-
Gbalịa Ịdị Na-ele Ndị Ọzọ Anya Otú Jehova Si Ele haỤlọ Nche—2003 | Mach 15
-
-
7. N’ọnọdụ ndị dị aṅaa ka Jona nọworo na-ejere Jehova ozi n’Izrel, oleekwa otú ịmara nke a si emetụta otú i si ele ya anya?
7 N’ezie, Jona ejiriwo ikwesị ntụkwasị obi gbasie mbọ ike n’Izrel, bụ́ ókèala ndị bi na ya na-adịghị aṅa ntị. Emọs onye amụma, bụ́ onye dịrị ndụ n’ihe dị ka n’otu oge ahụ Jona dịrị ndụ, kọwara ndị Izrel nke oge ahụ dị ka ndị hụrụ ihe onwunwe na ihe ụtọ n’anya.b Ihe ọjọọ nọ na-eme n’ala ahụ, ma ndị Izrel achọdịghị ịma. (Emọs 3:13-15; 4:4; 6:4-6) N’agbanyeghị nke ahụ, kwa ụbọchị, Jona ji ikwesị ntụkwasị obi na-arụ ọrụ ya nke izisara ha ozi. Ọ bụrụ na ị bụ onye na-ekwusa ozi ọma, ị maara otú o si esi ike ịgwa ndị onwe ha juru afọ na ndị na-enweghị mmasị okwu. Ya mere, ka anyị na-ekweta na Jona nwere adịghị ike, ka anyị cheta àgwà ya nke ikwesị ntụkwasị obi na ntachi obi ka ọ na-ezisara ndị Izrel na-ekwesịghị ntụkwasị obi ozi.
-
-
Gbalịa Ịdị Na-ele Ndị Ọzọ Anya Otú Jehova Si Ele haỤlọ Nche—2003 | Mach 15
-
-
b N’ihi nnukwu mmeri ụfọdụ Jeroboam nke Abụọ nwere na nnwetaghachi o nwetaghachiri ebe bụbu ókèala ha na ụtụ ndị ọ malitere ịnata n’ihi nke a, ihe àmà na-egosi na ọ mụbara nnọọ akụ̀ na ụba nke alaeze ebe ugwu ahụ.—2 Samuel 8:6; 2 Ndị Eze 14:23-28; 2 Ihe E Mere 8:3, 4; Emọs 6:2.
-