-
“Iwu Gbasara Ụlọ Nsọ A”A Maliteghachila Ife Jehova Ezigbo Ofufe
-
-
Ihe Ọhụụ Ezikiel Hụrụ Na-akụziri Anyị Taa
13, 14. (a) Olee otú anyị si mara na ihe Ezikiel hụrụ n’ọhụụ ụlọ nsọ na-emezu n’oge a? (b) Olee uru abụọ ọhụụ ahụ na-abara anyị taa? (Gụọkwa igbe nke 13A isiokwu ya bụ, “Ụlọ Nsọ Abụọ Dị Iche na Ihe Ha Na-akụziri Anyị.”)
13 Ànyị ji n’aka na ọhụụ ụlọ nsọ Ezikiel hụrụ gbasara anyị taa? Ee. Cheta na Ezikiel hụrụ ụlọ nsọ Chineke “n’elu otu ugwu dị nnọọ elu.” Ihe a dabara n’amụma Aịzaya buru na “ugwu nke ụlọ Jehova dị n’elu ya ga-akwụsi ike n’ebe dị elu karịa ugwu ukwu niile.” O kwukwara hoo haa na ọ bụ “n’oge ikpeazụ” ka amụma a ga-emezu. (Ezik. 40:2; Aịza. 2:2-4; i nwere ike ịgụ Maịka 4:1-4.) Amụma ndị a na-emezu n’oge ikpeazụ kemgbe afọ 1919. Ọ bụ mgbe ahụ ka e mere ka a maliteghachi ife Chineke ezigbo ofufe, ofufe ya abụrụzie ihe kacha mkpa. Ọ dịzi ka ihe dị n’ugwu dị nnọọ elu.b
14 O doro nnọọ anya na ọhụụ ahụ Ezikiel hụrụ gbasara ife Chineke ezigbo ofufe taa. Otú ahụ ọhụụ ahụ si baara ndị Juu a dọọrọ n’agha uru abụọ n’oge ochie ka ọ bakwaara anyị taa. (1) Ọ na-akụziri anyị otú anyị ga-esi na-efe Jehova ezigbo ofufe otú o kwuru ka e si na-efe ya. (2) Ọ na-eme ka obi sie anyị ike na a ga-amaliteghachi ife Jehova ezigbo ofufe nakwa na ọ ga na-agọzi ndị ya.
-
-
Ihe Ndị Anyị Ga-amụta n’Ọhụụ Ụlọ Nsọ Ezikiel HụrụA Maliteghachila Ife Jehova Ezigbo Ofufe
-
-
E Buliri Ezigbo Ofufe Elu, Gbaakwa Ya Ogige
E buliri ụlọ nsọ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ elu, ya adị “n’elu otu ugwu dị nnọọ elu” (1). Ànyị ebuliela ezigbo ofufe elu, mee ka ọ bụrụ ihe kacha anyị mkpa?
-