Isi nke Iri Abụọ na Asaa
Jehova Ewesa Mba Dị Iche Iche Iwe
1, 2. (a) Banyere ịbọ ọ́bọ̀ Jehova, gịnị ka anyị pụrụ ijide n’aka? (b) Gịnị ka Chineke na-emezu site n’ịbọ ọ́bọ̀?
JEHOVA CHINEKE na-enwe ndidi ọ bụghị nanị n’ebe ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi nọ, kamakwa, n’ebe ndị iro ya nọ, mgbe nzube ya mere ka ọ dị mkpa. (1 Pita 3:19, 20; 2 Pita 3:15) Ndị iro Jehova nwere ike ha agaghị eji ndidi ya kpọrọ ihe, ha pụkwara iwere ya dị ka adịghị ike ma ọ bụ achọghị ime ihe. Ma dị ka isi nke 34 nke Aịsaịa na-egosi, n’ikpeazụ Jehova na-achọ mgbe nile ka ndị iro ya zaa ajụjụ. (Zefanaịa 3:8) Ruo nwa oge, Chineke kwere ka Edọm na mba ndị ọzọ megide ndị Ya n’enweghị ihe mgbochi. Ma Jehova nwere oge nke ya maka ịkwụghachi ụgwọ. (Deuterọnọmi 32:35) N’otu aka ahụ, n’oge ọ kara aka, Jehova ga-abọ ọ́bọ̀ n’ahụ akụkụ nile nke ajọ ụwa dị ugbu a nke na-eleghara ọbụbụeze ya anya.
2 Nzube bụ́ isi Chineke ga-eji bọọ ọ́bọ̀ bụ iji gosipụta ọbụbụeze ya na iji bulie aha ya elu. (Abụ Ọma 83:13-18) Nkwụghachi ụgwọ ya na-ewepụkwa ndị ohu ya n’ụta dị ka ndị bụ́ ndị nnọchiteanya ya n’ezie, na-anapụtakwa ha n’ọnọdụ ndị na-adịghị mma. Ọzọkwa, ịbọ ọ́bọ̀ Jehova na-ekwekọ mgbe nile n’ụzọ zuru ezu n’ikpe ya ziri ezi.—Abụ Ọma 58:10, 11.
Ṅaanụ Ntị, Unu Mba Dị Iche Iche
3. Òkù dị aṅaa ka Jehova na-akpọ mba dị iche iche site n’ọnụ Aịsaịa?
3 Tupu o lekwasị anya ná nkwụghachi ụgwọ a ga-enye Edọm, Jehova kpọrọ mba nile òkù dị oké mkpa site n’ọnụ Aịsaịa, sị: “Bịanụ nso, unu mba, ịnụ ihe; unu ndị dị iche iche kwa, ṅaanụ ntị: ka ụwa nụ, ya na uju ya; elu ụwa dum mmadụ bi, na ihe nile si n’ime ya apụta.” (Aịsaịa 34:1) Onye amụma ahụ ekwuola okwu ọtụtụ ugboro megide mba ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke. Ugbu a, ọ na-aga ịchịkọta amamikpe nile nke Chineke megide ha. Ịdọ aka ná ntị ndị a ọ̀ dị ihe ha pụtara maka oge anyị?
4. (a) Gịnị ka a kpọrọ mba dị iche iche òkù ka ha mee, dị ka e dekọrọ n’Aịsaịa 34:1? (b) Okwu ikpe Jehova megide mba dị iche iche ọ̀ na-egosi na ọ bụ Chineke obi ọjọọ? (Lee igbe dị na peji nke 363.)
4 Ee. Eze eluigwe na ala na akụkụ nile nke usoro ihe a na-adịghị asọpụrụ Chineke, nọ n’esemokwu. Ọ bụ ya mere e ji kpọọ “ndị dị iche iche” na “ụwa” òkù ka ha nụrụ ozi ahụ dabeere na Bible nke Jehova meworo ka a kpọsaa n’ụwa nile. N’okwu ndị na-echetara anyị Abụ Ọma 24:1, Aịsaịa na-ekwu na a ga-eji ozi a gazuo ụwa—amụma nke mezuworo n’oge anyị, mgbe Ndịàmà Jehova na-eme nkwusa ‘ruo n’ebe ụwa sọtụrụ.’ (Ọrụ 1:8) Otú ọ dị, mba dị iche iche aṅabeghị ntị. Ha ejiribeghị ịdọ aka ná ntị ahụ banyere mbibi ha na-abịanụ kpọrọ ihe. Otú ọ dị, nke a agaghị egbochi Jehova imezu ihe o kwuru.
5, 6. (a) N’ihi gịni ka Chineke ji kpọọ mba dị iche iche òkù ịza ajụjụ? (b) Olee otú o si bụrụ eziokwu na “a ga-agbazekwa ugwu site n’ọbara ha”?
5 Amụma ahụ kọwaziri enweghị olileanya nke mba ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke—nke dị nnọọ iche n’olileanya dị ebube nke ndị Chineke, nke e mesịrị kọwaa. (Aịsaịa 35:1-10) Onye amụma ahụ kwuru, sị: “Iwe ka Jehova na-ewesa mba nile, Ọ na-ejidekwa ọnụma n’ahụ usuu nile nke ndị agha ha: O wezụgawo ha ka e bibie ha, O weere ha nye ka e gbuo ha. A ga-atụfukwa ndị ha e gburu egbu, ma ozu ha, ísì ọjọọ ha ga-arịgo n’elu, a ga-agbazekwa ugwu site n’ọbara ha.”—Aịsaịa 34:2, 3.
6 A dọọrọ uche gaa n’ikpe ọmụma ọbara nke mba dị iche iche. Taa mba dị iche iche nke Krisendọm bụ ndị kasị nwee ikpe ọmụma ọbara. N’agha ụwa abụọ nakwa n’ọtụtụ agha ndị dị nta karị, ha ejiriwo ọbara ụmụ mmadụ dee ụwa. Ònye kwesịrị ekwesị ịchọ ka e kpee ikpe ziri ezi maka ikpe ọmụma ọbara a nile? Ọ dịghị onye ọzọ ma e wezụga Onye Okike, onye ukwu Na-enye Ndụ. (Abụ Ọma 36:9) Iwu Jehova esetịpụwo ụkpụrụ a ga-agbaso: “Ị ga-emekwa ka ndụ laara ndụ.” (Ọpụpụ 21:23-25; Jenesis 9:4-6) N’ikwekọ n’iwu a, ọ ga-eme ka ọbara nke mba dị iche iche gbafuo—gbagbuo ha. Ísì nke ozu ha a na-elighị eli ga-ejupụta n’ikuku—ọ bụ ọnwụ ihere n’eziokwu! (Jeremaịa 25:33) Ọbara a gbatara ha n’ụgwọ ga-ezu ịgbaze ugwu, dị ka a pụrụ isi kwuo ya. (Zefanaịa 1:17) Mgbe e bibisịrị usuu ndị agha ha kpam kpam, mba dị iche iche nke ụwa ga-ahụ ka ọchịchị ha dara, bụ́ ndị a na-ese onyinyo ha mgbe ụfọdụ n’amụma Bible dị ka ugwu.—Daniel 2:35, 44, 45; Mkpughe 17:9.
7. Gịnị bụ “eluigwe,” gịnịkwa bụ “usuu nile nke ihe eluigwe”?
7 N’iji ihe atụ doro anya eme ihe ọzọ, Aịsaịa gara n’ihu ikwu, sị: “Usuu nile nke ihe eluigwe [ga-eretọ], a ga-apịakọtakwa eluigwe dị ka akwụkwọ odide: usuu ha nile ga-akpọnwụkwa, dị ka akwụkwọ si akpọnwụ dapụ n’osisi vine, na dị ka akwụkwọ nke na-akpọnwụ akpọnwụ si adapụ n’osisi fig.” (Aịsaịa 34:4) Okwu bụ́ “usuu nile nke ihe eluigwe” apụtaghị kpakpando na mbara ụwa nkịtị. Amaokwu nke 5 na 6 na-ekwu banyere mma agha ogbugbu ịṅụju ọbara nke ndị nọ “n’eluigwe” afọ. N’ihi ya, nke a aghaghị ịbụ ihe atụ nke ihe dị n’ógbè ụmụ mmadụ. (1 Ndị Kọrint 15:50) N’ihi ịdị elu ha dị ka ndị ọchịchị ka elu, e ji ọchịchị nke ihe a kpọrọ mmadụ tụnyere eluigwe nke na-achị òtù ụmụ mmadụ bi n’elu ala. (Ndị Rom 13:1-4) Ya mere “usuu nile nke ihe eluigwe” na-anọchite anya usuu ndị agha nile nke ọchịchị ndị a nke ihe a kpọrọ mmadụ.
8. Olee otú eluigwe ihe atụ si “dị ka akwụkwọ odide,” gịnịkwa ga-eme “ndị agha” ha?
8 “Usuu ndị agha” a “ga-eretọ,” gbarie, dị ka ihe na-emebi emebi. (Abụ Ọma 102:26; Aịsaịa 51:6) Nye onye ji anya nkịtị na-ele ya, eluigwe nkịtị nke dị anyị n’elu na-adị ka ọ rọgọrọ arọgọ, dị ka akwụkwọ odide oge ochie, nke ọ bụ n’akụkụ nke ime ya ka a na-edekarị ihe. Mgbe onye na-agụ ya gụsịrị ihe e dere n’akụkụ nke ime ya, ọ na-apịachi akwụkwọ odide ahụ a gụsịrị, debekwa ya. N’otu aka ahụ, “a [ghaghị ịpịakọta] eluigwe dị ka akwụkwọ odide,” n’echiche bụ́ na ọchịchị ụmụ mmadụ aghaghị ịbịa ná njedebe. Ebe ha ruworo ná njedebe nke akụkọ ihe mere eme ha, a ghaghị ibibi ha n’Amagedọn. “Ndị agha” ha dị ebube ga-ada nnọọ otú akwụkwọ kpọnwụrụ akpọnwụ si adapụ n’osisi vine ma ọ bụ otú “fig kpọnwụrụ akpọnwụ” (NW) si adapụ n’osisi fig. Oge ha ga-agafe.—Tụlee Mkpughe 6:12-14.
Ụbọchị Nkwụghachi Ụgwọ
9. (a) Olee otú Edọm si malite, mmekọrịta dịkwa aṅaa malitere ịdị n’etiti Israel na Edọm? (b) Gịnị ka Jehova nyere n’iwu banyere Edọm?
9 Ugbu a amụma ahụ kpọrọ otu mba nke dị adị n’oge Aịsaịa aha—Edọm. Ndị Edọm bụ ndị si n’eriri Isọ (Edọm), bụ́ onye resiri ejima ya, bụ́ Jekọb, ọnọdụ ya dị ka ọkpara n’ihi achịcha na ofe lentil. (Jenesis 25:24-34) N’ihi na Jekọb nọchiri ya dị ka ọkpara, Isọ kpọrọ nwanne ya nwoke asị nke ukwuu. Ka oge na-aga, mba Edọm na mba Israel ghọrọ ndị iro, ọ bụ ezie na ha sitere n’ụmụnne bụ́ ejima. N’ihi ibu iro a megide ndị Chineke, Edọm enwetawo iwe Jehova, bụ́ onye kwuru ugbu a, sị: “Mma agha m aṅụjuwo afọ n’eluigwe: lee, Edọm ka ọ ga-arịdakwasị, rịdakwasịkwa ndị M wezụgara ka e bibie ha, ikpe ikpe. Mma agha Jehova jupụtara n’ọbara, e mewo ka ọ maa abụba site n’abụba, site n’ọbara ụmụ atụrụ na mkpi, site n’abụba nke akụrụ ebulu: n’ihi na àjà dị [nke] Jehova nwere na Bọzra, O nwekwara oké ogbugbu n’ala Edọm.”—Aịsaịa 34:5, 6.
10. (a) Ònye ka Jehova ga-akwatu mgbe ọ ga-ebuli mma agha ya “n’eluigwe”? (b) Olee omume Edọm mere mgbe Babilọn wakporo Juda?
10 Edọm dị n’ógbè dị elu, nke jupụtara n’ugwu. (Jeremaịa 49:16; Obadaịa 8, 9, 19, 21) Ka o sina dị, ọbụna ihe nchebe ndị a e kere eke agaghị enye aka mgbe Jehova ga-ebuli mma agha ya nke ikpe “n’eluigwe,” na-akwatu ndị ọchịchị Edọm n’ọkwá ha dị elu. Edọm kwakọbara ọtụtụ ngwá agha, usuu ndị agha ya na-agafekwa ugwu ndị dị elu iji chebe mba ahụ. Ma Edọm dị ike enyereghị Juda aka mgbe ndị agha Babilọn wakporo ya. Kama nke ahụ, Edọm ṅụrịrị oké ọṅụ n’ịhụ ka alaeze Juda dara ma gbaa ndị meriri ya ume ka ha gaa n’ihu. (Abụ Ọma 137:7) Edọm ọbụna chụwara ma jide ndị Juu na-agba ọsọ maka ndụ ha wee kpụrụ ha kpụnye ndị Babilọn. (Obadaịa 11-14) Ndị Edọm na-eme atụmatụ iweghara mba ahụ ndị Israel gbahapụrụ, ha jikwa mpako na-ekwu okwu megide Jehova.—Ezikiel 35:10-15.
11. Olee otú Jehova ga-esi kwụghachi ndị Edọm ụgwọ maka omume aghụghọ ha?
11 Jehova ò leghaara omume enweghị obi nwanne a Edọm nwere anya? Ee e. Kama nke ahụ, o buru amụma banyere Edọm, sị: “Atụ ga-esokwa ha rịdaa, ụmụ oké ehi kwa, ha na oké ehi; ala ha ga-aṅụjukwa ọbara afọ, a ga-emekwa ka ájá ha maa abụba site n’abụba.” (Aịsaịa 34:7) Jehova na-ekwu banyere ndị dị elu karị na ndị dị ala karị nọ ná mba ahụ dị ka atụ na ụmụ oké ehi ihe atụ, dị ka ụmụ ebulu na mkpi. A ghaghị ime ka ala nke mba a ikpe ọbara mara bụrụ nke ọbara ndị obodo ahụ n’onwe ha dere site ná “mma agha” ogbugbu nke Jehova.
12. (a) Ònye ka Jehova ji nye Edọm ntaramahụhụ? (b) Gịnị ka Obadaịa onye amụma buru n’amụma banyere Edọm?
12 Chineke zubere inye Edọm ntaramahụhụ maka ihe e jiworo obi ọjọọ mee nzukọ elu ala Ya, nke a na-akpọ Zaịọn. Amụma ahụ kwuru, sị: “Ụbọchị ịbọ ọ́bọ̀ dị [nke] Jehova nwere, afọ nkwụghachi dịịrị iseokwu Zaịọn.” (Aịsaịa 34:8) Oge na-adịghị anya mgbe e bibisịrị Jerusalem na 607 T.O.A., Jehova malitere ịbọ ọ́bọ̀ ezi omume ya n’ahụ ndị Edọm site n’aka eze Babilọn, bụ́ Nebukadneza. (Jeremaịa 25:15-17, 21) Mgbe ndị agha Babilọn wakporo Edọm, ọ dịghị ihe ga-azọpụtali ndị Edọm! Ọ bụ “afọ nkwụghachi” nke ga-abịakwasị ala ahụ jupụtara n’ugwu. Jehova buru amụma site n’ọnụ Obadaịa onye amụma, sị: “N’ihi ihe ike e mere nwanne gị, bụ́ Jekọb, ka ihere ga-ekpuchi gị, a ga-ebipụkwa gị ruo mgbe ebighị ebi. . . . Dị ka i meworo, otú a ka a ga-eme gị; mmeso gị ga-alaghachi n’isi gị.”—Obadaịa 10, 15; Ezikiel 25:12-14.
Ọdịnihu Krisendọm nke Olileanya Na-adịghị na Ya
13. Ònye taa yiri Edọm, n’ihi gịnịkwa?
13 N’oge a, ọ dị nzukọ nke nwere ihe ndekọ yiri nke Edọm. Olee nzukọ ọ bụ? Ònye n’oge a buteworo ụzọ n’ịkatọ na ịkpagbu ndị ohu Jehova? Ọ́ bụghị Krisendọm, site n’aka òtù ndị ụkọchukwu ya? Ee! Krisendọm ebugowo onwe ya n’ebe yiri ugwu n’ihe omume ụwa a. Ọ na-ekwu na ya nọ n’ọkwá dị elu n’usoro ihe a nke ihe a kpọrọ mmadụ, okpukpe ya bụkwa akụkụ bụ́ isi nke Babilọn Ukwu ahụ. Ma Jehova akabiela “afọ nkwụghachi” megide Edọm a nke oge a n’ihi ajọ arụrụala ọ na-arụsa ndị Ya, Ndịàmà Ya.
14, 15. (a) Gịnị ga-eme ma ala Edọm ma Krisendọm? (b) Gịnị ka aka e zoro na pitch na anwụrụ ọkụ nke na-akwụgo ruo mgbe ebighị ebi pụtara, gịnịkwa ka ha na-apụtaghị?
14 N’ihi ya, ka anyị na-atụle ihe fọdụrụ n’akụkụ a nke amụma Aịsaịa, anyị na-eburu n’uche ọ bụghị nanị Edọm oge ochie kamakwa Krisendọm: “Iyi ya nile ga-agbanwe pitch, ájá ya ga-agbanwekwa brimstone, ala ya ga-aghọkwa pitch na-ere ọkụ. N’abalị ma ọ bụ n’ehihie ọ gaghị anyụ anyụ; ruo mgbe ebighị ebi ka anwụrụ ọkụ ya ga-akwụgo.” (Aịsaịa 34:9, 10a) Ala Edọm bịara kpọọ nnọọ nkụ nke na ọ dị ka a ga-asị na ájá ya bụ brimstone nakwa na iyi ya nile jupụtara, ọ bụghị na mmiri, kama na pitch. A mụnyeziri ihe ndị a na-ere ọkụ ngwa ngwa ọkụ!—Tụlee Mkpughe 17:16.
15 Ụfọdụ ewerewo nhota e hotara ọkụ, pitch, na brimstone dị ka ihe àmà na-egosi na hel na-ere ọkụ dị adị. Ma a tụbaghị Edọm n’ọkụ ala mmụọ a na-akọ n’akụkọ ifo ka o ree ọkụ ruo mgbe ebighị ebi. Kama nke ahụ, e bibiri ya, ọ pụọkwa n’ụwa dị ka a ga-asị na ọkụ na brimstone repịara ya. Dị ka amụma ahụ gara n’ihu igosi, ihe ga-esi na ya pụta n’ikpeazụ abụghị ahụhụ ebighị ebi, kama “ịtọgbọrọ n’efu . . . ịtọgbọrọ nkịtị . . . ihe efu.” (Aịsaịa 34:11, 12) Anwụrụ ọkụ ahụ ‘na-akwụgo ruo mgbe ebighị ebi’ na-eme ka nke a doo nnọọ anya. Mgbe ọkụ gbara ụlọ, anwụrụ ọkụ na-esi ná ntụ ya na-apụta ruo oge ụfọdụ mgbe ọkụ ahụ kwụsịworo ịgba, bụrụ ihe àmà nye ndị na-ahụ ya na e nwere ọkụ ọgbụgba. Ebe ndị Kraịst taa na-amụta ihe site ná mbibi nke Edọm, anwụrụ ọkụ sitere n’ọkụ gbara Edọm ka na-akwụgo, n’otu echiche.
16, 17. Gịnị ka Edọm ga-aghọ, ruo ogologo oge ha aṅaa ka ọ ga-adị otú ahụ?
16 Amụma Aịsaịa gara n’ihu, na-ekwu na anụ ọhịa, bụ́ nke na-egosi ntọgbọrọ n’efu na-abịanụ, ga-anọchi ụmụ mmadụ bi n’Edọm: “Site n’otu ọgbọ ruo ọgbọ ọzọ ọ ga-atọgbọrọ n’efu; ruo mgbe nile ebighị ebi ọ dịghị onye na-agabiga n’ime ya. Ma okwolo na ebinta ga-enweta ya; [ikwiikwii] na ugoloọma ga-ebi n’ime ya: Ọ ga-esetịkwa eriri nke ịtọgbọrọ n’efu na nkume ọ̀tụ̀tụ̀ nke ịtọgbọrọ nkịtị n’elu ya. Ndị ya a maara aha ha ka ha ga-akpọ inwe alaeze, ma ọ dịghị onye nọ n’ebe ahụ; ndị isi ya nile ga-aghọkwa ihe efu. Ogwu ga-epukwa n’ụlọ elu ya nile, akụba na ọhịa ogwu n’ebe ya nile e wusiri ike: o wee ghọọ ebe obibi nkịta ọhịa, ogige nke dịịrị enyí nnụnụ. Anụ ọhịa bi n’ala kpọrọ nkụ ga-ezutekwa anụ ọhịa na-ebe ebe, mkpi ọhịa ga-akpọkwa ibe ya; ọzọ, n’ebe ahụ ka lilith ga-anọdụ, chọtara onwe ya ebe izu ike. N’ebe ahụ ka agwọ dị ngwa ga-eme akwụ́ ya, yie àkwá.”—Aịsaịa 34:10b-15.a
17 Ee, Edọm ga-aghọ ala tọgbọrọ chakoo. Ọ ga-aghọ ala tọgbọrọ nkịtị nke ọ bụ nanị anụ ọhịa, nnụnụ, na agwọ ga-anọ na ya. Ịkpọ nkụ a nke ala ahụ ga-adịgide, dị ka amaokwu nke 10 na-ekwu, “ruo mgbe nile ebighị ebi.” A gaghị eweghachi ya.—Obadaịa 18.
Mmezu E Ji n’Aka nke Okwu Jehova
18, 19. Gịnị bụ ‘akwụkwọ Jehova,’ gịnịkwa na-echere Krisendọm n’ime ‘akwụkwọ’ a?
18 Lee ọdịnihu olileanya na-adịghị na ya nke a na-ese onyinyo ya maka Edọm nke oge a, Krisendọm! O gosiwo na ya bụ ajọ onye iro nke Jehova Chineke, bụ́ onye ọ na-akpagbu Ndịàmà Ya n’ụzọ dị ilu. Ihe ịrụ ụka adịghịkwa ya na Jehova ga-emezu ihe o kwuru. Mgbe ọ bụla onye ọ bụla ji amụma ahụ tụnyere mmezu ya, ọ ga-ahụ na ha abụọ ga-ekwekọ—dị nnọọ ka nke ọ bụla n’ihe ndị e kere eke bi n’Edọm ahụ e bibiri ebibi si nwee ‘onye ibe.’ Aịsaịa gwara ndị ga-amụ amụma Bible n’ọdịnihu, sị: “Chọpụtanụ n’akwụkwọ Jehova, gụọ: ọ dịghị otu n’ime ndị a fọdụrụ ịnọ ya, otu eleghị anya ibe ya ma ọ bịaghị: n’ihi na ọnụ m, nke ahụ nyere iwu, Mmụọ Ya kwa, Ya onwe ya chịkọtara ha. Ya onwe ya efewokwara ha nza, aka Ya ewerewokwa ya keere ha n’eriri ọ̀tụ̀tụ̀: ruo mgbe nile ka ha ga-enweta ya, ruo ọgbọ nile ka ha ga-enwe ebe obibi ha n’ime ya.”—Aịsaịa 34:16, 17.
19 E buwo mbibi na-abịanụ nke Krisendọm n’amụma “n’akwụkwọ Jehova.” ‘Akwụkwọ Jehova’ a na-enye nkọwa sara mbara banyere mpịazi nke Jehova na ndị bụ́ ndị iro ya kpọrọ ekwo nkụ na ndị mmegbu na-enweghị nchegharị nke ndị ya ga-eme. Ihe e dere n’akwụkwọ banyere Edọm oge ochie mezuru, nke a na-emekwa ka anyị nwekwuo obi ike na amụma ahụ dị ka o si metụta Krisendọm, bụ́ ihe yiri Edọm n’oge a, ga-emezu n’otu aka ahụ. ‘Eriri ọ̀tụ̀tụ̀,’ bụ́ ụkpụrụ Jehova ji eme ihe, na-eme ka e jide n’aka na nzukọ a na-anwụ anwụ n’ụzọ ime mmụọ ga-aghọ ala tọgbọrọ nkịtị.
20. Dị ka Edọm oge ochie, gịnị ga-eme Krisendọm?
20 Krisendọm na-eme ihe nile o nwere ike ime iji mee ka obi dajụọ ndị enyi ya bụ́ ndị ọchịchị, ma o nweghị isi! Dị ka Mkpughe isi nke 17 na 18 si kwuo, Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile, bụ́ Jehova, ga-etinye ya n’ime obi ha ka ha mee ihe megide Babilọn Ukwu ahụ, tinyere Krisendọm. Nke a ga-eme ka a ghara inwekwa Iso Ụzọ Kraịst adịgboroja n’ebe ọ bụla n’ụwa. Ọnọdụ Krisendọm ga-eyi ọnọdụ enweghị olileanya ahụ a kọwara n’Aịsaịa isi nke 34. Ọ gaghịdị anọ ya n’oge “agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke, Onye pụrụ ime ihe nile,” nke ga-ekpebi ihe nile! (Mkpughe 16:14) Dị ka Edọm oge ochie, a ga-ekpochapụ Krisendọm kpam kpam n’elu ala, “ruo mgbe nile ebighị ebi.”
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ka ọ na-erule n’oge Malakaị, amụma a emezuola. (Malakaị 1:3) Malakaị na-akọ na ndị Edọm tụrụ anya iwereghachi ala ha e bibiri ebibi. (Malakaị 1:4) Otú ọ dị, nke a abụghị ọchịchọ Jehova, ka oge na-agakwa, ndị ọzọ, ndị Nabataea, weghaara ebe bụbu ala Edọm.
Igbe dị na peeji nke 363]
Ọ̀ Bụ Chineke Na-ewekarị Iwe?
Okwu, ndị dị ka ndị ahụ dị n’Aịsaịa 34:2-7 akpaliwo ọtụtụ ndị iche na Jehova, di ka e si kọwaa ya n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, bụ Chineke obi ọjọọ, nke na-ewekarị iwe. Ọ̀ bụ?
Ee e. Ọ bụ ezie na Chineke na-egosipụta iwe ya mgbe ụfọdụ, a na-enwe ezi ihe kpatara ụdị iwe ahụ mgbe nile. Ọ na-adabere mgbe nile n’ụkpụrụ, ọ bụghị ná mmetụta uche a na-achịkwaghị achịkwa. Ọzọkwa, ọ na-abụ mgbe nile ikike Onye Okike nwere inweta ofufe a na-ekewaghị ekewa na nkwado ọ na-akwado eziokwu mgbe nile na-akpata ya. Ọ bụ ma ịhụnanya Chineke maka ezi omume ma ịhụnanya o nwere n’ebe ndị na-eme ezi omume nọ na-achịkwa iwe ya. Jehova na-ahụ ihe nile metụtara otu okwu, ọ makwaara n’ụzọ zuru ezu na n’ụzọ a na-akparaghị ókè ihe nile banyere otu ọnọdụ. (Ndị Hibru 4:13) Ọ na-enyocha obi; ọ na-achọpụta òkè ụfọdụ nke amaghị nke a na-akọ, nleghara anya, ma ọ bụ mmehie e leziri anya mee; ọ na-emekwa ihe n’eleghị mmadụ anya n’ihu.—Deuterọnọmi 10:17, 18; 1 Samuel 16:7; Ọrụ 10:34, 35.
Otú ọ dị, Jehova Chineke ‘adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, ọ na-abakwa ụba n’ebere.’ (Ọpụpụ 34:6) Ọ na-emere ndị na-atụ egwu ya ma na-agbalị ime ezi omume ebere, n’ihi na Onye Pụrụ Ime Ihe Nile ghọtara ezughị okè e ketara eketa nke mmadụ ma na-emere ya ebere n’ihi nke a. Taa Chineke na-eme nke a dabere n’àjà Jisọs. (Abụ Ọma 103:13, 14) N’oge kwesịrị ekwesị, a na-ewepụ iwe Jehova n’ahụ ndị kwetara mmehie ha, chegharịa, ma fee ya n’eziokwu. (Aịsaịa 12:1) N’ụzọ bụ́ isi, Jehova abụghị Chineke na-ewekarị iwe kama Chineke obi ụtọ, ọ bụghị onye a na-apụghị ịgakwuru kama onye na-anabata ndị ọzọ, onye na-achọ udo, ma dị jụụ n’ebe ndị na-agakwuru ya n’ụzọ kwesịrị ekwesị nọ. (1 Timoti 1:11, NW) Nke a dị nnọọ iche n’àgwà ịkpọ obi nkụ, nke obi ọjọọ a na-ekwu na chi ụgha dị iche iche nke ndị ọgọ mmụọ nwere, ndị a na-egosipụtakwa n’ihe osise nke chi ndị ahụ.
[[Map dị na peeji 362]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
Osimiri Ukwu
Damaskọs
Saịdọn
Taịa
ISRAEL
Dan
Oké Osimiri Galili
Osimiri Jọdan
Megido
Remọt-gilead
Sameria
FILISTIA
JUDA
Jerusalem
Libna
Lekish
Bia-sheba
Kedesh-banea
Oké Osimiri Nnu
AMỌN
Raba
MOAB
Kia-hareset
EDỌM
Bọzra
Timan
[Foto ndị dị na peeji nke 359]
Krisendọm ejiriwo ọbara dee ụwa
[Foto dị na peeji nke 360]
“A ga-apịakọtakwa eluigwe dị ka akwụkwọ odide”