Ihe ahụ Na-apụta n’Oge
N’IME osisi nile ndị na-amị mkpụrụ nke ógbè Mediterranea, osisi almond so ná ndị kasị na-akpali akpali. Ná ngwụsị January ma ọ bụ February—kpọmkwem tupu ihe ka ọtụtụ n’osisi ndị ọzọ—ọ na-eteta site n’ụra oge oyi ya. Leekwa aha nteta nke a bụ! Osisi ahụ dum na-ejupụta n’ụyọkọ okooko osisi na-acha pinki pinki ma ọ bụ na-acha ọcha, nke ahụ na-acha ọcha na-eyitụ agịrị isi ọcha nke onye meworo agadi.—Tụlee Eklisiastis 12:5.
Ndị Hibru oge ochie kpọrọ osisi almond “onye na-eteta n’ụra,” na-eji ya akọwa ọmụma ọ na-ama okooko osisi n’oge. Jehova ji àgwà nke a mee ihe iji kọwaa otu ozi dị mkpa. Ná mmalite nke ije ozi ya, e gosiri Jeremaịa n’ọhụụ otu almond na-epupụta epupụta. Gịnị ka ọ pụtara? Jehova kọwara, sị: “Onye na-amụ anya ka m bụ n’ebe okwu m dị ime ya.”—Jeremaịa 1:12.
Dị nnọọ ka osisi almond ‘na-eteta n’ụra’ n’oge, otú ahụ ka Jehova siworo n’ụzọ ihe atụ “na-ebili n’isi ụtụtụ” izite ndị amụma ya iji dọọ ndị ya aka ná ntị banyere ihe ga-esi ná nnupụisi pụta. (Jeremaịa 7:25) Ọ gaghị ezu ike—ọ ‘ga-eteta n’ụra’—ruo mgbe e mezuru okwu amụma ya. Otú ahụ ka ọ dị n’afọ 607 T.O.A., n’oge a kara aka, ikpe Jehova bịakwasịrị mba Juda ahụ si n’ezi ofufe dapụ.
Okwu Chineke na-ebu amụma na ikpe yiri nke ahụ ga-abịakwasị ajọ usoro ihe nke anyị bi n’ime ya. (Abụ Ọma 37:9, 10; 2 Pita 3:10-13) N’izo aka n’omume ikpe ikpe dị otú ahụ, onye amụma bụ́ Habakuk na-emesi anyị obi ike, sị: “N’ihi na ọhụụ ahụ na-adịru mgbe a kara aka . . . Chere ya; n’ihi na ọ ghaghị ịbịa, ọ gaghị anọ ọdụ.” (Habakuk 2:3) Ọmụma akwụkwọ ahụ mara mma nke almond na-echetara anyị na Jehova ga-amụ anya n’ihe banyere okwu ya iji hụ na e mezuru ya.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 32]
Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.