-
E Kpughee Oge Mesaịa Ga-abịaṄaa Ntị n’Amụma Daniel!
-
-
23. N’ihi gịnị ka “onye e tere mmanụ, bụ́ onye ndụ” na-aghaghị iji nwụọ, oleekwa mgbe nke a ga-eme?
23 Gịnị bụ ihe a ga-arụzu n’izu nke 70 ahụ? Gebriel kwuru na e kpebiwo “iri izu asaa” maka “ime ka njehie bie, na ime ka mmehie gwụsịa, na ikpuchi ajọ omume, na ime ka ezi omume ebighị ebi bata, na ịkachite ọhụụ na amụma akara, na ite [Ebe, NW] nsọ ahụ Nke kachasị [ebe, NW] nsọ nile mmanụ.” Iji mezuo nke a, “onye e tere mmanụ, bụ́ onye ndú” aghaghị ịnwụ. Olee mgbe? Gebriel kwuru, sị: “Mgbe [iri izu isii na abụọ] ahụ gasịrị a ga-ebipụ onye e tere mmanụ, ọ dịghịkwa ihe ọ ga-enwe. . . . Ọ ga-emekwa ka otu ọgbụgba ndụ siere ọtụtụ mmadụ ike otu izu: ọ bụkwa ná nkera izu ahụ ka ọ ga-eme ka àjà na onyinye ịnata ihu ọma kwụsị.” (Daniel 9:26a, 27a) Oge dị oké mkpa bụ “ná nkera izu ahụ,” ya bụ, n’etiti izu ikpeazụ nke izu ndị ahụ bụ́ afọ.
-
-
E Kpughee Oge Mesaịa Ga-abịaṄaa Ntị n’Amụma Daniel!
-
-
25 Ọ bụ ezie na mmehie na ọnwụ nọgidere na-eti ihe a kpọrọ mmadụ ihe otiti, mbipụ e bipụrụ Jisọs na mbilite n’ọnwụ ya gaa ná ndụ eluigwe mezuru amụma. O ‘mere ka njehie bie, mee ka mmehie gwụsịa, kpuchite ajọ omume, meekwa ka ezi omume bata.’ Chineke ewepụwo ọgbụgba ndụ Iwu ahụ, bụ́ nke gbaworo ndị Juu ọtọ, maakwa ha ikpe dị ka ndị mmehie. (Ndị Rom 5:12, 19, 20; Ndị Galetia 3:13, 19; Ndị Efesọs 2:15; Ndị Kọlọsi 2:13, 14) Ugbu a, a pụrụ ịkagbu mmehie nke ndị mmehie nwere nchegharị, a pụkwara iwepụ ntaramahụhụ ndị so ya. Site n’àjà ịjụrụ obi nke Mesaịa chụrụ, ọ ga-ekwe ndị nwere okwukwe mee isoro Chineke dịghachi n’otu. Ha pụrụ inwe olileanya ịnata onyinye Chineke bụ́ “ndụ ebighị ebi n’ime Kraịst Jisọs.”—Ndị Rom 3:21-26; 6:22, 23; 1 Jọn 2:1, 2.
-
-
E Kpughee Oge Mesaịa Ga-abịaṄaa Ntị n’Amụma Daniel!
-
-
27. “[Ebe, NW] nsọ Nke kachasị [ebe, NW] nsọ nile” dị aṅaa ka e tere mmanụ, ọ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa?
27 Amụma ahụ kwukwara banyere ite “[Ebe, NW] nsọ ahụ Nke kachasị [ebe, NW] nsọ nile” mmanụ. Nke a adịghị ezo aka n’ite Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile, ma ọ bụ nkebi nke kasị dịrị n’ime, nke ụlọ nsọ ahụ dị na Jerusalem, mmanụ. Okwu ahụ bụ́ “[Ebe, NW] nsọ ahụ Nke kachasị [ebe, NW] nsọ nile” n’ebe a na-ezo aka n’ebe nsọ eluigwe nke Chineke. N’ebe ahụ, Jisọs chere uru nke àjà mmadụ ya n’ihu Nna ya. Àjà ahụ tere ebe ime mmụọ ahụ dị n’eluigwe, nke Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile nke ụlọikwuu elu ala nakwa nke ụlọ nsọ ahụ e mesịrị wuo nọchitere anya ya, mmanụ, ma ọ bụ debe ya iche.—Ndị Hibru 9:11, 12.
AMỤMA AHỤ NKE CHINEKE KWADORO
28. Gịnị ka “ịkachite ọhụụ na amụma akara” pụtara?
28 Amụma ahụ banyere Mesaịa bụ́ nke mmụọ ozi Gebriel kwupụtara kwukwara banyere “ịkachite ọhụụ na amụma akara.” Nke a pụtara na ihe nile e buru n’amụma banyere Mesaịa—ihe nile ọ rụzuru site n’àjà, mbilite n’ọnwụ, na mpụta ya n’eluigwe, tinyekwara ihe ndị ọzọ merenụ n’ime izu nke 70 ahụ—bụ ndị a ga-eji nkwado Chineke kaa akara, ha ga-abụkwa eziokwu, a pụkwara ịtụkwasị ha obi. A ga-akachite ọhụụ ahụ akara, ọ ga-emezukwa nanị n’isi Mesaịa. Ọ ga-emezu n’ahụ ya nakwa n’ọrụ Chineke ji ya na-arụ. Ọ bụ nanị n’ihe metụtara Mesaịa ahụ e buru n’amụma ka anyị pụrụ ịchọta nkọwa ziri ezi banyere ọhụụ ahụ. Ọ dịghị ihe ọ bụla ọzọ nke ga-ekpughe ihe ọ pụtara.
-