Na-eburu n’Uche Ịdị Nso nke Ụbọchị Jehova
“Ụbọchị Jehova dị nso n’ime ndagwurugwu mkpebi ikpe.”—JOEL 3:14.
1. N’ihi gịnị ka agha ahụ dị nsọ na-abịanụ nke Jehova mara ọkwa ya ga-eji dị iche pụọ n’agha nile “dị nsọ” nke ihe a kpọrọ mmadụ?
“KPỌSAANỤ nke a n’etiti mba nile; doonụ agha nsọ”! (Joel 3:9) Nke a ọ̀ pụtara agha dị nsọ? N’ileghachi anya azụ n’Agha Ntụte ndị ahụ, agha okpukpe ndị ahụ, na agha ụwa abụọ ndị ahụ—bụ́ ndị Krisendọm keere òkè pụtara ìhè na ha—ọ pụrụ ịwụ anyị ibubo n’ahụ iche echiche banyere agha “dị nsọ.” Otú ọ dị, agha ahụ dị nsọ nke amụma Joel abụghị agha dị n’etiti mba nile. Ọ bụghị ndọrọ ndọrọ jupụtara n’ịkpọasị maka ókèala ma ọ bụ ihe onwunwe, na-eji okpukpe na-eme ihe dị ka ihe ngọpụ. Ọ bụ agha ezi omume. Ọ bụ agha Chineke ga-eji kpochapụ anyaukwu, esemokwu, omume rụrụ arụ, na mmegbu n’ụwa. Ọ ga-ewepụ izi ezi nke ọkaaka Jehova n’ụta n’elu ihe nile o kere eke. Agha ahụ ga-edozi ụzọ maka Alaeze Kraịst iwebata ihe a kpọrọ mmadụ gaa na Narị Afọ Iri nke udo, ịba ụba, na obi ụtọ zuru eluigwe na ala ọnụ, bụ́ nke ndị amụma Chineke buru amụma banyere ya.—Abụ Ọma 37:9-11; Aịsaịa 65:17, 18; Mkpughe 20:6.
2, 3. (a) Gịnị bụ “ụbọchị Jehova” nke e buru amụma ya na Joel 3:14? (b) N’ihi gịnị ka mba nile ji kwesị inweta ihe ha ga-eche ihu n’ụbọchị ahụ?
2 Mgbe ahụ, gịnị bụ “ụbọchị Jehova” nke e buru amụma ya na Joel 3:14? “Ewo, ụbọchị ahụ,” ka Jehova kwupụtara n’onwe ya, “n’ihi na ụbọchị Jehova dị nso, dị ka mbibi nke sitere n’aka Onye Pụrụ Ime Ihe Nile ka ọ ga-abịa!” Olee otú o si bụrụ mbibi? Onye amụma ahụ mesịrị kwuo, sị: “Ọtụtụ ìgwè mmadụ, ọtụtụ ìgwè mmadụ n’ime ndagwurugwu mkpebi ikpe! n’ihi na ụbọchị Jehova dị nso n’ime ndagwurugwu mkpebi ikpe.” (Joel 1:15; 3:14) Nke a bụ ụbọchị Jehova na-emezu ihe o kpere n’ikpe n’ahụ ìgwè mmadụ ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke bụ́ ndị jụrụ izi ezi nke ọkaaka ya n’eluigwe na n’elu ala. Ọ bụ mkpebi Jehova ibibi usoro ihe nke Setan nke jideworo ihe a kpọrọ mmadụ n’agbụ ya ruo ogologo oge.—Jeremaịa 17:5-7; 25:31-33.
3 Usoro ihe ahụ rụrụ arụ nke dị n’elu ala aghaghị izute mkpebi ahụ. Ma usoro ihe nke ụwa ọ̀ dị njọ n’ezie otú ahụ? Otu anya nkịtị a ga-eleba n’ihe ndekọ ya ga-ezu! Jisọs kwupụtara otu ụkpụrụ na Matiu 7:16: “Unu ga-esite ná mkpụrụ ha mazuo ha.” Ọ̀ bụ na obodo ukwu ndị e nwere n’ụwa aghọbeghị ebe rụrụ arụ nke ọgwụ ọjọọ, imempụ, imenye mmadụ egwu, omume rụrụ arụ, na mmetọ? N’ọtụtụ ala, ọgba aghara ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ụkọ ihe oriri, na ịda ogbenye na-emebi nnwere onwe ndị e nwetara ọhụrụ. Ihe karịrị otu ijeri mmadụ nọ n’agụụ. Ọzọkwa, ntiwapụ nke ọrịa AIDS, bụ́ nke ọgwụ ọjọọ na ibi ụdị ndụ rụrụ arụ meworo ka ọ mụbaa, na-eme ka akụkụ dị ukwuu nke ụwa gbaa ọchịchịrị. Karịsịa kemgbe Agha Ụwa Mbụ tiwapụrụ na 1914, e nwewo ndakpọ zuru ụwa ọnụ n’akụkụ ọ bụla nke ndụ.—Tụlee 2 Timoti 3:1-5.
4. Ịma aka dị aṅaa ka Jehova na-ama mba nile?
4 Otú ọ dị, Jehova anọwo na-achịkọta otu ndị site ná mba nile ndị mmadụ, bụ́ ndị ji ọṅụ na-anara ndụmọdụ banyere ụzọ ya nile ma na-aga ije n’okporo ụzọ ya. Ndị a zuru ụwa nile ọnụ akpụgharịwo mma agha ha ịghọ mma ogè, na-ahapụ ụzọ ime ihe ike nile nke ụwa. (Aịsaịa 2:2-4) Ee, mma agha ịghọ mma ogè! Ma nke a ọ̀ bụghị ihe megidere mkpu ahụ Jehova mere ka a kpọsaa na Joel 3:9, 10? N’ebe ahụ anyị na-agụ, sị: “Kpọsaanụ nke a n’etiti mba nile; doonụ agha nsọ: kpọteenụ ndị dike; ka ndị agha nile bịaruo nso, rịgota. Kpụgharịanụ mma ogè unu ka ha bụrụ mma agha, na mma ịkwa osisi unu ka ha bụrụ ube.” Ah, n’ebe a Jehova na-ama ndị ọchịchị ụwa aka ka ha wepụta ngwá agha nile ọ bụla ha nwere megide ya n’Amagedọn. Ma ha apụghị inwe ihe ịga nke ọma! Ha aghaghị ịbụ ndị e meriri kpam kpam!—Mkpughe 16:16.
5. Gịnị ga-esi n’ime ya pụta mgbe Jisọs ga-ewe ihe ubi nke “vine nke ụwa”?
5 Site n’inupụrụ Eze Onyenwe anyị Jehova isi, ndị ọchịchị dị ike ewuwo ebe nkwakọba nke ngwá agha ndị na-eyi egwu—ma nke ahụ enweghị isi! Jehova na-enye iwu na Joel 3:13, sị: “Tinye mma iwe ihe ubi, n’ihi na ihe a ga-ewe n’ubi achawo: bịanụ, zọchaa; n’ihi na ebe nzọcha mkpụrụ vine ejuwo, ebe ịnara mmanya vine nile erubigawo; n’ihi na ihe ọjọọ ha bara ụba.” Okwu ndị ahụ yiri ndị dị ná Mkpughe 14:18-20, bụ́ ebe e nyere mmụọ ozi ahụ ji mma iwe ihe ubi dị nkọ, iwu ka o “bipụ ụyọkọ nile nke vine nke ụwa; n’ihi na mkpụrụ vine ya achazuwo.” Mmụọ ozi ahụ tinyere mma iwe ihe ubi ya ma tụba mba ndị ahụ na-enupụ isi “n’ime ebe nzọcha mkpụrụ vine ahụ, nke dị ukwuu, bụ́ nke ọnụma Chineke.” N’ụzọ ihe atụ, ọbara si n’ebe nzọcha mkpụrụ vine ahụ pụta dị elu ruo bridle ịnyịnya, ruo ịdị anya nke 1,600 furlong—ihe dị ka 300 kilomita! Lee olileanya dị egwu nke ahụ bụụrụ mba ndị na-adịghị asọpụrụ Jehova!
Ụmụ Amaala Na-erube Isi n’Iwu
6. Olee ụzọ Ndịàmà Jehova si ele mba nile na ndị ọchịchị ha anya?
6 Nke a ọ̀ pụtara na Ndịàmà Jehova adịghị akwanyere mba dị iche iche na ndị ọchịchị ha ùgwù? Ọ dịghị otú ahụ ma ọlị! Nanị ihe ha na-eme bụ ịkatọ omume rụrụ arụ nke onye ọ bụla pụrụ iji anya ya hụ, ha na-adọkwa aka ná ntị banyere ụbọchị Jehova maka imezu ihe o kpere n’ikpe, bụ́ nke ji oké ọsọ na-abịaru nso. N’otu oge ahụ, ha na-eji obi umeala na-erube isi n’iwu ahụ Pọl onyeozi nyere ná Ndị Rom 13:1: “Ka mkpụrụ obi ọ bụla doo onwe ya n’okpuru ndị na-achị isi n’elu ya.” Nye ndị ọchịchị ndị a bụ mmadụ, ha na-enye ha nsọpụrụ ruuru ha ma ọ bụghị ofufe. Dị ka ụmụ amaala na-erube isi n’iwu, ha na-agbaso ụkpụrụ nile dị na Bible nke ime ihe n’eziokwu, ikwu eziokwu, na ịdị ọcha ma na-ewulite omume ọma n’ezinụlọ nke aka ha. Ha na-enyere ndị ọzọ aka ịmụta otú ha pụrụ isi mee nke a. Ha na-esoro mmadụ nile na-ebi n’udo, ha adịghị etinye aka n’ime ngagharị iwe ma ọ bụ ná nkwatụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ndịàmà Jehova na-achọ ịbụ ihe nlereanya n’irube isi n’iwu dị iche iche nke ndị ọchịchị bụ mmadụ, ebe ha na-echere ka Onye Isi Kasị Elu, bụ́ Eze Onyenwe anyị Jehova, weghachi udo zuru okè na ọchịchị ezi omume n’elu ala nke a.
Imezu Ihe O Kpere n’Ikpe
7, 8. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka a ga-esi mee ka mba nile mee mkpatụ, ọchịchịrị ewee bịakwasị ha? (b) Olee ndị ka Joel nọchiri anya ha taa, n’adịghịkwa ka ụwa n’ozuzu ya, è si aṅaa agọzi ndị a?
7 N’okwu ihe atụ doro anya, Jehova na-enyekwa nkọwa nke a banyere mmezu nke ihe o kpere n’ikpe: “Anyanwụ na ọnwa ejiwo nji, kpakpando achịkọpụwokwa onwunwu ha. Jehova ga-esikwa na Zaịọn bigbọ, mee ka olu ya si na Jerusalem daa; eluigwe na ụwa ga-emekwa mkpatụ: ma Jehova ga-abụrụ ndị ya ebe mgbaba, ọ ga-abụkwara ụmụ Israel ebe siri ike.” (Joel 3:15, 16) Ọnọdụ ihe a kpọrọ mmadụ nke yiri ihe na-egbu mara mara, nke bara ụba, ga-aghọ nke gbara ọchịchịrị, nke nọ n’ihe ize ndụ, a ga-etikpọsịkwa usoro ihe nke ụwa nke a na-adakpọsị adakpọsị pụọ n’ịdị adị, dị ka à ga-asị na ọ bụ oké ala ọma jijiji bibiri ya!—Hagaị 2:20-22.
8 Rịba ama nkwa ahụ na-enye obi ụtọ nke na Jehova ga-abụrụ ndị ya ebe mgbaba na ebe siri ike! N’ihi gịnị ka ọ ga-eji mee otú ahụ? N’ihi na ha bụ nanị ndị—ndị zuru ụwa ọnụ—zaghachiworo n’okwu Jehova bụ́: “Unu ewee mara na mụ onwe m bụ Jehova, bụ́ Chineke unu.” (Joel 3:17) Ebe ọ bụ na aha Joel pụtara “Jehova Bụ Chineke,” ọ nọchiri anya Ndịàmà Jehova e tere mmanụ nke oge a n’ụzọ kwesịrị ekwesị, bụ́ ndị ji obi ike na-eje ozi n’ịkpọsa ọkaaka nke Jehova. (Tụlee Malakaị 1:11.) N’ịtụgharị uche n’okwu mmalite nke amụma Joel, anyị ga-ahụ ụzọ o si buo amụma banyere ọrụ ndị Chineke ga-arụ n’oge a n’ụzọ doro anya.
Ìgwè Igurube
9, 10. (a) Ihe otiti dị aṅaa ka Joel buru amụma ya? (b) Olee ụzọ Mkpughe si ekwupụtaghachi amụma Joel nke ihe otiti, mmetụta dịkwa aṅaa ka ihe otiti nke a na-enwe n’ahụ Krisendọm?
9 Ugbu a gee ntị ‘n’okwu Jehova nke ruru Joel ntị’: “Nụrụnụ nke a, unu ndị okenye, ṅaakwanụ ntị, unu ndị nile bi n’ala nke a. Nke a, ọ̀ dịwo n’ụbọchị unu? ma ọ bụ n’ụbọchị nna unu hà? Kọọrọnụ ya ụmụ unu, ka ụmụ unu kọọkwara ụmụ ụmụ unu, ka ụmụ ha kọọkwara ọgbọ ọzọ. Ihe palmer worm rifọworo ka igurube riworo; ihe igurube rifọworo ka ụkpala riworo; ihe ụkpala rifọworo ka ọbụbụ riworo.”—Joel 1:1-4.
10 Nke a bụ mkpọsa pụrụ iche ná ndị ọzọ, nke a ga-echeta ruo mgbe nile. Ọtụtụ ìgwè ahụhụ, karịsịa igurube, bibiri ala ahụ. Gịnị ka nke a pụtara? Mkpughe 9:1-12 na-ekwukwa banyere ihe otiti nke igurube, nke Jehova zitere n’okpuru ‘mmụọ ozi nke abyss, bụ́ eze,’ onye na-abụghị onye ọzọ ma e wezụga Kraịst Jisọs. Aha ya nke bụ Abadọn (Hibru) na Apọliọn (Grik) pụtara “Mbibi” na “Onye Mbibi.” Igurube ndị a na-ese onyinyo ihe fọdụrụ ná ndị Kraịst e tere mmanụ bụ́ ndị, ugbu a n’ụbọchị Onyenwe anyị, na-aga n’ihu n’ibibi ebe ịta ahịhịa nile nke Krisendọm site n’ikpughe okpukpe ụgha kpam kpam na site n’ịkpọsa ịbọ ọ́bọ̀ Jehova n’ahụ ya.
11. Olee ụzọ e si eme ka igurube nke oge a dịwanye ike, oleekwa ndị ha na-ebuso agha ha?
11 Dị ka Mkpughe 9:13-21 na-egosi, oké ihe otiti nke ndị ịnyịnya anọchiwo anya ihe otiti nke igurube. Lee ka nke a si bụrụ eziokwu taa, ebe ọ bụ na e mewo ka puku ole na ole nke ihe fọdụrụ ná ndị Kraịst e tere mmanụ dịwanye ike site n’iwebata ihe karịrị nde anọ nke “atụrụ ọzọ,” ha abụọ na-emejupụta ndị ịnyịnya a na-apụghị ịgbanahụ agbanahụ! (Jọn 10:16) Ha ji ịdị n’otu na-akpọsa ikpe Jehova na-agba agba n’ahụ ndị Krisendọm na-ekpere arụsị nakwa n’ahụ ndị ahụ ‘na-echegharịghị isi n’igbu mmadụ ha, ma ọ bụ n’ime mgbaasị ha, ma ọ bụ n’ịkwa iko ha, ma ọ bụ n’izu ohi ha, pụta.’ Ndị ụkọchukwu—ma ndị Katọlik ma ndị Protestant—bụ́ ndị nyeworo ajọ agha ndị a lụrụ na narị afọ nke a nkwado siri ike, tinyere ndị ụkọchukwu na-edina ụmụaka na ndị okwuchukwu TV rụrụ arụ, so ná ndị a na-ezigara ozi ikpe ọmụma ndị a.
12. N’ihi gịnị ka ndị ndú Krisendọm ji kwesị ịnata ozi ikpe ọmụma, gịnịkwa ga-eme ha n’oge na-adịghị anya, tinyere ndị nile so na Babilọn Ukwu ahụ?
12 Nye “ndị ikom” ahụ rụrụ arụ na-eyi uwe mwụda, ọkpụkpọ òkù Jehova na-adasi ụda ike, sị: “Tetanụ, unu ndị na-aṅụbiga mmanya ókè, kwaanụ ákwá; kwasiekwanụ ákwá ike, unu nile ndị na-aṅụ mmanya vine, n’ihi mmanya ụtọ; n’ihi na e bipụwo ya n’ọnụ unu.” (Joel 1:5) N’ime narị afọ 20 nke a, okpukpe Krisendọm ejiriwo omume ụwa nke onye ọ bụla ime otú ọ masịrị ya dochie ụkpụrụ nile dị ọcha nke Okwu Chineke. O yiwo ihe dị ụtọ nye okpukpe ụgha na ndị parish ya ịnakwere ụzọ nile nke ụwa, ma lee aha owuwe ihe ubi nke ọrịa ime mmụọ na nke anụ ahụ ha wetaworo! N’oge na-adịghị anya, dị ka a kọwara ná Mkpughe 17:16, 17, ọ ga-abụ “izù” Chineke ka ike ndọrọ ndọrọ ọchịchị tụgharịa na mberede megide alaeze ụwa dum nke okpukpe ụgha, bụ́ Babilọn Ukwu ahụ, ma bibie ya. Ọ bụ nanị mgbe ahụ, mgbe ọ na-ahụ ka a na-emezu ihe Jehova kpere n’ikpe megide ya, ka ọ ‘ga-eteta’ site ná mmanya ogbugbu ya.
‘Otu Ndị Dị Ọtụtụ ma Nwee Ume’
13. N’ụzọ dị aṅaa ka ìgwè igurube ahụ si yie ‘ndị dị ọtụtụ ma nwee ume’ n’anya Krisendọm?
13 Onye amụma Jehova gara n’ihu ịkọwa ìgwè igurube ahụ dị ka ‘otu ndị dị ọtụtụ ma nwee ume,’ otú ahụkwa ka ọ dị n’anya Babilọn Ukwu ahụ. (Joel 2:2) Dị ka ihe atụ, ndị ụkọchukwu na-akwa arịrị n’eziokwu ahụ nke bụ na okpukpe nile nke Krisendọm adawo n’ịtọghata ndị nọ n’okpukpe Buddha nke Japan. Ma, taa, ihe karịrị 160,000 ndị Japan bụ Ndịàmà Jehova na-enugharị n’akụkụ nile nke mba ahụ ma na-eduzi ọmụmụ Bible onwe onye n’ihe karịrị 200,000 ebe obibi nke ndị mmadụ. N’Itali, a matawo 180,000 Ndịàmà Jehova nọ n’ebe ahụ ugbu a dị ka nanị ndị na-esote ndị Katọlik n’ọnụ ọgụgụ. Ọ bụ n’efu ka onye monsignor ndị Roman Katọlik nọ n’Itali kwara arịrị n’eziokwu ahụ bụ na Ndịàmà Jehova na-ewere site na chọọchị ahụ, ‘ma ọ dịkarịa ala 10,000 ndị Katọlik na-ekwesị ntụkwasị obi’ kwa afọ.a Ndịàmà na-enwe ọṅụ ịnabata ndị dị otú ahụ.—Aịsaịa 60:8, 22.
14, 15. Olee ụzọ Joel si kọwaa ìgwè igurube ahụ, n’ụzọ dịkwa aṅaa ka nke a siworo mezuo taa?
14 Mgbe ọ na-akọwa ìgwè igurube nke Ndịàmà ahụ e tere mmanụ, Joel 2:7-9 kwuru, sị: “Dị ka ndị dike ka ha na-agba ọsọ; dị ka ndị agha ka ha na-arịgo mgbidi; onye ọ bụla n’ụzọ ya nile, otú a ka ha na-aga ije, ha adịghị agwagbukwa agwagbu n’ojije nile ha. Ha adịghị enurịta onwe ha; onye ọ bụla n’ụzọ ya a tụliri atụli, otú a ka ha na-aga ije: ọ bụkwa n’etiti ihe agha ka ha na-ada n’ejebighị ije ha. N’obodo ka ha na-agbagharị; n’elu mgbidi ka ha na-agba ọsọ; n’ụlọ ka ha na-arịgobata; ha si na window nile aba n’ime dị ka onye ohi.”
15 N’ezie, nke a bụ ihe nnọchianya doro anya nke usuu “igurube” ndị e tere mmanụ, ndị ihe karịrị nde ndị enyi ha anọ, bụ́ atụrụ ọzọ ahụ, na-esonyere ugbu a! Ọ dịghị “mgbidi” ọ bụla nke ibu iro okpukpe pụrụ ime ka ndị a laa azụ. N’inwe obi ike, ha ‘na-agazi n’otu usoro ihe ahụ’ nke ịgba àmà n’ihu ọha na ọrụ ndị Kraịst ndị ọzọ. (Tụlee Ndị Filipaị 3:16.) Kama ịjụ okwukwe ha, ha adịwo njikere ịnagide ọnwụ, dị ka ọtụtụ puku Ndịàmà ‘dara n’etiti ihe agha’ n’ihi na ha jụrụ ito onye Katọlik ahụ bụ́ Hitler nke Nazi Germany. Ìgwè igurube ahụ agbawo àmà n’akụkụ nile dị “n’obodo” nke Krisendọm, na-arịgo n’elu ihe mgbochi nile, na-abanye, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, dị ka onye ohi n’ebe obibi ha ka ha na-ekesa ọtụtụ ijeri akwụkwọ Bible site n’ọrụ ụlọ ruo n’ụlọ nke ha na-arụ. Ọ bụ uche Jehova ka a gbaa àmà nke a, ọ dịghịkwa ike ọ bụla dị n’eluigwe ma ọ bụ n’elu ala nke pụrụ ịkwụsị ya.—Aịsaịa 55:11.
‘Ijupụta na Mmụọ Nsọ’
16, 17. (a) Olee mgbe okwu ndị dị na Joel 2:28, 29 nwere mmezu pụtara ìhè? (b) Okwu amụma dị aṅaa nke Joel ka a na-emezughị na narị afọ mbụ?
16 Jehova gwara Ndịàmà ya, sị: “Unu ga-amakwa na n’etiti Israel [ime mmụọ] ka m nọ, na mụ onwe m bụ Jehova, bụ́ Chineke unu, na ọ dịghị onye ọzọ.” (Joel 2:27) Ndị ya nwere nghọta nke a dị oké ọnụ ahịa mgbe Jehova malitere imezu okwu ya ndị dị na Joel 2:28, 29: “Ọ ga-erukwa ma e mesịa, na m ga-awụsa mmụọ m n’ahụ anụ ahụ nile, bụ́ mmadụ; ụmụ unu ndị ikom na ụmụ unu ndị inyom ga-ebukwa amụma.” Nke a mere na Pentikọst 33 O.A., mgbe e tere ndị na-eso ụzọ Jisọs zukọtaranụ mmanụ, “ha nile wee jupụta na mmụọ nsọ.” Site n’ike mmụọ nsọ, ha kwusara ozi ọma, n’otu ụbọchị ahụkwa, ‘a tụkwasịịrị ha ihe hà ka puku mmadụ atọ.’—Ọrụ 2:4, 16, 17, 41.
17 N’oge ihe omume ahụ na-enye obi ụtọ, Pita hotakwara Joel 2:30-32: “M ga-enyekwa ihe ebube dị iche iche n’eluigwe na n’ụwa: ọbara, na ọkụ, na ogidi nke anwụrụ ọkụ. Anyanwụ ga-agbanwe ghọọ ọchịchịrị, ọnwa ga-agbanwekwa ghọọ ọbara, tupu ụbọchị Jehova abịa, bụ́ ụbọchị ahụ dị ukwuu dịkwa egwu. Ọ ga-erukwa, na onye ọ bụla nke ga-akpọku aha Jehova, a ga-eme ka o wepụga onwe ya.” Okwu ndị ahụ nwere mmezu ụfọdụ mgbe e bibiri Jerusalem n’afọ 70 O.A.
18. Olee mgbe mmezu ka ukwuu nke Joel 2:28, 29 malitere iwere ọnọdụ?
18 Otú ọ dị, a ga-enwekwa mmezu ọzọ nke Joel 2:28-32. N’ezie, amụma nke a enwewo mmezu dị ịrịba ama kemgbe September 1919. N’oge ahụ e nwere otu mgbakọ ndị Jehova a na-agaghị echefu echefu na Cedar Point, Ohio, U.S.A. Mmụọ Chineke pụtara nnọọ ìhè, a kpalikwara ndị ohu ya e tere mmanụ ịmalite ọrụ ịgba àmà zuru ụwa ọnụ nke gbatịrị ruo n’oge ugbu a. Lee mmụba dị ukwuu nke siworo na ya pụta! Ihe ahụ karịrị 7,000 bịara mgbakọ ahụ e mere na Cedar Point amụbawo ruo ngụkọta nke 10,650,158 nke ndị bịara Ememe Ncheta ọnwụ Jisọs na March 30, 1991. N’ime ndị a, nanị 8,850 sịrị na ha bụ ndị Kraịst e tere mmanụ. Lee aha oké ọṅụ ndị a nile na-enwe ịhụ mkpụrụ ahụ a mịpụtaworo n’ụwa nile bụ́ nke mmụọ Jehova dị ike meworo ka e nwee!—Aịsaịa 40:29, 31.
19. N’iburu n’uche ịdị nso nke ụbọchị Jehova, gịnị kwesịrị ịbụ àgwà nke onye ọ bụla n’ime anyị?
19 Ihe na-achọ ime n’ọdịnihu bụ ‘ọbịbịa nke ụbọchị Jehova nke dị ukwuu ma dịkwa egwu’ nke ga-ebibi usoro ihe nke Setan. (Joel 2:31) Ọ bụ ihe obi ụtọ ịmara na “onye ọ bụla nke ga-akpọku aha Onyenwe anyị [“Jehova, NW], a ga-azọpụta ya.” (Ọrụ 2:21) N’ụzọ dị aṅaa? Pita onyeozi na-agwa anyị na “ụbọchị Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] ga-abịa dị ka onye ohi,” o kwukwara, sị: “Ebe a na-eme ka ihe ndị a nile laa n’iyi otú a, ọ̀ bụ aha mmadụ gịnị ka unu na-aghaghị ịbụ n’ibi obi nsọ nile na nsọpụrụ Chineke nile, na-ele anya ọbịbịa [“ọnụnọ,” NW] nke ụbọchị nke Chineke [“Jehova,” NW].” Site n’iburu n’uche na ụbọchị Jehova dị nso, anyị ga-aṅụrịkwa ọṅụ ịhụ mmezu nke nkwa Jehova banyere “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ” nke ezi omume.—2 Pita 3:10-13.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a La Repubblica, Rom, Itali, November 12, 1985, na La rivista del clero italiano, May 1985.
Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?
◻ Gịnị bụ “ụbọchị Jehova”?
◻ Olee ụzọ Jisọs ga-esi wee “vine nke ụwa” dị ka ihe ubi, n’ihi gịnịkwa?
◻ N’ụzọ dị aṅaa ka ihe otiti igurube siworo metụta Krisendọm kemgbe 1919?
◻ Olee otú e si wụsa mmụọ Jehova n’ahụ ndị ya n’afọ 33 O.A., ọzọkwa n’afọ 1919?