“M Nọnyeere Unu”
“Ọtụtụ ndị ga na-awagharị, ezi ihe ọmụma ga-abakwa ụba.”—DAN. 12:4.
GỊNỊ KA Ị GA-AZA?
N’oge anyị a, olee otú ndị mmadụ si nweta “ezi ihe ọmụma”?
Olee otú ndị natara eziokwu Baịbụl sirila dị “ọtụtụ”?
Olee ụzọ dị iche iche ezi ihe ọmụma sirila ‘baa ụba’?
1, 2. (a) Olee otú anyị si mara na Jizọs nọnyeere anyị ugbu a nakwa na ọ ga-anọnyere anyị n’ọdịnihu? (b) Dị ka Daniel 12:4 kwuru, olee ihe ga-eme mgbe ụfọdụ ndị ga-amụsi Akwụkwọ Nsọ ike?
WEREGODỊ ya na ị nọ na Paradaịs. Ụtụtụ ọ bụla i tetara ụra, ahụ́ na-agbasi gị ike, obi adịkwa gị ụtọ ime ihe ndị dịịrị gị n’ụbọchị ahụ. Isi anaghị awa gị, ahụ́ anaghịkwa egbu gị mgbu. Ọrịa ọ bụla na-arịabu gị alaala. Ị na-ahụ ụzọ nke ọma, na-anụ ihe, na-anụ ísì, na-anụkwa ụtọ ihe nke ọma. Ume juru gị obi. Ọrụ ị na-arụ na-atọ gị ụtọ. I nwere ọtụtụ ndị enyi. E nweghịzi ihe na-echegbu gị. Ihe ndị ahụ bụ ngọzi ị ga-enweta mgbe Alaeze Chineke ga na-achị ụwa. Kraịst Jizọs, bụ́ Eze Chineke họpụtara, ga-agọzi ndị ọ na-achị ma kụziere ha banyere Jehova.
2 Jehova ga-anọnyere ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi ka ha na-akụziri ndị mmadụ ime uche ya n’ụwa niile. Kemgbe ọtụtụ afọ, Chineke na Ọkpara ya nọnyeere ndị kwesịrị ntụkwasị obi. Tupu Jizọs alaghachi eluigwe, o kwere ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ntụkwasị obi nkwa na ya ga-anọnyere ha. (Gụọ Matiu 28:19, 20.) Iji mee ka obi sie anyị ike na Jizọs ga-emezu nkwa ahụ, ka anyị tụlee naanị otu ahịrịokwu dị n’amụma e dere na Babịlọn ihe karịrị puku afọ abụọ na narị ise gara aga. Daniel onye amụma dere banyere ‘oge ikpeazụ’ anyị bi na ya taa, sị: “Ọtụtụ ndị ga na-awagharị, ezi ihe ọmụma ga-abakwa ụba.” (Dan. 12:4) Anyị aghọtala ugbu a na ‘mwagharị’ e kwuru okwu ya n’amaokwu a pụtara ịmụsi ihe ike. Chineke ga-agọzi ndị na-amụsi Akwụkwọ Nsọ ike ma mee ka ha ghọta eziokwu dị n’Okwu ya nke ọma. Amụma ahụ kwukwara na ọtụtụ ndị ga-enweta “ezi ihe ọmụma,” ihe ọmụma ahụ ga-ejukwa ebe niile. Ha ga-akụziri ndị ọzọ eziokwu ha mụtara, onye ọ bụla chọrọ ya ga-enwekwa ike ịmụta ya. Ka anyị na-atụle otú amụma a sirila mezuo, anyị ga-ahụ na Jizọs nọnyeere ndị na-eso ụzọ ya taa nakwa na Jehova ga-emezuli nkwa niile o kwere.
OTÚ E SI NWETA “EZI IHE ỌMỤMA”
3. Mgbe ndịozi Jizọs nwụchara, gịnị mere “ezi ihe ọmụma”?
3 Mgbe ndịozi nwụchara, ụfọdụ ndị malitere isi n’ezi ofufe dapụ otú ahụ e buru n’amụma. Ozizi ụgha ha gbasakwara ka ọkụ. (Ọrụ 20:28-30; 2 Tesa. 2:1-3) Ruo ọtụtụ narị afọ, ma ndị na-amaghị ihe ọ bụla banyere Baịbụl ma ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst enweghị “ezi ihe ọmụma” ahụ. N’agbanyeghị na ndị isi okpukpe kwuru na ha kweere na Baịbụl bụ Okwu Chineke, ha kụziiri ndị mmadụ “ozizi ndị mmụọ ọjọọ,” bụ́ ozizi na-eme ka a kparịa Chineke. (1 Tim. 4:1) N’ihi ya, ọtụtụ ndị amaghị eziokwu banyere Chineke. Ụfọdụ n’ime ozizi ụgha ndị ha kụziri bụ na Chineke bụ Atọ n’Ime Otu, na mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ, nakwa na e nwere mkpụrụ obi ndị a na-ata ahụhụ ebighị ebi n’ọkụ mmụọ.
4. Olee otú Ndị Kraịst ole na ole si malite ịchọ “ezi ihe ọmụma” n’ihe dị ka afọ 1879?
4 Ma ihe gbanwere n’ihe dị ka afọ 1879, ya bụ, mgbe ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ iri afọ anọ tupu “oge ikpeazụ” amalite. Na Pensụlvenịa dị n’Amerịka, Ndị Kraịst ole na ole ji obi ha niile na-achọ eziokwu. Ha na-ezukọ ka ha mụọ Baịbụl nke ọma ma chọọ “ezi ihe ọmụma.” (2 Tim. 3:1) Ha kpọrọ onwe ha Ndị Mmụta Baịbụl. Ha abụghị “ndị amamihe na ndị nwere ọgụgụ isi,” bụ́ ndị Jizọs kwuru na a ga-ezonahụ ezi ihe ọmụma. (Mat. 11:25) Ha dị umeala n’obi, jiri obi ha niile na-achọ ime uche Chineke. Ha gụrụ Akwụkwọ Nsọ nke ọma, kwurịta ihe ha gụtara, tụgharịa uche na ya ma kpee ekpere ka Chineke nyere ha aka. Ha tụlere ihe amaokwu dị iche iche dị na Baịbụl kwuru, tụleekwa ihe ndị bu ha ụzọ mee ụdị nchọnchọ ahụ dere. Ndị Mmụta Baịbụl ji nwayọọ nwayọọ ghọta eziokwu ọtụtụ ndị na-amaghị kemgbe ọtụtụ narị afọ.
5. Gịnị mere e ji bipụta traktị ndị ahụ a kpọrọ The Old Theology?
5 Ọ bụ eziokwu na ihe Ndị Mmụta Baịbụl na-amụta mere ka obi dị ha ụtọ, ha ekweghị ka ihe ndị ahụ mee ka ha dị mpako; ha ekwughịkwa na ha achọpụtala ihe ọhụrụ. (1 Kọr. 8:1) Kama, ha bipụtara traktị ndị a kpọrọ The Old Theology (ya bụ, Ihe Ndị A Kụziri n’Oge Ochie). Ihe mere ha ji bipụta ha bụ ka ndị ga-agụ ha mata eziokwu ndị e dere na Baịbụl. Na traktị ndị ha bu ụzọ bipụta, e dere “ihe mmadụ ga-agụkwu ka o nyere ya aka mgbe ọ na-amụ Baịbụl, nke ga-eme ka ọ jụ omenala ụgha niile nke ndị mmadụ ma nabata eziokwu niile Onyenwe anyị na ndịozi ya kụziri n’oge ochie.”—The Old Theology, Nke 1, Eprel 1889, peeji nke 32.
6, 7. (a) Olee eziokwu ndị anyị ghọtarala kemgbe ihe dị ka afọ 1879? (b) Olee eziokwu ị mụtara nke kacha eme gị obi ụtọ?
6 Kemgbe ihe dị ka afọ 1879, Ndịàmà Jehova amụtala eziokwu ndị magburu onwe ha!a Eziokwu ndị ahụ abụghị ihe na-agwụ ike ma ọ bụ ihe e ji amata onye ụbụrụ na-aghọ nkọ. Ha na-eme anyị obi ụtọ, na-eme ka ndụ anyị ka mma, na-emekwa ka anyị nwee olileanya. Ha na-enyere anyị aka ịmata Jehova nke ọma ma ghọtakwuo nzube ya. Ha na-eme ka anyị ghọta onye Jizọs bụ, ihe mere o ji bịa n’ụwa nwụọ na ihe ọ na-eme ugbu a. Eziokwu ndị ahụ bara uru na-eme ka anyị ghọta ihe mere Chineke ji kwe ka ihe ọjọọ na-eme, ihe mere mmadụ ji anwụ anwụ, otú anyị kwesịrị isi na-ekpe ekpere, na otú anyị ga-esi na-enwe ezigbo obi ụtọ.
7 Anyị nweziri ike ịghọta amụma ndị ‘e zochiri’ ruo ọtụtụ afọ, bụ́ ndị na-emezu n’oge ikpeazụ a. (Dan. 12:9) Ọtụtụ amụma ndị ahụ dị n’akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn nakwa n’akwụkwọ Mkpughe. Jehova enyekwarala anyị aka ịghọta ihe ndị mere n’eluigwe, bụ́ ihe mmadụ na-enweghị ike ịhụ anya, ya bụ, na Jizọs aghọọla Eze, na a lụrụ agha n’eluigwe, nakwa na a chụdatara Setan n’ụwa. (Mkpu. 12:7-12) Chineke emeekwala ka anyị ghọta ihe mere ihe ndị anyị na-ahụ anya ji na-eme, ma agha ma ala ọma jijiji ma ọrịa dị iche iche ma ụkọ nri, nakwa ihe mere ndị mmadụ ji akpa àgwà ọjọọ ndị na-eme ka oge anyị bụrụ “oge dị oké egwu, nke tara akpụ.”—2 Tim. 3:1-5; Luk 21:10, 11.
8. Ònye ka anyị kwesịrị ịna-ekele maka ihe ndị anyị na-ahụ na ihe ndị anyị na-anụ?
8 Obi dị anyị otú ọ dị ndị na-eso ụzọ Jizọs mgbe Jizọs gwara ha, sị: “Obi ụtọ na-adịrị anya nke na-ahụ ihe unu na-ahụ. N’ihi na ana m asị unu, Ọtụtụ ndị amụma na ndị eze chọrọ ịhụ ihe ndị unu na-ahụ, ma ha ahụghị ha, ha chọkwara ịnụ ihe ndị unu na-anụ, ma ha anụghị ha.” (Luk 10:23, 24) Anyị na-ekele Jehova Chineke na o mere ka anyị na-ahụ ma na-anụ ihe ndị ahụ. Obi dịkwa anyị ụtọ na Chineke zitere “ihe inyeaka,” bụ́ mmụọ nsọ ya, ka o nyere anyị aka “ịghọta eziokwu niile”! (Gụọ Jọn 16:7, 13.) Ka anyị jiri “ezi ihe ọmụma” ahụ kpọrọ ihe mgbe niile, na-enyekwara ndị ọzọ aka ịmụta ya!
“ỌTỤTỤ NDỊ” NA-ANABATA “EZI IHE ỌMỤMA”
9. Olee òkù a kpọrọ n’Ụlọ Nche Eprel 1881?
9 Mgbe ọ na-erubeghị afọ abụọ a malitere ibipụta Ụlọ Nche, ya bụ, n’Eprel 1881, e bipụtara otu isiokwu bụ́ “A Chọrọ Otu Puku Ndị Nkwusa.” Isiokwu ahụ kwuru ka ndị nwere ike iji ọkara oge ha ma ọ bụ oge ha niile na-ekwusa ozi ọma bụrụ ndị kọpọtụa, ya bụ, ndị ọsụ ụzọ. A gwara ha ka ha gaa n’ebe niile ha nwere ike ịchọta Ndị Kraịst ji obi ha niile hụ Chineke n’anya ma ghara inwe ezi ihe ọmụma nakwa ka ha kụziere ha eziokwu banyere Chineke na Okwu ya, bụ́ Baịbụl.
10. Gịnị ka ndị mmadụ mere n’ihi òkù ahụ a kpọrọ maka ndị nkwusa oge niile?
10 Òkù ahụ Ndị Mmụta Baịbụl kpọrọ ndị ọzọ gosiri na ha ghọtara na ọrụ kacha mkpa ezi Ndị Kraịst na-arụ bụ ikwusa ozi ọma. Ma òkù ahụ ha kpọrọ maka otu puku ndị nkwusa gosiri na ha tụrụ anya na a ga-enwekwu ndị nkwusa, ebe ọ bụ na ndị na-abịa ọmụmụ ihe ha n’oge ahụ dị naanị narị ole na ole. Mgbe ọtụtụ ndị gụchara traktị ma ọ bụ Ụlọ Nche, ha ghọtara na ha achọtala eziokwu, zakwa òkù ahụ a kpọrọ. Dị ka ihe atụ, n’afọ 1882, otu nwoke bi na Lọndọn dị n’Ingland gụrụ Ụlọ Nche na otu akwụkwọ nta Ndị Mmụta Baịbụl bipụtara ma dee, sị: “Biko, kụzierenụ m ihe a ga-ekwusa na otú a ga-esi kwusaa ya ka m nwee ike iso rụọ ọrụ ahụ dị nsọ Chineke chọrọ ka a rụọ.”
11, 12. (a) Gịnị ka ndị kọpọtụa bu n’obi kwusaa ozi ọma? (b) Olee otú ndị kọpọtụa si malite “klas” ma ọ bụ ọgbakọ dị iche iche?
11 N’afọ 1885, ihe dị ka narị Ndị Mmụta Baịbụl atọ bụ ndị kọpọtụa. Ihe ndị ozi oge niile ahụ bu n’obi na-ekwusa ozi ọma bụkwa ihe anyị bu n’obi ekwusa ya taa, ya bụ, ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst. Ma, otú ha si kwusaa ya dị iche n’otú anyị si ekwusa ya. Taa, anyị na-amụrụ ndị mmadụ ihe otu otu, na-akụziri otu onye ihe naanị ya. Anyị na-akpọzi ya ka ọ bịa ọmụmụ ihe n’ọgbakọ dị adị. Ma n’oge ahụ, ndị kọpọtụa na-enye ndị mmadụ akwụkwọ ma kpọkọta ndị nwere mmasị ka ha niile mụkọọ Akwụkwọ Nsọ ọnụ. Kama ịmụrụ ndị mmadụ ihe otu otu, ha na-amalite ọgbakọ ndị ọhụrụ, bụ́ ndị ha kpọrọ klas.
12 Dị ka ihe atụ, n’afọ 1907, ụfọdụ ndị kọpọtụa gagharịrị n’otu obodo, na-achọ ndị nwerela akwụkwọ bụ́ Millennial Dawn (nke a kpọkwara Studies in the Scriptures). Ụlọ Nche kwuru, sị: “Ndị ahụ [nwere mmasị] na-ezukọ n’ụlọ otu onye n’ime ha. Malite n’ụtụtụ ụbọchị Sọnde ruo ná mgbede, onye Kọpọtụa na-agwa ha okwu banyere ihe Chineke bu n’obi maka ụmụ mmadụ. N’ụbọchị Sọnde ọzọ, ọ na-agba ndị bịara ọmụmụ ihe ume ka ha na-ezukọ kwa izu.” N’afọ 1911, ha gbanwere otú ha si akụziri ndị ọzọ Baịbụl. Mmadụ iri ise na asatọ, bụ́ ndị ozi pụrụ iche na-ejegharị ejegharị, gara ebe dị iche iche n’Amerịka nakwa na Kanada ikwu okwu ihu ọha. Ụmụnna ndị ahụ na-ede aha na adres ndị nwere mmasị, bụ́ ndị bịara gee okwu ihu ọha ahụ. Ha haziri ha ka ha na-ezukọ n’ụlọ ndị mmadụ iji malite “klas” ọhụrụ. N’afọ 1914, Ndị Mmụta Baịbụl nwere otu puku ọgbakọ na narị abụọ n’ụwa niile.
13. Gịnị na-eme gị obi ụtọ ma i cheta otú “ezi ihe ọmụma” gbasaruru taa?
13 Taa, ọgbakọ ndị e nwere n’ụwa niile dị ihe dị ka otu narị puku na itoolu, na narị anọ. Ndị ọsụ ụzọ oge niile e nwere dịkwa ihe dị ka narị puku asatọ na iri itoolu na ise, na narị asatọ. Ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ nde mmadụ asatọ enwetala “ezi ihe ọmụma,” na-emekwa ihe ndị ha mụtara. (Gụọ Aịzaya 60:22.)b Ihe a niile na-eme anyị obi ụtọ, ebe ọ bụ na Jizọs buru amụma na ‘mmadụ niile ga-akpọ ndị na-eso ụzọ ya asị’ n’ihi aha ya. O kwukwara na a ga-akpagbu ha, tụọ ha mkpọrọ, gbuokwa ha. (Luk 21:12-17) N’agbanyeghị na Setan, ndị mmụọ ọjọọ ya, na ọtụtụ mmadụ na-emegide ndị Jehova, ha ka na-eme ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs, na-arụpụtakwa ọtụtụ ihe. Taa, ha na-ekwusa ozi ọma “n’elu ụwa dum mmadụ bi,” ma n’ebe na-ekpo ezigbo ọkụ ma n’ebe na-ajụ ezigbo oyi ma n’ugwu ma n’ọzara ma n’obodo mepere emepe ma n’ime ime obodo. (Mat. 24:14) E nweghị otú ha gaara esi rụọ ihe a niile ma ọ bụrụ na Jehova anaghị akwado ha.
‘EZI IHE ỌMỤMA ABAALA ỤBA’
14. Olee otú akwụkwọ ndị a na-ebipụta sirila mee ka “ezi ihe ọmụma” baa ụba?
14 Ọtụtụ ndị na-ekwusa ozi ọma emeela ka “ezi ihe ọmụma” baa ụba. A na-ejikwa akwụkwọ ndị a na-ebipụta eme ka ọ bakwuo ụba. Na Julaị 1879, Ndị Mmụta Baịbụl bipụtara Ụlọ Nche mbụ nke a kpọrọ Zion’s Watch Tower and Herald of Christ’s Presence. Ndị Mmụta Baịbụl kwụrụ otu ụlọ ọrụ na-ebi akwụkwọ ụgwọ, ha ebiere ha puku magazin isii naanị n’asụsụ Bekee. A họọrọ Chas Tez Rọsel (Charles Taze Russell) ka ọ bụrụ onye na-achịkọta ihe a na-ede na magazin ahụ. Ọ dị afọ iri abụọ na asaa mgbe ahụ. E nwekwara mmadụ ise ndị ọzọ bụ́ Ndị Mmụta Baịbụl so na-ede ihe a na-ebipụta. Ugbu a, a na-ebipụta Ụlọ Nche n’asụsụ otu narị na iri itoolu na ise. Ọ bụ magazin a kacha ekesa n’ụwa niile. A na-ebipụta nke ọ bụla iri nde anọ na abụọ, na otu narị puku na iri puku asatọ na abụọ. Magazin nke abụọ a kacha ekesa bụ nwanne ya bụ́ Teta! A na-ebipụta nke ọ bụla iri nde anọ na otu, na iri puku anọ na abụọ, n’asụsụ iri asatọ na anọ. Baịbụl na akwụkwọ ndị ọzọ ha na-ebipụta kwa afọ na-eru ihe dị ka otu narị nde.
15. Olee otú e si enweta ego anyị ji ebipụta akwụkwọ?
15 E ji onyinye si ndị mmadụ n’obi akwado nnukwu ọrụ a. (Gụọ Matiu 10:8.) Ọ na-eju ndị na-ebi akwụkwọ anya n’ihi na ha ma na ihe ndị e ji ebi akwụkwọ dị oké ọnụ, ma ígwè ma akwụkwọ ma ink ma ihe ndị ọzọ. Otu nwanna nke na-azụtara alaka ụlọ ọrụ dị iche iche ihe ndị e ji ebi akwụkwọ kwuru, sị: “Ọ na-abụ ndị ọchụnta ego bịa ileta ebe anyị na-ebi akwụkwọ, ọ na-eju ha anya na ọ bụ onyinye si ndị mmadụ n’obi ka e ji azụta ígwè ọgbara ọhụrụ ndị dị oké ọnụ, bụ́ ndị nwere ike ibi ọtụtụ akwụkwọ. Ọ na-ejukwa ha anya na ọtụtụ ndị na-arụ ọrụ na Betel bụ ndị na-eto eto, bụrụkwa ndị obi dị ụtọ.”
IHE ỌMỤMA CHINEKE GA-EJUPỤTA ỤWA
16. Gịnị mere Jehova ji mee ka “ezi ihe ọmụma” baa ụba?
16 “Ezi ihe ọmụma” abaala ụba n’ihi na Chineke chọrọ “ka a zọpụta ụdị mmadụ niile, ka ha nwetakwa ezi ihe ọmụma nke eziokwu.” (1 Tim. 2:3, 4) Jehova chọrọ ka ndị mmadụ mara eziokwu, ka ha nwee ike ife ya ofufe nke ọma ma nweta ngọzi ya. Jehova emeela ka ndị mmadụ nweta “ezi ihe ọmụma,” si otú ahụ chịkọta ndị fọdụrụ ná Ndị Kraịst e tere mmanụ, bụ́ ndị kwesịrị ntụkwasị obi. Ọ na-achịkọtakwa “oké ìgwè mmadụ,” bụ́ ndị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa. Ha si “ná mba niile na ebo niile na ndị niile na asụsụ niile.”—Mkpu. 7:9.
17. Gịnị ka otú ezi ofufe sirila gbasaa na-egosi?
17 Otú ezi ofufe si gbasaa kemgbe ihe karịrị otu narị afọ na iri afọ atọ na-egosi na Chineke na Eze ọ họpụtara, bụ́ Jizọs Kraịst, nọnyeere ndị ohu Jehova nọ n’ụwa, na-eduzi ha, na-echebe ha, na-ahazi ha ma na-akụziri ha ihe. Ọ na-egosikwa na Jehova ga-emezurịrị nkwa niile o kwere anyị. “Ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa dị ka mmiri si kpuchie oké osimiri.” (Aịza. 11:9) Chegodị ọtụtụ ngọzi ụmụ mmadụ ga-enweta mgbe ahụ!
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ị ga-amụta ọtụtụ ihe na fim bụ́ Jehovah’s Witnesses—Faith in Action, Part 1: Out of Darkness (Okwukwe Siri Ike nke Ndịàmà Jehova Nwere, Nke Mbụ: Isi n’Ọchịchịrị Pụta) na Jehovah’s Witnesses—Faith in Action, Part 2: Let the Light Shine (Okwukwe Siri Ike nke Ndịàmà Jehova Nwere, Nke Abụọ: Ka Ìhè Nwuo).
b Gụọ akwụkwọ Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ, Mpịakọta nke II, peeji nke 320.
[Foto dị na peeji nke 6]
Ndị Mmụta Baịbụl dị umeala n’obi, jiri obi ha niile na-achọ ime uche Chineke
[Foto dị na peeji nke 7]
Jehova na-echeta otú i si agbalị ịkụziri ndị ọzọ “ezi ihe ọmụma” ya