Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 5/1 p. 8-13
  • Ụbọchị Jehova Dị Nso

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụbọchị Jehova Dị Nso
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mwakpo Ụmụ Ahụhụ
  • “Tetanụ, Unu Ndị Na-aṅụbiga Mmanya Ókè”!
  • “Tiekwanụ Aka n’Obi, Unu Ndị Nchụàjà”
  • “Ụbọchị Jehova Na-abịa”
  • “Onyenwe Anyị Anọghị Ọdụ”
  • Agha Ga-esi n’Ebe Ugwu Bịa
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2020
  • Na-eburu n’Uche Ịdị Nso nke Ụbọchị Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Ahụhụ nke Mbụ—Igurube
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • Ọnwụnwa Ndị Bịaara Anyị Mere Ka Anyị Tụkwasịkwuo Jehova Obi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 5/1 p. 8-13

Ụbọchị Jehova Dị Nso

“Nụrụnụ nke a, unu ndị okenye, ṅaakwanụ ntị, unu ndị nile bi n’ala nke a.”—JOEL 1:2.

1, 2. N’ihi ọnọdụ dị aṅaa dị na Juda ka Jehova ji mee ka Joel buo amụma ya dị ike?

“EWO, ụbọchị ahụ! n’ihi na ụbọchị Jehova dị nso, dị ka mbibi nke sitere n’aka Onye pụrụ ime ihe nile ka ọ ga-abịa.” Lee aha ọkwa na-akpali akpali ọ bụ! Ọ bụ ozi Chineke nye ndị ya nke Joel onye amụma ya ziri.

2 E dekọrọ okwu ndị ahụ nke Joel 1:15 na Juda, ma eleghị anya n’ihe dị ka n’afọ 820 T.O.A. Ugwu ahịhịa ndụ kpuchiri jupụtara ala ahụ mgbe ahụ. Mkpụrụ osisi na ọka juru eju. Ebe ịta nri sara mbara jupụtakwa n’ahịhịa ndụ. Ma ọ dị ihe na-adịghị agazi agazi ma ọlị. Ofufe Beal jupụtara na Jerusalem na n’ala Juda. Ndị ahụ tinyere aka n’oké aṅụrụma n’ihu chi ụgha a. (Tụlee 2 Ihe E Mere 21:4-6, 11.) Jehova ọ̀ ga-ekwe ka ihe a dum dịgide?

3. Gịnị ka Jehova dọrọ aka ná ntị banyere ya, gịnịkwa ka mba dị iche iche kwesịrị ijikere maka ya?

3 Akwụkwọ Bible bụ́ Joel ahapụghị obi abụọ ọ bụla banyere azịza ya. Jehova Chineke ga-ewepụ ọbụbụeze ya n’ụta ma doo aha nsọ ya nsọ. Oké ụbọchị Jehova dị nso. Mgbe ahụ Chineke ga-emezu ihe e kpere n’ikpe n’isi mba nile na “ndagwurugwu Jehoshafat.” (Joel 3:12) Ka ha jikere ibuso Onye Pụrụ Ime Ihe Nile, bụ́ Jehova, agha. Anyị onwe anyị kwa, na-eche oké ụbọchị Jehova ihu. Ya mere ka anyị lebatụkwuo anya n’okwu amụma Joel maka ụbọchị anyị na oge gara aga.

Mwakpo Ụmụ Ahụhụ

4. Ruo ókè hà aṅaa ka ihe Joel dọrọ aka ná ntị ya ga-adịru ukwuu?

4 Site n’ọnụ onye amụma ya, Jehova na-asị: “Nụrụnụ nke a, unu ndị okenye, ṅaakwanụ ntị, unu ndị nile bi n’ala nke a. Nke a, ọ̀ dịwo n’ụbọchị unu? ma ọ bụ n’ụbọchị nna unu hà? Kọọrọnụ ya ụmụ unu, ka ụmụ unu kọọkwara ụmụ ha, ka ụmụ ha kọọkwara ọgbọ ọzọ.” (Joel 1:2, 3) Ndị okenye na ndị ahụ nile pụrụ ịtụ anya ihe ihe yiri ya na-emetụbeghị mbụ n’oge ndụ ha ma ọ bụ n’ụbọchị ndị nna nna ha. Ọ ga-apụ nnọọ iche nke na a ga-akọrọ ya ọgbọ nke atọ! Gịnị bụ ihe omume a dị ịrịba ama? Iji chọpụta, ka anyị were ya na anyị nọ laa azụ n’ụbọchị Joel.

5, 6. (a) Kọwaa ihe otiti nke Joel buru amụma ya? (b) Ònye bụ Isi Iyi nke ihe otiti ahụ?

5 Gee ntị! Joel anụ mbigbọ si ebe dị anya. Ihu igwe agbachie, ụda ahụ na-atụ ụjọ adasikwuo ike ka ọchịchịrị ahụ na-agbasa n’ihu igwe. Mgbe ahụ urukpuru dị ka anwụrụ ọkụ agbadata. Ọ bụ ìgwè ụmụ ahụhụ dị ọtụtụ nde. Leekwa oké mbibi ha na-akpata! Ugbu a, tụlee Joel 1:4. Ụmụ ahụhụ a na-eme mwakpo abụghị nanị igurube puru nku na-esi otu ebe efega ebe ọzọ. Mbanụ! Ndị na-abịakwa bụ ìgwè igurube agụụ ji, ndị na-arị arị, ndị na-epughị nku. N’ịbụ ndị ikuku butere, igurube ndị ahụ rutere na mberede, ụzụ ha dịkwa ka nke ọtụtụ ụgbọ ịnyịnya. (Joel 2:5) N’ihi iri oké nri ha, ọtụtụ nde n’ime ha pụrụ ime ka ebe bụ paradaịs n’ezie ghọọ ọzara ọsọ ọsọ.

6 Ndị sokwa azọ ije bụ egu—ịkpakwuru nke nla ma ọ bụ urukurubụba. Usuu buru ibu nke egu agụụ ji pụrụ ịtabisị akwụkwọ ihe ọkụkụ nke nta nke nta ruo mgbe ihe ọkụkụ ndị ahụ fọrọ nke nta ka ha gharakwa inwe akwụkwọ ndụ. Ihe dịkwa ukwuu n’ihe ha hapụrụ, igurube ndị ahụ na-eri ha. Ihe igurube ndị ahụ hapụkwara, ọchịcha ndị na-aga ngwa ngwa aghaghị irichapụ ya. Ma rịba nke a ama: Na Joel isi nke 2, amaokwu nke 11, Chineke mere ka a mata usuu igurube ahụ dị ka “usuu ndị agha Ya.” Ee, ọ bụ ya bụ Isi Iyi nke ihe otiti igurube ahụ ga-ebibi ala ahụ ma kpata ajọ ụnwụ nri. Olee mgbe? Kpọmkwem tupu “ụbọchị Jehova.”

“Tetanụ, Unu Ndị Na-aṅụbiga Mmanya Ókè”!

7. (a) Gịnị bụ ọnọdụ nke ndị ndú okpukpe Juda? (b) Olee otú ndị ndú okpukpe Krisendọm taa si nọrọ n’ọnọdụ yiri nke ndị ndú okpukpe Juda?

7 A kpọrọ otu ìgwè nwere ajọ aha, bụ́ ndị ndú okpukpe nke Juda, aha kpọmkwem mgbe e nyere iwu bụ́: “Tetanụ, unu ndị na-aṅụbiga mmanya ókè, kwaanụ ákwá; kwasiekwanụ ákwá ike, unu nile ndị na-aṅụ mmanya vine, n’ihi mmanya ụtọ; n’ihi na e bipụwo ya n’ọnụ unu.” (Joel 1:5) Ee, a gwara ndị aṅụrụma ime mmụọ nke Juda ka ha ‘teta,’ ka anya foo ha. Ma echela na nke a bụ akụkọ mgbe ochie nkịtị. Kpọmkwem ugbu a, tupu oké ụbọchị Jehova, ndị ụkọchukwu Krisendọm n’ụzọ ihe atụ ṅụjuru mmanya ụtọ afọ nke na o siiri ha nnọọ ike ịnụ òkù a sitere n’ọnụ Onye Kasị Ihe Nile Elu. Lee ka ọ ga-esi tụọ ha n’anya mgbe oké ụbọchị ahụ nke Jehova, nke dịkwa egwu, kpọtere ha n’ụra mmanya ogbugbu ime mmụọ ha!

8, 9. (a) Olee otú Joel si akọwa igurube ndị ahụ na mmetụta nke ihe otiti ha? (b) Taa, ole ndị ka igurube ndị ahụ na-anọchite anya ha?

8 Lee oké usuu igurube ahụ! “Otu mba arịgokwasịwo n’ala m, o nwere ume, n’adịghịkwa ọnụ ọgụgụ; ezé ya nile dị ka ezé ọdụm, o nwekwara ikiri ezé nke nne ọdụm. O mewo ka osisi vine nke m ghọọ ebe tọgbọrọ n’efu, o mewo ka osisi fig nke m ghọọ irighiri osisi: o kpechapụsịwo ụgbụgbọ ya, kpofuo ya; e mewo ka alaka ya nile dị ọcha. Kwaa ákwá dị ka nwa agbọghọ nke e keworo ákwà mkpe n’ihi di o nwere na nwata.”—Joel 1:6-8.

9 Nke a ọ̀ bụ nanị amụma banyere “otu mba” nke igurube, ìgwè igurube, ịwakwasị Juda? Ee e, ọ karịrị nke ahụ. Ma na Joel 1:6 ma ná Mkpughe 9:7, e ji igurube nọchite anya ndị Chineke. Usuu igurube nke oge a bụ kpọmkwem usuu ndị agha nke igurube e tere mmanụ nke Jehova, nke ihe dị ka mmadụ 5,600,000 nke “atụrụ ọzọ” Jisọs na-esonyere ugbu a. (Jọn 10:16) Obi ọ́ dịghị gị ụtọ ịbụ akụkụ nke ìgwè a buru ibu nke ndị na-efe Jehova ofufe?

10. Gịnị bụ mmetụta nke ihe otiti igurube ahụ n’ahụ Juda?

10 Na Joel 1:9-12, anyị na-agụ banyere mmetụta nke ihe otiti igurube ahụ. Ìgwè kwuru ìgwè na-eme ka ala ahụ tọgbọrọ n’efu kpam kpam. N’enweghị ọka, mmanya, na mmanụ, ndị nchụàjà ahụ na-ekwesịghị ntụkwasị obi apụghị ịnọgide n’ọrụ ha. Ọbụna ala na-eru újú, n’ihi na igurube ndị ahụ na-agbaba ya aka mkpụrụ, osisi ndị na-amị mkpụrụ enweghịkwa mkpụrụ. Ebe e bibiworo osisi vine, e nwekwaghị mmanya maka ndị na-efe Beal na-aṅụbiga mmanya ókè ndị bụkwa ndị aṅụrụma ime mmụọ!

“Tiekwanụ Aka n’Obi, Unu Ndị Nchụàjà”

11, 12. (a) Olee ndị na-azọrọ ịbụ ndị nchụàjà Chineke taa? (b) Olee otú ihe otiti igurube nke oge a si emetụta ndị ndú okpukpe Krisendọm?

11 Gee ntị n’ozi Chineke maka ndị nchụàjà ahụ na-enupụ isi. “Keenụ ákwà mkpe n’úkwù unu, tiekwanụ aka n’obi, unu ndị nchụàjà; kwasienụ ákwá ike, unu ndị oje ozi nke ebe ịchụàjà.” (Joel 1:13) Ná mmezu mbụ nke amụma Joel, ndị nchụàjà bụ́ ndị Livaị jere ozi n’ebe ịchụàjà. Ma gịnị banyere mmezu ikpeazụ ya? Taa, ndị ụkọchukwu Krisendọm azọrọwo ikike ije ozi n’ebe ịchụàjà Chineke, na-asị na ha bụ ndị ozi ya, “ndị nchụàjà” ya. Ma, gịnị na-eme ugbu a ka igurube Chineke n’oge a na-aga n’ihu?

12 Mgbe “ndị nchụàjà” Krisendọm hụrụ ndị Jehova n’ọrụ ma nụ ịdọ aka ná ntị ha banyere ikpe Chineke, obi adịghị eru ha ala. Ha na-eti aka n’obi ha n’iwe na ọnụma n’ihi mmetụta mbibi nke ozi Alaeze ahụ na-enwe. Ha na-akwasikwa ákwá ike ka ìgwè atụrụ ha si n’aka ha na-amịpụ. Ka a na-ebibisị ebe ịta nri ha, ha nọọ ọnọdụ abalị n’ákwà mkpe, na-eru újú n’ihi ego na-efunarị ha. N’isi nso, ha agaghịkwa enwe ọrụ! N’ezie, Chineke na-agwa ha ka ha ruo újú abalị dum n’ihi na ọgwụgwụ ha dị nso.

13. Krisendọm n’ozuzu ya ọ̀ ga-aṅa ntị n’ịdọ aka ná ntị Jehova?

13 Dị ka Joel 1:14 na-ekwu, nanị olileanya ha nwere bụ ichegharị na ‘itiku Jehova.’ Ànyị pụrụ ịtụ anya ka ndị ụkọchukwu dum nke Krisendọm chigharịkwuru Jehova? Ọ dịghị ma ọlị! Ndị mmadụ n’otu n’otu n’etiti ha pụrụ ige ntị n’ịdọ aka ná ntị Jehova. Ma ọnọdụ ịnọ n’ụkọ ime mmụọ nke ndị ndú okpukpe a na ndị parish ha ga-adịgide. Emọs onye amụma buru amụma, sị: “Lee, ụbọchị na-abịa, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Onyenwe anyị Jehova pụta), mgbe M ga-ezite oké ụnwụ n’ala, ọ bụghị oké ụnwụ nke nri, ọ bụghịkwa akpịrị ịkpọ nkụ nke mmiri, kama ọ bụ nke ịnụ okwu nile nke Jehova.” (Emọs 8:11) N’aka nke ọzọ, lee ka anyị si enwe obi ekele maka ụba oriri ime mmụọ Chineke ji ịhụnanya na-emere anyị site n’aka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche”!—Matiu 24:45-47.

14. Gịnị ka ihe otiti igurube ahụ na-ebutere ụzọ?

14 Ihe otiti igurube ahụ bụ ma n’oge gara aga ma n’oge a ihe na-ebutere ihe ọzọ ụzọ. Gịnị bụ ihe ahụ? Joel na-agwa anyị hoo haa, na-asị: “Ewo, ụbọchị ahụ! n’ihi na ụbọchị Jehova dị nso, dị ka mbibi nke sitere n’aka Onye pụrụ ime ihe nile ka ọ ga-abịa.” (Joel 1:15) Mwakpo zuru ụwa ọnụ nke usuu ndị agha igurube nke Chineke taa na-egosi n’ụzọ doro anya na oké ụbọchị Jehova ahụ, nke dịkwa egwu dị nso. N’ezie, agụụ ụbọchị ahụ pụrụ iche nke mpịazi na-agụsi ndị nile obi ha ziri ezi ike mgbe a ga-emezu ihe Chineke kpere n’ikpe n’isi ndị ajọ mmadụ, Jehova enweekwa mmeri dị ka Eze Eluigwe na Ala.

15. N’iburu ọnọdụ dị mwute nke ala ahụ n’uche, olee otú ndị ṅara ntị n’ịdọ aka ná ntị ahụ nke Chineke si emeghachi omume?

15 Dị ka Joel 1:16-20 na-egosi, e gbochiri nri ịbata na Juda oge ochie. Otu ihe ahụ mekwara aṅụrị. Ebe nkwakọba nri tọgbọrọ chakoo, a ghaghịkwa itikpọsị ọbá. N’enweghị ebe ịta nri n’ihi na igurube ndị ahụ anapụla ala ahụ akwụkwọ ndụ, ehi wagharịrị ná mgbagwoju anya, ìgwè atụrụ lakwara n’iyi. Lee ọdachi ọ bụ! N’etiti ọnọdụ dịgasị otú ahụ, olee ihe mere Joel? Dị ka amaokwu nke 19 na-ekwu, ọ sịrị: “Ọ bụ Gị, Jehova, ka m na-akpọku.” Taakwa, ọtụtụ ndị na-aṅa ntị n’ịdọ aka ná ntị Chineke ma na-etiku Jehova Chineke n’okwukwe.

“Ụbọchị Jehova Na-abịa”

16. N’ihi gịnị ka “ndị nile ndị bi n’ala” ahụ kwesịrị iji maa jijiji?

16 Gee ntị n’iwu a si n’ọnụ Chineke: “Fụọnụ opi ike n’ime Zaịọn, tiekwanụ mkpu agha n’ugwu nsọ m; ka ndị nile ndị bi n’ala nke a maa jijiji.” (Joel 2:1) Gịnị mere a ga-eji meghachi omume n’ụzọ dị otú a? Amụma ahụ na-aza: “N’ihi na ụbọchị Jehova na-abịa, n’ihi na ọ dị nso; ọ bụ ụbọchị ọchịchịrị na oké mgbachi, ụbọchị igwe ojii na oké ọchịchịrị, dị ka chi ọbụbọ nke bọsaworo n’elu ugwu nile.” (Joel 2:1, 2) E nwere mmetụta nke ezigbo ịdị ngwa e jikọrọ ya na oké ụbọchị Jehova.

17. Olee otú ihe otiti igurube ahụ si metụta ala na ndị mmadụ n’ime Juda?

17 Cheedị banyere mmetụta nke ọhụụ onye amụma ahụ nwere ka igurube ahụ ike na-adịghị agwụ agwụ mere ka ebe yiri ogige Iden ghọọ ebe tọgbọrọ n’efu. Gee ntị otú e si kọwaa usuu igurube ahụ: “Dị ka ịnyịnya si dị n’ile ha anya, otú a ka ha dị n’ile ha anya; ee, dị ka ndị ịnyịnya, otú a ka ha na-agba ọsọ. Dị ka olu ọtụtụ ụgbọala n’elu ugwu ka ha na-amali amali, dị ka olu ire ọkụ nke na-eripịa ahịhịa ọka, dị ka otu ndị nke nwere ume nke e doworo n’usoro agha. N’ihu ha ndị nile dị iche iche na-agbali: ihu nile achagharịsịwo.” (Joel 2:4-6) N’oge ihe otiti igurube ahụ n’ụbọchị Joel, ihe mgbu nke ndị na-efe Beal rịrị elu, a pụkwara ịhụ nchekasị n’ihu ha.

18, 19. Olee otú ọrụ ndị Chineke taa siworo yie ihe otiti igurube?

18 Ọ dịghị ihe kwụsịrị igurube ndị ahụ dị n’usoro, ike na-adịghị agwụ agwụ. Ha gbara ọsọ “dị ka ndị dike,” ọbụnakwa rịgoo mgbidi. Ọ bụrụ na ‘ụfọdụ adaa n’etiti ihe agha, ndị ọzọ adịghị ejebi ije ha.’ (Joel 2:7, 8) Lee nkọwa amụma doro anya nke a bụ banyere usuu igurube ihe atụ Chineke nke oge a! Taakwa, usuu igurube nke Jehova nọ na-aga n’ihu n’ihu. Ọ dịghị “mgbidi” nke mmegide na-egbochi ha. Ha adịghị emebi nguzosi ike n’ezi ihe ha nye Chineke kama ha dị njikere iche ọnwụ ihu, dị ka ọtụtụ puku Ndịàmà ndị ‘dara n’etiti ihe agha’ n’ihi ịjụ ito Hitler n’oge ọchịchị Nazi nke Germany mere.

19 Usuu igurube Chineke nke oge a agbawo àmà zuru ezu “n’obodo” Krisendọm. (Joel 2:9) Ha emewo otú ahụ n’ụwa dum. Ha ka na-arịfe ihe mgbochi nile, na-abanye n’ọtụtụ nde ụlọ, na-ejekwu ndị mmadụ n’okporo ámá, na-agwa ha okwu na fon, na-agakwu ha n’ụzọ ọ bụla o kwere omume ka ha na-akpọsa ozi Jehova. N’ezie, ha ekesawo ọtụtụ ijeri mbipụta ndị dabeere na Bible, ha ka ga-ekesakwa ọtụtụ ndị ọzọ n’ozi ha na-enweghị nkwụsị—ma n’ihu ọha ma site n’ụlọ ruo n’ụlọ.—Ọrụ 20:20, 21.

20. Olee ndị na-akwado igurube nke oge a, gịnịkwa si na ya apụta?

20 Joel 2:10 na-egosi na ìgwè igurube buru nnọọ ibu yiri igwe ojii nke pụrụ ikpuchi anyanwụ, ọnwa, na kpakpando. (Tụlee Aịsaịa 60:8.) È nwere obi abụọ ọ bụla banyere onye nọ n’azụ usuu ndị agha a? Karịa oké ụzụ ụmụ ahụhụ ahụ, anyị na-anụ okwu ndị a nke Joel 2:11: “Jehova emewokwa ka olu Ya daa n’ihu usuu ndị agha Ya; n’ihi na ihe bara ụba nke ukwuu ka ọmụma ụlọikwuu Ya bụ; n’ihi na onye nwere ume ka onye na-eme ihe O kwuru bụ: n’ihi na ụbọchị Jehova dị ukwuu dịkwa egwu nke ukwuu; ònyekwa ga-anagide ya?” Ee, Jehova Chineke na-ezipụ usuu ndị agha ya nke igurube ugbu a—tupu oké ụbọchị ya.

“Onyenwe Anyị Anọghị Ọdụ”

21. Gịnị ga-eme mgbe ‘ụbọchị Jehova bịara dị ka onye ohi’?

21 Dị ka Joel, Pita onyeozi kwuru banyere oké ụbọchị Jehova. O dere, sị: “Ụbọchị Onyenwe anyị ga-abịa dị ka onye ohi; nke ọ bụ n’ime ya ka eluigwe ga-eji oké ụzụ gabiga, ihe nile dị n’eluigwe ga-agbakwa ọkụ wee laa n’iyi, ụwa na ọrụ nile a rụrụ n’ime ya ga-erechapụkwa.” (2 Pita 3:10) N’okpuru mmetụta Setan bụ́ Ekwensu, ajọ “eluigwe” nke ọchịchị na-achị “ụwa,” ya bụ, ihe a kpọrọ mmadụ e wezụgara n’ebe Chineke nọ. (Ndị Efesọs 6:12; 1 Jọn 5:19) Eluigwe na ụwa ihe atụ a agaghị alanarị okpomọkụ nke iwe Chineke n’oké ụbọchị Jehova. Kama nke ahụ, ‘eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ, anyị na-ele anya ya, nke ezi omume bi n’ime ha’ ga-anọchi ha.—2 Pita 3:13.

22, 23. (a) Olee otú anyị kwesịrị isi meghachi omume n’ebe Jehova iji obi ebere na-enwe ndidi dị? (b) Olee otú anyị kwesịrị isi meghachi omume n’ebe ịdị nso nke ụbọchị Jehova dị?

22 N’ihi ihe ndọpụ uche na ule okwukwe nile ndị e nwere taa, anyị pụrụ ilefuru ịdị ngwa nke oge anyị anya. Ma dị ka igurube ihe atụ ndị ahụ nọgidere na-aga n’ihu n’ihu, ọtụtụ ndị na-anakwere ozi Alaeze ahụ. Ọ bụ ezie na Chineke enyewo oge maka nke a, anyị ekwesịghị ịghọtahie ndidi ya ịbụ ịnọ ọdụ. “Onyenwe anyị anọghị ọdụ n’ime nkwa Ya, dị ka ụfọdụ na-agụ ya na ọ bụ ịnọ ọdụ; kama Ọ na-atachiri unu ogologo ntachi obi, n’ihi na O zubeghị ka ndị ọ bụla laa n’iyi, kama ka mmadụ nile bịaruo nchegharị.”—2 Pita 3:9.

23 Ka anyị nọ na-echere oké ụbọchị Jehova, ka anyị buru n’obi okwu Pita e dekọrọ na 2 Pita 3:11, 12: “Ebe a na-eme ka ihe ndị a nile laa n’iyi otú a, ọ̀ bụ aha mmadụ gịnị ka unu na-aghaghị ịbụ n’ibi obi nsọ nile na nsọpụrụ Chineke nile, na-ele anya ọbịbịa nke ụbọchị ahụ nke Chineke, na-emekwa ka ọ bịa ngwa ngwa, nke eluigwe ga-ere ọkụ wee laa n’iyi n’ihi ya, ihe nile dị n’eluigwe ga-agbakwa ọkụ wee gbazee?” Ọrụ na omume nile ndị a gụnyere n’ezie na anyị ga na-esochi usuu igurube nke Jehova anya site n’ịdị na-ekerechi òkè dị irè anya n’ikwusa ozi ọma Alaeze tupu ọgwụgwụ ahụ abịa.—Mak 13:10.

24, 25. (a) Olee otú i si emeghachi omume n’ihe ùgwù nke ikere òkè n’ọrụ usuu igurube nke Jehova? (b) Ajụjụ dị aṅaa dị mkpa ka Joel welitere?

24 Usuu igurube nke Chineke agaghị akwụsị ọrụ ya ruo mgbe oké ụbọchị ahụ nke Jehova, nke dịkwa egwu, tiwapụrụ. Ịdị adị n’ezie nke ìgwè igurube a a na-apụghị ịkwụsịli akwụsị bụ ihe nnwapụta dị ịrịba ama na ụbọchị Jehova dị nso. Obi ọ́ dịghị gị ụtọ ije ozi n’etiti igurube e tere mmanụ nke Chineke na ndị enyi ha ná mwakpo ikpeazụ tupu oké ụbọchị ahụ nke Jehova nke dịkwa egwu?

25 Lee ka ụbọchị Jehova ga-esi dị ukwuu! Ka a sịkwa ihe mere e ji welite ajụjụ bụ́: “Ònyekwa ga-anagide ya?” (Joel 2:11) A ga-atụle ajụjụ a na ọtụtụ ndị ọzọ n’isiokwu abụọ na-esonụ.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

◻ N’ihi gịnị ka Jehova ji dọọ aka ná ntị banyere ihe otiti ụmụ ahụhụ n’isi Juda?

◻ Ná mmezu nke oge a nke amụma Joel, olee ndị bụ igurube Jehova?

◻ Olee otú ndị ndú Krisendọm si emeghachi omume n’ebe ihe otiti igurube ahụ dị, oleekwa ụzọ ụfọdụ n’ime ha pụrụ isi gbanarị ihe ndị ga-esi na ya pụta?

◻ Ruo ókè hà aṅaa ka ihe otiti igurube ahụ ruworo na narị afọ nke 20 a, ruokwa ole mgbe ka ọ ga-adịgide?

[Foto dị na peeji nke 9]

Ihe otiti ụmụ ahụhụ bụ ihe na-ebutere ọbụna ihe ka ukwuu ụzọ

[Ebe E Si Nweta Foto]

Osisi na-enweghị akwụkwọ: foto FAO/G. Singh

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

Ọ bụ Jehova Chineke na-akpata ihe otiti igurube nke oge a

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 8]

Igurube: foto FAO/G. Tortoli; usuu igurube: foto FAO/Desert Locust Survey

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya