Soro Ụgbọ Ịnyịnya Eluigwe nke Jehova Na-aga Ụkwụ na Ụkwụ
“Ị ga-agwakwa ha okwu m nile, ma hà ga-anụ, ma hà ga-aghara.”—EZIKIEL 2:7.
1, 2. Ụgbọ ịnyịnya dị aṅaa nke onye bụ eze ka Ezikiel hụrụ, gịnịkwa ka a gwara ya?
ỤGBỌ ịnyịnya eluigwe nke Jehova na-eguzo ugbu a n’ihu ndị ohu ya. Ha ji anya nke okwukwe na-ahụ ụgbọ njem ahụ dị ebube nke Eze Onyenwe ha. Ọ dị ebube, dị egwu, maa oké mma.
2 Otu ụgbọ ịnyịnya ahụ nke onye bụ eze kwụsịrị n’ihu onye amụma Chineke bụ Ezikiel n’ọhụụ n’ihe dị ka 2,600 afọ gara aga. Site n’ụgbọ ịnyịnya nke a bu ocheeze—nzukọ eluigwe Chineke nke ndị mmụọ e kere eke—Jehova nyere Ezikiel iwu nke a na-akpali akpali: “Ụmụ ha bụkwa ndị na-enweghị ihere n’ihu, ndị obi ha dị ike; mụ onwe m na-eziga gị ijekwuru ha: ị ga-asịkwa ha, Otú a ka Onyenwe anyị, bụ́ Jehova, sịrị. Ma ha onwe ha, ma hà ga-anụ, ma hà ga-aghara, (n’ihi na ụlọ nnupụisi ka ha bụ,) ha ga-amara na onye amụma anọwo n’etiti ha.”—Ezikiel 2:4, 5.
3. Olee ndị nọ n’ọnọdụ Ezikiel n’oge a?
3 Ezikiel ji mkpebi siri ike rụzuo ọrụ ahụ e kenyere ya, na-eje ozi dị ka otu ngwá ọrụ dị n’aka Chineke. N’otu aka ahụ, ugbu a, Chineke nwere otu nzukọ bụ ngwá ọrụ nke o ji na-eme ihe. Òtù Ezikiel ahụ, bụ́ ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ, na-ebute ụzọ n’ọrụ ahụ nke ịgba àmà ikpeazụ, “oké ìgwè mmadụ” nke “atụrụ ọzọ” na-agbakwa ha gburugburu inye ha nkwado. (Mkpughe 7:9, 10; Jọn 10:16) N’ịdị n’otu, ha bụ “otu ìgwè atụrụ,” Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst, na-eduzikwa ha n’okpuru ọbụbụeze nke Onye Ukwu Na-anọkwasị n’Ụgbọ Ịnyịnya, bụ́ Jehova Chineke.
4, 5. Olee ụzọ nzụkọ Chineke a na-ahụ anya si malite ịdị adị, gịnịkwa ka o nweworo ahụmahụ ya n’ụzọ kwekọrọ n’Aịsaịa 60:22?
4 N’okpuru nduzi Jehova, nzukọ nke a zuru ụwa ọnụ etolitewo site ná mmalite ndị dị nta ịghọ ihe ọrụ dị ike maka ịkpọsa iwu ahụ nke ‘ịtụ egwu Chineke na inye ya otuto, n’ihi na oge hour nke ikpe ya abịawo.’ (Mkpughe 14:7) Dị ka ọ na-abụghị Ezikiel kpọlitere ma ọ bụ họpụta onwe ya dị ka onye amụma, otú ahụkwa ka o si bụrụ na nzukọ Chineke a na-ahụ anya eguzobeghị ma ọ bụ họpụta onwe ya. O biliteghị site ná nzube ma ọ bụ mgbalị mmadụ. Onye ahụ bụ Chineke nke Na-anọkwasị n’Ụgbọ Ịnyịnya ahụ mere ka nzukọ nke a malite ịdị adị. N’ịbụ ndị nwetara ike site ná mmụọ Chineke, ndị ndị mmụọ ozi dị nsọ na-akwadokwa, ndị Jehova enwewo ahụmahụ nke oké mgbasa ruo n’ókè nke na ‘onye nta aghọwo mba nwere ume.’—Aịsaịa 60:22.
5 Ihe karịrị 4,000,000 Ndịàmà Jehova nọ na-akpọsa ozi Alaeze ahụ na 212 ala dị iche iche. E kesara ha gaa n’ihe karịrị 63,000 ọgbakọ ndị a haziri gaa na sekit na distrikti dị iche iche. Nnukwute alaka ụlọ ọrụ na ebe obibi akwụkwọ dị iche iche na-arụ ọrụ n’okpuru nduzi nke Òtù Na-achị Isi dị ka akụkụ bụ isi nke isi ụlọ ọrụ ahụ. Dị ka à ga-asị na ha bụ otu onye, ha nile na-aga n’ihu, na-ekwusa ozi ọma ahụ, na-enye ndị nile zaghachirinụ ọzụzụ, na-ewu ụlọ nzukọ dị iche iche. Ee, nzukọ Jehova a na-ahụ anya na-esoro ụgbọ ịnyịnya eluigwe ahụ na Onye na-anọkwasị n’elu ya na-aga ụkwụ na ụkwụ.
6. Gịnị ka iso nzukọ Jehova a na-ahụ anya na-aga ụkwụ na ụkwụ gụnyere?
6 Ọ bụrụ na ị bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova, ì so nzukọ Chineke a na-ahụ anya na-aga ụkwụ na ụkwụ? Ime nke ahụ abụghị nanị ije nzukọ dị iche iche nke ndị Kraịst na itinye oge n’ije ozi ahụ. N’ụzọ bụ isi ịga ije metụtara inwe ọganihu na ito uto ime mmụọ. O metụtara ile ihe anya n’ụzọ dị mma, idebe ihe ndị kwesịrị ekwesị n’ọnọdụ mbụ, na ịma ihe na-aganụ. Ọ bụrụ na anyị so ụgbọ ịnyịnya eluigwe nke Jehova na-agakọ ụkwụ na ụkwụ, ndụ anyị na-ekwekọ n’ozi anyị na-akpọsa.
7. N’ihi gịnị ka anyị ga-eji tụlee àgwà Ezikiel dị ka onye amụma Chineke?
7 N’okwu banyere iso na-agakọ ụkwụ na ụkwụ, ndị ohu Jehova nke oge a pụrụ ịmụta ihe dị ukwuu site n’ihe nlereanya nke Ezikiel. Ọ bụ ezie na Jehova họpụtara ya n’ụzọ pụrụ iche dị ka onye amụma, Ezikiel nwere mmetụta, mkpa, na nchegbu dị iche iche. Dị ka ihe atụ, dị ka nwoke na-emechabeghị okenye nke lụworo nwanyị, o nwere ihe mgbu nke nwunye ya ịnwụnahụ ya. Ma n’agbanyeghị nke ahụ, ọ dịghị mgbe ọ bụla o chefuru ọrụ e nyere ya dị ka onye amụma Jehova. Site n’ịtụle ụzọ Ezikiel si duzie onwe ya n’akụkụ ndị ọzọkwa, anyị pụrụ iwusi onwe anyị ike iji nọgide soro nzukọ Chineke a na-ahụ anya na-aga ụkwụ na ụkwụ. Ọ ga-eme ka anyị nwee ike iso nzukọ ya a na-adịghị ahụ anya na-agakọ ụkwụ na ụkwụ.
A Naara Ọrụ ahụ, Rụzuokwa Ya
8. N’ihe banyere ọrụ e nyere ya, ihe nlereanya dị aṅaa ka Ezikiel setịpụrụ?
8 Ezikiel setịpụrụ ezi ihe nlereanya site n’ịnara ọrụ ahụ e nyere ya, rụzuokwa ya. Otú ọ dị, nrubeisi na obi ike dị mkpa iji rụzuo ya, n’ihi na anyị na-agụ, sị: “Ma gị onwe gị, nwa nke mmadụ, atụla egwu ha, atụkwala egwu okwu nile ha, a sị na ogwu na uké dị n’ebe ị nọ, a sịkwa na ọ bụ n’etiti akpị ka i bi: atụla egwu okwu nile ha, atụkwala ụjọ ihu ha, n’ihi na ụlọ nnupụisi ka ha bụ. Ị ga-agwakwa ha okwu m nile, ma hà ga-anụ, ma hà ga-aghara: n’ihi na ndị na-enupụ isi nke ukwuu ka ha bụ. Ma gị onwe gị, nwa nke mmadụ, nụ ihe mụ onwe m na-agwa gị; abụla onye na-enupụ isi dị ka ụlọ ahụ nke na-enupụ isi.”—Ezikiel 2:6-8.
9. Ọ̀ bụ nanị site n’ime gịnị ka Ezikiel ga-enwere onwe ya pụọ n’ikpe ọmụma ọbara?
9 Ezikiel agajeghị ịbụ onye na-enweghị mmetụta ma ọ bụ onye na-atụ egwu, na-abụ onye ọ dị mkpa ka a na-akwali akwali mgbe nile ịrụzu ọrụ e kenyere ya. Ọ ga-enwere onwe ya pụọ n’ikpe ọmụma ọbara nanị ma ọ bụrụ na o wepụta onwe ya ikwu okwu Jehova n’atụghị egwu. A gwara Ezikiel, sị: “Mgbe ị ga-adọ onye na-emebi iwu aka ná ntị, ma o sighị ná mmebi iwu ya na n’ụzọ mmebi iwu ya chigharịa, onye ahụ ga-anwụ n’ajọ omume ya; ma gị onwe gị, mkpụrụ obi gị ka ị napụtaworo.”—Ezikiel 3:19.
10. Olee ụzọ òtù Ezikiel siworo gosipụta na ha dị ka onye amụma ahụ?
10 Dị ka ọ dị n’ihe banyere Ezikiel, òtù Ezikiel ahụ e tere mmanụ anakwerewo ọrụ Chineke nyere ha, na-arụzukwa. Ọ bụrụ na anyị bụ Ndịàmà Jehova, anyị kwesịrị icheta na ndụ nke anyị na nke ndị ọzọ dabeere ná nrubeisi anyị. (1 Timoti 4:15, 16) Ọ dị mkpa ka Onyeàmà ọ bụla soro nzukọ Jehova na-agakọ ụkwụ na ụkwụ. Chineke agaghị ekegide anyị ekegide n’ụgbọ ịnyịnya ya ma dọkpuru anyị na-aga. Enweghị mmasị na ịbụ onye e kewara obi ya ekewa na-eweda Onye na-anọkwasị n’elu Ụgbọ Ịnyịnya ahụ n’ala. Ya mere, nzukọ Jehova a na-ahụ anya na-agba anyị ume ka anyị dobe ọdịmma Chineke n’ọkwa mbụ ná ndụ anyị. Ịnọgide na-azaghachi n’agbamume dị otú ahụ na-eme ka anyị na nzukọ Chineke na-agakọ ụkwụ na ụkwụ, na-ebulikwa ije ozi anyị dị nsọ elu karịa ịbụ ihe nkịtị anyị na-eme n’ụzọ mmeghachi efu. N’eziokwu, ndị Jehova n’ozuzu ha na-egosipụta nraranye pụrụ iche. Òkè anyị na-ekere n’otu n’otu bụ ịnọgide na-agakọ ụkwụ na ụkwụ.
E Tinyere Okwu Chineke n’Ime Obi
11. Ihe nlereanya dị aṅaa ka Ezikiel setịpụrụ n’ihe banyere okwu Chineke?
11 Ezikiel setịpụkwara ezi ihe nlereanya site n’itinye okwu Chineke n’ime obi ya. Mgbe e nyere ya iwu ka o mee otú ahụ, o riri otu akwụkwọ mpịakọta Chineke nyere ya. Ezikiel sịrị, “O wee dị n’ọnụ m dị ka mmanụ aṅụ n’ụtọ.” Ọ bụ ezie na ihe jupụtara n’akwụkwọ mpịakọta ahụ bụ “abụ ákwá dị iche iche na isu ude, na ahụhụ,” ọ dị ụtọ n’ọnụ Ezikiel n’ihi na o nwere obi ekele maka ihe ùgwù nke ịnọchite anya Jehova. Ọ bụ ahụmahụ na-atọ ụtọ nye onye amụma ahụ ịrụzu ọrụ ahụ Chineke kenyere ya. Chineke gwara ya, sị: “Nwa nke mmadụ, okwu m nile nke m ga-agwa gị, nara ha n’obi gị, nụrụkwa ha ná ntị gị abụọ.” (Ezikiel 2:9–3:3, 10) Ọhụụ ndị ahụ mere ka o doo Ezikiel anya ihe ndị Chineke kwere ka o kere òkè na ha, wusiekwa mmekọrịta ya na Jehova ike.
12. Gịnị ka Ezikiel mere n’ihe karịrị iri afọ abụọ nke ije ozi dị ka onye amụma?
12 E nyere Ezikiel ọhụụ na ozi dị iche iche maka nzube na ndị dị iche iche. Ọ ghaghị ige ntị nke ọma, mgbe ahụ, kwuo okwu, meekwa dị ka a gwara ya ka o mee. A nọgidere na-ekpughere ya ihe ọmụma na ụkpụrụ ọhụrụ dị iche iche n’ogologo ihe dị ka 22 afọ nke ije ozi dị ka onye amụma. Mgbe ụfọdụ, Ezikiel kwupụtara ozi ụfọdụ ndị a haziri n’ụzọ pụrụ iche. N’oge ndị ọzọ, ihe o ji mee ihe bụ imegharị ahụ n’ụzọ na-anọchi anya ihe, dị ka idina ala n’ihu otu brick nke sere onyinyo Jerusalem. (Ezikiel 4:1-8) Ihe nlereanya ya n’ihe onwe onye dị iche iche, dị ka mmeghachi omume ya mgbe nwunye ya nwụrụ, nwekwara ozi n’ime ha. (Ezikiel 24:15-19) Ọ ghaghị ịnọgide na-eme ihe kwekọrọ n’oge ya, na-ezi ozi kwesịrị ekwesị mgbe nile, na-emekwa ihe kwesịrị ekwesị n’oge kwesịịrị ya. Ezikiel nọ n’ezi mmekọrịta chiri anya nke na-aga n’ihu n’ihu n’etiti ya na Jehova.
13. Olee ụzọ anyị pụrụ isi wulite mmekọrịta chiri anya n’etiti anyị na Jehova?
13 Iji wee wulite ma nọgide ná mmekọrịta chiri anya n’etiti anyị na Jehova dị ka ndị ha na ya na-arụkọ ọrụ, anyị aghaghị itinye Okwu Chineke n’ime obi anyị. (1 Ndị Kọrint 3:9) Iso nzukọ Chineke a na-ahụ anya na-agakọ ụkwụ na ụkwụ n’ihe banyere nke a chọrọ anyị n’aka ịnọgide na-agbaso nri ime mmụọ nke a na-enye n’oge kwesịrị ekwesị. (Matiu 24:45-47) ‘Asụsụ ahụ dị ọcha’ nọgidere na-agbasawanye. (Zefanaịa 3:9) Ọ gwụlakwa ma ànyị mụ anya n’ihe na-aganụ ka anyị ga-enwe ike n’ezie iji nrubeisi meghachi omume ná nduzi ọ bụla sitere n’aka Onye Na-anọkwasị n’Ụgbọ Ịnyịnya ahụ.
14, 15. Usoro ime ihe dị aṅaa dị mkpa iji nọgide na-eso nzukọ Chineke na-aga ụkwụ na ụkwụ?
14 Iji mee nke ahụ, ọ dị anyị mkpa inwe ezi ndokwa nke ikpe ekpere onwe onye mgbe nile, ịmụ ihe onwe onye na ikere òkè n’ije ozi dị nsọ nke ozi ọma ahụ. (Ndị Rom 15:16) Cheta ihe nlereanya Ezikiel nke iri akwụkwọ mpịakọta ahụ nke e dere ozi Chineke n’ime ya. Ezikiel riri akwụkwọ mpịakọta ahụ dum, ọ bụghị otu akụkụ ya. Ọ họrọghị nanị akụkụ ndị ga-amasịworị ya karị. N’otu aka ahụ, anyị kwesịrị ịhazi ọmụmụ ihe onwe onye anyị nke Bible na akwụkwọ ndị Kraịst dị iche iche iji kwekọọ ná nrupụta nke nri ime mmụọ, anyị kwesịkwara ikere òkè n’ihe nile a na-edebe na table ime mmụọ ahụ, gụnyere eziokwu ndị dị omimi.
15 Ànyị na-eji ekpere na-etinye mgbalị iji ghọta echiche dị ná nri siri ike? Iso na-agakọ ụkwụ na ụkwụ chọrọ ka ihe ọmụma na nghọta anyị gaa n’ihu karịa ihe ndị mbụ, n’ihi na anyị na-agụ, sị: “N’ihi na onye ọ bụla nke na-eketa mmiri ara bụ onye a kanwaghị ya n’okwu ezi omume; n’ihi na ọ bụ nwa ọhụrụ. Ma nri siri ike bụ nke ndị tozuru okè, ndị a nwaworo nghọta ha n’ihi omume ha na-eme mgbe dum ịtụle ihe ọma na ihe ọjọọ.” (Ndị Hibru 5:13, 14) Ee, inwe ọganihu ime mmụọ bụ akụkụ dị oké mkpa nke iso nzukọ Chineke na-agakọ ụkwụ na ụkwụ.
Enweghị Mmasị Egbochighị Ya
16, 17. Olee ụzọ Ezikiel si meghachi omume n’ihe banyere enweghị mmasị, ịkwa emo, na ndị mmadụ anaraghị ya nke ọma?
16 Ezikiel setịpụkwara ezi ihe nlereanya site n’irube isi, gharakwa ikwe ka e mee ka ọ laa azụ n’ihi enweghị mmasị ma ọ bụ ịkwa emo. N’otu aka ahụ, site n’isochi ntolite nke asụsụ ahụ dị ọcha na-aga, anyị na-adị njikere ịgala ebe Onye ahụ bụ eze nke Na-anọkwasị n’Ụgbọ Ịnyịnya ahụ chere ihu. Otú a, a na-akwadebe anyị ịnakwere ihe ndị o nyere n’iwu, bụrụ ndị e wusiri ike ịghọ ndị na-agaghị ala azụ n’ihi enweghị mmasị ma ọ bụ ịkwa emo nke ndị ahụ anyị na-agwa okwu banyere ozi ikpe ọmụma Jehova. Dị ka ọ dị n’ihe banyere Ezikiel, Chineke ebuworị ụzọ dọọ anyị aka ná ntị na ụfọdụ ndị ga-emegide anyị n’ụzọ siri ike, na-abụ ndị isi ike na ndị obi ha siri ike. Ndị ọzọ agaghị anụ n’ihi na ha achọghị ige Jehova ntị. (Ezikiel 3:7-9) Ndị ọzọkwa ga-abụ ndị ihu abụọ, dị ka Ezikiel 33:31, 32 na-asị: “Ha wee na-abịakwute gị dị ka ọbịbịa nke otu ndị, nọdụ ala n’ihu gị dị ka ndị m, ha na-anụkwa okwu gị nile, ma okwu gị ndị a ka ha na-emeghị: n’ihi na ịhụnanya hiri nne ka ndị ahụ ji ọnụ ha egosi, ma uru ha nke na-ezighị ezi ka obi ha na-ejeso. Ma, lee, ị dịịrị ha ka abụ nke ịhụnanya hiri nne, dị ka onye nwere olu mara mma, nke na-akpọkwa ụbọ nke ọma: n’ihi na ha anụwo okwu gị nile, ma ha adịghị eme ha.”
17 Gịnị ga-esi na nke a pụta? Amaokwu 33 na-ekwu, sị: “Ma mgbe ọ ga-eme, (lee, ọ na-eme,) ha ga-amakwa na onye amụma anọworị n’etiti ha.” Okwu ndị ahụ na-ekpughe na Ezikiel akwụsịghị ọrụ ya n’ihi na ndị mmadụ azaghachighị nke ọma. Enweghị mmasị nke ndị ọzọ emeghị ka ya onwe ya kwụsị inwe mmasị. Ma ndị mmadụ hà gere ntị ma ọ bụ na ha egeghị, o rubeere Chineke isi, rụzuokwa ọrụ e nyere ya.
18. Ajụjụ dịgasị aṅaa ka ị pụrụ ịjụ onwe gị?
18 Nzukọ Jehova a na-ahụ anya nọ ugbu a na-akpọsi òkù ahụ ike ka mmadụ nile tụọ Chineke egwu, nyekwa ya otuto. Ị̀ na-anọgide na-aga n’ihu mgbe a katọrọ gị n’ihi iji anya ike na-agba àmà banyere Alaeze ahụ, na-ebi ndụ dị ọcha? Ị̀ na-eguzosi ike mgbe a na-arụgide gị n’ihi na ị jụrụ ị nara ọbara, jụ inye ihe nnọchianya mba dị iche iche ofufe, jụ ime ememe ụbọchị ezumike ụwa dị iche iche?—Matiu 5:11, 12; 1 Pita 4:4, 5.
19. N’ihe banyere nduzi, gịnị ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị so ụgbọ ịnyịnya elugiwe Jehova na-aga ụkwụ na ụkwụ?
19 Ịgbaso ụzọ nke a adịghị mfe, ma ndị nọgidere na-atachi obi ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta. (Matiu 24:13) Site n’enyamaka Jehova, ka anyị ghara ikwe ka ndị ụwa mee ka anyị yie ha, wee si otú a mee ka anyị kwụsị iso ụgbọ ịnyịnya eluigwe nke Jehova na-agakọ ụkwụ na ụkwụ. (Ezikiel 2:8; Ndị Rom 12:21) Ọ bụrụ na anyị so nzukọ ndị mmụọ ozi ahụ yiri ụgbọ ịnyịnya na-agakọ ụkwụ na ụkwụ, anyị ga-eme ihe ngwa ngwa n’ụzọ kwekọrọ ná nduzi na ntụziaka nile a natara site ná nzukọ Chineke a na-ahụ anya. Jehova na-enye anyị ihe dị anyị mkpa iji guzogide mwakwasị nile a na-awakwasị okwukwe anyị, iji jigidesie Okwu nke ndụ ahụ ike, ijikwa lekwasị anya anyị n’ihe ime mmụọ ndị dị adị n’ezie, ndị metụtara Onye ahụ bụ Eze nke Na-anọkwasị n’ụgbọ ịnyịnya eluigwe ahụ.
Ịbụ Ndị A Kpaliri Ịnọgide Soro Na-aga Ụkwụ na Ụkwụ
20. Olee ihe ụfọdụ Ezikiel dekọrọ, bụ́ ndị kwesịrị ịkpali anyị iso na-aga ụkwụ na ụkwụ?
20 Ọhụụ ndị Ezikiel hụrụ kwesịrị ịkpali anyị iso na-aga ụkwụ na ụkwụ. Ọ bụghị nanị na ọ kpọsara ikpe Chineke n’isi Israel, kama o mekwara ihe ndekọ amụma dị iche iche nke mweghachi. Ezikiel zoro aka n’ebe Onye ahụ nọ, bụ́ onye o ruru aka ịchị achị n’elu ocheeze Jehova n’oge a kara aka. (Ezikiel 21:27) Ohu ahụ bụ Eze, bụ́ “Devid,” ga-achịkọtaghachi ndị Chineke, zụọkwa ha dị ka atụrụ. (Ezikiel 34:23, 24) Ọ bụ ezie na Gọg nke ala Megọg ga-ebuso ha agha, Chineke ga-anapụta ha, a ga-amanyekwa ndị iro Ya ‘ịmara Jehova’ ọbụna ka ha na-abanye ná mbibi. (Ezikiel 38:8-12; 39:4, 7) Mgbe ahụ, ndị ohu Chineke ga-enweta ndụ ebighị ebi n’ime usoro ife ofufe dị ọcha nke gụnyere ụlọ nsọ ime mmụọ. Mmiri nke ndụ nke si n’ebe nsọ ahụ na-asọpụta ga-abụ isi iyi nke inye ọzụzụ na ịgwọ ọrịa, a ga-ekenyekwa ha ihe nketa nke ala maka ngọzi ha.—Ezikiel 40:2; 47:9, 12, 21.
21. N’ihi gịnị ka ọrụ Ndịàmà Jehova nke oge a na-arụ ji dị ukwuu karịa nke Ezikiel?
21 Lee nnọọ ka ọ na-aghaghị isiworị bụụrụ Ezikiel ihe mkpali idekọ amụma ndị ahụ! N’agbanyeghị nke ahụ, ọrụ Ndịàmà Jehova nke oge a na-arụ dị ukwuu karị. Anyị na-adị ndụ n’oge mgbe ụfọdụ n’ime amụma ndị ahụ na-emezu. N’eziokwu, anyị na-ekere òkè n’ụzọ pụtara ìhè ná mmezu nke ụfọdụ n’ime ha. Site n’ụzọ anyị si na-adị ndụ, ànyị na-egosi n’otu n’otu na anyị kwenyere n’ezie na Jisọs na-achị achị ugbu a dị ka Onye ahụ o ruru aka? Obi ò siri anyị ike n’onwe anyị na n’oge na-adịghị anya, Jehova ga-edo onwe ya nsọ, durukwa ndị ahụ na-eso nzukọ ya na-aga ụkwụ na ụkwụ banye n’ime ụwa ọhụrụ ya? (2 Pita 3:13) Inwe obi ike n’ụzọ dị otú ahụ, tinyere ọrụ dị iche iche ndị na-egosi okwukwe, na-egosipụta na anyị so ụgbọ ịnyịnya eluigwe nke Jehova na-agakọ ụkwụ na ụkwụ n’ezie.
Nọgide Soro Na-aga Ụkwụ na Ụkwụ
22. Gịnị ka a pụrụ ime iji zere ihe ndọpụ uche ka anyị wee nọgide na-ahụ ihe nke ọma n’ụzọ ime mmụọ?
22 Ebe ‘anyị tinyesịworo aka anyị n’ọ́gụ̀ anụ ụlọ na-adọkpụgharị,’ anyị ekwesịghị ile anya n’azụ n’inwe ọchịchọ maka ihe ọ bụla dị n’ụwa. (Luk 9:62; 17:32; Taịtọs 2:11-13) Ka anyị belata ọchịchọ ọ bụla ịkpakọba akụ n’elu ala, ka anyị mee ka anya anyị dịrị otu ebe, lekwasị n’Alaeze ahụ. (Matiu 6:19-22, 33) Ime ka ndụ anyị dịrị mfe, iwepụsị ihe nke ụwa ndị na-anyịgide anyị mgbe ọ bụla o kwere omume, ga-enyere anyị aka iso nzukọ Jehova na-aga ụkwụ na ụkwụ. (Ndị Hibru 12:1-3) Ihe ndọpụ uche pụrụ ime ka anyị ghara ịhụchazi ụgbọ ịnyịnya eluigwe ahụ na Onye Na-anọkwasị n’elu ya. Ma site n’enyemaka ya, anyị pụrụ ịnọgide na-ahụ ihe n’ụzọ dị mma n’ụzọ ime mmụọ, dị ka Ezikiel mere.
23. Gịnị ka ọ dị mkpa ka Ndịàmà kwesịrị ntụkwasị obi meere ndị ọhụrụ?
23 Otu akụkụ nke ibu ọrụ anyị dị ka Ndịàmà Jehova metụtara inyere ọtụtụ ndị ọhụrụ aka iso ụgbọ ịnyịnya eluigwe Chineke na-aga ụkwụ na ụkwụ. Na 1990 ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 10,000,000 mmadụ bịara Ememe Ncheta ọnwụ Jisọs Kraịst. Ọ bụ ezie na ọtụtụ n’ime mmadụ ndị a na-abịa nzukọ dị iche iche nke ndị Kraịst, ọ dị mkpa ka ha hụ mkpa ọ dị iso nzukọ Jehova a na-ahụ anya na-enwe ọganihu. Dị ka Ndịàmà kwesịrị ntụkwasị obi, anyị pụrụ inyere ha aka site ná mmụọ nke anyị na-egosipụta, na agbamume anyị na-enye.
24. Gịnị ka anyị kwesịrị ime n’oge nke a nke ga-eweta ihe nile ná njedebe?
24 Anyị na-ebi n’ime oge nke ga-eweta ihe nile ná njedebe. Anyị ejiriwo anya nke okwukwe anyị hụ ụgbọ ịnyịnya eluigwe ahụ ka ọ kwụsịrị n’ihu anyị. Onye ahụ bụ eze nke Na-anọkwasị n’Ụgbọ Ịnyịnya ahụ enyewo nzukọ ya a na-ahụ anya ọrụ nke ikwusara mba nile ozi ọma nke ọ ga-abụ, na mgbe ikpeazụ, ha ga-amara onye Jehova bụ. (Ezikiel 39:7) Jiri ohere nke a magburu onwe ya mee ihe nke ọma iji kere òkè n’iwepụ ọkaaka Jehova n’ụta, nakwa ido aha nsọ ya nsọ site n’iso ụgbọ ịnyịnya eluigwe nke Jehova na-aga ụkwụ na ụkwụ.
Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?
◻ Ihe nlereanya dị aṅaa ka Ezikiel setịpụrụ n’ihe banyere ọrụ e nyere ya?
◻ Gịnị ka ọ pụtara, bụ́ iso nzụkọ Chineke na-aga ụkwụ na ụkwụ?
◻ Olee ụzọ Ezikiel si lee okwu Jehova anya?
◻ Olee ụzọ anyị pụrụ isi gbasoo ihe nlereanya Ezikiel n’ụzọ o siri mee ihe megide enweghị mmasị?
◻ Gịnị kwesịrị ịkpali ndị ohu Jehova iso ụgbọ ịnyịnya eluigwe ya na-aga ụkwụ na ụkwụ?
[Foto ndị dị na peeji nke 15]
Gịnị ka a chọrọ n’aka mmadụ iji soro ụgbọ ịnyịnya eluigwe Jehova na-aga ụkwụ na ụkwụ?
[Foto dị na peeji nke 16]
Ezikiel nwere ekele maka ihe ùgwù ndị Chineke nyere ya. Ì nwere ekele otú ahụ?