-
“M Ga-ahọpụta . . . Ohu M Ka Ọ Na-Azụ Ha”A Maliteghachila Ife Jehova Ezigbo Ofufe
-
-
5. Gịnị ka a tụrụ n’ilu ahụ e ji buo amụma?
5 Gụọ Ezikiel 17:3-10. E kwuru n’ilu ahụ na e nwere otu “nnukwu ugo” nke feere gaa tụbiri ọnụ ọnụ alaka osisi sida ma buru ya busa “n’obodo ndị ahịa.” Ugo ahụ buuru “ụfọdụ n’ime mkpụrụ dị n’ala ahụ” kụọ n’ala na-eme nri nke dị “n’akụkụ nnukwu mmiri.” Mkpụrụ ahụ puru, bụrụzie ‘osisi vaịn nke wasara awasa.’ E nwekwara “nnukwu ugo” ọzọ. Osisi vaịn ahụ gbasara mgbọrọgwụ ya ka o ruo n’ebe ugo nke abụọ ahụ nọ. Ọ nọ na-achọ ka e foro ya gaa dọọ n’ebe ọzọ mmiri na-ede nke ọma. Jehova kwuru na ihe osisi vaịn a mere adịghị mma. Ihe o kwuru gosiri na a ga-efopụ mgbọrọgwụ ya, ọ ‘ga-akpọnwụchakwa.’
Nnukwu ugo nke mbụ nọchiri anya Nebukadneza, eze Babịlọn (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6)
6. Kọwaa ihe ilu ahụ pụtara.
6 Gịnị ka ilu a pụtara? (Gụọ Ezikiel 17:11-15.) N’afọ 617 T.O.N.K., Nebukadneza eze Babịlọn (onye bụ́ “nnukwu ugo” nke mbụ) nọchibidoro Jeruselem. Ọ chụturu eze Juda bụ́ Jehoyakin (onye bụ́ “ọnu ọnụ alaka osisi”) n’ọchịchị ma kpọta ya Babịlọn (bụ́ ‘obodo ndị ahịa’). Nebukadneza mere Zedekaya (otu “n’ime mkpụrụ dị n’ala ahụ,” onye sikwa n’ezinụlọ ndị eze) eze na Jeruselem. Nebukadneza mere ka Zedekaya jiri aha Chineke ṅụọ iyi na ọ ga na-erubere ya isi. (2 Ihe 36:13) Ma Zedekaya emeghị ihe ọ ṅụrụ n’iyi. O nupụụrụ eze Babịlọn isi ma gakwuru Fero eze Ijipt (onye bụ́ “nnukwu ugo” nke abụọ) ka o nyere ya aka lụso ndị Babịlọn ọgụ. Ma, ndị Ijipt enyereghị ya aka. Jehova katọrọ ihe Zedekaya mere. (Ezik. 17:16-21) N’ikpeazụ, a chụturu Zedekaya n’ọchịchị, ọ nwụkwara n’ụlọ mkpọrọ na Babịlọn.—Jere. 52:6-11.
-
-
Amụma E Buru Gbasara Mezaya—Nnukwu Osisi SidaA Maliteghachila Ife Jehova Ezigbo Ofufe
-
-
1. Nebukadneza kpọtara Jehoyakin Babịlọn
-