Ndị Ikom “Yiri Anyị n’Ahụ” Ha
Ọ BỤ eze na onye amụma ma bụrụkwa nna nke na-ahụ n’anya. Otu n’ime ụmụ ya ndị ikom tolitere ghọọ onye na-abaghị uru na onye nganga. Ná mgbalị siri ike iweghara ocheeze, nwa a mere ka agha obodo daa, na-ezube na nna ya ga-anwụ. Ma n’agha ahụ sochirinụ, ọ bụ nwa ahụ ka e gburu. Mgbe nna ahụ nụrụ banyere ọnwụ nwa ya nwoke, ọ rịgoro n’ụlọ elu nanị ya wee bee ákwá, sị: “Nwa m Absalọm, nwa m, nwa m Absalọm! ọ ga-adị m nnọọ mma ma a sị na mụ onwe m anwụwo n’ọnọdụ gị, Absalọm, nwa m, nwa m!” (2 Samuel 18:33) Nna ahụ bụ Eze Devid. Dị ka ndị amụma Jehova ndị ọzọ, ọ bụ “mmadụ yiri anyị n’ahụ ya.”—Jemes 5:17.
N’oge Bible ndị ikom na ndị inyom kwuchiteere Jehova sitere n’ọnọdụ nile nke ndụ, ha agbaghịkwa iche. Dị ka anyị, ha nwere nsogbu, taakwa ahụhụ n’ihi ezughị okè. Olee ndị bụ ụfọdụ n’ime ndị amụma a, oleekwa otú ha si yie anyị n’ahụ ha?
Mosis Sitere n’Inwebiga Obi Ike Ókè Gaa n’Ịdị Nwayọọ n’Obi
Otu onye amụma pụtara ìhè tupu oge ndị Kraịst bụ Mosis. Otú ọ dị, ọbụna n’afọ ndụ nke 40, ọ dịghị njikere ije ozi dị ka onye na-ekwuchitere Jehova. N’ihi gịnị? Ọ bụ ezie na Fero nke Ijipt na-echi ụmụnne ya ọnụ n’ala, a zụlitere Mosis n’ezinụlọ Fero, ọ dịkwa “ike n’okwu ya na ọrụ ya nile.” Ihe ndekọ ahụ na-agwa anyị, sị: “O chere na ụmụnne ya ghọtara na Chineke na-esi n’aka ya enye ha nzọpụta.” N’inwebiga obi ike ókè, o mere ihe n’ike iji gbachitere otu onye Hibru bụ́ ohu, wee gbuo onye Ijipt.—Ọrụ 7:22-25; Ọpụpụ 2:11-14.
Ugbu a a manyere Mosis ịgbalaga, o bikwara iri afọ anọ sochirinụ dị ka onye ọzụzụ atụrụ na Midian dị anya. (Ọpụpụ 2:15) Mgbe oge ahụ gwụrụ, Jehova kenyere Mosis, onye dị afọ 80 ugbu a, ọrụ dị ka onye amụma. Ma Mosis enwekwaghị obi ike gabiga ókè. O chere na ya erughị eru ma ọlị nke na o nwere obi abụọ banyere Jehova ikenye ya ọrụ dị ka onye amụma, na-ekwu ihe ndị dị ka, “Ònye ka m bụ, na m ga-ejekwuru Fero?” na, “Gịnị ka m ga-asị?” (Ọpụpụ 3:11, 13) Site ná mmesighachi obi ike na enyemaka ịhụnanya Jehova, Mosis gara n’ihu ịrụ ọrụ e kenyere ya, na-enwe oké ihe ịga nke ọma.
Ọ̀ dịwo mgbe, dị ka Mosis, i kwere ka inwebiga obi ike ókè duga gị n’ime ma ọ bụ n’ikwu ihe ghọrọ ihe amamihe na-adịghị na ya? Ya bụrụ otú ahụ, jiri ịdị umeala n’obi natakwuo ọzụzụ. Ka ì chewo na i rughị eru ịrụ ọrụ ndị Kraịst ụfọdụ? Kama ịjụ, nakwere enyemaka nke Jehova na nzukọ ya na-enye. Onye ahụ nyeere Mosis aka pụkwara inyere gị aka.
Elaịja Yiri Anyị n’Ahụ Ya n’Oge Ịdọ Aka ná Ntị
“Elaịja bụ mmadụ yiri anyị n’ahụ ya, o wee kpesie ekpere ike ka mmiri ghara izo; mmiri ezoghịkwa n’ala afọ atọ na ọnwa isii.” (Jemes 5:17) Ekpere Elaịja kwekọrọ n’uche Jehova ịdọ mba nke gbahapụworo Ya aka ná ntị. Ma, Elaịja maara na ụkọ mmiri ozuzo ahụ ọ na-ekpe ekpere maka ya ga-akpata nhụjuanya nke ụmụ mmadụ. Israel ji ịkọ ugbo biri; igirigi na mmiri ozuzo bụ ndụ nke ndị ahụ. Ụkọ mmiri ozuzo na-akwụsịtụghị akwụsị ga-akpata oké ahụhụ. Ihe ọkụkụ ga-akpọnwụ; nri agaghị eme. Anụ ụlọ ndị e ji arụ ọrụ na ndị e ji mere nri ga-anwụ, ezinụlọ ụfọdụ ga-anọkwa n’ihe iyi egwu nke ịnwụ n’agụụ. Olee ndị ga-akasị taa ahụhụ? Ndị nkịtị. Otu nwanyị di ya nwụrụ mesịrị gwa Elaịja na ihe fọdụụrụ ya bụ otu njuaka nke ntụ ọka na ntakịrị mmanụ. Ọ tụrụ nnọọ anya na ya na nwa ya nwoke ga-anwụ n’agụụ n’oge na-adịghị anya. (1 Ndị Eze 17:12) Ka Elaịja wee kpee ụdị ekpere a, ọ ghaghị inwe okwukwe siri ike na Jehova ga-elekọta ndị ohu Ya—ndị ọgaranya ma ọ bụ ndị ogbenye—ndị na-agbahapụbeghị ezi ofufe. Dị ka ihe ndekọ ahụ na-egosi, e mechughị Elaịja ihu.—1 Ndị Eze 17:13-16; 18:3-5.
Mgbe afọ atọ gasịrị, mgbe Jehova kwuru na ya ga-eme ka mmiri zoo n’isi nso, a na-ahụ ọchịchọ siri ike Elaịja nwere ịhụ ka ụkọ mmiri ozuzo ahụ kwụsịrị site n’ekpere ya dị ike, ndị o kpere ugboro ugboro ka o “[huuru] ala, tinye ihu ya n’etiti ikpere ya abụọ.” (1 Ndị Eze 18:42) Ugboro ugboro, ọ gbara nwa okorobịa ya ume, sị: “Biko, rịgoo, legide anya n’ụzọ oké osimiri” maka ihe na-egosi na Jehova nụrụ ekpere ya. (1 Ndị Eze 18:43) Lee ọṅụ ọ na-aghaghị inweworị mgbe n’ikpeazụ, n’azịza nye ekpere ya, “eluigwe wee nye mmiri ozuzo, ala wee mịa mkpụrụ ya”!—Jemes 5:18.
Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna ma ọ bụ onye okenye n’ọgbakọ ndị Kraịst, ọ pụrụ ịbụ na ị ga-alụso mmetụta miri emi ọgụ mgbe ị na-enye mgbazi olu. Otú ọ dị, ọ dị mkpa ka e jiri mmetụta uche mmadụ ndị dị otú ahụ tụgwaa nkweta siri ike bụ́ na ịdọ aka ná ntị dị mkpa mgbe ụfọdụ nakwa na mgbe e nyere ya n’ịhụnanya, ọ na-amịpụta “mkpụrụ nke dị n’udo, bụ́ mkpụrụ nke ezi omume.” (Ndị Hibru 12:11) Ihe ndị na-esi n’irube isi n’iwu nile nke Jehova pụta na-adịkarị mma. Dị ka Elaịja, anyị na-ekpe ekpere site n’obi ka e mezuo ha.
Jeremaịa Gosiri Obi Ike n’Agbanyeghị Nkụda Aka
N’ime ndị nile so dee Bible, ikekwe Jeremaịa bụ onye kasị dee banyere mmetụta ya. Dị ka nwa okorobịa, obi esighị ya ike ịnakwere ọrụ e kenyere ya. (Jeremaịa 1:6) Ka o sina dị, o ji obi ike dị ukwuu wee kpọsaa okwu Chineke, na-ezutezi mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ site n’aka ndị Israel ibe ya—malite n’onye eze ruo n’onye nkịtị. Mgbe ụfọdụ mmegide ahụ kpataara ya iwe na anya mmiri. (Jeremaịa 9:3; 18:20-23; 20:7-18) N’oge dị iche iche, a wakporo ya, tie ya ihe, kegide ya n’ọtọsị, tụọ ya mkpọrọ, jiri ọnwụ yie ya egwu, hapụkwa ya ka ọ nwụọ n’ime apịtị dị n’ala ala olulu ihe na-adịghị. Mgbe ụfọdụ ọbụna ozi Jehova na-afụ ụfụ, dị ka e gosipụtara site n’okwu ya: “Ngịrị afọ m, ngịrị afọ m! ana m agbalị ná mgbidi nile nke obi m.”—Jeremaịa 4:19.
Ma, ọ hụrụ okwu Jehova n’anya, na-asị: “Okwu Gị wee ghọọrọ m ihe obi ụtọ na ọṅụ obi m.” (Jeremaịa 15:16) N’otu oge ahụ, nkụda mmụọ mere ka o tikuo Jehova mkpu, sị: “Ị̀ ga-abụrụ m nanị ihe dị ka mmiri iyi na-arafu arafu, dị ka mmiri na-ekwesịghị ntụkwasị obi?” dị ka mmiri iyi ndị na-atakọ ngwa ngwa. (Jeremaịa 15:18) Otú o sina dị, Jehova ghọtara mmetụta ya ndị na-emegide onwe ha ma nọgide na-akwado ya ka o wee nwee ike rụzuo ọrụ ya.—Jeremaịa 15:20; leekwa 20:7-9.
Dị ka Jeremaịa, ị̀ na-eche nkụda mmụọ ma ọ bụ mmegide ihu n’ije ozi gị? Legara Jehova anya. Nọgide na-agbaso ntụziaka ya, Jehova ga-akwụghachikwa gị ụgwọ maka mgbalị gị nile.
Jisọs Yiri Anyị n’Ahụ Ya
Onye amụma kasị ukwuu e nwetụrụla bụ Ọkpara nke Chineke, bụ́ Jisọs Kraịst. Ọ bụ ezie na ọ bụ nwoke zuru okè, ọ kpachighị mmetụta uche ya. Anyị na-agụkarị banyere mmetụta ndị o nwere n’ime obi ya, bụ́ ndị na-aghaghị ịpụtawo ìhè n’ihu ya nakwa n’otú o si mesoo ndị ọzọ. Ọtụtụ mgbe, Jisọs ‘nwere ọmịiko,’ o jikwa otu okwu ahụ kọwaa ndị pụtara n’ihe atụ ya.—Mak 1:41; 6:34; Luk 10:33.
Ọ ghaghị iweliwo olu ya elu mgbe ọ chụpụrụ ndị na-ere ahịa na ụmụ anụmanụ n’ụlọ nsọ site n’okwu ndị bụ: “Chịpụnụ ihe ndị a n’ebe a.” (Jọn 2:14-16) Aro Pita tụrụ bụ́, “Chineke meere Gị ebere, Onyenwe anyị,” dọtara nzaghachi dị ike, “Gaa n’azụ m, Setan.”—Matiu 16:22, 23.
Jisọs nwere mmetụta ịhụnanya pụrụ iche maka ndị ụfọdụ nọ ya nso karịsịa. A kọwara Jọn onyeozi dị ka “onye ahụ nke na-eso ụzọ Ya onye Jisọs hụrụ n’anya.” (Jọn 21:7, 20) Anyị na-agụkwa, sị: “Ma Jisọs hụrụ Mata, na nwanne ya nwanyị, na Lazarọs, n’anya.”—Jọn 11:5.
Ihe pụkwara iwute Jisọs. N’ịbụ onye ọdachi nke ọnwụ Lazarọs ruru n’ahụ, “anya mmiri pụrụ n’anya Jisọs.” (Jọn 11:32-36) N’ikpughe obi mgbu nke nrara Judas Iskariọt raara ya nye kpataara ya, Jisọs hotara otu okwu jupụtara ná mmetụta site n’Abụ Ọma: “Onye na-eri nri m buliri ikiri ụkwụ ya imegide m.”—Jọn 13:18; Abụ Ọma 41:9.
Ọbụna ka ọ nọ n’oké ihe mgbu n’elu osisi, Jisọs gosiri ịdị omimi nke mmetụta ya. O ji ịhụnanya nyefee nne ya n’aka “onye ahụ nke na-eso ụzọ Ya, onye Ọ hụrụ n’anya.” (Jọn 19:26, 27) Mgbe ọ hụrụ ihe àmà nke nchegharị n’ime otu n’ime ndị ajọ omume ahụ a kpọgidere n’akụkụ ya, Jisọs ji ọmịiko kwuo, sị: “Mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.” (Luk 23:43) Anyị pụrụ ịghọta njupụta nke mmetụta uche dị ná mkpu ya: “Chineke m, Chineke m, ọ̀ bụ n’ihi gịnị ka Ị hapụrụ nanị Mụ?” (Matiu 27:46) Okwu ikpeazụ ya tupu ọ nwụọ kpughere ịhụnanya na ntụkwasị obi sitere n’obi: “Nna, n’aka Gị ka M na-enye mmụọ m idebe.”—Luk 23:46.
Lee aha mmesighachi obi ike ihe a nile na-enye anyị! “N’ihi na anyị enweghị onye isi nchụàjà onye na-apụghị iji obi so anyị hụkọọ ahụhụ n’adịghị ike anyị; kama anyị nwere Onye [Jisọs] a nwaworo n’ihe nile n’otu ụzọ ahụ a na-anwa anyị, ma O mehieghị.”—Ndị Hibru 4:15.
Obi Ike Jehova
Ọ dịbeghị mgbe Jehova kwara ụta maka ndị ọ họọrọ ikwuchitere ya. Ọ maara iguzosi ike n’ihe ha nye ya, o jikwa ọmịiko leghara adịghị ike nke ndị ahụ na-ezughị okè anya. Ma ọ tụrụ anya ka ha rụzuo ọrụ ha. Site n’enyemaka ya ha nwere ike ime otú ahụ.
Ka anyị jiri ndidi na-egosi obi ike n’ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị na-eguzosi ike n’ihe. Ha ga-anọgide na-abụ ndị na-ezughị okè n’usoro ihe a, dị ka anyị ga-abụ. Ma, anyị ekwesịghị ikpe ụmụnna anyị ikpe mgbe ọ bụla dị ka ndị na-erughị eru inweta ịhụnanya na nlebara anya anyị. Pọl dere, sị: “Ma anyị onwe anyị, bụ́ ndị nwere ike, anyị aghaghị ibu adịghị ike nile nke ndị na-enweghị ike, na ịghara ime ihe na-atọ onwe anyị ụtọ.”—Ndị Rom 15:1; Ndị Kọlọsi 3:13, 14.
Ndị amụma Jehova nwere mmetụta uche nile ndị anyị na-enwe. Otú o sina dị, ha tụkwasịrị Jehova obi, Jehova kwagidekwara ha. Karịa nke ahụ, Jehova nyere ha ihe ndị mere ha ga-eji nwee ọṅụ—ezi akọ na uche, inweta ihu ọma ya, ndị enyi na-eguzosi ike n’ihe bụ́ ndị kwagidere ha, na mmesi obi ike banyere ọdịnihu obi ụtọ. (Ndị Hibru 12:1-3) Ka anyị raparakwa Jehova n’ahụ n’obi ike zuru ezu ka anyị na-eṅomi okwukwe nke ndị amụma oge ochie, bụ́ ndị ikom “yiri anyị n’ahụ.”