-
“Cherenụ M”Ụlọ Nche—1996 | Mach 1
-
-
13. Ozi ikpe dị aṅaa ka Zefanaịa kwupụtara megide Moab, Amọn, na Asiria?
13 Site n’ọnụ onye amụma ya bụ́ Zefanaịa, Jehova kwupụtakwara iwe ya megide mba ndị megbuworo ndị ya. O kwuru, sị: “Anụwo m ịta ụta Moab, na nkwulu nile nke ụmụ Amọn, nke ha jiworo taa ndị m ụta, mee onwe ha ukwuu megide ókèala ha. N’ihi nke a, Mụ onwe m na-adị ndụ, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova nke usuu nile nke ndị agha, bụ́ Chineke nke Israel, pụta), n’ezie Moab ga-adị ka Sọdọm, ụmụ Amọn ga-adịkwa ka Gọmọra, ihe onwunwe nke akụba, na olulu nnu, na ebe tọgbọrọ n’efu ruo mgbe ebighị ebi. . . . Ọ ga-esetịkwa aka Ya imegide Ugwu, mee ka Asiria laa n’iyi; Ọ ga-emekwa ka Nineve ghọọ ebe tọgbọrọ n’efu, ala kpọrọ nkụ dị ka ọzara.”—Zefanaịa 2:8, 9, 13.
14. Ihe àmà dị aṅaa ka e nwere na mba ndị ọzọ ‘mere onwe ha ukwuu’ megide ndị Israel na Chineke ha, bụ́ Jehova?
14 Moab na Amọn bụ ndị iro nke Israel eri ogologo oge. (Tụlee Ndị Ikpe 3:12-14.) Nkume Moab, nke dị na Louvre Museum na Paris, bu ihe odide nke nwere okwu itu ọnụ nke Eze Mesha nke Moab. O ji mpako na-akọ banyere ya iweghara ọtụtụ obodo ukwu nke Israel site n’enyemaka nke chi ya bụ Kemọsh. (2 Ndị Eze 1:1) Jeremaịa, bụ́ onye ya na Zefanaịa biri ndụ n’otu oge, kwuru okwu banyere ndị Amọn ibi n’ókèala Israel bụ́ Gad n’aha chi ha bụ́ Malkam. (Jeremaịa 49:1) Banyere Asiria, Eze Shalmaneser nke Ise awakwasịwo ma weghara Sameria n’ihe dị ka otu narị afọ tupu ụbọchị Zefanaịa. (2 Ndị Eze 17:1-6) Ntakịrị oge ka e mesịrị, Eze Senakerib wakporo Juda, weghara ọtụtụ obodo ukwu ya ndị e wusiri ike, ọbụna yie Jerusalem egwu. (Aịsaịa 36:1, 2) Ọnụ na-ekwuchitere eze Asiria mere onwe ya ukwuu megide Jehova mgbe ọ na-ekwu ka Jerusalem chịlie aka elu.—Aịsaịa 36:4-20.
-
-
“Cherenụ M”Ụlọ Nche—1996 | Mach 1
-
-
15. Olee otú Jehova ga-esi wedaa chi nke mba nile ndị meworo onwe ha ukwuu megide ndị ya ala?
15 Abụ Ọma 83 hotara ọtụtụ mba, gụnyere Moab, Amọn, na Asiria, bụ́ ndị mere onwe ha ukwuu megide Israel, ma jiri itu ọnụ kwuo, sị: “Jeenụ, ka anyị zopụ ha n’ịbụ mba; a gaghị echetakwa aha Israel ọzọ.” (Abụ Ọma 83:4) Zefanaịa onye amụma jiri obi ike maa ọkwa na Jehova nke usuu nile nke ndị agha ga-eweda mba ndị a nile dị mpako na chi ha ala. “Nke a ka ha ga-enwe n’ihi mpako ha, n’ihi na ha atawo ndị Jehova nke usuu nile nke ndị agha ụta, mee onwe ha ukwuu imegide ha. Onye dị egwu ka Jehova ga-abụ n’imegide ha: n’ihi na Ọ ga-eme ka chi nile nke ụwa taa ahụ; mmadụ ga-akpọkwa isiala nye Ya, onye ọ bụla site n’ọnọdụ ya, bụ́ àgwàetiti nile nke mba nile.”—Zefanaịa 2:10, 11.
-
-
“Cherenụ M”Ụlọ Nche—1996 | Mach 1
-
-
18. (a) Olee otú e si mezuo ihe Chineke kpere n’ikpe n’ahụ Jerusalem, n’ihi gịnịkwa? (b) Olee otú e si mezuo amụma Zefanaịa banyere Moab na Amọn?
18 Ọtụtụ ndị Juu nọ na-echere Jehova dịkwara ndụ hụ ka e mezuru ikpe ya nile n’ahụ Juda na Jerusalem. Banyere Jerusalem, Zefanaịa ebuworị n’amụma, sị: “Ahụhụ ga-adịrị obodo nke na-enupụ isi, nke rụwokwara arụ, obodo ahụ nke na-eme ihe ike! O geghị ntị olu Chineke; ọ naraghị ịdọ aka ná ntị; Jehova ka ọ na-atụkwasịghị obi; Chineke ya ka ọ na-abịakwuteghị nso.” (Zefanaịa 3:1, 2) N’ihi ekwesịghị ntụkwasị obi ya, ndị Babilọn wakwasịrị Jerusalem ugboro abụọ, wegharakwa ma bibie ya n’ikpeazụ na 607 T.O.A. (2 Ihe Emere 36:5, 6, 11-21) Banyere Moab na Amọn, dị ka onye Juu bụ́ ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Josephus si kwuo, n’afọ nke ise mgbe ọdịda nke Jerusalem gasịrị, ndị Babilọn busoro ha agha ma merie ha. Ka nke ahụ gasịrị, ha kwụsịrị ịdị adị, dị ka e buru n’amụma.
-