-
Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụỤlọ Nche—1990 | Ọgọst 15
-
-
Dị ka ihe atụ nke metụtara amụma Bible, Ụlọ Nche (Bekee) nke December 15, 1928, kọwara Maịka 5:2-15. Akwụkwọ Maịka kọrọ ihe banyere ‘ndị Asiria’ ibibi Sameria na ndị Juu ịlọghachi site ná ndọrọ n’agha na Babilọn. (Maịka 1:1, 5-7; 4:10) Ma o zokwara aka n’ihe ndị ga-eme mgbe oge ụfọdụ gasịrị, dị ka ọmụmụ a ga-amụ Mesaịa ahụ na Betlehem. (Maịka 5:2) Maịka burụ amụma na mgbe a napụtasịrị ha site “n’aka Asiria,” “ndị Jekọb fọdụrụ” ga-eyi “igirigi sitere n’ebe Jehova nọ,” djkwa ka “nwa ọdụm n’etiti ìgwè ewu na atụrụ nile.” (Maịka 5:6-8) Ụlọ Nche ahụ kwurụ, sị: “A pụrụ iwere nke a dị ka ihe na-egosi na ụfọdụ n’ime ihe ahụ fọdụrụ ga-anọ n’elụ ala ọbụna mgbe a lụsịrị agha Amagedọn, ha ga-enwekwa ọrụ ụfọdụ ha ga-arụ n’oge ahụ n’aha Onyenwe anyị, ijikwa wetara ya otụto na nsọpụrụ.” Rịba ama ụdi asụsụ dị nwayọọ nke ezi uche dịkwa na ya e ji webata ihe nke a nke pụrụ ime: “A pụru iwere nke a dị ka ihe na-egosi.”
-
-
Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụỤlọ Nche—1990 | Ọgọst 15
-
-
Okwu ndị a na-ekwu banyere eziokwụ ahụ nke bụ na ọ pụrụ ikwe omụme ụfọdụ n’ime ndị ahụ e tere mmanụ ịlanarị banye n’ime ụwa ọhụrụ ahụ bụ ndị e bụ ihe dị mma n’uche wee na-ekwụ, ọ bụkwa n’ụzọ kwekọrọ n’ihe ndị meworo eme e dekọrọ na Bible, bụ́ ndị pụrụ inwe ihe ndị kwekọrọ na ha mgbe oge ụfọdụ gasịrị. Ọ bụrụ na o mesịa bụrụ na ọ dịghị nke ọ bụla ná ndị ahụ e tere mmanụ fọdụrụ n’elu ala, ọ dịghị ihe kwesịrị ịkpata enweghị afọ ojuju. Anyị anakwereworị na a na-aghọta okwu ndị dị na Bible nke ọma karị ka oge na-aga. Dị ka ihe atụ, Ụlọ Nche nke Janụary 15, 1982, tụlere Maịka 5:6-9 ọzọ wee kọwaa na “ọ dịghị mkpa ka ihe fọdụrụ ahụ nke Israel ime mmụọ chere ruo mgbe a lụsịrị . . . Ha-magedọn iji wee bụrụ ‘igirigi’ nke udo nye ndị” mmadụ. Ọzọkwa, ntụle nke a gosịkwara na ọ puru ime eme na ihe fọdụrụ ahụ pụrụ ịdị ndụ gabiga oké agha Chineke ahụ, ruokwa nwa mgbe, “[nọgidekwa] na-adị ka ‘igirigi’ na-enye ume ọhụrụ nye ‘oké ‵ịgwè mmadụ’ ahụ na ‘atụrụ ọzọ.’” Otú ọ dị, anyị pụrụ ịhụ na ngabiga nke oge na mmụba nke ìhè ime mmụọ pụrụ ịgbasawanye, gbanweekwa nghọta anyị nke amụma ma ọ bụ nke ihe omume ndị e dekọrọ na Bible.—Ilu 4:18.
-