isi ahụhụ. (Gụọ Aịsaịa 27:7-11.) Mmehie nke mba ahụ gafere ókè nke na àjà ụmụ anụmanụ apụghị ikpuchi ya. Ya mere, dị ka mmadụ pụrụ ịchụsa ewu ma ọ bụ atụrụ site n’iti ‘otiti’ ma ọ bụ jiri “ifufe siri ike” fesaa mkpá akwụkwọ, Jehova chụpụrụ ndị Israel n’ala nna ha. Mgbe nke ahụ gasịrị, ọbụna ndị na-adịghị ike, bụ́ ndị e ji ndị inyom mee ihe atụ ha, pụrụ ịkwakọrọ ihe fọdụrụ n’ala ahụ.
Otú ọ dị, oge ruru mgbe Jehova ga-anapụta ndị ya site n’ojiji e ji ha. Ọ tọhapụrụ ha dị ka onye ọrụ ugbo pụrụ isi tọhapụ mkpụrụ olive e ji eji n’elu osisi, dị ka a pụrụ isi kwuo ya. “Ọ ga-erukwa, n’ụbọchị ahụ, na Jehova ga-etichapụ mkpụrụ ọka Ya, site na mmiri na-eru ọkụ ọkụ nke Osimiri [Yufretis] ruo mmiri iyi Ijipt, e wee chịkọta unu onwe unu n’otu n’otu, unu ụmụ Israel. Ọ ga-erukwa, n’ụbọchị ahụ, na a ga-afụ opi ike ukwu; ha ga-abịakwa, bụ́ ndị na-ala n’iyi n’ala Asiria, na ndị a chụsara achụsa n’ala Ijipt; ha ga-akpọkwa isiala nye Jehova n’ugwu nsọ ahụ n’ime Jerusalem.” (Aịsaịa 27:12, 13) Mgbe o merisịrị na 539 T.O.A., Saịrọs nyere iwu ka a tọhapụ ndị Juu nile nọ n’alaeze ukwu ya, bụ́ nke gụnyere ndị nọ n’Asiria na Ijipt. (Ezra 1:1-4) O yiri ka a ga-asị na a fụrụ “opi ike ukwu,” na-abụrụ ndị Chineke abụ nnwere onwe.
[Foto dị na peeji nke 275]
“Oké oriri nke ihe mara abụba”
[Foto dị na peeji nke 277]
Ndị bụbu ndị mkpọrọ zọdara Babilọn
[Foto dị na peeji nke 279]
“Bata n’ime ụlọ gị nile”