-
A Gaje Ikpochapụ Ihe Dị n’Oge A nke Yiri EdọmInọ ná Ntụkwasị Obi Zuru Ụwa Ọnụ n’Okpuru “Onyeisi Udo” Ahụ
-
-
11, 12. Site ná nkọwa amụma e nyere n’Aịsaịa 34:10-15, gịnị ga-eme ala Edọm, ogologo oge hàkwa aṅaa ka ọnọdụ nke ala ahụ gadịru?
11 Amụma Aịsaịa gara n’ihu, sị: “Site n’otu ọgbọ ruo ọgbọ ọzọ ọ ga-atọgbọrọ n’efu; ruo mgbe nile ebighị ebi ọ dịghị onye na-agabiga n’ime ya. Ma okwolo na ebinta ga-enweta ya; okwukwu na ugoloọma ga-ebi n’ime ya: ọ ga-esetikwa eriri nke ịtọgbọrọ n’efu na nkume ọ̀tụ̀tụ̀ nke ịtọgbọrọ nkịtị n’elu ya. Ndị ya a maara aha ha ka ha ga-akpọ inwe alaeze, ma ọ dịghị onye nọ n’ebe ahụ; ndị isi ya nile ga-aghọkwa ihe efu. Ogwu ga-epukwa n’ụlọ elu ya nile, akụba na ọhịa ogwu n’ebe ya nile e wusiri ike: o wee ghọọ ebe obibi nkịta ọhịa, ogige nke dịịrị enyi nnụnụ. Anụ ọhịa bi n’ala kpọrọ nkụ ga-ezutekwa anụ ọhịa n’ebe ebe, mkpi ọhịa ga-akpọkwa ibe ya; ọzọ, n’ebe ahụ ka lilith ga-anọdụ, chọtara onwe ya ebe izu ike. N’ebe ahụ ka agwọ dị ngwa ga-eme akwụ ya, yie àkwá.”—Aịsaịa 34:10-15.
12 Edọm ga-aghọ ala “ịtọgbọrọ n’efu” ma a bịa n’ihe banyere mmadụ. Ọ gaje ịbụ ala tọgbọrọ nkịtị nke nwere nanị anụ ọhịa, nnụnụ, na agwọ n’ime ya. Ọnọdụ ihe na-adịghị ya nke ala ahụ gaje ịga n’ihu, dị ka Aịs 34 amaokwu nke 10 na-ekwu, “mgbe nile ebighị ebi.” Ndị bi n’ime ya ná mbụ agajeghị ịlọghachite.—Obadaịa 18.
13. Gịnị ka e buru n’amụma maka Krisendọm “n’akwụkwọ Jehova,” gịnịkwa kpọmkwem ka akwụkwọ a bụ?
13 Lee ajọ ihe nke nke a sere onyinyo ya maka ihe dị n’oge a nke nọchiri anya Edọm—Krisendọm! O gosipụtawo onwe ya ịbụ onye iro nwere obi ilu nke Jehova Chineke, bụ́ onye o jiworo obi ọjọọ sogbuo Ndịàmà ya. Ya mere mbibi nke a a gaje ibibi ya n’oge na-adịghị anya tupu Amagedọn abụrụwo nke e buru n’amụma “n’akwụkwọ Jehova.” (Aịsaịa 34:16) N’ikwu ya kpọmkwem, ‘akwụkwọ Jehova’ nke a bụ akwụkwọ ya nke ihe ndekọ, na-edepụtazu akụkọ nke ihe ndị iro ya na ndị na-akpagbu ndị ya ga-azara ọnụ ha na ya. Ihe e dere “n’akwụkwọ Jehova” banyere Edọm oge ochie mezuru, nke a bụkwa ihe na-eme ka e jide n’aka na amụma ahụ dị ka o si emetụta Krisendọm, Edọm nke oge a, ga-emezukwa n’otu aka ahụ.
-
-
A Gaje Ikpochapụ Ihe Dị n’Oge A nke Yiri EdọmInọ ná Ntụkwasị Obi Zuru Ụwa Ọnụ n’Okpuru “Onyeisi Udo” Ahụ
-
-
15, 16. Gịnị bụ ọdịnihu dị nso nke Krisendọm, dị ka e buru n’amụma na Mkpughe isi 17 na 18 na n’Aịsaịa nke 34?
15 Ọdịnihu na-adịghị anya nke Krisendọm bụ nke olileanya na-adịghị na ya n’ezie. Ọ na-eme ihe nile ọ pụrụ ime iji mee ka obi jụrụ ndị enyi ya bụ́ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma gbochie ha ijikọta aka n’otu n’omume mwakwasị megide ya, nke gaje ịrụpụta mbibi a gaje ibibi ya kpam kpam, ma o nweghị nke nwere isi!
16 Dị ka Mkpughe isi 17 na 18 si kwuo, Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile, bụ́ Jehova, ga-etinye ya n’obi ha inye ikike ndọrọ ndọrọ ọchịchị na nke agha ha maka omume anụ ọhịa megide Babilọn Ukwu ahụ n’akụkụ okpukpe ya nile, tinyere Krisendọm. Nke a ga-ewepụsị Iso Ụzọ Kraịst ụgha n’ụwa nile. Ọnọdụ nke Krisendọm ga-adị ka ọnọdụ enweghị olileanya ahụ a kọwara n’Aịsaịa nke 34. Ọ gaghị anọ ya ịhụ “agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Nile,” bụ́ nke ga-ekpebi ihe nile, megide mba nile, bụ́ ndị ga-ebibiworị Babilọn Ukwu ahụ. A ga-ekpochapụ kpam kpam n’elu ala, ihe ahụ yiri Edọm, bụ́ Krisendọm, “ruo mgbe nile ebighị ebi.”
-