-
Agha Ga-esi n’Ebe Ugwu BịaỤlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2020 | Eprel
-
-
14. Olee mgbe amụma e buru na Joel 2:28, 29 mezuru?
14 Joel nwere ozi dị mma o ziri ha. Ala ahụ ga-emewekwa nri. (Joel 2:23-26) O nwekwara mgbe ọ ga-eru, ihe ndị ga-enyere ha aka ife Chineke abaa ụba. Jehova sịrị: “M ga-awụkwasị mmụọ m n’ahụ́ ụdị anụ ahụ́ ọ bụla, ụmụ unu ndị ikom na ụmụ unu ndị inyom ga-ebukwa amụma. . . . M ga-awụkwasịkwa mmụọ m ọbụna n’ahụ́ ndị ikom na-eje ozi nakwa n’ahụ́ ndị inyom na-eje ozi.” (Joel 2:28, 29) Jehova awụkwasịghị ha mmụọ nsọ ya ozugbo ha si Babịlọn lọta n’ala ha. Kama, o mere ya mgbe ọtụtụ narị afọ gachara, na Pentikọst afọ 33. Olee otú anyị si mara?
15. Dị ka e kwuru n’Ọrụ Ndịozi 2:16, 17, olee ihe Pita gbanwere n’ihe e kwuru na Joel 2:28? Gịnịkwa ka ọ pụtara?
15 Pita onyeozi si n’ike mmụọ nsọ kwuo na ihe ndị dị ịtụnanya mere n’ụbọchị Pentikọst mezuru amụma ahụ e buru na Joel 2:28, 29. N’ihe dị ka elekere itoolu nke ụtụtụ, Chineke wụkwasịrị ndị mmadụ mmụọ nsọ ya, ha amalite ikwu “banyere ihe ndị dị ebube nke Chineke.” (Ọrụ 2:11) Mgbe Pita si n’ike mmụọ nsọ na-ekwughachi ihe Joel buru n’amụma, o ji okwu dịtụ iche kwuo ya. Ị̀ chọpụtara ihe ọ gbanwere? (Gụọ Ọrụ Ndịozi 2:16, 17.) Kama Pita ịsị “mgbe e mesịrị,” ọ sịrị: “N’oge ikpeazụ.” N’amaokwu a, oge ikpeazụ ọ na-ekwu gbasara ya bụ tupu e bibie Jeruselem na ụlọ nsọ ya. Chineke ga-awụkwasị “ụdị anụ ahụ́ ọ bụla” mmụọ nsọ ya. Ihe a gosiri na ogologo oge gafere tupu amụma Joel ahụ emezuo.
16. Olee otú mmụọ nsọ Chineke si nye aka n’ozi ọma n’oge ndịozi Jizọs? Oleekwa otú o si enyere anyị aka taa?
16 Ọ bụ mgbe Chineke wụkwasịchara ndị ya mmụọ nsọ n’oge ndịozi ka ha bidoro ikwusa ozi ọma ga-emecha ruo ebe niile n’ụwa. N’ihe dị ka afọ 61, mgbe Pọl degaara Ndị Kọlọsi akwụkwọ ozi, o kwuru na e kwusaala ozi ọma ahụ “n’etiti ihe niile e kere eke dị n’okpuru eluigwe.” (Kọl. 1:23) “Ihe niile e kere eke” Pọl na-ekwu okwu ya pụtara ebe ya na ndị ọzọ garuru. Jehova ejirila mmụọ nsọ ya mee ka ozi ọma ahụ gazuo ọtụtụ ebe n’ụwa taa. E nwere ike ikwu na o ruola ná “nsọtụ ụwa.”—Ọrụ 13:47; gụọ igbe bụ́ “M Ga-awụkwasị Mmụọ M n’Ahụ́” Ndị Ohu M.
-