-
Jehova Ewesa Mba Dị Iche Iche IweAmụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
-
-
Ụbọchị Nkwụghachi Ụgwọ
9. (a) Olee otú Edọm si malite, mmekọrịta dịkwa aṅaa malitere ịdị n’etiti Israel na Edọm? (b) Gịnị ka Jehova nyere n’iwu banyere Edọm?
9 Ugbu a amụma ahụ kpọrọ otu mba nke dị adị n’oge Aịsaịa aha—Edọm. Ndị Edọm bụ ndị si n’eriri Isọ (Edọm), bụ́ onye resiri ejima ya, bụ́ Jekọb, ọnọdụ ya dị ka ọkpara n’ihi achịcha na ofe lentil. (Jenesis 25:24-34) N’ihi na Jekọb nọchiri ya dị ka ọkpara, Isọ kpọrọ nwanne ya nwoke asị nke ukwuu. Ka oge na-aga, mba Edọm na mba Israel ghọrọ ndị iro, ọ bụ ezie na ha sitere n’ụmụnne bụ́ ejima. N’ihi ibu iro a megide ndị Chineke, Edọm enwetawo iwe Jehova, bụ́ onye kwuru ugbu a, sị: “Mma agha m aṅụjuwo afọ n’eluigwe: lee, Edọm ka ọ ga-arịdakwasị, rịdakwasịkwa ndị M wezụgara ka e bibie ha, ikpe ikpe. Mma agha Jehova jupụtara n’ọbara, e mewo ka ọ maa abụba site n’abụba, site n’ọbara ụmụ atụrụ na mkpi, site n’abụba nke akụrụ ebulu: n’ihi na àjà dị [nke] Jehova nwere na Bọzra, O nwekwara oké ogbugbu n’ala Edọm.”—Aịsaịa 34:5, 6.
10. (a) Ònye ka Jehova ga-akwatu mgbe ọ ga-ebuli mma agha ya “n’eluigwe”? (b) Olee omume Edọm mere mgbe Babilọn wakporo Juda?
10 Edọm dị n’ógbè dị elu, nke jupụtara n’ugwu. (Jeremaịa 49:16; Obadaịa 8, 9, 19, 21) Ka o sina dị, ọbụna ihe nchebe ndị a e kere eke agaghị enye aka mgbe Jehova ga-ebuli mma agha ya nke ikpe “n’eluigwe,” na-akwatu ndị ọchịchị Edọm n’ọkwá ha dị elu. Edọm kwakọbara ọtụtụ ngwá agha, usuu ndị agha ya na-agafekwa ugwu ndị dị elu iji chebe mba ahụ. Ma Edọm dị ike enyereghị Juda aka mgbe ndị agha Babilọn wakporo ya. Kama nke ahụ, Edọm ṅụrịrị oké ọṅụ n’ịhụ ka alaeze Juda dara ma gbaa ndị meriri ya ume ka ha gaa n’ihu. (Abụ Ọma 137:7) Edọm ọbụna chụwara ma jide ndị Juu na-agba ọsọ maka ndụ ha wee kpụrụ ha kpụnye ndị Babilọn. (Obadaịa 11-14) Ndị Edọm na-eme atụmatụ iweghara mba ahụ ndị Israel gbahapụrụ, ha jikwa mpako na-ekwu okwu megide Jehova.—Ezikiel 35:10-15.
-
-
Jehova Ewesa Mba Dị Iche Iche IweAmụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
-
-
12. (a) Ònye ka Jehova ji nye Edọm ntaramahụhụ? (b) Gịnị ka Obadaịa onye amụma buru n’amụma banyere Edọm?
12 Chineke zubere inye Edọm ntaramahụhụ maka ihe e jiworo obi ọjọọ mee nzukọ elu ala Ya, nke a na-akpọ Zaịọn. Amụma ahụ kwuru, sị: “Ụbọchị ịbọ ọ́bọ̀ dị [nke] Jehova nwere, afọ nkwụghachi dịịrị iseokwu Zaịọn.” (Aịsaịa 34:8) Oge na-adịghị anya mgbe e bibisịrị Jerusalem na 607 T.O.A., Jehova malitere ịbọ ọ́bọ̀ ezi omume ya n’ahụ ndị Edọm site n’aka eze Babilọn, bụ́ Nebukadneza. (Jeremaịa 25:15-17, 21) Mgbe ndị agha Babilọn wakporo Edọm, ọ dịghị ihe ga-azọpụtali ndị Edọm! Ọ bụ “afọ nkwụghachi” nke ga-abịakwasị ala ahụ jupụtara n’ugwu. Jehova buru amụma site n’ọnụ Obadaịa onye amụma, sị: “N’ihi ihe ike e mere nwanne gị, bụ́ Jekọb, ka ihere ga-ekpuchi gị, a ga-ebipụkwa gị ruo mgbe ebighị ebi. . . . Dị ka i meworo, otú a ka a ga-eme gị; mmeso gị ga-alaghachi n’isi gị.”—Obadaịa 10, 15; Ezikiel 25:12-14.
Ọdịnihu Krisendọm nke Olileanya Na-adịghị na Ya
13. Ònye taa yiri Edọm, n’ihi gịnịkwa?
13 N’oge a, ọ dị nzukọ nke nwere ihe ndekọ yiri nke Edọm. Olee nzukọ ọ bụ? Ònye n’oge a buteworo ụzọ n’ịkatọ na ịkpagbu ndị ohu Jehova? Ọ́ bụghị Krisendọm, site n’aka òtù ndị ụkọchukwu ya? Ee! Krisendọm ebugowo onwe ya n’ebe yiri ugwu n’ihe omume ụwa a. Ọ na-ekwu na ya nọ n’ọkwá dị elu n’usoro ihe a nke ihe a kpọrọ mmadụ, okpukpe ya bụkwa akụkụ bụ́ isi nke Babilọn Ukwu ahụ. Ma Jehova akabiela “afọ nkwụghachi” megide Edọm a nke oge a n’ihi ajọ arụrụala ọ na-arụsa ndị Ya, Ndịàmà Ya.
-