Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • A Gaje Ikpochapụ Ihe Dị n’Oge A nke Yiri Edọm
    Inọ ná Ntụkwasị Obi Zuru Ụwa Ọnụ n’Okpuru “Onyeisi Udo” Ahụ
    • 11, 12. Site ná nkọwa amụma e nyere n’Aịsaịa 34:​10-⁠15, gịnị ga-eme ala Edọm, ogologo oge hàkwa aṅaa ka ọnọdụ nke ala ahụ gadịru?

      11 Amụma Aịsaịa gara n’ihu, sị: “Site n’otu ọgbọ ruo ọgbọ ọzọ ọ ga-atọgbọrọ n’efu; ruo mgbe nile ebighị ebi ọ dịghị onye na-agabiga n’ime ya. Ma okwolo na ebinta ga-enweta ya; okwukwu na ugoloọma ga-ebi n’ime ya: ọ ga-esetikwa eriri nke ịtọgbọrọ n’efu na nkume ọ̀tụ̀tụ̀ nke ịtọgbọrọ nkịtị n’elu ya. Ndị ya a maara aha ha ka ha ga-akpọ inwe alaeze, ma ọ dịghị onye nọ n’ebe ahụ; ndị isi ya nile ga-aghọkwa ihe efu. Ogwu ga-epukwa n’ụlọ elu ya nile, akụba na ọhịa ogwu n’ebe ya nile e wusiri ike: o wee ghọọ ebe obibi nkịta ọhịa, ogige nke dịịrị enyi nnụnụ. Anụ ọhịa bi n’ala kpọrọ nkụ ga-ezutekwa anụ ọhịa n’ebe ebe, mkpi ọhịa ga-akpọkwa ibe ya; ọzọ, n’ebe ahụ ka lilith ga-anọdụ, chọtara onwe ya ebe izu ike. N’ebe ahụ ka agwọ dị ngwa ga-eme akwụ ya, yie àkwá.”​—⁠Aịsaịa 34:​10-⁠15.

      12 Edọm ga-aghọ ala “ịtọgbọrọ n’efu” ma a bịa n’ihe banyere mmadụ. Ọ gaje ịbụ ala tọgbọrọ nkịtị nke nwere nanị anụ ọhịa, nnụnụ, na agwọ n’ime ya. Ọnọdụ ihe na-adịghị ya nke ala ahụ gaje ịga n’ihu, dị ka Aịs 34 amaokwu nke 10 na-ekwu, “mgbe nile ebighị ebi.” Ndị bi n’ime ya ná mbụ agajeghị ịlọghachite.​—⁠Obadaịa 18.

      13. Gịnị ka e buru n’amụma maka Krisendọm “n’akwụkwọ Jehova,” gịnịkwa kpọmkwem ka akwụkwọ a bụ?

      13 Lee ajọ ihe nke nke a sere onyinyo ya maka ihe dị n’oge a nke nọchiri anya Edọm​—⁠Krisendọm! O gosipụtawo onwe ya ịbụ onye iro nwere obi ilu nke Jehova Chineke, bụ́ onye o jiworo obi ọjọọ sogbuo Ndịàmà ya. Ya mere mbibi nke a a gaje ibibi ya n’oge na-adịghị anya tupu Amagedọn abụrụwo nke e buru n’amụma “n’akwụkwọ Jehova.” (Aịsaịa 34:16) N’ikwu ya kpọmkwem, ‘akwụkwọ Jehova’ nke a bụ akwụkwọ ya nke ihe ndekọ, na-edepụtazu akụkọ nke ihe ndị iro ya na ndị na-akpagbu ndị ya ga-azara ọnụ ha na ya. Ihe e dere “n’akwụkwọ Jehova” banyere Edọm oge ochie mezuru, nke a bụkwa ihe na-eme ka e jide n’aka na amụma ahụ dị ka o si emetụta Krisendọm, Edọm nke oge a, ga-emezukwa n’otu aka ahụ.

  • A Gaje Ikpochapụ Ihe Dị n’Oge A nke Yiri Edọm
    Inọ ná Ntụkwasị Obi Zuru Ụwa Ọnụ n’Okpuru “Onyeisi Udo” Ahụ
    • 15, 16. Gịnị bụ ọdịnihu dị nso nke Krisendọm, dị ka e buru n’amụma na Mkpughe isi 17 na 18 na n’Aịsaịa nke 34?

      15 Ọdịnihu na-adịghị anya nke Krisendọm bụ nke olileanya na-adịghị na ya n’ezie. Ọ na-eme ihe nile ọ pụrụ ime iji mee ka obi jụrụ ndị enyi ya bụ́ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma gbochie ha ijikọta aka n’otu n’omume mwakwasị megide ya, nke gaje ịrụpụta mbibi a gaje ibibi ya kpam kpam, ma o nweghị nke nwere isi!

      16 Dị ka Mkpughe isi 17 na 18 si kwuo, Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile, bụ́ Jehova, ga-etinye ya n’obi ha inye ikike ndọrọ ndọrọ ọchịchị na nke agha ha maka omume anụ ọhịa megide Babilọn Ukwu ahụ n’akụkụ okpukpe ya nile, tinyere Krisendọm. Nke a ga-ewepụsị Iso Ụzọ Kraịst ụgha n’ụwa nile. Ọnọdụ nke Krisendọm ga-adị ka ọnọdụ enweghị olileanya ahụ a kọwara n’Aịsaịa nke 34. Ọ gaghị anọ ya ịhụ “agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Nile,” bụ́ nke ga-ekpebi ihe nile, megide mba nile, bụ́ ndị ga-ebibiworị Babilọn Ukwu ahụ. A ga-ekpochapụ kpam kpam n’elu ala, ihe ahụ yiri Edọm, bụ́ Krisendọm, “ruo mgbe nile ebighị ebi.”

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya