-
“Gọg, . . . M Ga-eme Gị Ihe”A Maliteghachila Ife Jehova Ezigbo Ofufe
-
-
19. Gịnị mere Gọg ga-eji achọ ime ka a kwụsị ife Chineke ezigbo ofufe?
19 Ihe ọjọọ Gọg bu n’obi. Mba dị iche iche ‘ga-akpa nkata ọjọọ.’ Ha ga-achọ otú ha ga-esi ewesa ndị na-efe Jehova iwe ha buuru ha n’obi kemgbe maka na ha kpọrọ ha asị. Ha ga-eche na ọ gaghị esiri ha ike imemila ha maka na ha yiri ndị bi “ebe na-enweghị mgbidi, ibo ụzọ, na ihe e ji atụchi ụzọ.” Mba ndị ahụ ga-achọ isi na nke ndị “na-akpata akụ̀” “kwakọrọ ọtụtụ ihe, bukọrọkwa nnukwu ihe.” (Ezik. 38:10-12) Olee “akụ̀” ha ga-akwakọrọ? Ndị na-efe Jehova nwejuru akụ̀ enwejụ. Akụ̀ kacha mkpa anyị nwere bụ na anyị na-efe naanị Jehova ezigbo ofufe. Mba ndị ahụ ga-agbalị ime ka a kwụsị ife Jehova ezigbo ofufe maka na ha kpọrọ ezigbo ofufe na ndị na-akwado ya asị.
Gọg ‘ga-akpa nkata ọjọọ’ ka o kpochapụ ndị na-efe Chineke ezigbo ofufe. Ma atụmatụ ya ga-akụ afọ n’ala (A ga-akọwa ya na paragraf nke 19)
-