Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 3/1 p. 13-18
  • “Ụlọukwu” ahụ na “Onyeisi” ahụ Taa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Ụlọukwu” ahụ na “Onyeisi” ahụ Taa
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ụlọukwu ahụ na Gị
  • Òtù Ndị Nchụàjà Kwesịrị Ntụkwasị Obi
  • Onyeisi ahụ—Ònye Ka Ọ Bụ?
  • Ala nke Ndị Chineke Taa
  • ‘Tụkwasị Obi Gị’ N’ụlọukwu Chineke!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • “Iwu Gbasara Ụlọ Nsọ A”
    A Maliteghachila Ife Jehova Ezigbo Ofufe
  • ‘Kọọ Otú Ụlọ Nsọ A Dị’
    A Maliteghachila Ife Jehova Ezigbo Ofufe
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ezikiel—Akụkụ nke Abụọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 3/1 p. 13-18

“Ụlọukwu” ahụ na “Onyeisi” ahụ Taa

“Ma onyeisi, ọ bụ n’etiti ha, mgbe ha na-abata, ka ọ ga-eso bata; ọzọ, mgbe ha na-apụ, ha ga-apụ n’otu.”—EZIKIEL 46:10.

1, 2. Eziokwu dị aṅaa gbara ọkpụrụkpụ na-enyere anyị aka ịghọta ihe ihe dị ukwuu n’ọhụụ Ezikiel banyere ụlọukwu pụtara?

ỤFỌDỤ ndị rabaị oge ochie enwechaghị afọ ojuju banyere akwụkwọ Ezikiel. Dị ka Talmud si kwuo, ụfọdụ n’ime ha ọbụna chere echiche ịgụpụ akwụkwọ ahụ n’Akwụkwọ Nsọ. O siiri ha ike nke ukwuu ịkọwa ọhụụ nke ụlọukwu ahụ, ha kwuokwa na ọ karịrị nghọta mmadụ. Ọhụụ Ezikiel banyere ụlọukwu Jehova agbagwojuwo ndị ọkà mmụta Bible ndị ọzọ anya. Olee banyere anyị?

2 Kemgbe e weghachiri ofufe dị ọcha, Jehova ejiriwo ọtụtụ nghọta ime mmụọ gọzie ndị ya, gụnyere nghọta nke ihe ụlọukwu ime mmụọ nke Chineke bụ—ndokwa Jehova maka ofufe dị ọcha bụ́ nke yiri ụlọukwu.a Eziokwu a gbara ọkpụrụkpụ na-enyere anyị aka ịghọta ihe dị ukwuu n’ihe ọhụụ Ezikiel banyere ụlọukwu pụtara. Ka anyị tụlee nke ọma karị akụkụ anọ ahụ mejupụtara ọhụụ a—ụlọukwu, òtù ndị nchụàjà, onyeisi, na ala ahụ. Gịnị ka ihe ndị a pụtara taa?

Ụlọukwu ahụ na Gị

3. Gịnị ka anyị na-amụta site n’uko dị elu na ihe ndị a tụrụ atụ n’ahụ ájá ndị dị n’ụzọ ndị e si abata n’ụlọukwu ahụ?

3 Were ya na anyị na-eme njem nleta n’ụlọukwu a a hụrụ n’ọhụụ. Anyị erute ma rịa ihe nrịgo asaa ruo n’otu n’ime nnukwute ọnụ ụzọ ámá ahụ. N’ime ụzọ mbata a, anyị ji ụjọ lelie anya elu. Uko ya dị ihe karịrị mita 30 n’ịdị elu! E si otú a na-echetara anyị na ụkpụrụ a chọrọ iji banye ná ndokwa Jehova maka ife ofufe dị elu. Ụzarị ìhè ndị si na windo abata na-achakwasị osisi nkwụ ndị a tụrụ atụ n’ahụ ájá ya, bụ́ ndị a na-eji eme ihe n’Akwụkwọ Nsọ iji see onyinyo izi ezi. (Abụ Ọma 92:12; Ezikiel 40:14, 16, 22) Ebe a dị nsọ bụ maka ndị ziri ezi n’omume na n’ime mmụọ. N’ikwekọ na nke ahụ, anyị kwesịrị ịnọgide bụrụ ndị ziri ezi ka ofufe anyị wee bụrụ nke Jehova na-anakwere.—Abụ Ọma 11:7.

4. Ole ndị ka a na-ekweghị ka ha banye n’ụlọukwu ahụ, gịnịkwa ka nke a na-akụziri anyị?

4 N’akụkụ nke ọ bụla nke paseeji ya, e nwere ime ụlọ atọ. Ndị nche hà ga-ekwe ka anyị baa n’ime ụlọukwu ahụ? Jehova na-agwa Ezikiel na ọ dịghị onye ala ọzọ nke “a na-ebighị úgwù n’obi” nke pụrụ ịbanye. (Ezikiel 40:10; 44:9) Gịnị ka nke ahụ pụtara? Chineke na-anakwere nanị ndị hụrụ iwu ya n’anya, ndị na-ebikwa ndụ kwekọrọ na ha, ịbụ ndị na-efe ya ofufe. (Jeremaịa 4:4; Ndị Rom 2:29) Ọ na-anabata ndị dị otú ahụ n’ụlọikwuu ime mmụọ ya, ụlọ ofufe ya. (Abụ Ọma 15:1-5) Kemgbe e weghachiri ofufe dị ọcha na 1919, nzukọ elu ala nke Jehova ejigidesiwo iwu ya nile metụtara omume ike ma mee ka ha doo anya n’ụzọ na-aga n’ihu n’ihu. A dịkwaghị anabata ndị ma ụma jụ irube isi iso ndị ya na-akpakọrịta. Taa, omume ahụ dabeere na Bible bụ́ ịchụpụ ndị mmehie na-enweghị nchegharị emewo ka ofufe anyị dị ọcha.—1 Ndị Kọrint 5:13.

5. (a) Myirịta dị aṅaa dị n’etiti ọhụụ Ezikiel na ọhụụ Jọn nke e dekọrọ ná Mkpughe 7:9-15? (b) N’ọhụụ Ezikiel, ole ndị ka ebo 12 ahụ na-efe ofufe n’ogige dị n’èzí na-ese onyinyo ha?

5 Ụzọ paseeji dịịrị banye n’ogige dị n’èzí, bụ́ ebe ndị mmadụ na-efe ma na-eto Jehova. Nke a na-echetara anyị ọhụụ Jọn onyeozi banyere “oké ìgwè mmadụ” ahụ, bụ́ ndị na-efe Jehova ofufe “ehihie na abalị n’ụlọ nsọ Ya.” Osisi nkwụ pụtara n’ọhụụ abụọ ahụ. N’ọhụụ Ezikiel, e ji ha chọọ mgbidi ụzọ mbata mma. N’ọhụụ Jọn, ndị ahụ na-efe ofufe ji igu nkwụ n’aka ha, na-egosi ọṅụ ha n’ito Jehova na n’ịnabata Jisọs dị ka Eze ha. (Mkpughe 7:9-15) Dabere n’ihe a na-ekwu maka ya n’ọhụụ Ezikiel, ebo 12 nke Israel na-ese onyinyo “atụrụ ọzọ.” (Jọn 10:16; tụlee Luk 22:28-30.) Gị onwe gị kwa ị̀ bụ otu n’ime ndị na-enweta ọṅụ n’ito Jehova site n’ịkpọsa Alaeze ya?

6. Gịnị ka e ji ime ụlọ ndị dị n’ime ogige ahụ dị n’èzí eme, ihe ùgwù dị aṅaa ka nke a pụrụ ichetara ndị so n’atụrụ ọzọ ahụ?

6 Ka anyị na-ejegharị n’ogige dị n’èzí, anyị hụrụ ime ụlọ 30 bụ́ ebe ndị ahụ na-ekere òkè n’onyinye afọ ofufo ha. (Ezikiel 40:17) Taa, ndị so n’atụrụ ọzọ ahụ adịghị achụ àjà ụmụ anụmanụ, ma ha adịghị agba aka abịa n’ụlọukwu ime mmụọ ahụ. (Tụlee Ọpụpụ 23:15.) Pọl onyeozi dere, sị: “Ka anyị site n’aka [Jisọs] na-achụ àjà, bụ́ otuto, nye Chineke mgbe nile, nke ahụ bụ, mkpụrụ egbugbere ọnụ nke na-ekwupụta nye aha Ya. Ma unu echezọla ime ihe dị mma na ime ka unu na ndị ọzọ nwekọọ ihe unu: n’ihi na àjà dị otú a na-atọ Chineke ezi ụtọ.” (Ndị Hibru 13:15, 16; Hosea 14:2) Ọ bụ oké ihe ùgwù ịchụrụ Jehova àjà ndị dị otú ahụ.—Ilu 3:9, 27.

7. Gịnị ka ịtụ ụlọukwu ahụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ na-emesi anyị obi ike banyere ya?

7 Ezikiel nọ na-ele anya ka otu mmụọ ozi na-atụ ụlọukwu a a hụrụ n’ọhụụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀. (Ezikiel 40:3) N’otu aka ahụ, a gwara Jọn onyeozi, sị: “Bilie, tụọkwa ụlọ nsọ nke Chineke, na ebe ịchụàjà ya, na ndị na-akpọ isi ala n’ime ya [n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀].” (Mkpughe 11:1) Gịnị ka ịtụ ihe n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ a pụtara? N’ọnọdụ abụọ ahụ, dị ka ihe àmà gosiri, nke a bụ mmesi obi ike, ihe àmà iji gosi na ọ dịghị ihe pụrụ igbochi Jehova imezu nzube ya banyere ofufe dị ọcha. N’otu aka ahụ taa, a pụrụ imesi anyị obi ike na ọ dịghị ihe ọ bụla—ọbụna mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ site n’aka gọọmenti ndị dị ike—pụrụ ịkwụsị mweghachi nke ofufe dị ọcha.

8. Olee ndị na-abanye ọnụ ụzọ ámá ndị na-eduga n’ogige dị n’ime, gịnịkwa ka ọnụ ụzọ ámá ndị a na-echetara anyị?

8 Ka anyị na-agafe ogige ahụ dị n’èzí, anyị hụrụ na e nwere ọnụ ụzọ ámá atọ na-eduga n’ogige dị n’ime; ọnụ ụzọ ámá ndị ahụ dị n’ime kwụ n’otu ahịrị ahụ ma harakwa ka ọnụ ụzọ ámá ndị dị ná mpụta. (Ezikiel 40:6, 20, 23, 24, 27) Nanị ndị nchụàjà pụrụ ịbanye n’ogige ahụ dị n’ime. Ọnụ ụzọ ámá ndị ahụ dị n’ime na-echetara anyị na ndị ahụ e tere mmanụ aghaghị iru ihe ọ̀tụ̀tụ̀ nke ụkpụrụ na iwu Chineke, ma otu ụkpụrụ na iwu na-eduzi ezi ndị Kraịst nile. Ma gịnị bụ ọrụ ndị nchụàjà ahụ, gịnị ka ha pụtara taa?

Òtù Ndị Nchụàjà Kwesịrị Ntụkwasị Obi

9, 10. Olee otú “òtù ndị nchụàjà ndị bụkwa eze,” dị ka òtù ndị nchụàjà ahụ a hụrụ n’ọhụụ Ezikiel sere onyinyo ya, siworo nye ntụziaka ime mmụọ?

9 Tupu oge ndị Kraịst, ndị nchụàjà rụrụ ọrụ siri ike n’ụlọukwu ahụ. Igbu anụmanụ ndị e ji achụ àjà, ịchụ ha n’àjà n’elu ebe ịchụàjà, na ijere ndị nchụàjà ibe ha na ndị ahụ ozi bụ ọrụ chọrọ ike ọkpụkpụ aka. Ma ha nwere ọrụ ọzọ dị mkpa. Jehova nyere iwu banyere ndị nchụàjà ahụ, sị: “Ndị m ka ha ga-ezi ihe dị iche n’etiti ihe nsọ na ihe na-adịghị nsọ, ọ bụkwa ihe dị iche n’etiti ihe dị ọcha na ihe rụrụ arụ ka ha ga-eme ka ha mara.”—Ezikiel 44:23; Malakaị 2:7.

10 Ì nwere ekele maka ọrụ siri ike na ozi obi umeala nke ndị ahụ e tere mmanụ dị ka otu ìgwè, “òtù ndị nchụàjà ndị bụkwa eze,” jeworo maka ofufe dị ọcha? (1 Pita 2:9) Dị ka usoro ndị nchụàjà si n’ebo Livaị oge ochie ahụ, ha ebutewo ụzọ n’inye ntụziaka ime mmụọ, na-enyere ndị mmadụ aka ịghọta ihe dị ọcha na ihe dị mma n’anya Chineke na ihe na-adịghị. (Matiu 24:45) Ntụziaka dị otú ahụ, nke na-abịa site ná mbipụta ndị dabeere na Bible na site ná nzukọ na mgbakọ ndị Kraịst, enyeworo ọtụtụ nde aka ịbụ ndị ha na Chineke dịghachiri ná mma.—2 Ndị Kọrint 5:20.

11. (a) Olee otú ọhụụ Ezikiel si mesie ike mkpa ọ dị ndị nchụàjà ịdị ọcha? (b) Na mgbe ikpeazụ, olee otú e siworo sachaa ndị e tere mmanụ n’ụzọ ime mmụọ?

11 Otú ọ dị, ndị nchụàjà ahụ aghaghị ime ihe karịrị ịkụziri ndị ọzọ ka ha dị ọcha; ha aghaghị ịdị ọcha n’onwe ha. N’ihi ya, Ezikiel hụrụ usoro nnụcha maka òtù ndị nchụàjà nke Israel tupu o mee. (Ezikiel 44:10-16) N’otu aka ahụ, akụkọ ihe mere eme na-egosi na na 1918, Jehova nọdụrụ ala dị ka “onye nnụcha” n’ụlọukwu ime mmụọ ya, na-enyocha òtù ndị nchụàjà ahụ e tere mmanụ. (Malakaị 3:1-5) A hapụrụ ndị e weere na ha dị ọcha n’ụzọ ime mmụọ ma ọ bụ ndị chegharịworo n’omume ha mbụ nke ikpere arụsị ka ha nọgide n’ihe ùgwù ha nke ije ozi n’ụlọukwu ime mmụọ ya. Ma, dị ka onye ọ bụla ọzọ, onye e tere mmanụ pụrụ ịghọ onye na-adịghị ọcha—n’ụzọ ime mmụọ na n’omume. (Ezikiel 44:22, 25-27) Ha arụsiwo ọrụ ike iji nọgide “n’enweghị ntụpọ site n’ụwa.”—Jemes 1:27; tụlee Mak 7:20-23.

12. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji nwee ekele maka ọrụ nke ndị ahụ e tere mmanụ?

12 Onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ ịjụ, sị, ‘Ènwere m ekele maka ihe nlereanya nke ndị ahụ e tere mmanụ setịpụworo n’ọtụtụ afọ ha nke ije ozi n’ikwesị ntụkwasị obi? M̀ na-eṅomi okwukwe ha?’ Ọ dị mma ka ndị so n’oké ìgwè mmadụ ahụ cheta na ndị ahụ e tere mmanụ agaghị eso ha nọrọ n’elu ala ebe a mgbe nile. Banyere ndị nchụàjà a hụrụ n’ọhụụ Ezikiel, Jehova kwuru, sị: “Ọ dịghịkwa ihe onwunwe [ala] unu ga-enye ha n’Israel; Mụ onwe m bụ ihe onwunwe ha.” (Ezikiel 44:28) N’otu aka ahụ, ndị ahụ e tere mmanụ agaghị anọru ebighị ebi n’elu ala. Ha nwere ihe nketa n’eluigwe, ndị sokwa n’oké ìgwè mmadụ ahụ na-ewere ya dị ka ihe ùgwù ịkwado na ịgba ha ume mgbe ha ka nọ n’elu ala ebe a.—Matiu 25:34-40; 1 Pita 1:3, 4.

Onyeisi ahụ—Ònye Ka Ọ Bụ?

13, 14. (a) Gịnị mere onyeisi ahụ na-aghaghị iji soro n’atụrụ ọzọ ahụ? (b) Olee ndị onyeisi ahụ na-ese onyinyo ha?

13 Ugbu a ajụjụ na-akpali mmasị na-ebilite. Ònyezi ka onyeisi ahụ na-anọchite anya ya? Ebe e kwuru banyere ya dị ka ma otu onye ma ìgwè, anyị pụrụ iwere ya na ọ na-anọchite anya otu òtù ndị mmadụ. (Ezikiel 44:3; 45:8, 9) Ole ndị kwanụ? N’ezie ọ bụghị ndị e tere mmanụ. N’ọhụụ ahụ, o so òtù ndị nchụàjà na-arụ ọrụ n’ụzọ chiri anya, ma ọ bụghị otu n’ime ha. N’adịghị ka òtù ndị nchụàjà, e nyere ya ihe nketa n’ala ahụ, o sikwa otú a nwee olileanya ịnọgide n’elu ala ebe a, ọ bụghị n’eluigwe. (Ezikiel 48:21) Ọzọkwa, Ezikiel 46:10 na-ekwu, sị: “Ma onyeisi, ọ bụ n’etiti ha, mgbe ha [ebo ndị na-abụghị ndị nchụàjà] na-abata [n’ogige dị n’èzí ụlọukwu ahụ], ka ọ ga-eso bata; ọzọ, mgbe ha na-apụ, ha ga-apụ n’otu.” Ọ dịghị abanye n’ogige dị n’ime kama ọ na-efe ofufe n’ogige dị n’èzí, na-eso ndị ahụ abata ma na-apụ n’ụlọukwu ahụ. Ihe ndị a na-egosi na onyeisi ahụ so kpọmkwem n’oké ìgwè mmadụ nke atụrụ ọzọ ahụ.

14 N’ụzọ doro anya, onyeisi ahụ nwere ibu ọrụ ụfọdụ n’etiti ndị Chineke. N’ogige dị n’èzí, ọ na-anọdụ ala n’ụzọ mbata nke Ọnụ Ụzọ Ámá Ọwụwa Anyanwụ. (Ezikiel 44:2, 3) Nke a ga-egosi ọnọdụ nlekọta, nke yiri nke ndị okenye n’Israel bụ́ ndị na-anọdụ ala n’ọnụ ụzọ ámá obodo ma na-ekpe ikpe. (Rut 4:1-12; Ilu 22:22) Olee ndị n’etiti atụrụ ọzọ ahụ nwere ọrụ nlekọta taa? Ndị okenye nwere olileanya elu ala bụ́ ndị e jiworo mmụọ nsọ họpụta. (Ọrụ 20:28) Ya mere a na-ejikere òtù onyeisi ahụ ugbu a n’olileanya nke imesịa jee ozi n’ọnọdụ nlekọta n’ime ụwa ọhụrụ ahụ.

15. (a) Olee otú ọhụụ Ezikiel si amụkwasị ìhè ná njikọ dị n’etiti ndị okenye bụ́ ndị so n’oké ìgwè mmadụ ahụ na òtù ndị nchụàjà ahụ e tere mmanụ? (b) Idu ndú dị aṅaa ka ndị okenye e tere mmanụ duworo ná nzukọ elu ala nke Chineke?

15 Otú ọ dị, gịnị bụ njikọ dị taa n’etiti òtù ndị nchụàjà ahụ e tere mmanụ na ndị okenye dị otú ahụ bụ́ ndị, dị ka akụkụ nke oké ìgwè mmadụ ahụ, na-eje ozi n’ọnọdụ nlekọta dị iche iche? Ọhụụ Ezikiel na-enye echiche bụ́ na ndị okenye ahụ so n’oké ìgwè mmadụ ahụ nwere ọrụ inye nkwado na nke ịnọ n’okpuru, ebe ndị e tere mmanụ na-ebute ụzọ n’ihe ime mmụọ. N’ụzọ dị aṅaa? Cheta na e nyere ndị nchụàjà ahụ a hụrụ n’ọhụụ ibu ọrụ nke inye ndị ahụ ntụziaka n’ihe ime mmụọ. A gwakwara ha ka ha jee ozi dị ka ndị ikpe n’okwu ikpe dị iche iche. Ọzọkwa, e kenyere ndị Livaị ọrụ “ndị nlekọta” n’ọnụ ụzọ ámá nke ụlọukwu ahụ. (Ezikiel 44:11, 23, 24) N’ụzọ doro anya, onyeisi ahụ gaje ido onwe ya n’okpuru ije ozi ime mmụọ na idu ndú nke ndị nchụàjà ahụ. Ya bụrụ otú ahụ, o kwesịrị ekwesị na ndị e tere mmanụ ebutewo ụzọ n’ofufe dị ọcha n’oge a. Dị ka ihe atụ, e siwo n’etiti ha họrọ ndị so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova. Ndị okenye dị otú ahụ kwesịrị ntụkwasị obi e tere mmanụ anọwo na-azụ òtù onyeisi ahụ na-apụtanụ kemgbe ọtụtụ iri afọ, na-akwadebe ndị ga-eso n’òtù a maka mgbe a ga-enyecha ha ikike ha n’ime ụwa ọhụrụ Chineke na-abịanụ.

16. Dị ka Aịsaịa 32:1, 2 si kwuo, olee otú ndị okenye nile na-aghaghị isi na-eme omume?

16 Ụdị ndị nlekọta dị aṅaa ka ndị a ga-eso na ya ga-abụ, bụ́ ndị ga-enweta ibu ọrụ buru ibu karị dị ka òtù onyeisi? Amụma ahụ dị n’Aịsaịa 32:1, 2 na-asị: “Lee, n’ezi omume ka otu eze ga-abụ eze, ndị isi kwa, n’ikpe ziri ezi ka ha ga-abụ ndị isi. Otu onye ga-adịkwa ka ebe izonarị ifufe, na ebe nzuzo ịpụ n’oké mmiri ozuzo; dị ka ọtụtụ iyi jupụtara na mmiri n’ebe kpọrọ nkụ, dị ka ndo nke oké nkume dị elu n’ala nke kpatara ike ọgwụgwụ.” A na-emezu amụma a taa ka ndị okenye bụ́ ndị Kraịst—ndị e tere mmanụ na atụrụ ọzọ—na-arụ ọrụ iji chebe ìgwè atụrụ ahụ pụọ “n’oké mmiri ozuzo” ndị dị ka mkpagbu na nkụda aka.

17. Olee otú ndị Kraịst bụ́ ndị ọzụzụ atụrụ kwesịrị isi na-ele onwe ha anya, oleekwa otú ìgwè atụrụ ahụ kwesịrị isi na-ele ha anya?

17 A naghị eji okwu bụ́ “onyeisi” eme ihe dị ka utu aha e ji eto ndị mmadụ. Kama nke ahụ, ha na-akọwa ọrụ ndị ikom a na-arụ n’ilekọta atụrụ Chineke. Jehova na-adọsi aka ná ntị ike, sị: “O [zuworo] unu, unu ndị isi Israel: wezụganụ ime ihe ike na ịpụnara mmadụ ihe, meenụ ihe e kpere n’ikpe na ezi omume.” (Ezikiel 45:9) Ọ dị mma ka ndị okenye nile taa jiri ndụmọdụ ahụ kpọrọ ihe. (1 Pita 5:2, 3) N’aka nke ha, ìgwè atụrụ ahụ na-amata na Jisọs enyewo ndị ọzụzụ atụrụ dị ka “onyinye n’ụdị mmadụ.” (Ndị Efesọs 4:8, NW) E deturu iru eru ha n’Okwu Chineke sitere n’ike mmụọ nsọ. (1 Timoti 3:1-7; Taịtọs 1:5-9) Ya mere ndị Kraịst na-agbaso idu ndú nke ndị okenye.—Ndị Hibru 13:7.

18. Gịnị bụ ụfọdụ ibu ọrụ nke ndị gaje ịbụ òtù onyeisi ahụ ugbu a, gịnịkwa ga-abụ ibu ọrụ ya n’ọdịnihu?

18 N’oge Bible ndị isi ụfọdụ nwere ikike dị ukwuu, ndị ọzọ nwere nke dị ala karị. Taa, ndị okenye so n’oké ìgwè mmadụ ahụ nwere ibu ọrụ dịgasị iche. Ụfọdụ na-eje ozi n’otu ọgbakọ; ndị ọzọ na-eje ozi n’ọtụtụ ọgbakọ dị ka ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị; ndị ọzọ na-elekọta mba dum dị ka ndị òtù Kọmitii Alaka; ndị ọzọ na-enyere kọmitii dị iche iche nke Òtù Na-achị Isi aka kpọmkwem. N’ime ụwa ọhụrụ ahụ, Jisọs ga-ahọpụta “ndị isi n’ụwa nile” idu ndú n’etiti ndị na-efe Jehova nọ n’elu ala. (Abụ Ọma 45:16) Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ ga-ahọrọ ọtụtụ n’ime ndị a site ná ndị okenye na-ekwesị ntụkwasị obi taa. N’ihi na ndị ikom a na-egosipụta ihe ha bụ ugbu a, ọ ga-ahọrọ inyefe ọtụtụ ọbụna ihe ùgwù ndị ka ukwuu n’ọdịnihu mgbe ọ ga-ekpughe ọrụ òtù onyeisi ahụ n’ime ụwa ọhụrụ.

Ala nke Ndị Chineke Taa

19. Gịnị ka ala ahụ a hụrụ n’ọhụụ Ezikiel na-anọchite anya ya?

19 Ọhụụ Ezikiel na-egosikwa ala Israel ahụ e weghachiri. Gịnị ka akụkụ a nke ọhụụ ahụ na-anọchite anya ya? Amụma mweghachi ndị ọzọ kwuru na ala ahụ, bụ́ Israel, ga-abụ paradaịs yiri Iden. (Ezikiel 36:34, 35) Taa, anyị na-anụ ụtọ “ala” e weghachiri eweghachi, o yikwara Iden n’ụzọ ụfọdụ. N’otu aka ahụ, anyị na-ekwukarị okwu banyere paradaịs ime mmụọ anyị. Ụlọ Nche akọwawo “ala” anyị dị ka “ógbè ịrụ ọrụ” nke ndị Chineke họpụtara.b Ebe ọ sọkwara ohu Jehova nọrọ, ọ nọ n’ala ahụ e weghachiri eweghachi ma ọ bụrụhaala na ọ na-agbalị ịkwado ezi ofufe site n’ije ije na nzọụkwụ Kraịst Jisọs.—1 Pita 2:21.

20. Ụkpụrụ dị aṅaa ka anyị pụrụ ịmụta site ‘n’òkè nsọ’ ahụ a hụrụ n’ọhụụ Ezikiel, oleekwa otú anyị pụrụ isi tinye ụkpụrụ a n’ọrụ?

20 Gịnị banyere ibe ala ahụ a kpọrọ “òkè nsọ”? Nke a bụ ihe ndị ahụ wepụtara iji kwadoo òtù ndị nchụàjà na obodo ukwu ahụ. N’otu aka ahụ, “ndị nile nke ala” ahụ gaje iwepụta otu ibe ala maka onyeisi ahụ. Gịnị ka nke a pụtara taa? N’ezie, ọ bụghị na e kwesịrị ibo ndị Chineke ibu arọ nke inwe òtù ndị ụkọchukwu a na-akwụ ụgwọ ọnwa. (2 Ndị Tesalọnaịka 3:8) Kama nke ahụ, nkwado a na-enye ndị okenye bụ n’ụzọ bụ́ isi nke ime mmụọ. Ọ na-agụnye inye aka n’ọrụ ndị a na-arụ ugbu a na igosi mmụọ imekọ ihe ọnụ, nke ido onwe onye n’okpuru. Ma, dị ka ọ dị n’oge Ezikiel, a na-atụrụ “Jehova” ụtụ a, ọ bụghị mmadụ ọ bụla.—Ezikiel 45:1, 7, 16.

21. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’okike e kere ala ahụ a hụrụ n’ọhụụ Ezikiel?

21 Ọ bụghị nanị onyeisi na òtù ndị nchụàjà nwere ebe e kenyere ha n’ala a e weghachiri. Otú e si kewasịa ala ahụ na-egosi na nke ọ bụla n’ime ebo 12 ahụ nwere ihe nketa e ji n’aka. (Ezikiel 47:13, 22, 23) Ya mere ndị so n’oké ìgwè mmadụ ahụ abụghị nanị na ha nwere ọnọdụ n’ime paradaịs ime mmụọ ahụ taa kamakwa a ga-ekenye ha ala mgbe ha nwetara ọnọdụ n’ógbè elu ala nke Alaeze Chineke.

22. (a) Obodo ahụ a hụrụ n’ọhụụ Ezikiel na-anọchite anya gịnị? (b) Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’onwunwe obodo ahụ nwere ọnụ ụzọ ámá n’akụkụ nile?

22 N’ikpeazụ, gịnị ka obodo ahụ a hụrụ n’ọhụụ na-anọchite anya ya? Ọ bụghị obodo dị n’eluigwe, n’ihi na ọ dị n’etiti ala “na-adịghị nsọ.” (Ezikiel 48:15-17) Ya mere ọ ghaghị ịbụ ihe dị n’elu ala. Gịnị bụ obodo ukwu? Ọ̀ bụ na ọ dịghị enye echiche nke ndị mmadụ ịbịakọta ọnụ dị ka otu ìgwè ma nwee ihe dị n’usoro, nke a hazikwara ahazi? Ee. N’ihi ya, obodo ahụ yiri ka ọ na-ese onyinyo ọchịchị elu ala nke ga-abara mmadụ nile ga-emejupụta òtù ụwa ọhụrụ ahụ nke ezi omume uru. Ọ ga-arụ ọrụ n’uju ya n’ime “ụwa ọhụrụ” na-abịanụ. (2 Pita 3:13) Ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ nke dị n’akụkụ nile, otu maka ebo nke ọ bụla, na-egosi nnọọ ighere oghe ya. Taa, ndị Chineke anọghị n’okpuru nlekọta nzuzo. Ụmụnna ndị nwere ibu ọrụ ga-abụ ndị a pụrụ ijekwuru; ụkpụrụ ndị na-eduzi ha bụ ndị mmadụ nile maara nke ọma. Eziokwu ahụ bụ́ na ndị mmadụ si n’ebo nile na-akọ ala nke na-azụ obodo ahụ na-echetara anyị na atụrụ ọzọ ahụ na-akwado, ọbụna n’ụzọ ihe onwunwe, ndokwa maka nlekọta ndị e meere ndị Chineke gburugburu ụwa.—Ezikiel 48:19, 30-34.

23. Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

23 Otú ọ dị, gịnị banyere mmiri ahụ si n’ebe nsọ nke ụlọukwu ahụ na-erupụta? Ihe nke ahụ na-anọchite anya ya taa na ruo n’ọdịnihu ga-abụ ihe isiokwu nke atọ, bụ́kwa nke ikpeazụ n’usoro isiokwu a, ga-atụle.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Lee akwụkwọ bụ́ Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!, peji nke 64, paragraf nke 22, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

b Lee Ụlọ Nche, July 1, 1995, peji nke 20.

Isi Ihe Ndị A Ga-atụleghachi

◻ Gịnị ka ụlọukwu ahụ a hụrụ n’ọhụụ Ezikiel na-ese onyinyo ya?

◻ Ole ndị ka ndị nchụàjà na-eje ozi n’ụlọukwu ahụ na-ese onyinyo ha?

◻ Gịnị bụ òtù onyeisi ahụ, gịnịkwa bụ ụfọdụ n’ime ibu ọrụ ya?

◻ Gịnị bụ ala ahụ a hụrụ n’ọhụụ Ezikiel, n’echiche dịkwa aṅaa ka e kenyere ya ebo 12 ahụ?

◻ Gịnị ka obodo ahụ na-ese onyinyo ya?

[Diagram/Map on peeji 15]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Otú e si kenyesịa ala ahụ dị ka e gosiri n’ọhụụ Ezikiel

EBO IRI NA ABỤỌ AHỤ

Oké Osimiri Ahụ

Osimiri Galili

Osimiri Jọdan

Osimiri Nnu

DAN

ASHA

NAFTALI

MANASE

EFRAIM

REUBEN

JUDA

ONYEISI AHỤ

BENJAMIN

SIMEON

ISAKA

ZEBULUN

GAD

[Diagram]

MBASAWANYE NKE ÒKÈ NSỌ

A. “Jehova n’Onwe Ya Nọ Ebe Ahụ” (Jehova Shama); B. ala na-emepụta ihe nke obodo

Òkè Ndị Livaị

Ebe Nsọ Jehova

Òkè Ndị Nchụàjà

B A B

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya