Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ip-1 isi 5 p. 49-60
  • Jehova Ewedaa Ndị Na-ebuli Onwe Ha Elu Ala

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jehova Ewedaa Ndị Na-ebuli Onwe Ha Elu Ala
  • Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ha Ji Nganga Na-akpọ Isiala
  • ‘Anya Mpako Aghaghị Ịdị Ala’
  • “Ụbọchị Onyenwe Anyị” nke Dị Nso
  • “Nye Anụ Mole na Ụsụ”
  • ‘Ndị Ndú Na-eme Gị Ka Ị Wagharịa’
  • “Egbugbu Ọkụ Ga-adị n’Ọnọdụ Ịma Mma”
  • “A Ga-emekwa Ka Ọ Tọgbọrọ n’Efu”
  • Na-echere Jehova
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
  • Aịsaịa Ebuo Amụma Banyere ‘Ihe Omume Na-eju Anya’ nke Jehova
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
  • Aka Jehova Adị Elu
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
  • Okwu Amụma Nkasi Obi Ndị Metụtara Gị
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ II
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
ip-1 isi 5 p. 49-60

Isi nke Ise

Jehova Ewedaa Ndị Na-ebuli Onwe Ha Elu Ala

Aịsaịa 2:6–4:1

1, 2. N’ihi gịnị ka ozi amụma ahụ Aịsaịa ziri ndị Juu nke oge ya ji na-adọrọ mmasị anyị?

N’ỊBỤ onye na-enweghị afọ ojuju n’ọnọdụ Jerusalem na Juda nọ na ya, Aịsaịa onye amụma chigharịkwuuru Jehova Chineke ugbu a ma kwuo, sị: “Ị hapụwo ndị Gị, bụ́ ụlọ Jekọb.” (Aịsaịa 2:6a) Gịnị kpasuru Chineke iwe mere o ji jụ ndị o ji aka ya họpụta ịbụ “ihe nke aka Ya”?—Deuterọnọmi 14:2.

2 Nkatọ Aịsaịa katọrọ ndị Juu nke oge ya na-adọrọ mmasị anyị nke ukwuu. N’ihi gịnị? N’ihi na ọnọdụ Krisendọm taa yiri nnọọ nke ndị obodo Aịsaịa, otú a kwa ka ọ dị ikpe ọmụma Jehova kwupụtara. Ịṅa ntị n’ihe Aịsaịa kpọsara ga-eme ka anyị ghọta n’ụzọ doro anya ihe Chineke katọrọ, ọ ga-enyekwara anyị aka izere omume ndị ọ kagburu. Mgbe ahụ, ka anyị jiri oké mmasị tụlee okwu amụma Jehova dị ka e dekọrọ ya n’Aịsaịa 2:6–4:1.

Ha Ji Nganga Na-akpọ Isiala

3. Olee mmehie ndị obodo Aịsaịa mere nke ọ na-ekwupụta?

3 N’ikwupụta mmehie nke ndị obodo ya, Aịsaịa na-ekwu, sị: “Ha jupụtara n’omenala site n’Ihu anyanwụ, ha bụkwa ndị ji igwe ojii na-atụ isi ọma na isi ọjọọ dị ka ndị Filistia, ọzọ, ha na ụmụ ndị ala ọzọ na-ekwekọ aka.” (Aịsaịa 2:6b) Ihe dị ka afọ 800 tupu mgbe ahụ, Jehova nyere ndị ya ọ họpụtara iwu, sị: “Unu ewerela ihe ndị a nile merụọ onwe unu: n’ihi na e weere ihe ndị a nile mee ka mba nile rụọ arụ, bụ́ ndị Mụ onwe m na-achụpụ n’ihu unu.” (Levitikọs 18:24) Jehova manyere Belam ikwu banyere ndị ọ họpụtara ịbụ ihe nke aka ya, sị: “N’elu oké nkume ndị a ka m si ahụ ya, ọ bụkwa n’ugwu nta ndị a ka m si ekiri ya: lee, otu ndị ka ọ bụ, ọ na-ebi iche, ọ dịghị agụ onwe ya n’etiti mba nile.” (Ọnụ Ọgụgụ 23:9, 12) N’agbanyeghị nke ahụ, ka ọ na-erule n’oge Aịsaịa, ndị Jehova họpụtara amalitewo ime omume ndị na-asọ oyi nke mba ndị gbara ha gburugburu ma jupụta “n’omenala site n’Ihu anyanwụ.” Kama inwe okwukwe na Jehova na n’okwu ya, ha ji “igwe ojii na-atụ isi ọma na isi ọjọọ dị ka ndị Filistia.” Kama ịnọpụ iche site ná mba dị iche iche, ala ahụ ‘jupụtara n’ụmụ ndị ala ọzọ’—n’enweghị obi abụọ, ndị ala ọzọ ndị na-ewebata omume asọpụrụghị Chineke n’etiti ndị Chineke.

4. Kama ime ka ha nye Jehova ekele, mmetụta dị aṅaa ka akụ̀ na ụba na ike agha nwere n’ahụ ndị Juu?

4 N’ịrịba ama ihe ịga nke ọma n’ụzọ akụ̀ na ụba na nke ike agha nke Juda nwere n’oge ahụ n’okpuru Eze Ụzaịa, Aịsaịa na-ekwu, sị: “Ala ha jupụtakwara n’ọlaọcha na ọlaedo, ọ dịghịkwa ọgwụgwụ dịịrị akụ̀ ha; ala ha jupụtakwara n’ịnyịnya, ọ dịghịkwa ọgwụgwụ dịịrị ụgbọala ha.” (Aịsaịa 2:7) Ndị ahụ hà na-enye Jehova ekele maka akụ̀ na ụba na ike agha dị otú ahụ? (2 Ihe E Mere 26:1, 6-15) Ọ dịghị ma ọlị! Kama nke ahụ, ha na-atụkwasị obi n’akụ̀ na ụba ahụ kpọmkwem ma na-agbakụta Isi Iyi ya, bụ́ Jehova Chineke, azụ. Gịnị si na ya pụta? “Ala ha jupụtakwara n’ihe efu; ọrụ nke aka ha ka ha na-akpọ isiala nye, bụ́ ihe nke mkpịsị aka ha mere. Mmadụ wee hudaa n’ala, onye dị elu na-emekwa onwe ya ka ọ dị ala: ebupụkwala mmehie ha.” (Aịsaịa 2:8, 9) Ha na-ewepụ ihu ha n’ebe Chineke dị ndụ nọ ma na-akpọ isiala nye arụsị ndị na-adịghị ndụ.

5. N’ihi gịnị ka ịkpọ isiala nye arụsị na-ejighị bụrụ omume ịdị umeala n’obi?

5 Ịkpọ isiala pụrụ ịbụ ihe àmà nke ịdị umeala n’obi. Ma ịkpọ isiala nye ihe ndị na-adịghị ndụ abaghị uru, ọ na-eme ka onye na-ekpere arụsị “dị ala,” bụrụ onye e wedara n’ala. Olee otú Jehova ga-esi gbaghara ụdị mmehie ahụ? Gịnị ka ndị a na-ekpere arụsị ga-eme mgbe Jehova kpọrọ ha ịbịa zara ọnụ ha?

‘Anya Mpako Aghaghị Ịdị Ala’

6, 7. (a) Gịnị ga-eme ndị na-ebuli onwe ha elu n’ụbọchị ikpe Jehova? (b) N’ahụ gịnị nakwa n’ahụ ònye ka Jehova gosipụtara iwe ya, n’ihi gịnịkwa?

6 Aịsaịa gara n’ihu: “Baa n’oké nkume, zobekwa onwe gị n’ájá, ịpụ n’ihu oké egwu Jehova, na ịpụ n’ịma mma nke ịdị elu Ya.” (Aịsaịa 2:10) Ma ọ dịghị nkume buru ibu ichebe ha, ọ dịghị ihe mkpuchi zurunụ iji zopụ ha n’ebe Jehova, bụ́ Onye Pụrụ Ime Ihe Nile, nọ. Mgbe ọ bịara imezu ihe o kpere n’ikpe, “a ghaghị ime anya mpako nke mmadụ ka ha dị ala, a ghaghịkwa iruda mbuli elu nke ndị nile n’ala, a ghaghịkwa ime ka Jehova, nanị Ya, dị elu n’ụbọchị ahụ.”—Aịsaịa 2:11.

7 ‘Ụbọchị Jehova nke usuu nile nke ndị agha nwere’ na-abịa. Ọ ga-abụ oge Chineke ga-egosi iwe ya n’ahụ “osisi cedar nile nke Lebanọn nke dị elu nke e buliwokwara . . . elu, ọ ga-adakwasịkwa osisi oak nile nke Beshan; ọ ga-adakwasịkwa ugwu nile nke dị elu, ọ ga-adakwasịkwa ugwu nta nile nke e buliworo elu; ọ ga-adakwasịkwa ụlọ elu ọ bụla dị elu, ọ ga-adakwasịkwa mgbidi ọ bụla e wusiri ike; ọ ga-adakwasịkwa ụgbọ nile nke Tashish, ọ ga-adakwasịkwa ihe ile anya nile a na-achọsi ike.” (Aịsaịa 2:12-16) Ee, a ga-elebara òtù ọ bụla mmadụ guzobere dị ka ihe nnọchiteanya nke nganga ya na onye ọ bụla na-adịghị asọpụrụ Chineke anya n’ụbọchị iwe Jehova. N’ụzọ dị otú a, “a ghaghịkwa iruda mpako mmadụ, a ghaghịkwa ime mbuli elu nke ndị nile ka ọ dị ala: a ghaghịkwa ime ka Jehova, nanị Ya, dị elu n’ụbọchị ahụ.”—Aịsaịa 2:17.

8. Olee otú ụbọchị ikpe ahụ e buru n’amụma si bịakwasị Jerusalem na 607 T.O.A.?

8 Ụbọchị ahụ e buru n’amụma nke imezu ihe e kpere n’ikpe bịakwasịrị ndị Juu na 607 T.O.A. mgbe Eze Nebukadneza nke Babilọn bibiri Jerusalem. Ndị bi n’ime ya hụrụ ka obodo ha ha hụrụ n’anya na-agba ọkụ, ka e bibiri ụlọ ya ndị dị ebube, ka a kwaturu oké mgbidi ya. A kụrisịrị ụlọ nsọ Jehova. Ma akụ̀ na ụba ha ma ụgbọ ịnyịnya ha abaghị uru ọ bụla ‘n’ụbọchị Jehova nke usuu nile nke ndị agha nwere.’ Arụsị ha kwanụ? O mere nnọọ dị ka Aịsaịa buru n’amụma: “Ihe efu ha, ha nile aghaghị ịgasị.” (Aịsaịa 2:18) A kpụụrụ ndị Juu—ma ndị isi ma ndị dị ike—gaa n’ala ọzọ na Babilọn. Jerusalem gaje ịtọgbọrọ nkịtị ruo afọ 70.

9. N’ụzọ dị aṅaa ka ọnọdụ Krisendọm si yie nke Jerusalem na Juda n’oge Aịsaịa?

9 Lee ka ọnọdụ Krisendọm si yie nke Jerusalem na nke Juda n’oge Aịsaịa! Krisendọm esorowo mba dị iche iche nke ụwa a na-enwe mmekọrịta chiri anya n’ezie. Ọ bụ onye nkwado siri ike nke Mba Ndị Dị n’Otu, o jiriwokwa arụsị na omume ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị mejupụta ụlọ ya. Ndị na-akwado ya hụrụ ihe onwunwe n’anya ma na-atụkwasị obi n’ike agha. Ọ̀ bụkwa na ha adịghị ewere ndị ụkọchukwu ha dị ka ndị ruru eru inweta nkwanye ùgwù dị ukwuu, na-enye ha utu aha na nsọpụrụ dị iche iche? A ghaghị ime ka mbuli elu nke Krisendọm na-ebuli onwe ya bụrụ ihe efu. Ma ọ̀ bụ olee mgbe?

“Ụbọchị Onyenwe Anyị” nke Dị Nso

10. Olee ‘ụbọchị Jehova’ nke ndị ozi bụ́ Pọl na Pita zoro aka na ya?

10 Akwụkwọ Nsọ na-ezo aka ‘n’ụbọchị Onyenwe anyị’ nke ga-akarị nnọọ ụbọchị mmezu ihe e kpere n’ikpe nke bịakwasịrị Jerusalem na Juda oge ochie. Pọl onyeozi, site n’ike mmụọ nsọ, jikọtara “ụbọchị Onyenwe anyị” ahụ na-abịanụ na ọnụnọ nke Eze Jisọs Kraịst ahụ e mere ka ọ nọkwasị n’ocheeze. (2 Ndị Tesalọnaịka 2:1, 2) Pita kwuru okwu banyere ụbọchị ahụ, na-ejikọta ya na nguzobe nke “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ nke ezi omume bi n’ime ha.” (2 Pita 3:10-13) Ọ bụ ụbọchị Jehova ga-emezu ihe o kpere n’ikpe n’ahụ ajọ usoro ihe a dum, gụnyere Krisendọm.

11. (a) Ònye ‘ga-anagide ụbọchị Jehova’ nke na-abịanụ? (b) Olee otú anyị pụrụ isi mee Jehova ebe mgbaba anyị?

11 “Ewo, ụbọchị ahụ!,” ka Joel onye amụma kwuru, “n’ihi na ụbọchị Jehova dị nso, dị ka mbibi nke sitere n’aka Onye pụrụ ime ihe nile ka ọ ga-abịa.” N’ihi ịdị nso nke “ụbọchị” ahụ, ọ̀ bụ na okwu banyere ịnọ ná nchebe n’oge ahụ na-atụ ụjọ ekwesịghị ịdị na-echegbu mmadụ nile? “Ònye kwa ga-anagide ya?” ka Joel jụrụ. Ọ na-aza, sị: “Jehova ga-abụrụ ndị Ya ebe mgbaba.” (Joel 1:15; 2:11; 3:16) Jehova Chineke ọ̀ ga-abụrụ ndị nwere mmụọ mpako na ndị na-atụkwasị obi n’akụ̀ na ụba, ike agha, na chi ndị ụmụ mmadụ mere ebe mgbaba? Ọ gaghị ekwe omume! Chineke hapụrụ ọbụna ndị ya ọ họpụtara mgbe ha mere otú a. Lee ka o si dị mkpa ka ndị ohu Chineke nile “[chọọ] ezi omume, [chọọ] umeala n’obi,” ma nyochaa n’ụzọ siri ike ọnọdụ ofufe Jehova nwere ná ndụ ha!—Zefanaịa 2:2, 3.

“Nye Anụ Mole na Ụsụ”

12, 13. N’ihi gịnị ka o ji kwesị ekwesị ka ndị ahụ na-ekpere arụsị tụbara “anụ mole na ụsụ” arụsị ha n’ụbọchị Jehova?

12 Olee otú ndị na-ekpere arụsị ga-esi lee arụsị ha anya n’oké ụbọchị Jehova? Aịsaịa na-aza, sị: “Mmadụ ga-abakwa n’ọ́gbà nile nke oké nkume nile, na n’olulu nile nke ájá, ịpụ n’ihu oké egwu Jehova, na ịpụ n’ịma mma nke mbili elu Ya, mgbe O biliri ime ka ụwa maa jijiji nke ukwuu. N’ụbọchị ahụ mmadụ ga-atụfu ihe efu ya nile nke ọlaọcha, na ihe efu ya nile nke ọlaedo . . . nye anụ mole na ụsụ; ka o wee baa n’oghere nile nke oké nkume nile, na n’ime mgbawa nile nke nkume nile dị elu, ịpụ n’ihu oké egwu Jehova, na ịpụ n’ịma mma nke mbili elu Ya, mgbe O biliri ime ka ụwa maa jijiji nke ukwuu. Hapụnụ mmadụ, onye otu nku ume dị n’imi ya: n’ihi na n’ime gịnị ka a ga na-agụ ya?”—Aịsaịa 2:19-22.

13 Anụ mole na-ebi n’ọnụ, ụsụ na-ebikwa n’ọ́gbà ndị gbara ọchịchịrị na ndị tọgbọ chakoo. Ọzọkwa, n’ebe ọnụ ọgụgụ buru ibu nke ụsụ bi n’otu ebe, a na-enwe ísì ọjọọ na ikpo nsị. Ịtụba arụsị n’ụdị ebe ndị ahụ kwesịrị nnọọ ekwesị. Ebe ọchịchịrị gbara na ebe na-adịghị ọcha agwụla ebe kwesịrị ha. Banyere ndị ahụ n’onwe ha, ha ga-achọ ebe mgbaba n’ọ́gbà na ná mgbawa nke oké nkume n’ụbọchị ikpe Jehova. Ya mere ihe mere arụsị ndị ahụ bụ ihe ga-eme ndị na-efe ha. Dị nnọọ ka amụma Aịsaịa si kwuo, arụsị ndị na-adịghị ndụ azọpụtalighị ma ndị na-efe ha ma Jerusalem n’aka Nebukadneza na 607 T.O.A.

14. N’ụbọchị ikpe Jehova ahụ ga-abịakwasị alaeze ụwa nke okpukpe ụgha, gịnị ka ndị mikpuru onwe ha ná nchụso nke ihe ụwa ga-eme?

14 N’ụbọchị mmezu ihe Jehova kpere n’ikpe nke na-abịanụ n’ahụ Krisendọm na akụkụ ndị ọzọ nke alaeze ụwa nke okpukpe ụgha, gịnị ka ndị mmadụ ga-eme? N’ịbụ ndị ọnọdụ na-akawanye njọ n’ụwa nile chere ihu, ma eleghị anya ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ga-aghọta na arụsị ha abaghị uru. N’ọnọdụ ihe ndị a, ha pụrụ nnọọ ịchọ ebe mgbaba na nchebe n’òtù dị iche iche nke ụwa, ndị na-abụghị nke ime mmụọ, ikekwe gụnyere Mba Ndị Dị n’Otu, bụ́ ‘anụ ọhịa ahụ na-acha uhie uhie’ nke Mkpughe isi nke 17. Ọ bụ “mpi iri ahụ” nke anụ ọhịa ihe atụ ahụ ga-ebibi Babilọn Ukwu ahụ, bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha, nke Krisendọm bụ akụkụ pụtara ìhè na ya.—Mkpughe 17:3, 8-12, 16, 17.

15. Olee otú Jehova, nanị ya, ga-esi “dị elu” n’ụbọchị ikpe ya?

15 Ọ bụ ezie na ibibi na ịgba Babilọn Ukwu ahụ ọkụ pụrụ ịbụ ọrụ aka nke mpi iri ihe atụ ahụ kpọmkwem, n’ezie ọ bụ mmezu nke ikpe Jehova. Banyere Babilọn Ukwu ahụ, Mkpughe 18:8 na-ekwu, sị: “N’ihi nke a ọ bụ n’otu ụbọchị ka ihe otiti ya nile ga-abịa, bụ ọnwụ, na iru újú, na ụnwụ; a ga-erechapụkwa ya n’ọkụ; n’ihi na Ọ dị ike, bụ Onyenwe anyị Chineke, Onye kpere ya ikpe.” Ya mere, otuto ga-agara Jehova Chineke, bụ́ Onye Pụrụ Ime Ihe Nile, maka ịtọhapụ ihe a kpọrọ mmadụ ná nchịkwa nke okpukpe ụgha. Dị ka Aịsaịa kwuru, “a ghaghịkwa ime ka Jehova, nanị Ya, dị elu n’ụbọchị ahụ. N’ihi na Jehova nke usuu nile nke ndị agha nwere otu ụbọchị.”—Aịsaịa 2:11b, 12a.

‘Ndị Ndú Na-eme Gị Ka Ị Wagharịa’

16. (a) Gịnị bụ “ihe ndabere na mkpanaka” nke ọha mmadụ? (b) Olee otú ndị obodo Aịsaịa ga-esi taa ahụhụ n’ihi mwepụ e wepụrụ “ihe ndabere na mkpanaka” nke ọha mmadụ ha?

16 Ka ọha mmadụ wee kwụsie ike, ọ ghaghị inwe “ihe ndabere na mkpanaka”—ihe ndị dị mkpa dị ka ihe oriri na mmiri na, nke ka mkpa, ndị ndú a pụrụ ịtụkwasị obi bụ́ ndị nwere ike iduzi ndị ahụ ma mee ka ihe nọgide na-aga n’usoro n’ọha mmadụ. Otú ọ dị, banyere Israel oge ochie, Aịsaịa buru amụma, sị: “Lee, Onyenwe anyị, bụ́ Jehova nke usuu nile nke ndị agha, na-esi na Jerusalem, sikwa na Juda, wezụga ihe ndabere na mkpanaka, ihe ndabere nile, bụ́ nri, na ihe ndabere nile, bụ́ mmiri; dike, na onye agha; na onyeikpe, na onye amụma, na onye na-ajụ ase, na okenye; onyeisi nke [iri ndị agha ise], na onye a na-ahụ ihu ọma, na onye ndụmọdụ, na onye maara ihe n’etiti ndị ọkà, na onye nghọta n’ịra ụrà.” (Aịsaịa 3:1-3) Ụmụ okoro ga-aghọ ndị isi ma chịa otú o si masị ha. Ọ bụghị nanị na ndị ọchịchị ahụ ga-emegbu ndị ahụ kama “ndị ahụ ga-achịrịta onwe ha n’ihe ike . . . ha ga-ebulite onwe ha, nwa okoro megide okenye, na onye a na-elelị megide onye a na-asọpụrụ.” (Aịsaịa 3:4, 5) Ụmụaka “ga-ebulite onwe ha” megide ndị tọrọ ha, n’akwanyereghị ha ùgwù. Ọnọdụ ibi ndụ ga-adị nnọọ njọ nke na otu onye ga-asị onye ọzọ na-erughị eru ịchị achị: “I nwere uwe mgbokwasị, onyeikpe ka ị ga-abụrụ anyị, ka ihe ịsụ ngọngọ a dịkwa n’okpuru aka gị.” (Aịsaịa 3:6) Ma ndị e si otú a kpọọ ga-ajụ, na-ekwusi ike na ha apụghị ịgwọta ala ahụ e mekpaworo ahụ ma ọ bụkwanụ nwee akụ̀ na ụba iji rụọ ọrụ ahụ. Ha ga-asị: “M gaghị abụ onye nkechi; n’ihi na ọ dịghị nri dị n’ụlọ m, ọ dịghịkwa uwe mgbokwasị: unu agaghị edo m onyeikpe ndị anyị.”—Aịsaịa 3:7.

17. (a) N’echiche dị aṅaa ka mmehie nke Jerusalem na Juda “dị ka nke Sọdọm”? (b) Ònye ka Aịsaịa na-ata ụta maka ọnọdụ nke ndị obodo ya?

17 Aịsaịa gara n’ihu: “Jerusalem asụwo ngọngọ, Juda adawokwa: n’ihi na ire ha na omume ha nile na-emegide Jehova, inupụ isi n’okpuru anya abụọ nke ebube Ya. Mmata ha na-amata ihu mmadụ n’ikpe azawo megide ha; mmehie ha ka ha gosiwokwara dị ka Sọdọm, ha ezobeghị ya. Ahụhụ ga-adịrị mkpụrụ obi ha! n’ihi na ha emesowo onwe ha ihe ọjọọ.” (Aịsaịa 3:8, 9) Ndị Chineke enupụworo ezi Chineke ahụ isi n’okwu na n’omume. Ọbụna enweghị ihere na enweghị nchegharị nke dị ha n’ihu na-ekpughe mmehie ha, bụ́ ndị na-asọ oyi dị ka nke Sọdọm. Ha na Jehova Chineke nọ n’ọgbụgba ndụ, ma ọ gaghị agbanwe ụkpụrụ ya maka ha. ‘Onye ezi omume, ọ ga-adịrị ya mma: n’ihi na mkpụrụ omume ha nile ka ha ga-eri. Ahụhụ ga-adịrị onye na-emebi iwu! ọ ga-adịrị ya njọ: n’ihi na mmeso aka ya abụọ mesoro mmadụ ka a ga-eme ya. Ndị m, ndị na-achị ha n’ihe ike bụ nwatakịrị, ndị inyom achịwokwa ha. Gị ndị m, ndị nduzi gị na-eme ka ị wagharịa, ha elodawokwa ụzọ nke okporo ụzọ gị nile.’—Aịsaịa 3:10-12.

18. (a) Olee amamikpe Jehova kwupụtara megide ndị okenye na ndị isi nke oge Aịsaịa? (b) Gịnị ka anyị na-amụta site n’ikpe Jehova mara ndị okenye na ndị isi ahụ?

18 Jehova ‘na-ekpe’ ma ‘soro ndị okenye na ndị isi’ nọ na Juda “baa n’ikpe,” sị: “Unu onwe unu, unu eripịawo ubi vine; ihe unu napụworo onye e wedara n’ala n’ike dị n’ụlọ unu nile: gịnị mere unu ji azọpịa ndị m, gwepịakwa ihu onye e wedara n’ala?” (Aịsaịa 3:13-15) Kama ịrụ ọrụ maka ọdịmma nke ndị ahụ, ndị ndú na-eme omume akwụwaghị aka ọtọ. Ha na-eji ike ha eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi site n’ime onwe ha ọgaranya na ịnapụ ndị ogbenye na ndị nọ ná mkpa ihe. Ma ndị ndú a aghaghị ịza Jehova nke usuu nile nke ndị agha ajụjụ maka mmegbu ha na-emegbu ndị e wedara n’ala. Lee ịdọ aka ná ntị nke a bụụrụ ndị nọ n’ọnọdụ ibu ọrụ taa! Ka ha kpachara anya mgbe nile ịghara iji ike ha eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi.

19. Ikpe mmegbu na mkpagbu dị aṅaa maworo Krisendọm?

19 Krisendọm—karịsịa ndị ụkọchukwu na ndị isi ya—ejiriwo ụzọ wayo kwakọba ihe dị ukwuu nke kwesịrị ịbụ nke ndị nkịtị, bụ́ ndị o megbuworo ma ka nọgide na-emegbu. O tiwo ndị Chineke ihe, kpagbuo, ma mesoo ha mmeso ọjọọ, o wetawokwara aha Jehova nkọcha dị ukwuu. Mgbe oge ya ruru, n’ezie Jehova ga-ekpe ya ikpe.

“Egbugbu Ọkụ Ga-adị n’Ọnọdụ Ịma Mma”

20. N’ihi gịnị ka Jehova ji katọọ “ụmụ ndị inyom Zaịọn”?

20 Mgbe ọ katọsịrị omume ọjọọ nke ndị ndú ahụ, Jehova chigharịkwuuru ụmụ ndị inyom Zaịọn, ma ọ bụ Jerusalem. O doro anya na n’aha iji ejiji, “ụmụ ndị inyom Zaịọn” na-eyi “ịyagba ụkwụ”—ịyagba ndị ha na-eyinye na nkwonkwo ụkwụ ha—ndị na-ada ụda dị mma. Ndị inyom ahụ adịghị agasi ike ma “na-arọ mma mgbe ha na-ejegharị,” na-eje ije a pụrụ iwere dị ka ije ngala ndị inyom. Gịnị dị njọ na nke a, ma ọ bụrụ na ọ dị? Ọ bụ omume ndị inyom a. Jehova na-ekwu, sị: “Ụmụ ndị inyom Zaịọn dị mpako, na-ewerekwa olu setịrị esetị na anya na-arara ndị ikom ejegharị.” (Aịsaịa 3:16) Ụdị mpako ahụ ga-enwetarịrị ụgwọ ọrụ.

21. Olee otú ikpe Jehova mara Jerusalem si metụta ndị inyom ndị Juu?

21 N’ihi ya, mgbe ikpe Jehova ga-abịakwasị ala ahụ, ihe nile “ụmụ ndị inyom Zaịọn” a dị mpako nwere ga-efunahụ ha—ọbụna ịma mma ahụ ha ji eme nganga. Jehova na-ebu amụma, sị: “Onyenwe anyị ga-emekwa ka ọnyá dị n’opu n’isi ụmụ ndị inyom Zaịọn, Jehova ga-agbawakwa ha ọtọ. N’ụbọchị ahụ Onyenwe anyị ga-ewezụga ịma mma nke ọla ụkwụ ha nile, na ihe ịchọ mma nile ha na-eyi n’egedege ihu, na ihe ịchọ mma nile nke yiri ọnwa ọhụrụ; na ihe nile a na-akwụba ná ntị, na ọla aka nile, na ákwà mgbochi ihu nile; na ihe ọma nile ike n’isi, na ịyagba ụkwụ nile, na ihe nile ike n’úkwù, na karama ihe ísì ọma nile, na ọgwụ dị iche iche iyi n’ahụ; na mgbaaka akara nile, na mgbaaka imi nile; na uwe ememe nile, na uwe mwụda nile, na ákwà mgbokwasị nile, na akpa nile; na enyo aka nile, na ezi ákwà ọcha nile, na ákwà ọma nile ịkụkụ n’isi, na ákwà mgbochi nile.” (Aịsaịa 3:17-23) Lee ajọ mgbanwe ọ bụ!

22. E wezụga ihe ịchọ mma ha, gịnị ọzọ ga-efunahụ ndị inyom Jerusalem?

22 Ozi ahụ e buru n’amụma gara n’ihu ikwu, sị: “N’ọnọdụ ụdà ọma ire ure ga-adị; n’ọnọdụ ihe ike n’úkwù ụdọ ga-adị; n’ọnọdụ agịrị isi a kpara nke ọma nkwọcha isi ga-adị; n’ọnọdụ ákwà ọma ihe okike nke ákwà mkpe ga-adị: egbugbu ọkụ ga-adị n’ọnọdụ ịma mma.” (Aịsaịa 3:24) Na 607 T.O.A., ndị inyom ahụ dị mpako nke Jerusalem si n’ịba ọgaranya daa ghọọ ogbenye. Ha enwerekwaghị onwe ha, e gbukwara ha “egbugbu ọkụ” nke ịbụ ndị ohu.

“A Ga-emekwa Ka Ọ Tọgbọrọ n’Efu”

23. Gịnị ka Jehova kwupụtara banyere Jerusalem?

23 Ka ọ na-agwa obodo Jerusalem okwu ugbu a, Jehova kwupụtara, sị: “Ndị ikom gị ga-ada site ná mma agha, ịdị ike gị nile ga-adakwa n’agha. Ọnụ ụzọ ya nile ga-eze ume, ruokwa újú; a ga-emekwa ka ọ tọgbọrọ n’efu, ọ ga-anọdụ n’ala.” (Aịsaịa 3:25, 26) A ga-egbu ndị ikom Jerusalem, ọbụna ndị dike ya, n’agha. A ga-etikpọ obodo ahụ kpam kpam. Banyere “ọnụ ụzọ ya nile,” ọ ga-abụ oge ‘ize ume na iru újú.’ A ga-eme ka Jerusalem “tọgbọrọ n’efu” ma bụrụ nke e bibiri kpam kpam.

24. Ogbugbu e ji mma agha gbuo ndị ikom rụpụtaara ụmụ nwanyị Jerusalem ihe ọjọọ dị aṅaa?

24 Ogbugbu a ga-eji mma agha gbuo ndị ikom ga-enwe ihe ọjọọ ọ ga-arụpụtara ndị inyom Jerusalem. N’imechi akụkụ a nke akwụkwọ amụma ya, Aịsaịa na-ebu amụma, sị: “Ndị inyom asaa ga-ejide otu nwoke n’ụbọchị ahụ, sị, Nri nke aka anyị ka anyị ga-eri, uwe nke aka anyị ka anyị ga-eyikwa: ọ bụ nanị na a ga-akpọkwasị anyị aha gị; gị wepụ ịta ụta anyị.” (Aịsaịa 4:1) A ga-enwe oké ụkọ ndị ikom ruru eru ịlụ nwanyị nke na ọtụtụ ndị inyom ga-arapara n’ahụ otu nwoke iji zara aha ya—ya bụ, ka a mara ha n’ihu ọha dị ka ndị nwunye ya—wee si otú a gbanahụ ihe nkọcha nke enweghị di. Iwu Mosis kwuru na di ga na-enye nwunye ya ihe oriri na uwe. (Ọpụpụ 21:10) Otú ọ dị, n’ikweta ‘iri nri nke aka ha na iyi uwe nke aka ha,’ ndị inyom a dị njikere ịtọhapụ nwoke ahụ n’ọrụ iwu kwuru dịịrị ya. Lee ọnọdụ enweghị olileanya ọ bụụrụ “ụmụ ndị inyom Zaịọn” dịbu mpako!

25. Gịnị ga-abịakwasị ndị na-ebuli onwe ha elu?

25 Jehova na-eweda ndị na-ebuli onwe ha elu ala. Na 607 T.O.A., o mere n’ezie ka ịdị mpako nke ndị ya ọ họpụtara ‘hudaa’ ala ma mee ka “ịdị elu” ha “dị ala.” Ka ezi ndị Kraịst ghara ichefu mgbe ọ bụla na “Chineke na-edo Onwe ya imegide ndị mpako, ma Ọ na-enye ndị dị umeala n’obi amara.”—Jemes 4:6.

[Foto dị na peeji nke 50]

Arụsị, akụ̀ na ụba, na ike agha azọpụtaghị Jerusalem n’ụbọchị ikpe Jehova

[Foto dị na peeji nke 55]

‘N’ụbọchị Jehova,’ a ga-ebibi alaeze ụwa nke okpukpe ụgha

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya