Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ka Mmadụ Nile Too Jehova!
    Ụlọ Nche—1997 | Jenụwarị 1
    • 19. Olee otú anyị pụrụ isi kere òkè ná mmezu nke Hagaị 2:6, 7?

      19 Ihe ùgwù anyị nke ikere òkè ná mmezu nke oge a nke Hagaị 2:6, 7 bụ ihe aṅụrị: “Otú a ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị: Ọ fọdụrụ otu ugbo, nwa mgbe nta ka ọ bụ, Mụ onwe m gaje ime ka eluigwe na ụwa na oké osimiri na ala kpọrọ nkụ mee mkpatụ; M ga-emekwa ka mba nile mee mkpatụ, ihe a na-achọsi ike nke mba nile ga-abịakwa, M ga-emejukwa ụlọ a n’ebube, ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị.” Anyaukwu, ịrụ arụ, na ịkpọasị juru ebe nile n’ụwa nke narị afọ nke 20 a. Ọ nọ n’ezie na mgbe ikpeazụ ya, Jehova amalitewokwarị ime ka o mee “mkpatụ” site n’ime ka Ndịàmà ya ‘kpọsaa ụbọchị ịbọ ọ́bọ̀ ya.’ (Aịsaịa 61:2) Ime mkpatụ nke a bu ụzọ ga-agwụsị ná mbibi ụwa n’Amagedọn, ma tupu oge ahụ, Jehova na-adọpụta maka ozi ya “ihe a na-achọsi ike nke mba nile”—ndị dị umeala n’obi yiri atụrụ n’ụwa. (Jọn 6:44) “Oké ìgwè mmadụ” a ‘na-efe ofufe’ ugbu a n’ogige elu ala nke ụlọ ofufe ya.—Mkpughe 7:9, 15.

  • Ebube Ka Ukwuu nke Ụlọ Jehova
    Ụlọ Nche—1997 | Jenụwarị 1
    • Ebube Ka Ukwuu nke Ụlọ Jehova

      “M ga-emejukwa ụlọ a n’ebube, ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị.”—HAGAỊ 2:7.

      1. Olee otú e si jikọọ mmụọ nsọ n’ebe okwukwe na ọrụ dị?

      KA Ọ na-aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ, otu n’ime Ndịàmà Jehova zutere otu nwaada Pentikọstal bụ́ onye sịrị, ‘Anyị nwere mmụọ nsọ, ma ọ bụ unu na-arụ ọrụ ahụ.’ N’ụzọ akọ, a kọwaara ya na a ga-akpali onye nwere mmụọ nsọ, dị ka a pụrụ ịtụ anya ya, ịrụ ọrụ Chineke. Jemes 2:17 na-asị: “Okwukwe, ma ọ bụrụ na o nweghị ọrụ, ọ bụ ihe nwụrụ anwụ n’onwe ya.” Site n’enyemaka mmụọ Jehova, Ndịàmà ya azụlitewo okwukwe siri ike, o ‘mejuwokwa ụlọ ya n’ebube’ site n’idokwa ha ịrụ ọrụ ezi omume—n’ụzọ bụ isi ‘ikwusa ozi ọma nke a nke Alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba nile.’ Mgbe a rụzuru ọrụ a otú juru Jehova afọ, “mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.”—Matiu 24:14.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya