Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Ebe ọ bụ na Ndịàmà Jehova na-agbalị ime ihe n’eziokwu, ha tụkwasịkwara ibe ha obi, n’ihi gịnị ka ha jiri chee na ọ dị mkpa inwe nkwekọrịta e dere ede mgbe e nwere ihe metụtara azụmahịa n’etiti ha?
Ha ime otú ahụ bụ ihe Akwụkwọ Nsọ kwadoro, baa uru, bụrụkwa ihe ịhụnanya. N’ụzọ dị aṅaa? Ọ dị mma, ka anyị tụlee akụkụ ndị ahụ nke nkwekọrịta azụmahịa.
Bible na-enye akụkọ e dere ede nke ụzọ Chineke si mesoo ndị ya na ya gbara ndụ, bụ́ ndị Israel. Ọ na-agụnye mmekọrịta azụmahịa ndị metụtara ndị na-efe ezi ofufe. Jenesis isi nke 23 nwere otu nke anyị pụrụ ịtụle. Mgbe Sera ọ hụrụ n’anya nwụrụ, Abraham chọrọ inweta ebe olili ozu. Ọ malitere iso ndị Kenean bi nso Hebrọn emekọ ihe. Amaokwu nke 7-9 na-egosi na o kwuru ka ya kwụọ ọnụ ahịa a kpọrọ aha maka ibé ala ọ chọrọ. Amaokwu nke 10 na-egosi na o kwere ịkwụ ọnụ ahịa nke a n’ihu ọha, ná ntị ndị ọzọ n’ọnụ ụzọ ámá nke obodo. Amaokwu nke 13 na-egosi na onye ahụ nwe ya kwetara inye Abraham ala ahụ, ma ọ zaghachiri na ya ga-ewere ala ahụ nanị dị ka ihe nzụta. Amaokwu nke 17, 18, na 20 na-akọwa na ọ bụ otú a ka o mere, bụrụ nke e mere ka o guzosie ike “n’anya ụmụ Het, n’etiti ndị nile na-aba n’ọnụ ụzọ ámá obodo ya.”
Ma, ọ̀ ga-adị iche mgbe mmadụ abụọ na-enwe mmekọrịta azụmahịa dị otú ahụ bụ ndị na-efe ezi ofufe? Isi nke 32 nke Jeremaịa na-enye azịza. Site n’amaokwu nke 6 gaa n’ihu, anyị na-ahụ na Jeremaịa gaje ịzụta ala site n’aka nwa nwanne ya. Amaokwu nke 9 na-egosi na e kwekọrịtara n’ọnụ ahịa dị mma. Ugbu a gụọ amaokwu nke 10-12: “M [Jeremaịa] wee dee aha m n’akwụkwọ ala ahụ, kaa ya akara, kpọọ ndị àmà, tụọrọ ya ego ahụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀. M wee were akwụkwọ nzụta ala ahụ, ma nke a kara akara, nke ihe ya e nyere n’iwu na ụkpụrụ ya nile dị n’ime ya, ma nke ghere oghe: m wee were akwụkwọ nzụta ala ahụ nye Beruk nwa Neraịa, nwa Mahseịa, n’anya Hanamel nwa nwanne nna m, na n’anya ndị àmà ndị deworo aha ha n’akwụkwọ nzụta ala ahụ, n’anya ndị Juu nile na-anọdụ ala n’ogige ụlọ nche ahụ.”
Ee, ọ bụ ezie na Jeremaịa na onye ofufe ibe ya, ọbụna onye ikwu, na-emekọ ihe, ọ gbasoro ụkpụrụ iwu ụfọdụ ndị ezi uche dị na ha. E nwere ihe ndekọ abụọ—a na-eghewe otu oghe maka izo aka ngwa ngwa, a na-aka nke abụọ akara iji nwee ihe àmà nkwado maka mgbe ọ bụla e nwere obi abụọ banyere izi ezi nke ahụ ghere oghe. E mere nke a nile, dị ka amaokwu nke 13 na-ekwu, “n’anya ha.” Ya mere ọ bụ mmekọrịta azụmahịa e mere n’ihu ọha nke iwu kwadoro, nke nwere ndị akaebe. Mgbe ahụ, o doro anya na ọ bụ ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ ka ndị na-efe ezi ofufe na-eme ihe n’ụzọ e mere ka o guzosie ike, nke e deturu edetu.
Ọ bakwara uru. Anyị maara otú okwu ahụ si bụrụ eziokwu na “mgbe na ihe ndapụta na-adabara ha nile.” (Eklisiastis 9:11) Nke ahụ na-agụnye ndị Kraịst raara onwe ha nye ma kwesị ntụkwasị obi. Jemes 4:13, 14 na-etinye ya n’ụzọ dị otú a: “Geenụ ntị, unu ndị na-asị, Taa ma ọ bụ echi ka anyị ga-aga obodo a, nọọkwa n’ebe ahụ otu afọ, zụọkwa ahịa, ritekwa uru: ma unu bụ ndị na-amataghị ihe ga-eme echi.” Ya mere, anyị pụrụ ịmalite otu atụmatụ, dị ka ịzụta ihe, ịrụ ọrụ ma ọ bụ ije ozi e kwekọrịtara na ya, ma ọ bụ imepụtara onye ọzọ otu ihe. Ma gịnị ka echi—ma ọ bụ ọnwa ọzọ ma ọ bụ afọ ọzọ—ga-eweta? Gịnị ma ọ bụrụ na anyị ma ọ bụ onye nke ọzọ enwee ihe ọghọm? Nke ahụ nwere ike ime ka o yie ka imezu nkwekọrịta ahụ agaghị ekwe omume. Gịnị ma ọ bụrụ na anyị apụghị ịrụ ọrụ ahụ ma ọ bụ ije ozi ahụ, ma ọ bụ ikekwe ọ chọpụta na ọ fọrọ nke nta ka ya ghara inwe ike ịdị na-akwụta ego ma ọ bụ imezu akụkụ ya ná nkwekọrịta ahụ? Ọ bụrụ na e nweghị nkwekọrịta e dere ede, ezigbo nsogbu pụrụ ibilite, bụ́ ndị a pụrụ idozi ma ọ bụ ndị a gaara enwewo ike izere site n’inwe nkwekọrịta e dere ede dị mfe.
Ọzọkwa, anyị ekwesịghị ichefu na ọdịdị a na-ejighị n’aka nke ọtụtụ akụkụ nke ndụ pụrụ ọbụna ịpụta na onye ọzọ aghaghị iweghara ma ọ bụ na-ahụ maka ihe metụtara azụmahịa anyị (ma ọ bụ nke ya). Jemes gbakwụnyere n’amaokwu nke 14, sị: “N’ihi na unu bụ alụlụụ, nke na-apụta ìhè nwa oge, e mesịa o wee pụọ n’anya.” N’ikwu eziokwu, anyị nwere ike ịnwụ na mberede. Nkwekọrịta e dere ede pụrụ n’ụzọ dị irè inye ndị ọzọ ohere ịga n’ihu n’idozi okwu ma ọ bụrụ na ihe mberede emee n’akụkụ onye nke ọ bụla.
N’otu echiche, nke a na-edugakwa n’akụkụ nke atọ—nkwekọrịta e dere ede bụ ihe ịhụnanya. N’ụzọ doro anya, ọ bụrụ na onye so ná nkwekọrịta anwụọ ma ọ bụ nwee ihe mberede nke napụrụ ya ikike ime ihe, ọ gaara abụrụ onye Kraịst ahụ ihe ịhụnanya iwepụtaworị ihe ndekọ e dere ede nke ụgwọ ma ọ bụ ego ndị ọ na-atụ anya ya. Kamakwa igosi enweghị ntụkwasị obi, ọ na-egosi nwanna anyị na ya na-emekọ ihe ịhụnanya mgbe anyị mere nkwekọrịta e dere ede nke ga-ekwu n’ụzọ pụtara ìhè ma doo anya ihe ọ na-aghaghị ime ma ọ bụ ihe ruuru ya inweta. Nzọụkwụ ịhụnanya a ga-ebelata ihe ọ bụla ga-akpata obi ilu ma ọ bụ iwe ma ọ bụrụ na otu n’ime ndị ahụ na-ezughị okè echezọọ ihe ma ọ bụ ibu ọrụ ụfọdụ. Ònyekwa n’ime anyị bụ onye na-ezughị okè, na-adịghị echefu ihe, ma ọ bụ na-adịghị aghọtahie ihe ma ọ bụ nzube?—Matiu 16:5.
E nwere ụzọ ndị ọzọ nke inwe nkwekọrịta azụmahịa e dere ede si egosipụta ịhụnanya maka nwanna anyị, ezinụlọ anyị, na maka ọgbakọ n’ozuzu ya. Ma o kwesịrị ido anya na e wezụga ịbụ ihe ịhụnanya, ihe ndekọ ndị dị otú ahụ e denyere ihe ọmụma zuru ezu na-aba uru, bụrụkwa nke Akwụkwọ Nsọ kwadoro.