-
Jehova Ewesa Mba Dị Iche Iche IweAmụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
-
-
7. Gịnị bụ “eluigwe,” gịnịkwa bụ “usuu nile nke ihe eluigwe”?
7 N’iji ihe atụ doro anya eme ihe ọzọ, Aịsaịa gara n’ihu ikwu, sị: “Usuu nile nke ihe eluigwe [ga-eretọ], a ga-apịakọtakwa eluigwe dị ka akwụkwọ odide: usuu ha nile ga-akpọnwụkwa, dị ka akwụkwọ si akpọnwụ dapụ n’osisi vine, na dị ka akwụkwọ nke na-akpọnwụ akpọnwụ si adapụ n’osisi fig.” (Aịsaịa 34:4) Okwu bụ́ “usuu nile nke ihe eluigwe” apụtaghị kpakpando na mbara ụwa nkịtị. Amaokwu nke 5 na 6 na-ekwu banyere mma agha ogbugbu ịṅụju ọbara nke ndị nọ “n’eluigwe” afọ. N’ihi ya, nke a aghaghị ịbụ ihe atụ nke ihe dị n’ógbè ụmụ mmadụ. (1 Ndị Kọrint 15:50) N’ihi ịdị elu ha dị ka ndị ọchịchị ka elu, e ji ọchịchị nke ihe a kpọrọ mmadụ tụnyere eluigwe nke na-achị òtù ụmụ mmadụ bi n’elu ala. (Ndị Rom 13:1-4) Ya mere “usuu nile nke ihe eluigwe” na-anọchite anya usuu ndị agha nile nke ọchịchị ndị a nke ihe a kpọrọ mmadụ.
8. Olee otú eluigwe ihe atụ si “dị ka akwụkwọ odide,” gịnịkwa ga-eme “ndị agha” ha?
8 “Usuu ndị agha” a “ga-eretọ,” gbarie, dị ka ihe na-emebi emebi. (Abụ Ọma 102:26; Aịsaịa 51:6) Nye onye ji anya nkịtị na-ele ya, eluigwe nkịtị nke dị anyị n’elu na-adị ka ọ rọgọrọ arọgọ, dị ka akwụkwọ odide oge ochie, nke ọ bụ n’akụkụ nke ime ya ka a na-edekarị ihe. Mgbe onye na-agụ ya gụsịrị ihe e dere n’akụkụ nke ime ya, ọ na-apịachi akwụkwọ odide ahụ a gụsịrị, debekwa ya. N’otu aka ahụ, “a [ghaghị ịpịakọta] eluigwe dị ka akwụkwọ odide,” n’echiche bụ́ na ọchịchị ụmụ mmadụ aghaghị ịbịa ná njedebe. Ebe ha ruworo ná njedebe nke akụkọ ihe mere eme ha, a ghaghị ibibi ha n’Amagedọn. “Ndị agha” ha dị ebube ga-ada nnọọ otú akwụkwọ kpọnwụrụ akpọnwụ si adapụ n’osisi vine ma ọ bụ otú “fig kpọnwụrụ akpọnwụ” (NW) si adapụ n’osisi fig. Oge ha ga-agafe.—Tụlee Mkpughe 6:12-14.
-
-
Jehova Ewesa Mba Dị Iche Iche IweAmụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
-
-
[Foto dị na peeji nke 360]
“A ga-apịakọtakwa eluigwe dị ka akwụkwọ odide”
-