Isi nke Iri Abụọ na Ise
Eze ahụ na Ndị Isi Ya
1, 2. Gịnị ka a pụrụ ikwu banyere ihe odide Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ nke Aịsaịa?
KA Ọ na-erule ná ngwụsị nke afọ ndị 1940, a chọtara ọtụtụ akwụkwọ mpịakọta ndị dị ịrịba ama n’ọgba ndị dịdewere Osimiri Nwụrụ Anwụ, na Palestine. A bịara mara ha dị ka Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ, a na-echekwa na e dere ha n’ihe dị ka n’agbata afọ 200 T.O.A. na 70 O.A. Nke a kasị mara n’ime ha bụ akwụkwọ mpịakọta Aịsaịa, bụ́ nke e ji asụsụ Hibru dee n’akpụkpọ siri ike. Ọ fọrọ ntakịrị ka ọ bụrụ na akwụkwọ mpịakọta a zuru ezu, ihe odide dị n’ime ya adịkebeghịkwa iche n’ihe odide ochie nke ndị Masorete nke e dere ihe dị ka 1,000 afọ mgbe e desịrị ya. N’ụzọ dị otú a, akwụkwọ mpịakọta ahụ na-egosipụta ndepụta e depụtara Bible n’ụzọ ziri ezi.
2 Otu ihe kwesịrị ịrịba ama banyere Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ nke Aịsaịa bụ na otu odeakwụkwọ kanyere akara “X” n’etiti peji nke akụkụ mejupụtara ihe a maara taa dị ka Aịsaịa isi nke 32. Anyị amaghị ihe mere odeakwụkwọ ahụ ji kanye akara dị otú ahụ, ma anyị maara na akụkụ Bible Nsọ a pụrụ iche.
Ịchị n’Ezi Omume na n’Ikpe Ziri Ezi
3. Ọchịchị dị aṅaa ka e buru amụma ya n’akwụkwọ Aịsaịa na Mkpughe?
3 Aịsaịa isi nke 32 ji amụma na-akpali akpali nke na-enwe mmezu dị ịrịba ama n’oge anyị malite: “Lee, n’ezi omume ka otu eze ga-abụ eze, ndị isi kwa, n’ikpe ziri ezi ka ha ga-abụ ndị isi.” (Aịsaịa 32:1) Ee, “Lee”! Mkpu a na-echetara anyị mkpu yiri ya nke dị n’akwụkwọ amụma ikpeazụ nke Bible: “Onye ahụ Nke na-anọkwasị n’ocheeze ahụ wee sị, Lee, ana m eme ihe nile ka ha dị ọhụrụ.” (Mkpughe 21:5, ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’ụdị dị iche.) Akwụkwọ Bible bụ́ Aịsaịa na Mkpughe, bụ́ ndị oge dị n’agbata odide ha abụọ dị ihe dị ka afọ 900, na-enyecha nkọwa na-enye obi ụtọ banyere ọchịchị ọhụrụ—“eluigwe ọhụrụ,” nke ihe mejupụtara ya bụ Eze, bụ́ Kraịst Jisọs, onye e chiri eze n’eluigwe na 1914, na 144,000 ga-eso ya chịa, bụ́ ndị “a gbatara n’etiti mmadụ”—tinyere “ụwa ọhụrụ,” bụ́ ọha mmadụ zuru ụwa ọnụ, ndị dị n’otu.a (Mkpughe 14:1–4; 21:1–4; Aịsaịa 65:17–25) Ọ bụ àjà mgbapụta Kraịst mere ka ndokwa a dum kwe omume.
4. Olee ebe ụwa ọhụrụ ahụ hiwere isi nke dị adị ugbu a?
4 Mgbe ọ hụsịrị n’ọhụụ ịka akara ikpeazụ nke 144,000 ndị a ga-eso ya chịa, Jọn onyeozi kọrọ, sị: “M wee hụ, ma lee, oké ìgwè mmadụ, nke onye ọ bụla na-apụghị ịgụta ọnụ, ndị si ná mba nile ọ bụla, na ebo nile, na ndị nile, na asụsụ nile, pụta, na-eguzo n’ihu ocheeze ahụ na n’ihu Nwa atụrụ ahụ.” (Ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’ụdị dị iche.) Nke a bụ ebe ụwa ọhụrụ hiwere isi—oké ìgwè mmadụ ndị ruworo ọtụtụ nde ugbu a, ndị a chịkọtaworo ịnọ n’akụkụ ihe fọdụrụ n’ime 144,000 ahụ dị ole na ole, ndị ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ha meworo agadi. Oké ìgwè mmadụ a ga-alanarị oké mkpagbu ahụ ji ọsọ na-abịa, ndị kwesịrị ntụkwasị obi e si n’ọnwụ kpọlite na ọtụtụ ijeri ndị ọzọ a ga-enye ohere inwe okwukwe ga-esonyekwara ha n’ụwa Paradaịs ahụ. A ga-eji ndụ ebighị ebi gọzie ndị nile mere otú ahụ.—Mkpughe 7:4, 9–17.
5-7. Ọrụ dị aṅaa ka “ndị isi” ahụ e buru n’amụma na-arụ n’etiti ìgwè atụrụ Chineke?
5 Otú ọ dị, ruo ogologo oge ụwa nke a jupụtara n’ịkpọasị dịruru, nchebe dị ndị so n’oké ìgwè mmadụ ahụ mkpa. Ruo n’ókè dị ukwuu, ọ bụ “ndị isi,” ndị ‘ga-abụ ndị isi n’ikpe ziri ezi’ na-enye nchebe a! Lee ndokwa magburu onwe ya ọ bụ! A kọwakwuru “ndị isi” a n’ihe ndị mara mma e kwuru n’amụma Aịsaịa, sị: “Otu onye ga-adịkwa ka ebe izonarị ifufe, na ebe nzuzo ịpụ n’oké mmiri ozuzo; dị ka ọtụtụ iyi jupụtara na mmiri n’ebe kpọrọ nkụ, dị ka ndò nke oké nkume dị elu n’ala nke kpatara ike ọgwụgwụ.”—Aịsaịa 32:2.
6 Ugbu a, n’oge a ụwa nile nọ ná nsogbu, e nwere mkpa maka “ndị isi,” ee, ndị okenye, ndị “[ga-elezi] . . . ìgwè atụrụ nta nile [anya],” na-elekọta atụrụ Jehova ma na-ekpe ikpe ziri ezi n’ikwekọ n’ụkpụrụ ezi omume Jehova. (Ọrụ 20:28) “Ndị isi” dị otú ahụ aghaghị iru ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ndị e depụtara na 1 Timoti 3:2–7 na na Taịtọs 1:6–9.
7 N’oké amụma ya nke kọwara “ọgwụgwụ oge a” jupụtara n’ahụhụ, Jisọs sịrị: “Leenụ ka unu ghara ịtụ ụjọ.” (Matiu 24:3–8) N’ihi gịnị ka ndị na-eso ụzọ Jisọs na-agaghị eji tụọ ụjọ banyere ọnọdụ ụwa dị ize ndụ taa? Otu ihe bụ na “ndị isi” ahụ—ma hà bụ ndị e tere mmanụ ma hà bụ “atụrụ ọzọ”—ji iguzosi ike n’ihe na-echebe ìgwè atụrụ ahụ. (Jọn 10:16) Ha na-elekọta ụmụnna ha ndị nwoke na ndị nwanyị n’atụghị egwu, ọbụna n’agbanyeghị ihe ndị dị egwu dị ka agha agbụrụ na mgbuchapụ. N’ime ụwa tọgbọ chakoo n’ụzọ ime mmụọ, ha na-ahụ na e ji eziokwu na-ewuli elu nke Okwu Chineke, bụ́ Bible, enye ndị dara mbà n’obi ume ọhụrụ.
8. Olee otú Jehova si na-azụ ma na-eji “ndị isi” so n’atụrụ ọzọ ahụ eme ihe?
8 N’ime afọ 50 gara aga, “ndị isi” ahụ apụtawo nnọọ ìhè. A na-azụ “ndị isi” so n’atụrụ ọzọ dị ka òtù “onyeisi” na-apụtanụ, ka ọ ga-abụ mgbe oké mkpagbu ahụ gasịrị, ndị ruru eru n’ime ha ga-adị njikere ịbụ ndị a họpụtara ije ozi n’ọnọdụ nlekọta n’ime “ụwa ọhụrụ” ahụ. (Ezikiel 44:2, 3; 2 Pita 3:13) Site n’inye nduzi ime mmụọ na ume ọhụrụ ka ha nọ na-ebute ụzọ n’ozi Alaeze ahụ, ha na-egosi na ha yiri “ndo nke oké nkume,” na-ewetara ìgwè atụrụ ahụ nọ n’ógbè ebe ha na-efe ofufe ahụ efe.b
9. Ọnọdụ dịgasị aṅaa na-egosi na e nwere mkpa maka “ndị isi” taa?
9 Na mgbe ikpeazụ a dị ize ndụ nke ajọ ụwa Setan, nchebe dị otú ahụ dị ndị Kraịst raara onwe ha nye mkpa nke ukwuu. (2 Timoti 3:1–5, 13) Oké ifufe nke ozizi ụgha na echiche gbagọrọ agbagọ na-efe. Oké ifufe na-efe n’ụdị nke agha dị iche iche dị n’etiti na n’ime mba dị iche iche nakwa mwakpo a na-awakpo ndị ji ikwesị ntụkwasị obi na-efe Jehova Chineke kpọmkwem. N’ime ụwa nke kpọrọ nkụ n’ihi ọkọchị ime mmụọ, iyi nke mmiri eziokwu dị ọcha, nke a na-agwagbughị agwagbu dị ndị Kraịst oké mkpa iji mejụọ akpịrị ịkpọ nkụ ime mmụọ ha. N’ụzọ na-enye obi ụtọ, Jehova ekwewo nkwa na Eze ya na-achị achị, site n’aka ụmụnna ya e tere mmanụ na “ndị isi” na-enye nkwado, ndị so n’atụrụ ọzọ ahụ, ga-enye ndị dara mbà n’obi na ndị nwere nkụda mmụọ agbamume na nduzi n’oge a nke mkpa. Jehova ga-esi otú a hụ na ezi omume na ikpe ziri ezi ga-ejupụta.
Iji Anya, Ntị, na Obi Na-aṅa Ntị
10. Ndokwa dịgasị aṅaa ka Jehova meworo ka ndị ya wee nwee ike ‘ịhụ’ na ‘ịnụ’ ihe ime mmụọ?
10 Olee otú oké ìgwè mmadụ ahụ siworo meghachi omume ná ndokwa ọchịchị Jehova? Amụma ahụ gara n’ihu ikwu, sị: “A gaghị etechikwa anya nke ndị na-ahụ ụzọ, ntị nke ndị na-anụ ihe ga-aṅakwa ntị.” (Aịsaịa 32:3) Eri ọtụtụ afọ, Jehova emewo ndokwa maka inye ntụziaka na ime ka ndị ohu ya ọ hụrụ n’anya nke ukwuu ruo ntozu okè. Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke na nzukọ ndị ọzọ a na-enwe n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova n’ụwa nile; mgbakọ distrikti, nke mba, na nke mba nile; tinyere ọzụzụ pụrụ iche a na-enye “ndị isi” ahụ ka ha jiri ịhụnanya na-elekọta ìgwè atụrụ ahụ, atụnyewo ụtụ n’iwulite òtù ụmụnna dị n’otu, nke zuru ụwa ọnụ, nke ọtụtụ nde mmadụ mejupụtara. Ebe ọ bụla ndị ọzụzụ atụrụ a nọ n’elu ala, ntị ha ghere nnọọ oghe ịnụ mgbanwe e nwere ná nghọta nke okwu eziokwu ahụ na-aga n’ihu. N’iji akọ na uche e ji Bible zụọ eme ihe, ha dị njikere mgbe ọ bụla ịṅa ntị na irube isi.—Abụ Ọma 25:10.
11. N’ihi gịnị ka ndị Chineke ji jiri obi ike na-ekwu okwu ugbu a, n’asụghị nsụ n’ihi ihe edoghị ha anya?
11 Amụma ahụ dọzịrị aka ná ntị, sị: “Obi nke ndị na-eme ngwa ngwa ga-aghọtakwa ihe ọmụma, ire nke ndị nsụ ga-ekwuwakwa okwu ngwa ngwa.” (Aịsaịa 32:4) Ka onye ọ bụla ghara ịdị oké ngwa n’ikwubi ihe bụ ezi ihe na ihe ọjọọ. Bible na-ekwu, sị: “Ị̀ hụwo onye ọ bụla na-anụkpọ onwe ya n’okwu ya nile? Olileanya dịịrị onye nzuzu karịa onye ahụ.” (Ilu 29:20; Eklisiastis 5:2) Tupu 1919, ọbụna ndị Jehova nwere echiche ụfọdụ nke ndị Babilọn. Ma malite n’afọ ahụ, Jehova emewo ka ha ghọta nzube ya n’ụzọ doro anya karị. Ha achọpụtawo na eziokwu ndị o kpugheworo, abụghị ndị e kpughere oké ngwa ngwa, kama ndị e chepụtara nke ọma, ugbu a kwa, ihe ha na-ekwu doro ha anya, ha adịghị asụ nsụ n’ihi ihe edoghị ha anya.
“Onye Nzuzu”
12. Olee ndị bụ ‘ndị nzuzu’ taa, n’ụzọ dịkwa aṅaa ka ha si bụrụ ndị na-adịghị emesapụ aka?
12 Amụma Aịsaịa kọwapụtaziri ọdịiche e nwere, sị: “A gaghị akpọkwa onye nzuzu onye a maara aha ya ọzọ, a gaghị asịkwa na onye aghụghọ bụ ọgaranya. N’ihi na onye nzuzu ga-ekwu ihe nzuzu.” (Aịsaịa 32:5, 6a) Ònye bụ “onye nzuzu” ahụ? Dị ka ọ̀ bụ iji mesie okwu ike, Eze Devid zara ya ugboro abụọ, sị: “Onye nzuzu asịwo n’obi ya, Ọ dịghị Chineke ọ bụla dị. Ha ebibiwo onwe ha, ha emewo ka omume ha bụrụ ihe arụ; ọ dịghị onye na-eme ezi ihe.” (Abụ Ọma 14:1; 53:1) N’ezie, ndị na-ekweghị na Chineke ma ọlị na-ekwu na Jehova adịghị. N’ezie, otú a ka ọ dịkwa ndị “gụrụ oké akwụkwọ” na ndị ọzọ na-eme ka a ga-asị na Chineke adịghị, na-ekwenye na ọ dịghị onye ha ga-aza ajụjụ. Eziokwu adịghị n’ime ndị dị otú ahụ. Imesapụ aka adịghị ha n’obi. Ha enweghị ozi ọma nke ịhụnanya. N’ụzọ dị iche n’ebe ezi ndị Kraịst nọ, ha adịghị enye ndị nọ n’ahụhụ, bụ́ ndị nwere mkpa, ihe ngwa ngwa ma ọ bụdị ghara inye ha ma ọlị.
13, 14. (a) Olee otú ndị si n’ezi ofufe dapụ n’oge a si arụ ọrụ ọjọọ? (b) Gịnị ka ndị si n’ezi ofufe dapụ na-agbalị igbochi ndị agụụ na-agụ na ndị akpịrị na-akpọ nkụ inweta, ma gịnị ga-esi n’ime ya pụta n’ikpeazụ?
13 Ọtụtụ n’ime ndị nzuzu dị otú ahụ na-akpọ ndị na-akwado eziokwu Chineke asị. “Obi ya ga-emekwa ajọ ihe, ime ihe e merụrụ emerụ, na ikwu okwu njehie megide Jehova.” (Aịsaịa 32:6b) Lee ka nke a si bụrụ eziokwu banyere ndị si n’ezi ofufe dapụ n’oge a! N’ọtụtụ mba dị na Europe na Esia, ndị si n’ezi ofufe dapụ na ndị ọzọ na-emegide eziokwu ejikọwo aka na-aghara ndị ọchịchị ụgha chara acha n’ebumnobi nke ime ka a machibido Ndịàmà Jehova iwu ma ọ bụ kpaara ha ókè. Ha na-egosipụta mmụọ nke “ohu ọjọọ” ahụ, onye Jisọs buru amụma banyere ya, sị: “Ọ bụrụ na ohu ọjọọ ahụ ga-asị n’obi ya, Onye nwe m na-anọ ọdụ dị anya; ọ bụrụkwa na ọ ga-amalite iti ndị ohu ibe ya aka, so[ro]kwa ndị na-aṅụbiga mmanya ókè na-eri na-aṅụkwa; onye nwe ohu ahụ ga-abịa n’ụbọchị ọ na-eleghị anya ya, na n’oge awa ọ na-amaghị, ọ ga-egbubikwa ya mkpirikpi abụọ, kee òkè nye ya n’etiti ndị ihu abụọ: n’ebe ahụ ka ịkwa ákwá na ịta ikekere eze ahụ ga-adị.”—Matiu 24:48–51.
14 Ka ọ dịgodị, ndị si n’ezi ofufe dapụ na-eme ka “mkpụrụ obi nke onye agụụ na-agụ gbara aka, [na-emekwa] ka ihe ọṅụṅụ nke onye akpịrị na-akpọ nkụ kọọ ụkọ.” (Aịsaịa 32:6ch) Ndị iro nke eziokwu na-agbalị igbochi ndị agụụ eziokwu na-agụ iri nri ime mmụọ, ha na-agbalịkwa igbochi ndị akpịrị na-akpọ nkụ ịṅụ mmiri nke ozi Alaeze ahụ na-enye ume ọhụrụ. Ma ihe ga-esi n’ime ya pụta n’ikpeazụ ga-abụ ihe Jehova gwara ndị ya site n’ọnụ onye amụma ya ọzọ, sị: “Ha ga-ebusokwa gị agha; ma ha agaghị enwe ike imegide gị: n’ihi na gị ka M nọnyeere, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta), ịnapụta gị.”—Jeremaịa 1:19; Aịsaịa 54:17.
15. Taa, olee ndị karịsịa bụ ndị “aghụghọ,” olee “okwu ụgha” ndị ha kwaliteworo, gịnịkwa si na ya pụta?
15 Malite n’etiti narị afọ nke 20, omume rụrụ arụ amụbawo nke ukwuu n’ala ndị nke Krisendọm. N’ihi gịnị? Amụma ahụ kwuru otu ihe kpatara ya, sị: “Ihe ọrụ nile nke onye aghụghọ jọkwara njọ: onye ahụ ezubewo ihe nzube ọjọọ dị iche iche iji okwu ọnụ nile nke bụ́ okwu ụgha mebie ndị e wedara n’ala, ọbụna mgbe ogbenye na-ekwu okwu ikpe ziri ezi.” (Aịsaịa 32:7) N’imezu okwu ndị a, ọtụtụ n’ime ndị ụkọchukwu karịsịa, azụlitewo àgwà onye ọ bụla mere ihe masịrị ya n’ihe banyere mmekọahụ tupu alụmdi na nwunye, ndị na-abụghị di na nwunye ibikọ ọnụ, idina ụdị onwe—n’ezie, “ịkwa iko, na adịghị ọcha nile.” (Ndị Efesọs 5:3) N’ụzọ dị otú a, ha ejiriwo okwu ụgha ha “mebie” ìgwè atụrụ ha.
16. Gịnị na-enye ezi ndị Kraịst obi ụtọ?
16 N’ụzọ dị iche, lee ka mmezu nke ihe ọzọ onye amụma ahụ kwuru si enye ume ọhụrụ! “Onye [mmesapụ aka] ezubewo [imesapụ aka]; onye ahụ na-eguzosikwa ike [n’imesapụ aka].” (Aịsaịa 32:8) Jisọs n’onwe ya gbara ume ka a na-emesapụ aka mgbe o kwuru, sị: “Na-enyenụ, a ga-enyekwa unu; ọ̀tụ̀tụ̀ ọma, nke a bịadaworo ala, yọkọta, nke na-ejubigakwa ókè, ka ha ga-enye n’obi unu. N’ihi na ihe unu ji tụọ ihe ka a ga-eji tụọkwara unu ọzọ.” (Luk 6:38) Pọl onyeozi zokwara aka ná ngọzi ndị na-abịara ndị na-emesapụ aka mgbe o kwuru, sị: “[Na-echetanụ] okwu Onyenwe anyị Jisọs, na Ya onwe ya sịrị, Ọ dị ngọzi inye ihe karịa ịnara ihe.” (Ọrụ 20:35) Ezi ndị Kraịst na-enweta obi ụtọ, ọ bụghị site n’inweta akụ̀ na ụba nkịtị ma ọ bụ ịbụ ndị a ma ama, kama site n’imesapụ aka—n’otu ụzọ ahụ Chineke ha, bụ́ Jehova, si emesapụ aka. (Matiu 5:44, 45) Ha na-enweta obi ụtọ kasịnụ site n’ime uche Chineke, n’iwepụta onwe ha n’afọ ofufo iji mee ka ndị ọzọ mara “ozi ọma nke ebube nke Chineke dị ngọzi.”—1 Timoti 1:11.
17. Olee ndị taa yiri “ụmụ ndị inyom ndị nwere ntụkwasị obi,” bụ́ ndị Aịsaịa zoro aka n’ebe ha nọ?
17 Amụma Aịsaịa gara n’ihu ikwu, sị: “Unu ndị inyom ndị nọ jụụ, bilienụ, nụrụnụ olu m; unu ụmụ ndị inyom ndị nwere ntụkwasị obi, geenụ ntị okwu ọnụ m. Tụkwasị ụbọchị ụfọdụ n’otu mgbaafọ, unu ewee mee mkpatụ, unu ndị inyom ndị nwere ntụkwasị obi: n’ihi na ọghụghọ mkpụrụ vine agwụsịwo, nchịkọta ihe agaghị abịa. Maanụ jijiji, unu ndị inyom ndị nọ jụụ; meenụ mkpatụ, unu ndị inyom ndị nwere ntụkwasị obi.” (Aịsaịa 32:9–11a) Omume ndị inyom ndị a pụrụ ichetara anyị ndị na-azọrọ taa na ha na-efe Chineke ma ha adịghị anụ ọkụ n’obi n’ozi ya. A na-ahụ ndị dị otú ahụ n’okpukpe dị iche iche nke “Babilọn Ukwu ahụ, nne nke ndị na-akwa iko.” (Mkpughe 17:5) Dị ka ihe atụ, ndị nọ n’okpukpe dị iche iche nke Krisendọm dị nnọọ otú Aịsaịa si kọwaa “ndị inyom” a. Ha “nọ jụụ,” ha achọghị ịma banyere ikpe na obi erughị ala gaje ịbịakwasị ha n’isi nso.
18. Ònye ka a gwara ka o “kee ákwà mkpe n’úkwù,” n’ihi gịnịkwa?
18 A gwaziri okpukpe ụgha, sị: “Yipụnụ uwe, gbara ọtọ, kee ákwà mkpe n’úkwù unu. N’ihi ara nile ka ha ga na-eti aka n’obi, n’ihi ubi nile a na-achọsi ike, n’ihi osisi vine na-amị mkpụrụ, n’ihi ala ndị m, nke ogwu na uke na-epute n’ime ya, ee, n’elu ụlọ nile nke obi ụtọ n’obodo na-aṅụrị ọṅụ agha.” (Aịsaịa 32:11b–13) Okwu bụ́ “Yipụnụ uwe, gbara ọtọ” eyighị ka ọ pụtara iyipụcha ákwà. Ihe a na-emekarị n’oge ochie bụ iyikwasị uwe elu n’elu uwe ime. Uwe elu ahụ na-abụkarị ihe e ji amata mmadụ. (2 Ndị Eze 10:22, 23; Mkpughe 7:13, 14) Ya mere, amụma ahụ na-enye ndị so n’okpukpe ụgha iwu ka ha yipụ uwe elu ha—ihe ha ji na-eme ka ha bụ ndị ohu Chineke—ma yiri ákwà mkpe, bụ́ ihe àmà nke iru újú n’ihi ikpe ga-abịakwasị ha n’isi nso. (Mkpughe 17:16) Ọ dịghị mkpụrụ ọ bụla nke nsọpụrụ Chineke nke òtù okpukpe dị iche iche nke Krisendọm, bụ́ ndị na-azọrọ na ha bụ “obodo na-aṅụrị ọṅụ” nke Chineke, ma ọ bụ nke ndị ọzọ so n’alaeze ụwa nke okpukpe ụgha, na-amịpụta. Ógbè ha na-epupụta nanị “ogwu na uke” nke nleghara anya na mgbahapụ.
19. Olee ọnọdụ “Jerusalem” si n’ezi ofufe dapụ nọ na ya nke Aịsaịa kpughere?
19 Nkọwa enweghị olileanya a na-emetụta akụkụ nile nke “Jerusalem” si n’ezi ofufe dapụ: “A hapụwo ụlọ elu; a gbanahụwo ìgwè obodo; Ofel na ụlọ nche anọchiwo n’ọnọdụ ọgba ruo mgbe ebighị ebi, ebe obi ụtọ nke ịnyịnya ibu ọhịa, ebe ịta nri nke ìgwè atụrụ dị iche iche.” (Aịsaịa 32:14) Ee, a gụnyere ọbụna Ofel. Ofel bụ akụkụ Jerusalem nke dị elu, bụ́ ebe dị mma ịnọ chebe ya. Ikwu na Ofel ghọrọ ọgba na-egosi na obodo ahụ ga-atọgbọrọ n’efu kpam kpam. Ihe Aịsaịa kwuru na-egosi na “Jerusalem” si n’ezi ofufe dapụ—Krisendọm—anọghị na nche ime uche Chineke. Ọ tọgbọ chakoo n’ụzọ ime mmụọ, n’enwetụghị eziokwu na ikpe ziri ezi—yie nnọọ anụ ọhịa gabiga ókè.
Ọdịiche Dị Ebube!
20. Mmetụta dị aṅaa ka ịwụpụ mmụọ Chineke n’ahụ ndị ya nwere?
20 Aịsaịa nyeziri ndị na-eme uche Jehova olileanya na-akpali akpali. Ntọgbọrọ n’efu ọ bụla nke ndị Chineke ga-abụ nanị “ruo mgbe a ga-awụkwasị anyị Mmụọ site n’elu, ọzara ewee ghọọ ubi ọma, a gụọkwa ubi ọma n’oké ọhịa.” (Aịsaịa 32:15) N’ụzọ na-enye obi ụtọ, kemgbe 1919, a wụkwasịwo ndị Jehova mmụọ ya n’ụba, na-eweghachi, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ubi na-amị mkpụrụ nke Ndịàmà e tere mmanụ, nke oké ọhịa na-agbasa agbasa nke atụrụ ọzọ ahụ ga-esochi. Ọganihu na uto bụ ihe ndị pụtara ìhè ná nzukọ elu ala ya. Na paradaịs ime mmụọ ahụ e weghachiri eweghachi, ndị Chineke na-egosipụta “ebube Jehova, bụ́ ịma mma nke Chineke anyị,” ka ha na-akpọsa Alaeze ya na-abịanụ n’ụwa nile.—Aịsaịa 35:1, 2.
21. Olee ebe a na-achọta ezi omume, ịdị jụụ, na ịnọ ná ntụkwasị obi taa?
21 Gee ntị ugbu a ná nkwa dị ebube nke Jehova: “Ikpe ziri ezi ga-enwe ebe obibi ya n’ọzara, ezi omume ga-ebikwa n’ubi ọma ahụ. Ihe ezi omume ahụ ga-arụpụta bụ udo; ihe nke ga-esi n’ofufe ezi omume ahụ pụta bụkwa ịnọ jụụ na ntụkwasị obi ruo mgbe ebighị ebi.” (Aịsaịa 32:16, 17) Lee otú nke a si akọwa ọnọdụ ime mmụọ nke ndị Jehova taa nke ọma! N’ụzọ dị iche n’ebe ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nke ihe a kpọrọ mmadụ nọ, bụ́ ndị ịkpọasị, ime ihe ike, na ajọ ịda ogbenye ime mmụọ kewasịrị, ezi ndị Kraịst dị n’otu n’ụwa nile, ọ bụ ezie na ha si ná “mba nile ọ bụla, na ebo nile, na ndị nile, na asụsụ nile.” Ha na-ebi ndụ, na-arụ ọrụ, na-ejekwa ozi n’ụzọ kwekọrọ n’ezi omume Chineke, na-eme ya n’obi ike nke imesị nwee ezi udo na ịnọ ná ntụkwasị obi ruo mgbe ebighị ebi.—Mkpughe 7:9, 17.
22. Gịnị dị iche n’ọnọdụ nke ndị Chineke na nke ndị nọ n’okpukpe ụgha?
22 Aịsaịa 32:18 amalitelarị imezu n’ime paradaịs ime mmụọ. Ọ na-ekwu, sị: “Ndị m ga-anọkwa n’ụlọ obibi udo, na n’ebe obibi dị iche iche kwesịrị ntụkwasị obi, na n’ebe izu ike dị iche iche dị jụụ.” Ma nye ndị Kraịst adịgboroja, “ọ ga-ezo akụ́ mmiri igwe, n’ọdịda nke oké ọhịa; ọ bụkwa n’ọnọdụ dị ala ka a ga-eme ka obodo a dị ala.” (Aịsaịa 32:19) Ee, dị ka oké mmiri ozuzo, ikpe Jehova na-aga ịbịakwasị obodo adịgboroja nke okpukpe ụgha, bibie “oké ọhịa” ya nke ndị na-akwado ya, kpochapụ ndị a ruo mgbe ebighị ebi!
23. Ọrụ dị aṅaa zuru ụwa ọnụ na-abịaru ọgwụgwụ ya, à ga-agụkwa ndị na-ekere òkè n’ime ya na gịnị?
23 Akụkụ a nke amụma ahụ mechiri site n’ikwu, sị: “Ndị ihe na-agara nke ọma ka unu ndị na-agha mkpụrụ n’akụkụ mmiri nile bụ, ndị na-ezipụta ụkwụ ehi na ịnyịnya ibu.” (Aịsaịa 32:20) Ehi na ịnyịnya ibu bụ anụ e ji arụ ọrụ nke ndị Chineke n’oge ochie ji kọọ ubi, kụọkwa mkpụrụ. Taa, ndị Jehova ji ígwè e ji ebi akwụkwọ, ngwá ọrụ electronic, ihe owuwu na usoro ime njem ọgbara ọhụrụ, karịsịa, nzukọ ọchịchị Chineke, nke dị n’otu, na-ebipụta ma na-ekesa ọtụtụ ijeri akwụkwọ ndị dabeere na Bible. Ndị ọrụ wepụtara onwe ha na-eji ngwá ọrụ ndị a akụ mkpụrụ eziokwu Alaeze n’ụwa nile, n’ụzọ nkịtị, “n’akụkụ mmiri nile.” E wetalarị ọtụtụ nde ndị ikom na ndị inyom na-atụ egwu Chineke dị ka ihe ubi, ìgwè ndị ọzọ na-esonyekwara ha. (Mkpughe 14:15, 16) N’ezie, a ga-agụ ha nile ná ndị “ihe na-agara nke ọma”!
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a “Eze” ahụ dị n’Aịsaịa 32:1 pụrụ izoworị aka na mbụ n’ebe Eze Hezekaịa nọ. Otú ọ dị, mmezu bụ́ isi nke Aịsaịa isi nke 32 bụ n’ihe metụtara Eze ahụ, bụ́ Kraịst Jisọs.
b Lee Ụlọ Nche nke March 1, 1999, peji nke 13-18, nke Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania, bipụtara.
[Foto ndị dị na peeji nke 331]
N’akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ, a kanyere “X” n’Aịsaịa isi nke 32
[Foto ndị dị na peeji nke 333]
‘Onyeisi’ nke ọ bụla yiri ebe izonarị ifufe, ebe nchebe pụọ ná mmiri ozuzo, mmiri dị n’ọzara, ndo pụọ n’anwụ
[Foto dị na peeji nke 338]
Onye Kraịst na-enweta obi ụtọ dị ukwuu n’iso ndị ọzọ kerịta ozi ọma ahụ