-
“Cherenụ M”Ụlọ Nche—1996 | Mach 1
-
-
“Cherenụ”
16. (a) Ole ndị ka ọbịbịa nke ụbọchị Jehova bụụrụ ihe ọṅụ, n’ihi gịnịkwa? (b) Olee ọkpụkpọ òkù na-akpali akpali nke a kpọrọ ihe a fọdụrụnụ na-ekwesị ntụkwasị obi?
16 Ọ bụ ezie na ịdị ọ̀bọ̀ ime mmụọ, inwe obi abụọ, ikpere arụsị, ịrụ arụ, na ịhụ ihe onwunwe n’anya jupụtara n’etiti ndị ndú na ọtụtụ ndị bi na Juda na Jerusalem, o doro anya na ụfọdụ ndị Juu gere ntị n’amụma ịdọ aka ná ntị Zefanaịa. Omume nile a na-asọ nsọ nke ndị isi, ndị ikpe, na ndị nchụàjà nke Juda wutere ha. Nkwupụta okwu nile nke Zefanaịa bụ ihe nkasi obi nye ndị a na-eguzosi ike n’ihe. Kama ịbụ ihe na-akpata nchekasị, ọbịbịa nke ụbọchị Jehova bụụrụ ha ihe na-enye ọṅụ, n’ihi na ọ gaje ime ka omume ndị dị otú ahụ rụrụ arụ kwụsị. Ndị a fọdụrụnụ kwesịrị ntụkwasị obi ṅara ntị n’òkù na-akpali akpali nke Jehova, sị: “N’ihi nke a cherenụ m, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta), cherenụ ụbọchị mgbe M ga-ebili ọtọ ịkwata ihe: n’ihi na ikpe m bụ ime ka mba nile zukọta, ka M wee chịkọta alaeze nile, ịwụsa ha oké iwe m, bụ́ ọnụma nile nke iwe m.”—Zefanaịa 3:8.
17. Olee mgbe, ọ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa ka ozi ikpe nile nke Zefanaịa malitere imezu n’ahụ mba nile?
17 Ọ daghị ndị ṅara ntị n’ịdọ aka ná ntị ahụ na mberede. Ọtụtụ ndị dịrị ndụ hụ mmezu nke amụma Zefanaịa. Na 632 T.O.A., e weghaara Nineve ma bibie ya site ná njikọ nke ndị Babilọn, ndị Midia, na ìgwè ndị si n’ebe ugwu, ikekwe ndị Sitia. Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Will Durant na-akọ, sị: “Ndị agha Babilọn n’okpuru idu ndú Nabopolassar sooro ndị agha Midia n’okpuru idu ndú Cyaxares na ìgwè ndị Sitia sitere Caucasus wee jikọọ aka, wee weghara ebe ndị e wusiri ike nke ebe ugwu n’ụzọ dị oké mfe nakwa ọsọ ọsọ. . . . N’otu mwakwasị Asiria pụrụ n’akụkọ ihe mere eme.” Nke a bụ kpọmkwem ihe Zefanaịa buwororị n’amụma.—Zefanaịa 2:13-15.
18. (a) Olee otú e si mezuo ihe Chineke kpere n’ikpe n’ahụ Jerusalem, n’ihi gịnịkwa? (b) Olee otú e si mezuo amụma Zefanaịa banyere Moab na Amọn?
18 Ọtụtụ ndị Juu nọ na-echere Jehova dịkwara ndụ hụ ka e mezuru ikpe ya nile n’ahụ Juda na Jerusalem. Banyere Jerusalem, Zefanaịa ebuworị n’amụma, sị: “Ahụhụ ga-adịrị obodo nke na-enupụ isi, nke rụwokwara arụ, obodo ahụ nke na-eme ihe ike! O geghị ntị olu Chineke; ọ naraghị ịdọ aka ná ntị; Jehova ka ọ na-atụkwasịghị obi; Chineke ya ka ọ na-abịakwuteghị nso.” (Zefanaịa 3:1, 2) N’ihi ekwesịghị ntụkwasị obi ya, ndị Babilọn wakwasịrị Jerusalem ugboro abụọ, wegharakwa ma bibie ya n’ikpeazụ na 607 T.O.A. (2 Ihe Emere 36:5, 6, 11-21) Banyere Moab na Amọn, dị ka onye Juu bụ́ ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Josephus si kwuo, n’afọ nke ise mgbe ọdịda nke Jerusalem gasịrị, ndị Babilọn busoro ha agha ma merie ha. Ka nke ahụ gasịrị, ha kwụsịrị ịdị adị, dị ka e buru n’amụma.
19, 20. (a) Olee otú Jehova si kwụghachi ndị nọ na-echere ya ụgwọ ọrụ? (b) N’ihi gịnị ka ihe omume ndị a ji gbasa anyị, gịnịkwa ka a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?
19 Mmezu nke nkọwa nke ụmụ irighiri ihe ndị a na ndị ọzọ nke amụma Zefanaịa bụ ahụmahụ na-ewusi okwukwe ike nye ndị Juu na ndị na-abụghị ndị Juu bụ́ ndị nọ na-echere Jehova. Jeremaịa, onye Etiopịa bụ́ Ebed-melek, na ezinụlọ Jehonadab, bụ́ onye Rịkab, so ná ndị lanarịrị mbibi ahụ dakwasịrị Juda na Jerusalem. (Jeremaịa 35:18, 19; 39:11, 12, 16-18) Ndị Juu kwesịrị ntụkwasị obi ndị nọ ná ndọrọ n’agha na ụmụ ha, bụ́ ndị nọgidere na-echere Jehova, ghọrọ otu akụkụ nke ihe ahụ fọdụrụnụ obi dị ụtọ ndị e si na Babilọn napụta na 537 T.O.A., ha alaghachikwa Juda iji guzobeghachi ofufe dị ọcha.—Ezra 2:1; Zefanaịa 3:14, 15, 20.
-
-
“Ekwela Ka Aka Gị Abụọ Kụdaa”Ụlọ Nche—1996 | Mach 1
-
-
2. Myirịta dịgasị aṅaa dị n’agbata ọnọdụ ndị dị n’ụbọchị Zefanaịa na ọnọdụ dị taa n’ime Krisendọm?
2 Taa, ihe Jehova kpere n’ikpe bụ ịchịkọta mba nile maka mbibi n’ụzọ sara nnọọ mbara karịa ka ọ dị n’ụbọchị Zefanaịa. (Zefanaịa 3:8) Mba ndị ahụ na-azọrọ na ha bụ ndị Kraịst bụ ndị ụta dịịrị karịsịa n’anya Chineke. Dị nnọọ ka Jerusalem kwụrụ ụgwọ dị elu n’ihi ekwesịghị ntụkwasị obi ya nye Jehova, otú a ka Krisendọm na-aghaghị ịza Chineke ajụjụ maka ụzọ ya nile rụrụ arụ. Ikpe Chineke ndị e kwupụtara megide Juda na Jerusalem n’ụbọchị Zefanaịa na-emetụtakwa chọọchị na ịrọ òtù dị iche iche nke Krisendọm ọbụna n’ụzọ ka ukwuu. Ha emetọwokwa ofufe dị ọcha site n’ozizi ha ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke, nke ọtụtụ n’ime ha malitere n’aka ndị ọgọ mmụọ. Ha achụwo ọtụtụ nde ụmụ ha ahụ siri ike n’àjà n’ebe ịchụàjà nke oge a nke agha. Ọzọkwa, ndị bi na Jerusalem ihe atụ ahụ na-agwakọta ihe a ha kpọrọ Iso Ụzọ Kraịst na ịgụ kpakpando, omume mgbaasị, na omume mmekọahụ rụrụ arụ ndị na-eweda n’ala, ihe ndị e ji mara ofufe Beal.—Zefanaịa 1:4, 5.
-