Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • dp isi 16 p. 270-285
  • Ndị Eze ahụ Na-asọrịta Mpi Abịaruo Nso Ọgwụgwụ Ha

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị Eze ahụ Na-asọrịta Mpi Abịaruo Nso Ọgwụgwụ Ha
  • Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • EZI NDỊ KRAỊST ASỤỌ NGỌNGỌ MA DỊ IKE
  • A NỤCHAA NDỊ JEHOVA
  • EZE AHỤ EBULIE ONWE YA ELU
  • ‘ỊSỌ MPI’ NA MGBE NKE ỌGWỤGWỤ IHE NDỊ A
  • IJIPT AGBAPỤGHỊ
  • OBUBUAGHA IKPEAZỤ
  • ONYE IHE Ọ NỤRỤ MERE KA Ọ MAA JIJIJI
  • ‘EZE AHỤ GA-ABỊARU ỌGWỤGWỤ YA’
  • Mmeri Ikpeazụ Nke Maịkael, Onye Isi Ukwu Ahụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Ònye Bụ “Eze Ugwu” Taa?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2020
  • Ndị Bụ́ “Eze Ugwu” n’Oge Ikpeazụ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2020
  • Otu Eze Emetọọ Ebe Nsọ Nke Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!
dp isi 16 p. 270-285

Isi nke Iri na Isii

Ndị Eze ahụ Na-asọrịta Mpi Abịaruo Nso Ọgwụgwụ Ha

1, 2. Olee otú onye bụ́ eze ugwu si gbanwee mgbe Agha Ụwa nke Abụọ gasịrị?

KA Ọ na-atụgharị uche n’ọnọdụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke United States na Russia, onye France bụ́ ọkà ihe ọmụma na ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Alexis de Tocqueville dere na 1835, sị: “Otu na-eji nnwere onwe eme ihe n’ụzọ bụ́ isi; nke ọzọ enwereghị onwe ya ikpebi ihe ọ ga-eme. Ụzọ ha . . . dịgasị iche; ka o sina dị, o yiri ka ọ dị otú Chineke si mee ya n’ụzọ na-apụtachaghị ìhè na otu ụbọchị nke ọ bụla ga-achịkwa ọdịnihu nke ọkara ụwa.” Olee otú amụma a si mezuo mgbe Agha Ụwa nke Abụọ gasịrị? Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ J. M. Roberts na-ede, sị: “Mgbe Agha Ụwa nke Abụọ gasịrị ọdịnihu nke ụwa, n’ezie, mesịrị n’ikpeazụ yie ka ọ bụ nke usoro ọchịchị abụọ dị ukwuu ma dịrịta nnọọ iche ga-achịkwa, otu hiwere isi n’ihe bụbu Russia, otu na United States of America.”

2 N’oge agha ụwa abụọ ahụ, Germany bụ onye iro bụ́ isi nke eze ndịda—Ike Ọchịchị Ụwa Anglo-America—nọrọkwa n’ọkwá nke eze ugwu. Otú ọ dị, mgbe Agha Ụwa nke Abụọ gasịrị, mba ahụ kewara. West Germany na eze ndịda jikọrọ aka, East Germany kekọrọ onwe ya n’usoro ọchịchị ọzọ dị ike—ìgwè mba ndị Kọmunist bụ́ nke Soviet Union na-edu. Ìgwè mba, ma ọ bụ usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị a, guzoro ọtọ dị ka eze ugwu, na-emegide njikọ Britain na America n’ụzọ siri ike. Ịma aka ahụ dị n’etiti eze abụọ ahụ ghọkwara Agha Nzuzo nke dịrị malite na 1948 ruo 1989. N’oge mbụ, eze Germany bụ́ eze ugwu emewo ihe “imegide ọgbụgba ndụ nsọ” ahụ. (Daniel 11:28, 30) Olee otú ìgwè mba ndị Kọmunist ahụ ga-esi eme ihe banyere ọgbụgba ndụ ahụ?

EZI NDỊ KRAỊST ASỤỌ NGỌNGỌ MA DỊ IKE

3, 4. Olee ndị bụ “ndị na-emebi iwu megide ọgbụgba ndụ ahụ,” mmekọrịta dịkwa aṅaa ka ha na eze ugwu ahụ nweworo?

3 “Ọ bụkwa ndị na-emebi iwu megide ọgbụgba ndụ ahụ,” ka mmụọ ozi Chineke kwuru, “ka ọ [eze ugwu] ga-emerụ site n’ire ụtọ dị iche iche.” Mmụọ ozi ahụ gbakwụnyere, sị: “Ma ndị ahụ nke maara Chineke ha ga-adị ike, mee ihe. Ọzọ, ndị [nwere] uche n’etiti ndị Chineke ga-eme ka ọha mmadụ ghọta ihe: ma ha ga-asụ ngọngọ site ná mma agha, sitekwa n’ire ọkụ, sitekwa ná ndọta n’agha, sitekwa ná nlụta n’agha, ọtụtụ ụbọchị.”—Daniel 11:32, 33.

4 Ndị ahụ “na-emebi iwu megide ọgbụgba ndụ ahụ” pụrụ nanị ịbụ ndị ndú nke Krisendọm, bụ́ ndị na-azọrọ na ha bụ ndị Kraịst ma na-emerụ aha Iso Ụzọ Kraịst site n’omume ha. N’akwụkwọ ya bụ́ Religion in the Soviet Union, Walter Kolarz na-ekwu, sị: “[N’oge Agha Ụwa nke Abụọ] Gọọmenti mba Soviet mere mgbalị inweta enyemaka ego na nkwado nke Chọọchị dị iche iche maka ichebe ala nna ha.” Mgba agha ahụ gasịrị, ndị ndú chọọchị gbalịrị ịhụ na ọbụbụenyi ahụ dịgidere, n’agbanyeghị ụkpụrụ ekweghị na Chineke nke ike ọchịchị bụ eze ugwu ugbu a. Otú a, karịa mgbe ọ bụla ọzọ, Krisendọm ghọrọ akụkụ nke ụwa a—ndapụ n’ezi ofufe rụrụ arụ n’anya Jehova.—Jọn 17:16; Jemes 4:4.

5, 6. Olee ndị bụ “ndị ahụ nke maara Chineke ha,” oleekwa otú ihe siri gaara ha n’okpuru eze ugwu ahụ?

5 Gịnị banyere ezi ndị Kraịst—“ndị ahụ nke maara Chineke ha” na “ndị [nwere] uche”? Ọ bụ ezie na ha ‘doro onwe ha n’okpuru ndị na-achị isi’ n’ụzọ kwesịrị ekwesị, ndị Kraịst bi n’okpuru ịchịisi nke eze ugwu abụghị akụkụ nke ụwa a. (Ndị Rom 13:1; Jọn 18:36) N’ilezi anya ịkwụghachi “Siza ihe nke Siza,” ha nyekwara “Chineke ihe nke Chineke.” (Matiu 22:21) N’ihi nke a, a mara iguzosi ike n’ezi ihe ha aka.—2 Timoti 3:12.

6 N’ihi ya, ezi ndị Kraịst ‘sụrụ ngọngọ’ ma ‘dị ike.’ Ha sụrụ ngọngọ n’ihi na a kpagburu ha nke ukwuu, ọbụna na e gburu ụfọdụ. Ma ha dịrị ike n’ihi na ihe ka nnọọ ọtụtụ nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi. Ha meriri ụwa, dị nnọọ ka Jisọs mere. (Jọn 16:33) Ọzọkwa, ọ dịghị mgbe ha kwụsịrị ime nkwusa, ọ bụrụgodị na ha ahụ onwe ha n’ụlọ mkpọrọ ma ọ bụ n’ogige ịta ahụhụ. N’ime otú ahụ, ha ‘mere ka ọha mmadụ ghọta ihe.’ N’agbanyeghị mkpagbu n’ihe ka n’ọtụtụ ala ebe eze ugwu na-achị, ọnụ ọgụgụ Ndịàmà Jehova mụbara. N’ihi ikwesị ntụkwasị obi nke “ndị nwere uche,” akụkụ na-abawanye ụba nke “oké ìgwè mmadụ” ahụ apụtawo n’ala ndị ahụ.—Mkpughe 7:9-14.

A NỤCHAA NDỊ JEHOVA

7. Olee ‘enyemaka dị nta’ nke ndị Kraịst e tere mmanụ bi n’okpuru eze ugwu ahụ nwetara?

7 “Mgbe ha [ndị Chineke] na-asụ ngọngọ a ga-enyere ha aka nke nta,” ka mmụọ ozi ahụ kwuru. (Daniel 11:34a) Mmeri nke eze ndịda meriri n’Agha Ụwa nke Abụọ rụpụtaara ndị Kraịst bi n’okpuru eze nke na-ama ya aka ahụ efe. (Tụlee Mkpughe 12:15, 16.) N’otu aka ahụ, ndị ahụ nke eze nke nọchiri ya kpagburu nwetara ahụ efe site n’oge ruo n’oge. Ka Agha Nzuzo ahụ jikwa nke nta nke nta na-ebelata, ọtụtụ ndị ndú bịara ghọta na ndị Kraịst na-ekwesị ntụkwasị obi abụghị ihe iyi egwu ma nyezie ha nkwado iwu. Enyemaka bịakwara site n’ọnụ ọgụgụ na-amụba amụba nke oké ìgwè mmadụ ahụ, bụ́ ndị zaghachiri ná nkwusa nke ndị ahụ e tere mmanụ ji ikwesị ntụkwasị obi na-eme ma nyere ha aka.—Matiu 25:34-40.

8. Olee otú ụfọdụ si ‘jiri ire ụtọ’ rapara n’ahụ ndị Chineke?

8 Ọ bụghị ndị nile kwuru na ha nwere mmasị n’ijere Chineke ozi n’oge Agha Nzuzo ahụ nwere ezi nzube. Mmụọ ozi ahụ adọwo aka ná ntị, sị: “Ọtụtụ mmadụ ga-eji ire ụtọ dị iche iche rapara ha n’ahụ.” (Daniel 11:34b) Ọnụ ọgụgụ dị ukwuu gosiri mmasị n’eziokwu ahụ ma ha adịghị njikere ịrara onwe ha nye Chineke. Ndị ọzọ kwa bụ́ ndị yiri ka ha anarawo ozi ọma ahụ bụ n’ezie ndị nledo maka ndị ọchịchị. Otu akụkọ a natara site n’otu ala na-agụ, sị: “Ụfọdụ n’ime ndị aghụghọ a bụ ezi ndị Kọmụnist bụ́ ndị gbebataworo n’ime nzukọ Onyenwe anyị, gosipụta ịnụ ọkụ n’obi dị ukwuu, ọbụna bụrụ ndị a họpụtara ịrụ ọrụ n’ọnọdụ ije ozi ndị dị elu.”

9. N’ihi gịnị ka Jehova ji kwere ka ụfọdụ ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi ‘sụọ ngọngọ’ n’ihi ndị mgbebata?

9 Mmụọ ozi ahụ gara n’ihu: “Ọzọ, ụfọdụ n’ime ndị ahụ [nwere] uche ga-asụ ngọngọ, ịnụcha ha, na ime ka ha dị ọcha, na ime ka ha nwuo ọcha, ruo mgbe ọgwụgwụ ihe ndị a: n’ihi na ọ fọdụrụ ịdị na mgbe a kara aka.” (Daniel 11:35) Ndị ahụ gbebataranụ mere ka ụfọdụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi daba n’aka ndị ọchịchị. Jehova kwere ka ihe ndị dị otú ahụ mee maka ịnụcha na ime ka ndị ya dị ọcha. Dị nnọọ ka Jisọs “mụtara ịṅa ntị Ya site n’ahụhụ nile Ọ hụrụ,” otú ahụ ka ndị a kwesịrị ntụkwasị obi si mụta ịtachi obi site n’ule e lere okwukwe ha. (Ndị Hibru 5:8; Jemes 1:2, 3; tụlee Malakaị 3:3.) E si otú a ‘nụchaa ha, mee ka ha dị ọcha, meekwa ka ha nwuo ọcha.’

10. Gịnị ka okwu ahụ bụ́ “ruo mgbe ọgwụgwụ ihe ndị a” pụtara?

10 Ndị Jehova ga na-asụ ngọngọ ma bụrụ ndị a na-anụcha “ruo mgbe ọgwụgwụ ihe ndị a.” N’ezie, ha tụrụ anya na a ga na-akpagbu ha ruo ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe a. Otú ọ dị, okwu Aramaic nke ya na okwu a sụgharịrị ebe a ịbụ “ruo” bụ otu ihe dị n’ihe odide Aramaic nke Daniel 7:25, n’ebe ahụ kwa ọ pụtara “n’oge.” N’ihi ya, na Daniel 11:35 “mgbe ọgwụgwụ ihe ndị a” aghaghị ịbụ nke e jikọtara ya na ọgwụgwụ nke oge a chọrọ maka ịnụcha ndị Chineke ka ha nọ na-atachi obi ná mwakwasị nke eze ugwu. Ihe àmà na-egosi na ịsụ ngọngọ ahụ kwụsịrị na “mgbe [Jehova] kara aka.”

EZE AHỤ EBULIE ONWE YA ELU

11. Gịnị ka mmụọ ozi ahụ kwuru banyere omume nke eze ugwu n’ebe ọkaaka Jehova dị?

11 Banyere eze ugwu ahụ, mmụọ ozi ahụ gbakwụnyere, sị: “Eze ahụ ga-emekwa ka o si tọọ ya; ọ ga-ebulikwa onwe ya, mee onwe ya ukwuu n’elu chi nile ọ bụla, [n’ịjụ ịnakwere ọkaaka Jehova] ọ bụkwa Chineke nke chi nile ka ọ ga-ekwu oké okwu dị iche iche megide: ọ ga-agakwara ya nke ọma ruo mgbe oké iwe ga-agwụsị; n’ihi na ihe a kara aka ga-eme. Ma ọ gaghị atụgharị uche na chi nile nke nna ya hà, ma ọ bụ n’ihe ahụ ndị inyom na-achọsi ike, ọ bụkwa na chi nile ọ bụla ka ọ na-agaghị atụgharị uche: n’ihi na n’elu ihe nile ka ọ ga-eme onwe ya ukwuu.”—Daniel 11:36, 37.

12, 13. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka eze ugwu ahụ si jụ “chi nile nke nna ya hà”? (b) Olee ndị bụ “ndị inyom” ahụ eze ugwu na-atụgharịghị uche ‘n’ihe ha na-achọsi ike’? (ch) Olee “chi” eze ugwu nyere otuto?

12 N’imezu okwu amụma ndị a, eze ugwu ahụ jụrụ “chi nile nke nna ya hà,” dị ka chi Atọ n’Ime Otu nke Krisendọm. Ìgwè mba ndị Kọmunist kwalitere nnọọ ekweghị na Chineke. N’ụzọ dị otú a eze ugwu mere onwe ya chi, ‘na-eme onwe ya ukwuu n’elu onye ọ bụla.’ N’atụgharịghị uche “n’ihe ahụ ndị inyom na-achọsi ike”—ala ndị nọ n’okpuru ya, dị ka Ebe Ugwu Vietnam, bụ́ ndị ọchịchị ya jiri mee ihe—eze ahụ mere “ka o si tọọ ya.”

13 N’ịga n’ihu n’amụma ahụ, mmụọ ozi ahụ kwuru, sị: “Ọ bụ chi nke ebe nile siri ike ka ọ ga-asọpụrụ n’ọnọdụ ya: ọ bụkwa chi nke nna ya hà na-amaghị ka ọ ga-eji ọlaedo, [jirikwa] ọlaọcha, [jirikwa] nkume dị oké ọnụ ahịa, [jirikwa] ihe dị iche iche a na-achọsi ike, sọpụrụ.” (Daniel 11:38) N’ezie, eze ugwu tụkwasịrị obi ya ná ngwá agha sayensị ọgbara ọhụrụ, “chi nke ebe nile siri ike.” Ọ chọrọ inweta nzọpụta site n’aka “chi” a, na-achụ nnukwu akụ̀ na ụba n’àjà n’elu ebe ịchụàjà ya.

14. Olee otú eze ugwu ahụ si ‘mee ihe n’ụzọ dị irè’?

14 “Ọ ga-emesokwa ebe nile e wusiri ike nke ebe nile siri ike site n’inyeaka chi ala ọzọ: onye ọ matara ga-eme ka nsọpụrụ ya baa ụba; ọ ga-emekwa ka ha chịa ọha mmadụ, ọ bụkwa ala ka ọ ga-eke n’ọnụ ahịa.” (Daniel 11:39) N’ịtụkwasị obi na “chi ala ọzọ” ya nke ngwá agha, eze ugwu ‘mere ihe n’ụzọ kasị dị irè,’ na-egosi onwe ya ịbụ ike agha dị ike na “mgbe ikpeazụ.” (2 Timoti 3:1) E ji nkwado ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ego, na mgbe ụfọdụ ngwá agha kwụghachi ndị kwadoro echiche ya.

‘ỊSỌ MPI’ NA MGBE NKE ỌGWỤGWỤ IHE NDỊ A

15. Olee otú eze ndịda siworo ‘sọọ eze ugwu mpi’?

15 “Na mgbe nke ọgwụgwụ ihe ndị a eze Ndịda ga-amalite ịsọ ya mpi,” ka mmụọ ozi ahụ gwara Daniel. (Daniel 11:40a) Eze ndịda ọ̀ ‘sọwo’ eze ugwu mpi “na mgbe nke ọgwụgwụ ihe ndị a”? (Daniel 12:4, 9) N’ezie ọ sọwo ya. Mgbe Agha Ụwa Mbụ gasịrị, nkwekọrịta udo ntaramahụhụ ahụ a manyere eze ugwu mgbe ahụ—Germany—ịnakwere bụ n’ezie “ịsọ ya mpi,” ịkpali ya imegwara. Mgbe o merisịrị n’Agha Ụwa nke Abụọ, eze ndịda tụgidere onye ya na ya na-ama aka ngwá agha nuklia na-atụ ụjọ ma hazie njikọ ka dị ike nke ndị agha megide ya, bụ́ Òtù Nkwekọrịta nke Ebe Ugwu Atlantic (NATO). Banyere ọrụ nke òtù NATO, otu onye Britain na-akọ akụkọ ihe mere eme na-asị: “Ọ bụ ngwá ọrụ bụ́ isi maka ‘ịchịkwa’ USSR, bụ́ nke e weere ugbu a dị ka ihe iyi egwu bụ́ isi nye udo Europe. Ọrụ ya dịgidere ruo afọ 40, a rụkwara ya n’ụzọ gara nke ọma n’ụzọ a na-apụghị ịgbagha agbagha.” Ka afọ Agha Nzuzo ndị ahụ na-agafe, ‘ịsọ mpi’ nke eze ndịda ahụ gụnyere iji ngwa ọrụ nkà na ụzụ ndị bụ́ ọkpọka na-eme nledo tinyere mwakpo e ji akọ na ngwá agha mee.

16. Olee otú eze ugwu si meghachi omume n’ịsọ mpi nke eze ndịda?

16 Olee otú eze ugwu si meghachi omume? “Eze Ugwu ewee dakwasị ya dị ka oké ifufe, chịrị ụgbọala, chịrịkwa ndị ịnyịnya, chịrịkwa ọtụtụ ụgbọ; ọ ga-abakwa n’ala ya nile, rubiga ókè dị ka mmiri, gabiga.” (Daniel 11:40b) Akụkọ ihe mere eme nke mgbe ikpeazụ egosiwo ụkpụrụ mgbasapụ ókèala nke eze ugwu. N’oge Agha Ụwa nke Abụọ, “eze” Nazi ahụ rubigara ókèala ya banye n’ala ndị gbara ya gburugburu. Mgbe agha ahụ biri, “eze” nọchiri ya wuru alaeze ukwu dị ike. N’oge Agha Nzuzo, eze ugwu lụrụ ọgụ megide onye iro ya n’agha metụtara mba ndị ọzọ, na n’agha nnupụisi megide ọchịchị, bụ́ ndị a lụrụ n’Africa, n’Esia, nakwa na Latin America. Ọ kpagburu ezi ndị Kraịst, na-egbochi—ma n’akwụsịghị—ọrụ ha ma ọlị. Mwakwasị agha na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ya mekwara ka ọtụtụ mba nọrọ n’okpuru ọchịchị ya. Nke a bụ kpọmkwem ihe mmụọ ozi ahụ buru n’amụma: “Ọ ga-abakwa n’ala ahụ mara mma [ógbè ime mmụọ nke ndị Jehova], ọ dịkwa ọtụtụ ala ga-asụ ngọngọ.”—Daniel 11:41a.

17. Olee ebe mgbasapụ ókèala nke eze ugwu ahụ mere na-erughị?

17 Otú o sina dị, eze ugwu emerighị ụwa nile. Mmụọ ozi ahụ buru amụma, sị: “Ndị a ka a ga-eme ka ha wepụga onwe ha n’aka ya: Edọm, na Moab, na ndị isi n’ụmụ Amọn.” (Daniel 11:41b) N’oge ochie, Edọm, Moab, na Amọn dịcha n’agbata ebe eze ndịda bụ́ eze Ijipt na-achị na ebe eze ugwu bụ́ eze Siria na-achị. N’oge a, ha nọchiri anya mba na òtù nile nke eze ugwu lekwasịrị anya ma bụrụ ndị ọ na-enweghị ike ịchịkwa.

IJIPT AGBAPỤGHỊ

18, 19. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka eze ndịda si nwee mmetụta nke onye na-ama ya aka?

18 Mmụọ ozi Jehova gara n’ihu: “Ọ [eze ugwu] ga-esetịpụkwa aka ya imegide ala nile: ala Ijipt agaghị aghọkwa ndị na-agbapụ agbapụ. Ma ọ ga-enwe ike n’akụ̀ nile nke ọlaedo na ọlaọcha, na n’ihe nile a na-achọsi ike nke Ijipt: ndị Libia na ndị Etiopia ga-esokwa na nzọụkwụ ya nile.” (Daniel 11:42, 43) Ọbụna eze ndịda, bụ́ “Ijipt,” agbanahụghị mmetụta nke ụkpụrụ mgbasawanye ókèala nke eze ugwu. Dị ka ihe atụ, e meriri eze ndịda mmeri dị ịrịba ama na Vietnam. Gịnịkwa banyere “ndị Libia na ndị Etiopia”? Ndị agbata obi a nke Ijipt oge ochie pụkwara ise onyinyo mba dị iche iche, n’ikwu ya n’echiche nke ebe ha dị, bụ́ ndị agbata obi nke “Ijipt” nke oge a (eze ndịda). Mgbe ụfọdụ, ha abụwo ndị na-eso—“na nzọụkwụ”—eze ugwu.

19 Eze ugwu ahụ ọ̀ chịwo isi n’elu ‘ihe nile a na-achọsi ike nke Ijipt’? N’ezie o nwewo mmetụta dị ike n’ụzọ eze ndịda siworo jiri ego ya mee ihe. N’ihi ịtụ onye na-ama ya aka egwu, eze ndịda etinyewo ego buru oké ibu kwa afọ n’ilekọta ndị agha, ndị agha mmiri, na ndị agha ụgbọelu bara ụba. Ruo n’ókè a, eze ugwu ‘nwere ike,’ ma ọ bụ chịkwara, mmefu nke akụ̀ na ụba nke eze ndịda.

OBUBUAGHA IKPEAZỤ

20. Olee otú mmụọ ozi ahụ si kọwaa agha ikpeazụ nke eze ugwu?

20 Ịma aka dị n’etiti eze ugwu na eze ndịda—ma ọ bụ n’ụzọ agha, akụ̀ na ụba, ma ọ bụ n’ụzọ ndị ọzọ—na-abịa na njedebe ya. N’ikpughe ihe ndị ọzọ sara mbara banyere ọgụ ka ga-abịanụ, mmụọ ozi Jehova kwuru, sị: “Ihe dị iche iche a nụrụ site n’Ọwụwa anyanwụ, sitekwa n’Ugwu, ga-eme ka ọ [eze ugwu] maa jijiji: ọ ga-ejikwa oké ọnụma pụọ ikpochapụ na iwezụga ọtụtụ mmadụ ka e bibie ha. Ọ ga-amakwa ụlọikwuu nile nke ụlọukwu ya n’etiti oké osimiri nile na ugwu nsọ ahụ mara mma; ma ọ ga-abịaru ọgwụgwụ ya, ọ dịghịkwa onye ga na-enyere ya aka.”—Daniel 11:44, 45.

21. Gịnị ka anyị ga-amata n’ọdịnihu banyere eze ugwu?

21 Mgbe e kposara Soviet Union na December 1991, a dọlara eze ugwu azụ nke ukwuu. Ònye ga-abụ eze a mgbe Daniel 11:44, 45 ga-emezu? Ọ̀ ga-abụ otu n’ime mba ndị so n’ebe bụbu Soviet Union? Ka ọ̀ ga-agbanwe kpam kpam, dị ka o meworo ọtụtụ mgbe n’oge gara aga? Mba ndị ọzọ kwa imepụta ngwá agha nuklia ọ̀ ga-akpata asọmpi ọhụrụ n’ịkpụpụta ngwá agha ma metụta onye ga-abụ eze ahụ? A ga-aza ajụjụ ndị a n’ọdịnihu. Ọ ga-abụrụ anyị ihe amamihe ịghara ịkọ nkọ. Mgbe eze ugwu ga-amalite agha ikpeazụ ya, ndị nile nwere nghọta dabeere na Bible ga-amata n’ụzọ doro anya mmezu nke amụma.—Lee “Eze Ndị Dị na Daniel Isi nke 11,” na peji nke 284.

22. Olee ajụjụ ndị na-ebilite banyere mwakpo ikpeazụ nke eze ugwu?

22 Otú ọ dị, anyị maara ihe eze ugwu ga-eme n’isi nso. N’ịbụ onye ihe a nụrụ “site n’Ọwụwa anyanwụ, sitekwa n’Ugwu” kpaliri, ọ ga-ebu agha ‘iji kpochapụ ọtụtụ mmadụ.’ Ònye ka ọ ga-ebuso agha a? Oleekwa “ihe a nụrụ” nke ga-akpali mwakpo dị otú ahụ?

ONYE IHE Ọ NỤRỤ MERE KA Ọ MAA JIJIJI

23. (a) Olee ihe omume dị ịrịba ama nke na-aghaghị iwere ọnọdụ tupu Amagedọn? (b) Olee ndị bụ “ndị eze ahụ ndị si n’ọwụwa anyanwụ bịa”?

23 Tụlee ihe akwụkwọ Mkpughe nwere ikwu banyere ọgwụgwụ nke Babilọn Ukwu ahụ, bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha. Tupu “agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke, Onye pụrụ ime ihe nile,” bụ́ Amagedọn, onye iro ukwu a nke ezi ofufe bụ nke ‘a ga-erechapụ n’ọkụ.’ (Mkpughe 16:14, 16; 18:2-8) Mwụsị nke ọkwá nke isii nke ọnụma Chineke n’elu osimiri Yufretis ihe atụ ahụ sere onyinyo mbibi ya. E mere ka osimiri ahụ tasịa ka e “wee dozie ụzọ ndị eze ahụ ndị si n’ọwụwa anyanwụ bịa.” (Mkpughe 16:12) Olee ndị bụ ndị eze a? Ọ dịghị ndị ọzọ ọ bụ ma ọ́ bụghị Jehova Chineke na Jisọs Kraịst!—Tụlee Aịsaịa 41:2; 46:10, 11.

24. Olee ihe Jehova ga-eme nke ga-eme ka eze ugwu maa jijiji?

24 A kọwara mbibi nke Babilọn Ukwu ahụ n’ụzọ doro anya n’akwụkwọ Mkpughe, bụ́ nke na-asị: “Mpi iri ahụ ị hụrụ [ndị eze na-achị na mgbe ọgwụgwụ], ha na anụ ọhịa ahụ [Mba Ndị Dị n’Otu], ndị a ga-akpọ nwanyị ahụ na-akwa iko asị, ha ga-emekwa ya ka ọ bụrụ onye tọgbọrọ n’efu bụrụkwa onye gba ọtọ, ha ga-erikwa anụ ahụ ya, rechapụkwa ya n’ọkụ.” (Mkpughe 17:16) N’ihi gịnị ka ndị ọchịchị ga-eji bibie Babilọn Ukwu ahụ? N’ihi na ‘Chineke tinyere ya n’obi ha ime izu ya.’ (Mkpughe 17:17) Eze ugwu so na ndị ọchịchị a. Ihe ọ nụrụ “site n’Ọwụwa anyanwụ” pụrụ nnọọ ịdị na-ezo aka n’ihe a Jehova ga-eme, mgbe ọ ga-etinye ya n’obi ndị ndú bụ́ mmadụ ikpochapụ oké nwanyị a na-akwa iko n’ụzọ okpukpe.

25. (a) Olee ebe pụrụ iche eze ugwu lekwasịrị anya? (b) Olee ebe eze ugwu ‘mara ụlọikwuu nile nke ụlọukwu ya’?

25 Ma e nwere ebe pụrụ iche eze ugwu na-eweso iwe. Mmụọ ozi ahụ na-ekwu na “ọ ga-amakwa ụlọikwuu nile nke ụlọukwu ya n’etiti oké osimiri nile na ugwu nsọ ahụ mara mma.” N’oge Daniel oké osimiri ahụ bụ Mediterranean, ugwu nsọ ahụ bụkwa Zaịọn, ebe bụbu ebe ụlọ nsọ Chineke dị. N’ihi ya, ná mmezu nke amụma ahụ, eze ugwu ahụ iwe ji na-ebuso ndị Chineke agha. N’echiche ime mmụọ, ebe dị “n’etiti oké osimiri nile na ugwu nsọ ahụ” na-anọchi anya ógbè ime mmụọ nke ndị ohu Jehova e tere mmanụ. Ha esiwo ‘n’oké osimiri’ nke ihe a kpọrọ mmadụ kewapụrụ onwe ha n’ebe Chineke nọ pụta ma nwee olileanya nke isoro Jisọs Kraịst chịa n’Ugwu Zaịọn nke eluigwe.—Aịsaịa 57:20; Ndị Hibru 12:22; Mkpughe 14:1.

26. Dị ka amụma Ezikiel gosiri, ebee nwere ike ịbụ ebe akụkọ ahụ a nụrụ ‘site n’Ugwu’ si bịa?

26 Ezikiel, onye ya na Daniel dịrị ndụ n’otu mgbe, bukwara amụma banyere mwakwasị a ga-awakwasị ndị Chineke “n’ikpeazụ nke ụbọchị ndị a.” Ọ sịrị na ọ bụ Gọg nke Megọg, ya bụ, Setan bụ́ Ekwensu ga-amalite mwakpo ahụ. (Ezikiel 38:14, 16) N’ụzọ ihe atụ, olee akụkụ Gọg ga-esi bịa? Site “n’akụkụ nile nke Ugwu dịkarịsịrị anya,” ka Jehova na-ekwu, site n’ọnụ Ezikiel. (Ezikiel 38:15) N’agbanyeghị otú mwakwasị a dịruru ná njọ, ọ gaghị ebibi ndị Jehova. Nsọkọrịta isi a dị ịrịba ama ga-esite n’ihe omume Jehova haziri nke ọma iji kpochapụ usuu ndị agha Gọg. N’ihi ya, Jehova na-agwa Setan, sị: ‘M ga-etinye mgbaaka imi n’agba gị abụọ, mee ka ị pụta.’ ‘M ga-eme ka i si n’akụkụ nile dịkarịsịrị anya nke Ugwu rịgota; M ga-emekwa ka ị bịa n’elu ugwu nile nke Israel.’ (Ezikiel 38:4; 39:2) N’ihi ya, akụkọ ahụ a nụrụ ‘site n’ugwu’ nke were eze ugwu iwe aghaghị isite n’ebe Jehova nọ. Ma ọ bụ nanị Chineke ga-ekpebi ihe ihe ahụ a nụrụ “site n’Ọwụwa anyanwụ, sitekwa n’Ugwu” ga-emesịa bụrụ kpọmkwem, a ga-amakwa ya mgbe oge na-aga.

27. (a) N’ihi gịnị ka Gọg ga-eji kpalie mba nile, tinyere eze ugwu, ịwakpo ndị Jehova? (b) Olee ihe mwakpo Gọg ga-arụpụta?

27 Banyere Gọg, ọ na-ahazi mbuso agha zuru ezu n’ihi ọganihu nke “Israel nke Chineke,” bụ́ ndị, ha na “oké ìgwè mmadụ” nke “atụrụ ọzọ,” na-abụghịzi akụkụ nke ụwa ya. (Ndị Galetia 6:16; Mkpughe 7:9; Jọn 10:16; 17:15, 16; 1 Jọn 5:19) Gọg na-ele “otu ndị nke a chịkọpụtaworo ná mba dị iche iche, nke rụtaworo anụ ụlọ na ihe ahịa [ime mmụọ] n’ọrụ” anya ọjọọ. (Ezikiel 38:12) N’ile ógbè ime mmụọ nke ndị Kraịst anya dị ka “obodo na-enweghị mgbidi” nke a pụrụ imeri n’ụzọ dị mfe, Gọg ga-eme mgbalị dị ukwuu ikpochapụ ihe a na-egbochi ya ịchịkwa ihe nile a kpọrọ mmadụ. Ma ọ gaghị emeli ya. (Ezikiel 38:11, 18; 39:4) Mgbe ndị eze nke ụwa, tinyere eze ugwu, wakwasịrị ndị Jehova, ha ‘ga-abịaru ọgwụgwụ ha.’

‘EZE AHỤ GA-ABỊARU ỌGWỤGWỤ YA’

28. Gịnị ka anyị maara banyere ọdịnihu nke eze ugwu na eze ndịda?

28 Obubuagha ikpeazụ nke eze ugwu abụghị megide eze ndịda. Ya mere, eze ugwu agaghị abịaru ọgwụgwụ ya n’aka onye ukwu na-ama ya aka. N’otu aka ahụ, ọ bụghị eze ugwu ga-ebibi eze ndịda. Alaeze Chineke ga-ebibi eze ndịda, “n’ejighị aka [mmadụ].”a (Daniel 8:25) N’ezie, n’agha Amagedọn, Alaeze Chineke ga-ekpochapụ ndị eze nile nke ụwa, ihe àmà na-egosikwa na nke a bụ ihe ga-eme eze ugwu. (Daniel 2:44) Daniel 11:44, 45 na-akọwa ihe omume ndị na-eduje n’agha ikpeazụ ahụ. Ka a sịkwa ihe mere na ‘ọ dịghị onye ga-enyere eze ugwu aka’ mgbe ọ ga-abịa n’ọgwụgwụ ya!

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Lee Isi nke 10 nke akwụkwọ a.

Gịnị Ka Ị Ghọtara?

• Olee otú onye bụ́ eze ugwu ahụ si gbanwee mgbe Agha Ụwa nke Abụọ gasịrị?

• Gịnị ga-emesịa mee eze ugwu na eze ndịda?

• Olee otú i siworo rite uru site n’ịṅa ntị n’amụma Daniel banyere ịma aka dị n’etiti eze abụọ ahụ?

[Chaatị/Foto dị na peeji nke 284]

Ndị Eze Dị na Daniel Isi nke 11

Eze Ugwu Eze Ndịda

Daniel 11:5 Seleucus Mbụ Nicator Ptolemy nke Mbụ

Daniel 11:6 Antiochus nke Abụọ Ptolemy nke Abụọ

(nwunye ya bụ Laodice) (ada ya bụ Berenice)

Daniel 11:7-9 Seleucus nke Abụọ Ptolemy nke Atọ

Daniel 11:10-12 Antiochus nke Atọ Ptolemy nke Anọ

Daniel 11:13-19 Antiochus nke Atọ Ptolemy nke Ise

(ada ya bụ Cleopatra Onye nnọchi:

nke Mbụ) Ndị nnọchi: Ptolemy nke Isii

Seleucus nke Anọ na

Antiochus nke Anọ

Daniel 11:20 Ọgọstọs

Daniel 11:21-24 Taịbiriọs

Daniel 11:25, 26 Aurelian Eze Nwanyị

Alaeze Ukwu Rom Zenobia

adakpọọ

Daniel 11:27-30a Alaeze Ukwu Britain, e mesịa

Germany Ike Ọchịchị Ụwa

(Agha Ụwa Mbụ) Anglo-America

Daniel 11:30b, 31 Alaeze nke Atọ Hitler Ike Ọchịchị Ụwa

(Agha Ụwa nke Abụọ) Anglo-America

Daniel 11:32-43 Ìgwè mba Kọmunist Ike Ọchịchị Ụwa

(Agha Nzuzo) Anglo-America

Daniel 11:44,45 O bilitebeghịb Ike Ọchịchị Ụwa

Anglo-America

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

b Amụma dị na Daniel isi nke 11 ekwughị aha òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ndị ga-anọ n’ọkwá eze ugwu na eze ndịda n’oge dị iche iche. A na-amara ndị ha bụ nanị mgbe ihe ndị ahụ malitere ime. Ọzọkwa, ebe ọgụ ahụ na-abịa ná nkebi ná nkebi, e nwere mgbe ha na-adịghị alụ ọgụ—otu eze ga na-akpa ike ebe nke ọzọ na-agaghị adị ike.

[Foto dị na peeji nke nke 271]

[Foto dị na peeji nke 279]

‘Ịsọ mpi’ nke eze ndịda agụnyewo iji nkà na ụzụ ndị bụ́ ọkpọka na-eme nledo nakwa iyi egwu ibu agha

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya