-
‘Chineke Mere Ka M Hụwa Ọhụụ’A Maliteghachila Ife Jehova Ezigbo Ofufe
-
-
15. Gịnị ka Ezikiel hụrụ gbasara otú wiil ndị ahụ hà na ihe ndị dị na ha?
15 Otú wiil ndị ahụ si buo ibu riri Ezikiel ọnụ. O dere, sị: “Gburugburu elu wiil ndị ahụ dị elu nke na ha na-atụ egwu.” Anyị nwere ike iji uche anyị hụ ka Ezikiel na-eleli anya elu ka ọ hụ gburugburu elu nnukwu wiil ndị ahụ na-egbuke egbuke nke ọma. O kwukwara, sị: “Gburugburu elu wiil anọ ahụ bụ anya anya.” Ma, e nwere ike ikwu na ihe kacha gbagwojuo Ezikiel anya bụ otú wiil ndị ahụ dị. Ọ sịrị: “Otú ha dị dị ka à ga-asị na otu wiil dị n’ime wiil ọzọ.” Gịnị ka ihe a o kwuru pụtara?
-
-
‘Chineke Mere Ka M Hụwa Ọhụụ’A Maliteghachila Ife Jehova Ezigbo Ofufe
-
-
17 Wiil ndị buru ibu otú a nwere ike ịgaru ebe dị anya naanị otu ugboro ha tụgharịrị. N’eziokwu, ọhụụ ahụ Ezikiel hụrụ na-egosi anyị na ụgbọ ahụ na-efe oké ọsọ ka ebe àmụ̀mà gburu. (Ezik. 1:14) Ihe ọzọ bụ na wiil ndị ahụ nwere ike ịga ihu, gaa azụ, gaa aka nri ma ọ bụ aka ekpe. Ndị njinia e nwere taa enweghị ike ịrụ nke dị ka ya. Ụgbọ a nwere ike ịga n’akụkụ ọ bụla n’akwụsịtụghị akwụsị ma ọ bụkwanụ tụgharịa atụgharịa. Ma, ọ pụtaghị na ọ na-etinye isi ebe ọ bụla ka onye na-amaghị ebe ọ na-aga. Anya ndị juru na wiil ndị ahụ gosiri na ụgbọ ahụ ma ihe niile na-eme gburugburu ya, ya bụ, ihe niile na-eme n’akụkụ ya niile.
Wiil ndị ahụ buru ezigbo ibu, na-efekwa oké ọsọ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17)
-