Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 3/1 p. 17-23
  • Esemokwu Jehova na Mba Nile

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Esemokwu Jehova na Mba Nile
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ikpe Megide Ógbè Krisendọm Na-anakwere Ihe Ọjọọ
  • Ikpe Megide Babilọn Ukwu Ahụ
  • Ikpe Megide “Mba Nile”
  • Ndị Ọzụzụ Atụrụ Ga-akwa Ákwá, Tiekwa Mkpu
  • “Jehova Emewo Ihe O bu n’Obi”
    Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
  • Ije Ozi “n’Oge Ikpeazụ”
    Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Jeremaịa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 3/1 p. 17-23

Esemokwu Jehova na Mba Nile

“Mkpọtụ na-abịaru nsọtụ ụwa; n’ihi na Jehova nwere okwu ikpe megide mba nile.”​—⁠JEREMAỊA 25:31.

1, 2. (a) Gịnị mere na Juda mgbe Eze Josaịa nwụsịrị? (b) Ònye bụ eze ikpeazụ nke Juda, oleekwa otú o si taa ahụhụ n’ihi ekwesịghị ntụkwasị obi ya?

ALA Juda chere oge ndị dị oké egwu ihu. Otu ezi eze, bụ́ Josaịa, emewo ka iwe dị ọkụ nke Jehova laa azụ ruo nwa oge. Ma gịnị sochiri mgbe e gburu Josaịa na 629 T.O.A.? Eze nke nọchiri ya egosighị Jehova nsọpụrụ.

2 Eze ikpeazụ nke Juda, bụ́ Zedekaịa, nwa nke anọ nke Josaịa, gara n’ihu, dị ka 2 Ndị Eze 24:19 na-ekwu, “mee ihe jọrọ njọ n’anya Jehova, dị ka ihe nile si dị nke Jehoịakim [nwanne ya nwoke nke tọrọ ya] mere.” Gịnị si n’ime ya pụta? Nebukadneza bịakwasịrị Jerusalem, jide Zedekaịa, gbuo ụmụ ya ndị ikom n’anya ya, rụkpọọ ya anya abụọ, ma kpọrọ ya jee Babilọn. Ọzọkwa, ndị Babilọn chịkọọrọ arịa ndị e ji eme ihe n’ofufe Jehova dị ka ihe a lụtara n’agha, na-esure ụlọ nsọ ahụ na obodo ahụ n’ọkụ. Ndị lanarịrị ghọrọ ndị a dọtara n’agha na Babilọn.

3. Oge dị aṅaa malitere ná mbibi nke Jerusalem na 607 T.O.A., gịnịkwa ka oge ya ruru ka o mee ná ngwụsị nke oge ahụ?

3 Afọ ahụ, 607 T.O.A., kara akara ọ bụghị nanị mbibi ikpeazụ nke Jerusalem kamakwa mmalite nke “oge nke mba ọzọ,” bụ́ nke e zoro aka na ya na Luk 21:24. Ogologo oge nke a dị 2,520 afọ gwụrụ na narị afọ nke anyị, n’afọ 1914. Mgbe ahụ oge ruru ka Jehova, site n’aka Ọkpara ya e chiri eze, bụ́ Jisọs Kraịst, onye ka Nebukadneza ukwuu, kpọsaa ma mee ihe e kpere n’ikpe n’ahụ ụwa rụrụ arụ. Ikpe ikpe nke a na-amalite n’ahụ ihe dị n’oge a nke ya na Juda bụ otu ihe ahụ, ihe yiri ya nke na-azọrọ na ya na-anọchite anya Chineke na Kraịst n’elu ụwa.

4. Olee ajụjụ ndị e welitere ugbu a n’ihe banyere amụma Jeremaịa?

4 Ànyị na-ahụ myirịta dị n’etiti ọgba aghara ahụ e nwere n’ime afọ ikpeazụ ndị ahụ nke Juda n’okpuru ndị eze ya​—⁠nke ihe omume ndị na-emebi ihe, bụ́ ndị na-emetụtakwa mba ndị agbata obi ya⁠—​na ọgba aghara e nwere na Krisendọm taa? N’ezie anyị na-ahụ ya! Mgbe ahụ, gịnị ka amụma Jeremaịa na-egosi banyere ụzọ Jehova ga-esi eme ihe taa? Ka anyị lee.

5, 6. (a) Kemgbe 1914, olee otú ọnọdụ dị na Krisendọm siworo yie nke dị na Juda kpọmkwem tupu mbibi ya? (b) Olee ozi Jeremaịa nke oge a bugawooro Krisendọm?

5 Onye Britain bụ́ ọkà mmụta mgbakọ na mwepụ na amamihe ụwa bụ́ Bertrand Russell kwuru n’ihe dị ka 40 afọ gara aga, sị: “Kemgbe 1914, onye ọ bụla nke maara ihe na-aga n’ụwa enweela mwute dị ukwuu n’ihi ihe yiworo ịzọ ije e bu ụzọ kaa aka ijeru ọdachi ka ukwuu.” Onye nọ n’ọkwá ọchịchị dị elu na Germany bụ́ Konrad Adenauer kwukwara, sị: “Ịnọ ná ntụkwasị obi na ịnọ jụụ apụwo ná ndụ ụmụ mmadụ kemgbe 1914.”

6 Taa, dị ka ọ dị n’ụbọchị Jeremaịa, ejiwo oké nkwafu ọbara nke ndị ọ na-adịghị ihe ha mere kaa akara mbịaru a na-abịaru nso n’ọgwụgwụ usoro ihe nke a, karịsịa n’ime agha ụwa abụọ ndị ahụ nke narị afọ nke a. Akụkụ ka ukwuu nke ndị lụrụ agha ahụ bụ mba dị iche iche nke Krisendọm, bụ́ nke na-azọrọ na ya na-efe Chineke nke Bible. Lee ụdị ihu abụọ nke ahụ bụ! Ọ bụghị ihe ijuanya na Jehova zigaara ha Ndịàmà ya na-ekwu, dị ka ọ dị n’okwu ndị ahụ nke Jeremaịa 25:​5, 6: “Biko, latanụ, onye ọ bụla ya si n’ụzọ ọjọọ ya na n’ihe ọjọọ nke omume nile unu lata, . . . unu ejesokwala chi ọzọ ife ha na ịkpọ isiala nye ha, unu ejikwala ọrụ aka unu kpasuo m iwe; m gaghị emekwa unu ihe ọjọọ.”

7. Olee ihe àmà e nwere nke na Krisendọm elegharawo ịdọ ná ntị nile nke Jehova anya?

7 Otú ọ dị, mba nile nke Krisendọm ajụwo ịlata. E gosiwo nke a site na ha ịchụkwuru chi nke agha àjà na Korea na Vietnam. Ha anọgidewokwa na-akwado ndị ahịa ọnwụ, ndị na-emepụta ngwá agha, n’ụzọ ego. Ala dị iche iche nke Krisendọm wetara akụkụ ka ukwuu nke ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu puku ijeri dollar e mefuru ná ngwá agha kwa afọ n’ime afọ ndị 1980. Site na 1951 ruo 1991, ego a mawapụtara maka ndị agha na United States nanị karịrị nchịkọta uru ahịa nke ụlọ ọrụ nile nke America ma a chịkọta ha ọnụ. Kemgbe ọgwụgwụ a kpọsara n’ụzọ dara ụda nke Agha Nzuzo ahụ, e gbubilatara ngwá agha ndị meworo ochie, ma nnukwu nkwakọba nke ngwá agha ndị dị ọbụna njọ karị ka dị, a nọgidewo na-emepụta ha. Otu ụbọchị a pụrụ iji ndị a mee ihe.

Ikpe Megide Ógbè Krisendọm Na-anakwere Ihe Ọjọọ

8. Olee otú a ga-esi mezuo okwu ndị nke Jeremaịa 25:​8, 9 n’isi Krisendọm?

8 Okwu ndị ọzọ Jehova kwuru, ndị a na-achọta na Jeremaịa 25:​8, 9, na-emetụta Krisendọm ugbu a kpọmkwem, bụ́ nke daworo n’ime ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ ezi omume dị iche iche nke ndị Kraịst: “N’ihi nke a ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha ji sị otú a: N’ihi na unu anụghị okwu m nile, lee, m gaje iziga chịrị agbụrụ nile nke Ugwu, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta), ọ bụkwa Nebukadreza, bụ́ eze Babilọn, bụ́ ohu m, ka M ga-ezigara ozi, M ga-emekwa ka ha bịa imegide ala nke a, na imegide ndị bi na ya, na imegide mba nile ndị a nọ ya gburugburu; M ga-ewezụgakwa ha ka e bibie ha, M ga-emekwa ha ka ha ghọọ ihe ijuanya, na ihe ịma ọsọ, na mkpọmkpọ ebe dị mgbe ebighị ebi.” Otú a, na-amalite n’ebe ndị sị na ha bụ ndị Chineke, bụ́ Krisendọm, mkpagbu ukwu ahụ ga-amalite, n’ikpeazụ na-agbasaru gburugburu ụwa, ruo ‘mba nile dị gburugburu.’

9. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka ọnọdụ ime mmụọ nke Krisendọm siworo kawanye njọ n’oge anyị?

9 Ọ dị mgbe a na-akwanyere Bible ùgwù n’ime Krisendọm, mgbe ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’ebe nile ka a na-ele alụmdi na nwunye na ndụ ezinụlọ anya dị ka isi iyi nke obi ụtọ, mgbe mmadụ na-ebili n’isi ụtụtụ ma chọta afọ ojuju n’ọrụ ha na-arụ kwa ụbọchị. Ọtụtụ ndị na-achọtara onwe ha obi ụtọ site n’iji oriọna abalị na-agụ ma na-amụ Okwu Chineke. Ma taa, inwe mmekọahụ aghara aghara, ịgba alụkwaghịm, iji ọgwụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, ịṅụbiga mmanya ókè, nnupụisi, anyaukwu, àgwà inwe umengwụ n’ọrụ, ịbụ onye TV riri ahụ, na omume ọjọọ ndị ọzọ emerụwo ndụ ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị egwu. Nke a bụ ihe ga-ebute mbibi Jehova Chineke gaje ibibi ókèala Krisendọm ahụ na-anakwere ihe ọjọọ ụzọ.

10. Kọwaa ọnọdụ Krisendọm mgbe e mezusịrị ihe Jehova kpere n’ikpe.

10 Jehova kwupụtara, dị ka anyị na-agụ na Jeremaịa isi 25, amaokwu nke 10 na 11: “M ga-eme ka olu obi ụtọ, na olu ọṅụ, na olu nwoke na-alụ nwunye ọhụrụ na olu nwanyị a na-alụ ọhụrụ, na olu nkume igwe nri, na ìhè oriọna, lanarị ha n’iyi. Ala nke a nile ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe na ihe ijuanya.” N’ezie ọ ga-abụ ihe ijuanya mgbe oké ụlọ nsọ na obí okomoko dị iche iche nke Krisendọm ga-adakasị ruo ná mbibi ha. Ruo ókè hà aṅaa ka mbibi nke a ga-eburu n’ibu? N’oge Jeremaịa, mbibi Juda na mba ndị agbata obi ya dịruru 70 afọ, bụ́ nke Abụ Ọma 90:10 kọwara dị ka ogologo afọ ndụ zuru ezu. Mmezu nke Jehova ga-emezu ihe e kpere n’ikpe taa ga-ezu ezu, ga-adịru mgbe ebighị ebi.

Ikpe Megide Babilọn Ukwu Ahụ

11. Ònye ka a ga-eji mee ihe n’ibibi Krisendọm? N’ihi gịnị?

11 Dị ka e buru amụma ná Mkpughe 17:​12-⁠17, oge ga-abịa mgbe Jehova ga-amalite oké ọrụ ya site n’itinye ya n’obi nke “mpi iri ahụ”​—⁠ndị òtù nke òtù United Nations nwere ìgwè ndị agha⁠—​“ime izu ya” nke ibibi alaeze ụwa nke okpukpe ụgha. Ma olee otú nke a ga-esi mee? E nwere ọtụtụ ụzọ nke “mpi iri ahụ” nke Mkpughe isi 17 pụrụ isi, dị ka ọ dị n’okwu ndị ahụ nke amaokwu nke 16, “kpọọ nwanyị ahụ na-akwa iko asị . . . rechapụkwa ya n’ọkụ.” N’ezie, ngwá agha nuklia amụbawo ma ka nọgide na-amụba n’ọtụtụ ebe ndị dị ize ndụ n’elu ụwa. Ma anyị aghaghị ichere ma hụ ụzọ Jehova ga-esi tinye ya n’obi ndị ọchịchị ndọrọ ndọrọ ịbọ ọ́bọ̀ ya.

12. (a) Gịnị mere Babilọn mgbe o bibisịrị Jerusalem? (b) Gịnị ga-eme mba nile mgbe mbibi Krisendọm gasịrị?

12 N’oge ochie ọ ghọrọ oge nke Babilọn inwe ahụmahụ nke iwe dị ọkụ nke Jehova. N’ihi ya, na-amalite na Jeremaịa isi 25, amaokwu nke 12, amụma ahụ lere ọnọdụ ahụ anya site n’ọnọdụ ọzọ nke gbanwere agbanwe. N’anọghịzi n’ọnọdụ nke Onye Na-emezu Ihe Jehova Kpere n’Ikpe, ugbu a a gụnyere Nebukadneza na Babilọn n’etiti mba nile nke ụwa. Nke a yiri ọnọdụ dịnụ taa. “Mpi iri ahụ” nke Mkpughe isi 17 ga-ekpochapụ okpukpe ụgha, ma mgbe e mesịrị a ga-ala ha onwe ha n’iyi, ha na ndị ‘ndị eze ọzọ nile nke ụwa,’ dị ka a kọwara ná Mkpughe isi 19. Jeremaịa 25:​13, 14 na-akọwa otú Babilọn, tinyere “mba nile” megbuworo ndị Jehova, ga-esi bata n’ikpe. Jehova ejiwo Nebukadneza mee ihe dị ka onye na-emezu ihe e kpere n’ikpe n’inye Juda ntaramahụhụ. Mana ya na ndị mesịrị bụrụ eze Babilọn jiri nganga bulie onwe ha elu megide Jehova n’onwe ya, dị ka ihe atụ, dị ka e gosiri site n’imerụ arịa dị iche iche nke ụlọ nsọ Jehova. (Daniel 5:​22, 23) Mgbe ndị Babilọn bibikwara Jerusalem, mba ndị agbata obi Juda​—⁠Moab, Amọn, Taịa, Edọm, na ndị ọzọ⁠—​nwere ọṅụ ma kwaa ndị Chineke emo. Ha aghaghịkwa ịnata ụgwọ ọrụ kwesịrị ha site n’aka Jehova.

Ikpe Megide “Mba Nile”

13. Gịnị ka “iko mmanya nke ọnụma nke a” pụtara, gịnị ga-emekwa ndị ṅụrụ site n’iko ahụ?

13 N’ihi ya, Jeremaịa kwupụtara, dị ka e dekọrọ n’isi nke 25, amaokwu nke 15 na 16, sị: “Otú a ka Jehova, bụ́ Chineke nke Israel, sịrị m: Nara iko mmanya nke ọnụma nke a n’aka m, mee ka mba nile ṅụọ ya, bụ́ ndị Mụ onwe m na-eziga gị jekwuru. Ha ga-aṅụkwa, wee ṅagharịa, wịa ara, n’ihi mmà agha ahụ nke Mụ onwe m na-eziga n’etiti ha.” N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ‘iko mmanya nke ọnụma Jehova’? Na Matiu 26:​39, 42 na Jọn 18:11, Jisọs kwuru okwu banyere “iko” dị ka nke bụ ihe atụ nke uche Chineke n’ebe ọ nọ. N’otu aka ahụ, a na-eji iko eme ihe atụ nke uche Jehova maka mba nile ịṅụ ọ́bọ̀ nke Chineke. Jeremaịa 25:​17-⁠26 na-edepụta ala ndị a na-ese onyinyo mba nile taa.

14. Dị ka amụma Jeremaịa na-ekwu, olè ndị ṅụrụ site n’iko mmanya nke ọnụma Jehova, gịnịkwa ka nke a na-eme ihe atụ ya maka ụbọchị anyị?

14 Mgbe e mesịrị ka Krisendọm bụrụ “mkpọmkpọ ebe, na ihe ijuanya, na ihe ịma ọsọ, na ihe nkọwa,” dị ka e mere Juda, mbibi na-echere ihe fọdụrụ n’alaeze ụwa nke okpukpe ụgha. E mesịa ụwa dum, nke e jiri Ijipt mee ihe atụ ya, aghaghị ịṅụ iko nke mmanya nke ọnụma iwe Jehova! Ee, “eze nile nke Ugwu, ma ndị bi nso ma ndị bi n’ebe dị anya, onye na ibe ya; na alaeze nile nke ụwa, nke dị n’elu ụwa” aghaghị ịṅụ. N’ikpeazụ, “eze Shishak ga-aṅụsokwa ha.” Ònyekwa bụ́ “eze Shishak” nke a? Shishak bụ aha ihe atụ, ma ọ bụ ihe nnọchiteanya, maka Babilọn. Dị ka Setan si bụrụ eze a na-adịghị ahụ anya nke Babilọn, otú a ka o si bụrụ “onye isi nke ụwa” ruo taa, dị ka Jisọs gosiri. (Jọn 14:30) Otú a, Jeremaịa 25:​17-⁠26 kwekọrọ n’ihe dị ná Mkpughe isi 18 ruo 20 n’ime ka usoro ihe omume dị iche iche doo anya ka a na-ebugharị iko nke ọnụma Jehova. Nke mbụ, alaeze ụwa nke okpukpe ụgha aghaghị ịla n’iyi, e mesịa ike ndọrọ ndọrọ ọchịchị nile, mgbe ahụkwa a ga-atụba Setan n’onwe ya n’ime abyss.​—⁠Mkpughe 18:8; 19:19-⁠21; 20:1-⁠3.

15. Gịnị ga-eme mgbe a nụrụ mkpu “udo na ntụkwasị obi dị”?

15 E kwuwo okwu dị ukwuu banyere udo na ịnọ ná ntụkwasị obi kemgbe a sịrị na Agha Nzuzo ahụ ebiwo, na-enwe nanị otu mba ụwa bụ dike nke fọdụrụnụ. Dị ka e kwuru ná Mkpughe 17:10, mba ahụ bụ dike, isi nke asaa nke anụ ọhịa ahụ, aghaghị “ịnọgide nwa oge.” Ma “nwa oge” ahụ na-abịaru ọgwụgwụ ya nso. N’oge na-adịghị anya mkpu nile nke “udo na ịnọ ná ntụkwasị obi” nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị ga-enye ohere maka ‘mbibi mberede ga-abịakwasị ha.’ Otú a ka Pọl onyeozi kwuru.​—⁠1 Ndị Tesalọnaịka 5:​2, 3.

16, 17. (a) Ọ bụrụ na onye ọ bụla anwaa ịgbanarị ikpe Jehova, gịnị ka ọ ga-arụpụta? (b) N’ụzọ dị aṅaa na-akpata mbibi ka uche Jehova ga-esi mee n’elu ụwa n’isi nso?

16 Usoro ụwa dum nke Setan, na-amalite n’ebe Krisendọm dị, aghaghị ịṅụ site n’iko nke ọ́bọ̀ Jehova. Iwu ọzọ o nyere Jeremaịa, nke e dekọrọ n’isi nke 25, amaokwu nke 27 ruo 29, na-akwado nke a: “Ị ga-asịkwa ha, Otú a ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha, bụ́ Chineke nke Israel, sịrị: Ṅụọnụ, ṅụbiga ókè, gbọọ agbọ, daa, unu ebilikwala ọzọ, n’ihi mmà agha ahụ nke Mụ onwe m na-eziga n’etiti unu. Ọ ga-erukwa, mgbe ha ga-ajụ ịnara iko ahụ n’aka gị ịṅụ, na ị ga-asị ha, Otú a ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị: Unu aghaghị ịṅụ. N’ihi na, lee, ọ bụ n’obodo ahụ nke a kpọkwasịrị aha m ka Mụ onwe m na-amalite ime ihe ọjọọ, ma unu onwe unu, ùnu ga-abụ ndị a na-amaghị ikpe ma ọlị? Unu agaghị abụ ndị a na-amaghị ikpe: n’ihi na mmà agha ka Mụ onwe m na-akpọ ka ọ dakwasị ndị nile bi n’ụwa; ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova nke usuu nile nke ndị agha pụta.”

17 Ndị ahụ bụ okwu ndị siri ike​—⁠n’ezie, okwu ndị na-akpali ịtụ egwu, n’ihi na ọ bụ Ọkaaka Onyenwe eluigwe na ala nile, bụ́ Jehova Chineke, kwuru ya. N’ime ọtụtụ puku afọ, o jiriwo ndidi tachie obi ná nkwulu, ná nkọcha, na n’ịkpọasị nke e kpokwasịworo aha nsọ ya. Ma n’ikpeazụ oge eruwo maka ya ịza ekpere ahụ nke Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya, Jisọs Kraịst, kụziiri ndị na-eso ụzọ ya mgbe ọ nọ n’elu ụwa: “Ya mere, kpeenụ ekpere otu a: Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ. Ka alaeze gị bịa. Ka e mee ihe ị na-achọ, dị ka e si eme ya n’eluigwe, ka e meekwa otú ahụ n’ụwa.” (Matiu 6:​9, 10) Ọ bụ uche Jehova na Jisọs ga-eme ihe dị ka mmà agha Ya n’ịbọ ọ́bọ̀.

18, 19. (a) Ònye gbaara na-aga imeri n’aha Jehova, gịnịkwa ka ọ na-echere tupu imezu mmeri ya? (b) Mgbe ndị mmụọ ozi tọhapụrụ ajọ ifufe nke ọnụma Jehova, ihe ndị dị aṅaa na-atụ egwu ga-eme n’elu ụwa?

18 Ná Mkpughe isi 6, anyị na-agụ nke mbụ ya banyere Jisọs ịnọkwasị n’ịnyịnya ọcha ‘imeri, ya na ka o wee merie.’ (Amaokwu nke 2) Nke a malitere ná nnọkwasị ọ nọkwasịrị n’ocheeze dị ka Eze eluigwe na 1914. Ịnyịnya ndị ọzọ na ndị na-anọkwasị ha sochiri, na-egosipụta ibu agha zuru ezu, ụnwụ nri, na ọrịa na-efe efe bụ́ ndị tiworo ụwa anyị ihe otiti kemgbe. Ma olee mgbe ọgba aghara ndị a nile ga-agwụsị? Mkpughe isi 7 na-eme ka anyị mara na ndị mmụọ ozi anọ na-ejidesi ike “ifufe anọ nke ụwa” ruo mgbe a chịkọtachara Israel ime mmụọ na oké ìgwè mmadụ si ná mba nile maka nzọpụta. (Amaokwu 1) Mgbe ahụ gịnị ga-eme?

19 Jeremaịa isi 25, n’amaokwu nke 30 na 31, na-aga n’ihu: “Jehova ga-esi n’elu bigbọọ, sikwa n’ebe obibi Ya dị nsọ mee ka olu Ya daa ụda; Ọ ga-ebigbọsi ebe ịta nri Ya ike; mkpu dị ka ndị na-azọcha mkpụrụ vine ka Ọ ga-eti imegide ndị nile bi n’ụwa. Mkpọtụ na-abịaru nsọtụ ụwa; n’ihi na Jehova nwere okwu ikpe megide mba nile, Ya na anụ ahụ nile, bụ́ mmadụ, ga na-eje ikpe; ma ndị na-emebi iwu, Ọ ga-ewere ha nye mmà agha; ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta.” Ọ dịghị mba ọ bụla ga-alanarị isite otú a ṅụọ iko nke ọnụma Jehova. N’ihi ya, ọ dịwo ngwa ka ndị nile obi ha ziri ezi kewapụ onwe ha site n’ajọ omume nke mba nile tupu ndị mmụọ ozi anọ ahụ ahapụ ajọ oké ifufe nke ọnụma Jehova. Ọ dị ọjọọ n’ezie, n’ihi na amụma Jeremaịa na-aga n’ihu n’amaokwu nke 32 na 33, sị:

20. Onyinyo dị aṅaa na-egosipụta ịdị ike nke ikpe Jehova, ma n’ihi gịnị ka ihe omume nke a ji dị mkpa?

20 “Otú a ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị, Lee, ihe ọjọọ na-apụ si n’otu mba jeruo mba ọzọ, a ga-akpọtekwa oké ifufe site ná nsọtụ nile nke ụwa. Ndị Jehova gburu ga-adịzukwa n’ụbọchị ahụ site n’otu nsọtụ ụwa wee ruo nsọtụ ọzọ nke ụwa: a gaghị etiri ha aka n’obi, a gaghị achịkọtakwa ha, a gaghị elikwa ha; nsị anụ n’elu ala ka ha ga-aghọ.” N’eziokwu nke a bụ ihe omume na-atụ oké egwu, ma ihe omume nke a dị mkpa iji mee ka ụwa dị ọcha pụọ n’ajọ omume nile tupu e webata Paradaịs ahụ nke Chineke kwere ná nkwa.

Ndị Ọzụzụ Atụrụ Ga-akwa Ákwá, Tiekwa Mkpu

21, 22. (a) Na Jeremaịa 25:​34-⁠36, olè ndị bụ “ndị ọzụzụ atụrụ” Israel, n’ihi gịnị ka e jikwa manye ha ịkwasi ákwá ike? (b) Ndị ọzụzụ atụrụ dị aṅaa nke oge a kwesịrị ịnata iwe Jehova, n’ihi gịnị ka o jikwa kwesị nnọọ ekwesị?

21 Amaokwu 34 ruo 36 gara n’ihu ikwu banyere ikpe Jehova, na-asị: “Kwasienụ ákwà ike, unu ndị ọzụzụ atụrụ, tiekwanụ mkpu; tụrụọkwanụ ná ntụ, unu ndị dị ebube n’etiti ìgwè ewu na atụrụ: n’ihi na ụbọchị unu eruzuwo ka e gbuo unu, M ga-akpasakwa unu, unu ga-adakwa dị ka ihe a na-achọsi ike. Ebe mgbalaga alanarịwokwa ndị ọzụzụ atụrụ, mgbapụ alanarịwo ndị dị ebube n’etiti ìgwè ewu na atụrụ. Gee ntị olu iti mkpu nke ndị ọzụzụ atụrụ, na nke ịkwasi ákwà ike nke ndị dị ebube n’etiti ìgwè ewu na atụrụ! n’ihi na Jehova na-ebibi ebe ịta nri ha.”

22 Olee ndị ka ndị ọzụzụ atụrụ ndị a bụ? Ha abụghị ndị ndú okpukpe, ndị ṅụwororịị iwe Jehova. Ha bụ ndị ọzụzụ atụrụ nke agha, ndị a kọwakwara na Jeremaịa 6:3, ndị na-achịkọta ndị agha ha n’ìgwè iji guzogide Jehova. Ha bụ ndị ọchịchị ndọrọ ndọrọ, ndị jiworo ndị ha na-achị baa ọgaranya. Ọtụtụ n’ime ndị a bụ ndị na-eji anya nkà na-agba mgbere ahịa, ndị isi arụrụala. Ha emebeghị ihe ngwa ngwa ibelata ụnwụ nri gbukpọworo mmadụ dum n’ala ndị dara ogbenye. Ha na-eme ka “ndị dị ebube n’etiti ìgwè ewu na atụrụ” baa ọgaranya, dị ka ndị dike n’ịzụ ahịa ngwá agha na ndị anyaukwu na-ebibi gburugburu ebe obibi, ma n’otu mgbe ahụ na-ajụ inye aka n’ụzọ ahụ ike na nri na-edozi ahụ bụ́ nke gaara efu nanị ihe dị nta iji chebe ndụ nke ọtụtụ iri nde ụmụaka ndị na-anwụ anwụ.

23. Kọwaa ọnọdụ ụwa Setan mgbe ihe omume nile na-ebibi ihe nke Jehova gasịrị.

23 Ọ bụghị ihe ijuanya na Jeremaịa isi nke 25 na-ekwubi, n’amaokwu nke 37 na 38, site n’ikwu banyere ndị a ji ọchịchọ ọdịmma onwe ha nanị na-achọrọ nanị onwe ha udo, sị: “E mewokwa ka ụlọ obibi nile nke dị n’udo dere duu site n’iwe dị ọkụ nke Jehova. Ọ hapụwo okwu ọhịa Ya, dị ka ọdụm: n’ihi na ala ha aghọwo ihe ijuanya site n’ịdị ọkụ nke mmà agha na-eme ihe ike, na site n’iwe Ya dị ọkụ.” Ihe ijuanya n’ezie! N’agbanyeghị nke ahụ, n’ụzọ e ji n’aka a ga-egosipụta iwe dị ọkụ nke Jehova site n’Onye ahụ nke a kọwara ná Mkpughe 19:​15, 16 dị ka “Eze kachasị ndị eze nile, na Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ nile,” onye ji mkpanaka ígwè na-azụ mba nile dị ka atụrụ. Gịnị ga-esochikwa?

24. Ngọzi ndị dị aṅaa ka mbibi nke okpukpe ụgha na akụkụ nile ọzọ nke ụwa Setan ga-ewetara ihe a kpọrọ mmadụ na-eme ezi omume?

24 Ị̀ dịwo ndụ gabiga oké ifufe ma ọ bụ ajọ ifufe? Ọ pụrụ ịbụ ahụmahụ na-atụ egwu. Ma n’ụtụtụ na-esochi, ọ bụ ezie na ị pụrụ ịhụ ihe ndị mebiri emebi n’ebe nile, ikuku na-agbachapụkarị nnọọ agbachapụ, ịdị jụụ a na-enwe na-abụ nnọọ nke na-edo ahụ nke na ị pụrụ inye Jehova ekele maka ụbọchị ọma nke pụrụ iche. N’otu aka ahụ, mgbe oké ifufe nke mkpagbu ukwu ahụ kwụsịrị, ị pụrụ ile anya n’elu ụwa na-enwe ekele na ị dị ndụ ma dịrị njikere ikere òkè n’ọrụ ndị ọzọ Jehova ga-arụ nke ime ka ụwa e mere ka ọ dị ọcha ghọọ paradaịs nke dị ebube. Esemokwu Jehova na mba nile ga-abịaruworị ná njedebe ya dị ebube, na-eme ka aha ya dị nsọ ma na-eme ka ụzọ ghere oghe maka uche ya ime n’elu ụwa n’okpuru Ọchịchị Narị Afọ Iri nke Alaeze Mesaịa ahụ. Ka Alaeze ahụ bịa ngwa ngwa!

Ịtụleghachi paragraf nke 5-⁠24 nke isiokwu nke a

◻ Ụzọ ihu abụọ ndị dị aṅaa nke Krisendọm bataworo ugbu a n’ikpe?

◻ Echiche sara mbara dị aṅaa nke ikpe ahụ ka e weere na Jeremaịa 25:​12-⁠38?

◻ Iko dị aṅaa nke ịbọ ọ́bọ̀ ka e bugharịịrị mba nile?

◻ Olè ndị bụ ndị ọzụzụ atụrụ na-akwasi ákwá ike na-etikwa mkpu, n’ihi gịnịkwa ka ha ji nọrọ ná nsogbu?

[Foto dị na peeji nke 18]

Jehova ahọrọwo ngwá ọrụ a ga-eji bibie Krisendọm

[Foto dị na peeji nke 23]

Mgbe ikuku nke ajọ ifufe nke mkpagbu ukwu ahụ gasịrị, ụwa e mere ka ọ dị ọcha ga-apụta

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya