Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 7/1 p. 20-25
  • Ndị Na-ebikọ ‘n’Ala’ E Weghachiri Eweghachi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị Na-ebikọ ‘n’Ala’ E Weghachiri Eweghachi
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Ala” Ime Mmụọ
  • Ndị Ala Ọzọ Na-arụsi Ọrụ Ike ‘n’Ala’ Ahụ
  • “Ka Otu Sheik”
  • Ndị Nchụàjà na Ndị Ọrụ Ubi
  • “Ala” ahụ Adịgide
  • “Israel nke Chineke” na “Oké Ìgwè Mmadụ” Ahụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Nlekọta Ọchịchị Chineke n’Oge Ndị Kraịst
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Ị̀ Natawo “Mmụọ Nke Eziokwu Ahụ”?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Ndị A Gụrụ ná Ndị Ruru Eru Ka E Duga Ha n’Isi Iyi nke Mmiri nke Ndụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 7/1 p. 20-25

Ndị Na-ebikọ ‘n’Ala’ E Weghachiri Eweghachi

“Ma a ga-akpọ unu onwe unu ndị nchụàjà nke Jehova: ndị na-ejere Chineke anyị ozi ka a ga-asị na unu bụ.”—AỊSAỊA 61:6.

1, 2. (a) Gịnị bụ ọnọdụ ndị na-eso ụzọ ndị Juu n’Israel? (b) Mmụọ dị aṅaa ka ndị òtù “oké ìgwè mmadụ” ahụ gosiworo n’oge anyị a?

N’OGE ochie, Israel mgbe ọ na-ekwesị ntụkwasị obi jere ozi nye ụwa dum dị ka ihe àmà nke ebube Jehova. (Aịsaịa 41:8, 9; 43:10) Ọtụtụ ndị ala ọzọ zaghachiri ma bịa ife Jehova site n’isonyere ndị Ya a họpụtara ahọpụta. N’ezie, ha gwara Israel ihe Rut gwara Naomi: “Ndị gị ga-abụ ndị m, Chineke gị ga-abụkwa Chineke m.” (Rut 1:16) Ha nakweere ihe nile ọgbụgba ndụ Iwu ahụ chọrọ, e bie ndị ikom ha úgwù. (Ọpụpụ 12:43-48) Ndị Israel lụrụ ndị inyom ha ụfọdụ. Rehab nke Jeriko na Rut nke Moab ghọrọ ndị nne ochie Jisọs Kraịst. (Matiu 1:5) Ndị dị otú ahụ na-eso ụzọ ndị Juu bụ akụkụ ọgbakọ ndị Israel.—Deuterọnọmi 23:7, 8.

2 Dị ka ndị na-eso ụzọ ndị Juu n’Israel, “oké ìgwè mmadụ” ahụ taa agwawo ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ, sị: “Anyị na unu ga-ayịkọ jee, n’ihi na anyị anụwo na Chineke nọnyeere unu.” (Mkpughe 7:9; Zekaraịa 8:23) Ha ghọtara na ndị Kraịst a e tere mmanụ bụ “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” nke Jehova, ha na-esochikwa ha nnọọ anya na-arụ ọrụ nke na ndị ahụ e tere mmanụ na “atụrụ ọzọ” ahụ bụ ‘otu ìgwè atụrụ, otu onye ọzụzụ atụrụ.’ (Matiu 24:45-47; Jọn 10:16) Gịnị ga-eme oké ìgwè mmadụ ahụ mgbe ụmụnna ha nile e tere mmanụ natasịrị ụgwọ ọrụ ha nke eluigwe? Ọ dịghị ha mkpa ịtụwa egwu. Ná “mgbe ikpeazụ” a dum, Jehova emewo ndokwa maka oge ahụ.—2 Timoti 3:1.

“Ala” Ime Mmụọ

3. Gịnị bụ “eluigwe ọhụrụ” nke Pita buru n’amụma, oleekwa mgbe e hiwere ha?

3 Pita onyeozi buru amụma ndokwa ọchịchị eluigwe nke 144,000 ndị Kraịst e tere mmanụ ga-abụ akụkụ ya. Ọ sịrị: “Dị ka nkwa Ya si dị, anyị na-ele anya eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ, nke ezi omume bi n’ime ha.” (2 Pita 3:13) E hiwere “eluigwe ọhụrụ” a na 1914, mgbe e mere ka Kraịst nọkwasị dị ka Eze n’Alaeze eluigwe. Ma gịnị banyere “ụwa ọhụrụ” ahụ?

4. (a) Ihe omume dị aṅaa a na-atụghị anya ya mere na 1919? (b) Gịnị bụ ‘mba ahụ a mụrụ n’otu mgbe,’ gịnịkwa bụ ‘ala ahụ a mụpụtara n’ime omume’?

4 Na 1919, Jehova si ná ndọrọ laa n’agha na Babilọn Ukwu ahụ gbapụta ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ. (Mkpughe 18:4) Nye ndị ndú Krisendọm, oké ihe omume a bụ nke a na-atụtụghị anya ya ma ọlị. Banyere ya, Bible na-asị: “Ònye nụworo ihe dị ka nke a? ònye hụworo ihe dị ka ndị a? Ime ala [ọ̀] ga-eme ya n’otu ụbọchị? à ga-amụ mba n’otu mgbe?” (Aịsaịa 66:8) Mgbe ọgbakọ ahụ e tere mmanụ pụtara na mberede n’ihu mba nile dị ka ndị a tọhapụrụ atọhapụ, ọ bụ n’ezie mba ‘a mụrụ n’otu mgbe.’ Ma, gịnị bụ “ala” ahụ? N’otu ụzọ, ọ bụ ihe ime mmụọ nke ya na ala Israel oge ochie hà. Ọ bụ ógbè ọrụ nke e nyere “mba” ahụ a mụrụ ọhụrụ, ebe amụma ndị ahụ nke Paradaịs nke dị n’akwụkwọ Aịsaịa nweworo mmezu ya nke ime mmụọ n’oge anyị a. (Aịsaịa 32:16-20; 35:1-7; tụlee Ndị Hibru 12:12-14.) N’agbanyeghị ebe onye Kraịst pụrụ ịnọ n’anụ ahụ, ọ nọ ‘n’ala’ ahụ.

5. Akụkụ bụ isi dị aṅaa malitere ịdị na 1919? Kọwaa.

5 Gịnị jikọrọ nke a na “ụwa ọhụrụ” nke Pita buru amụma ya? Ọ dị mma, “mba” ọhụrụ ahụ, nke a mụrụ na 1919 ‘n’ala’ e weghachiri eweghachi, bụ nke e wulitere ịbụ nzukọ zuru ụwa ọnụ nke ndị e tere mmanụ na ndị a na-eteghị bụ́ ndị na-eto Jehova mejupụtara. Nzukọ a ga-alanarị Amagedọn banye n’ụwa ọhụrụ Chineke. N’ụzọ dị otú a a pụrụ ile mba ahụ anya dị ka akụkụ bụ isi nke ọha mmadụ ahụ nke ezi omume, ụwa ọhụrụ ahụ, nke ga-adị mgbe e bibisịrị ụwa Setan.a Ka ọ na-erule etiti afọ ndị 1930, a chịkọtawo ndị e tere mmanụ, dị ka otu ìgwè, n’ala ahụ e weghachiri. Eri mgbe ahụ, ihe a nọworo na-emesi ike bụ nchịkọta nke oké ìgwè mmadụ nke atụrụ ọzọ ahụ, nke fọrọ nke nta ka o ruo nde ise n’ọnụ ọgụgụ taa. (Mkpughe 14:15, 16) “Ala” ahụ ò jubigara ókè? Ee e, a pụrụ ịgbasawanye ókèala ya nile ruo ókè ọ bụla ọ dịrị mkpa. (Aịsaịa 26:15) N’ezie, ọ na-akpali ọṅụ ịhụ ka ụba mmadụ ya na-amụba ka ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ na-emejupụta “ala” ahụ “n’ihe omume”—nri ime mmụọ na-enye ahụ ike, nke na-enye ume. (Aịsaịa 27:6) Ma gịnị bụ ọnọdụ nke atụrụ ọzọ ndị a ‘n’ala’ ahụ e weghachiri eweghachi nke ndị Chineke?

Ndị Ala Ọzọ Na-arụsi Ọrụ Ike ‘n’Ala’ Ahụ

6. Olee otú ndị ala ọzọ siworo na-arụsi ọrụ ike ‘n’ala’ ndị Chineke?

6 Dị ka ndị na-eso ụzọ ndị Juu n’ala Israel doro onwe ha n’okpuru Iwu Mosis, oké ìgwè mmadụ ahụ taa ‘n’ala’ ahụ e weghachiri eweghachi na-aṅa ntị n’ihe nile Jehova nyere n’iwu. N’ịbụ ndị ụmụnna ha e tere mmanụ ziri ihe, ha na-ezere ofufe ụgha n’ụdị ya nile ma na-edebe ịdị nsọ nke ọbara. (Ọrụ 15:19, 20; Ndị Galetia 5:19, 20; Ndị Kọlọsi 3:5) Ha hụrụ Jehova n’anya site n’obi, uche, mkpụrụ obi, na ike ha dum, hụkwa ndị agbata obi ha n’anya dị ka onwe ha. (Matiu 22:37; Jemes 2:8) N’Israel oge ochie ndị na-eso ụzọ ndị Juu nyere aka n’owuwu nke ụlọ nsọ Solomọn ma kwado mweghachi nke ezi ofufe. (1 Ihe Emere 22:2; 2 Ihe Emere 15:8-14; 30:25) Taa, oké ìgwè mmadụ ahụ na-ekerekwa òkè n’owuwu ihe. Dị ka ihe atụ, ha na-enye aka n’iwulite ọgbakọ na sekit, ka a hapụgodị ikwu maka ọrụ ihe owuwu nkịtị dị iche iche, dị ka Ụlọ Nzukọ Alaeze, Ụlọ Mgbakọ, na alaka ụlọ ọrụ.

7. Gịnị mere na Jerusalem mgbe ịnọ n’ala ọzọ ahụ gasịrị mgbe a na-enweghị ndị Livaị zuru ezu ije ozi n’ụlọ nsọ?

7 Na 537 T.O.A., mgbe Israel si n’ịnọ n’ala ọzọ na Babilọn lata, ha malitere ịhazi ije ozi n’ụlọ nsọ ahụ e wughachiri. Otú ọ dị, ndị Livaị lataranụ adịchaghị ọtụtụ. N’ihi ya, e nyere ndị Netinim—ndị ọbịa e biri úgwù bụ́ ndị na-enyeburu ndị Livaị aka—ihe ùgwù ndị ka ukwuu n’ije ozi ụlọ nsọ. Otú ọ dị, ha na ndị nchụàjà Erọn e tere mmanụ ahaghị.b—Ezra 7:24; 8:15-20; Nehemaịa 3:22-26.

8, 9. Olee otú atụrụ ọzọ ahụ siworo na-ekere òkè na-arị elu n’ọrụ ije ozi dị nsọ na mgbe ikpeazụ a?

8 Ndị Kraịst e tere mmanụ agbasowo ụkpụrụ a taa. Ka “oge ọgwụgwụ” gaworo n’ihu, ndị fọdụrụnụ n’ime ndị ahụ e tere mmanụ anọwo na-adịwanye ole na ole ‘n’ala’ ndị Chineke. (Daniel 12:9; Mkpughe 12:17) N’ihi nke a, oké ìgwè mmadụ ahụ na-arụzu ugbu a ihe ka ukwuu n’ọrụ nke ije “ozi dị nsọ.” (Mkpughe 7:15, NW) N’ịgbaso idu ndú nke ụmụnna ha e tere mmanụ, ha “na-achụ àjà, bụ́ otuto, nye Chineke mgbe nile, nke ahụ bụ, mkpụrụ egbugbere ọnụ nke na-ekwupụta nye aha Ya.” Ha ‘adịghị echezọ ime ihe dị mma na ime ka ha na ndị ọzọ nwekọọ ihe ha,’ na-amara na “àjà dị otú a na-atọ Chineke ezi ụtọ.”—Ndị Hibru 13:15, 16.

9 Ọzọkwa, ebe oké ìgwè mmadụ ahụ na-amụba n’ọtụtụ narị puku kwa afọ, e nwere mkpa na-arịwanye elu maka nlekọta. N’otu oge nanị ndị Kraịst e tere mmanụ hụrụ maka nke a. Ugbu a, nlekọta nke ihe ka ọnụ ọgụgụ n’ọgbakọ nile, nakwa na sekit, distrikti, na alaka ụlọ ọrụ, abụwo nke mkpa mere ka a tụkwasị ya n’aka atụrụ ọzọ ahụ. Na 1992 e nyere ole na ole n’ime ndị a ihe ùgwù nke ịdị na-aga nzukọ kọmitii dị iche iche nke Òtù Na-achị Isi na ije ozi dị ka ndị enyemaka na-adịghị eso eme ntụliaka. Ma, atụrụ ọzọ ahụ na-anọgidesi ike n’ihe nye ndị Kraịst ibe ha e tere mmanụ ma na-enwe mmetụta nke inwe ihe ùgwù n’ịkwado ha dị ka ohu Jehova nke kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche.—Matiu 25:34-40.

“Ka Otu Sheik”

10, 11. N’ịgbaso ụkpụrụ nke ụfọdụ ndị Filistia, olee otú ụfọdụ bụbu ndị iro nke ndị Chineke siworo nwee mgbanwe obi? Gịnị ka ọ rụpụtaworo?

10 E buru amụma ụzọ ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche siworo jiri atụrụ ọzọ ahụ na-eme ihe n’ọkwá ibu ọrụ dị iche iche na Zekaraịa 9:6, 7 (NW). N’ebe ahụ anyị na-agụ, sị: “M ga-ebipụrịrị mpako nke ndị Filistia. M ga-ewepụkwa ihe ya nile ọbara tetọsịrị site n’ọnụ ya na ihe arụ ya nile site n’etiti ezé ya, a gakwa ahapụrịrị ya onwe ya ka ọ dịgidere Chineke anyị; ọ ghaghịkwa ịdị ka otu sheik na Juda, Ekrọn kwa dị ka onye Jebus.”c Ndị Filistia bụ ajọ ndị iro nke ndị Jehova, dị ka ụwa Setan bụ taa. (1 Jọn 5:19) Dị ka e mesịrị kpochapụ ndị Filistia dị ka otu ndị, otú ahụ ka ụwa a, ya na ihe okpukpe, ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na azụmahịa ya nile ga-ahụ ọnụma na-eweta mbibi nke Jehova n’isi nso.—Mkpughe 18:21; 19:19-21.

11 Otú ọ dị, dị ka okwu Zekaraịa na-egosi, ndị Filistia ụfọdụ nwere mgbanwe nke obi, nke a sekwara onyinyo nke na ụfọdụ ndị ụwa taa agaghị anọgide na-abụ ndị iro Jehova. Ha ga-akwụsị ikpere arụsị nke okpukpe, ya na ememe ya nile a na-asọ nsọ na àjà ndị na-asọ oyi, e wee mee ka ha dị ọcha n’anya Jehova. N’ụbọchị anyị a na-achọta “ndị Filistia” a gbanwere n’ụzọ dị otú ahụ n’etiti oké ìgwè mmadụ ahụ.

12. N’oge anyị a, olee otú “Ekrọn” siworo ‘dị ka onye Jebus’?

12 Di ka amụma ahụ na-egosi, obodo bụ isi nke Filistia bụ́ Ekrọn ga-adị ka “onye Jebus.” Ndị Jebus kwa bụbu ndị iro Israel. Jerusalem dị n’aka ha ruo mgbe Devid meriri ya. Ka o sina dị, ihe àmà na-egosi na ụfọdụ ndị lanarịrị agha ndị ha na Israel buru ghọrọ ndị na-eso ụzọ ndị Juu. Ha jere ozi n’ala Israel dị ka ndị ohu ma ọbụna nwee ihe ùgwù nke ịrụ ọrụ n’owuwu ụlọ nsọ ahụ. (2 Samuel 5:4-9; 2 Ihe Emere 8:1-18) Taa, “ndị Ekrọn” chigharịkwuuru ofufe Jehova na-enwekwa ihe ùgwù ije ozi dị iche iche ‘n’ala’ nke nọ n’okpuru nlekọta ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche.

13. Gịnị bụ ndị sheikh n’oge ochie ahụ?

13 Zekaraịa kwuru na onye Filistia ga-adị ka otu sheikh na Juda. Okwu Hibru bụ́ ʼal·luphʹ, mgbe a sụgharịrị ya “sheikh,” pụtara “onye ndú nke otu puku” (ma ọ bụ, “onye chịlịak”). Ọ bụ ọkwá dị nnọọ elu. O yiri ka mba Edọm mbụ ò nwere nanị ndị sheikh 13. (Jenesis 36:15-19) A dịghị ejikebe okwu ahụ bụ́ “sheikh” eme ihe mgbe a na-ekwu maka Israel, ma okwu bụ́ “onye isi (ma ọ bụ, chiifu) nke otu puku” na-apụta ugboro ugboro. Mgbe Mosis kpọkọtara ndị nnọchiteanya nke mba Israel, ọ kpọrọ “ndị isi nke usuu nile nke [otu puku ndị ikom] nke Israel.”d E nwere 12 nke ndị a, ihe àmà na-egosikwa na ọ bụ nanị Mosis ka ha nọ n’okpuru. (Ọnụ Ọgụgụ 1:4-16) N’otu aka ahụ, ná nhazi nke usuu ndị agha, chiifu nile nke otu puku otu puku na-anọ n’okpuru nanị ọchịagha ma ọ bụ eze ha.—2 Samuel 18:1, 2; 2 Ihe Emere 25:5.

14. Olee otú “onye Filistia” siworo dị ka onye sheikh taa?

14 Zekaraịa ebughị amụma na onye Filistia chegharịrị ga-abụ n’ezie sheikh n’ime Israel. Nke ahụ agaghị ekwesị ekwesị, ebe ọ bụ na ọ bụghị onye Israel anụ ahụ site n’ọmụmụ. Kama ọ ga-adị ka sheikh, na-anọ ọnọdụ nke inwe ikike a pụrụ iji tụnyere nke onye sheikh. Otú ahụ ka ọ dịwokwara. Ka ihe fọdụrụnụ ná ndị Kraịst e tere mmanụ na-adalata n’ọnụ ọgụgụ, afọ ndụ na-akpakwara ọtụtụ ndị ka nọ ndụ ókè, atụrụ ọzọ ahụ a zụrụ nke ọma na-emeju mkpa e nwere, dị ka a pụrụ ikwu ya. Ha adịghị achọ ịnọchi ụmụnna ha e tere mmanụ. Ma ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche na-enye ha ikike dị ka ọ dị mkpa ‘n’ala’ ahụ ka nzukọ Chineke wee nọgide na-aga n’ihu n’ụzọ a haziri ahazi. A na-ahụ usoro dị otú ahụ nke na-aga n’ihu n’ihu n’amụma ọzọ kwa.

Ndị Nchụàjà na Ndị Ọrụ Ubi

15. (a) Ná mmezu nke Aịsaịa 61:5, 6, olee ndị bụ “ndị nchụàjà nke Jehova,” oleekwa mgbe ha na-eje ozi n’ọkwá a n’ụzọ zuru ezu? (b) Olee ndị bụ “ndị ala ọzọ” na-arụ ọrụ ubi nke Israel, gịnịkwa—n’ụzọ ime mmụọ—ka ọrụ ahụ gụnyere?

15 Aịsaịa 61:5, 6 na-agụ, sị: “Ndị ala ọzọ ga-eguzo na-azụ ìgwè ewu na atụrụ unu, ụmụ ala ọzọ ga-abụkwa ndị ọrụ ubi unu na ndị ọrụ ubi vine unu. Ma a ga-akpọ unu onwe unu ndị nchụàjà nke Jehova: ndị na-ejere Chineke anyị ozi ka a ga-asị na unu bụ: akụ̀ nke mba dị iche iche ka unu ga-eri, ọ bụkwa ná nsọpụrụ ha ka unu ga-anya isi.” Taa, “ndị nchụàjà nke Jehova” bụ ndị Kraịst e tere mmanụ. N’ụzọ ikpeazụ na nke zuru ezu, ha ga-eje ozi dị ka “ndị nchụàjà nke Jehova: ndị na-ejere Chineke anyị ozi,” n’Alaeze eluigwe ahụ. (Mkpughe 4:9-11) Olee ndị bụ “ndị ala ọzọ” a na-ahụ maka ọrụ ubi? Ndị a bụ atụrụ ọzọ ahụ, ndị na-ebi ‘n’ala’ Israel nke Chineke. Gịnị bụ ọzụzụ atụrụ, ọrụ ubi, na ọrụ ubi vine nke e tinyere n’aka ha? N’echiche ime mmụọ dị mkpa, ọrụ ndị a metụtara inyere ndị mmadụ aka, ịzụ ha na iwe ha dị ka ihe ubi.—Aịsaịa 5:7; Matiu 9:37, 38; 1 Ndị Kọrint 3:9; 1 Pita 5:2.

16. Olee ndị ga-emesị na-arụ ọrụ nile n’ime “ala” ndị Chineke ahụ?

16 Ka ọ dị ugbu a, ọnụ ọgụgụ dị nta nke Israel ime mmụọ ka nọ n’elu ụwa na-ekere òkè n’ọzụzụ, ọrụ ubi, na ọrụ ubi vine ime mmụọ. Mgbe a ga-emesị jikọọ ọgbakọ ahụ e tere mmanụ n’ozuzu ya ya na Kraịst, a ga-ahapụrụ atụrụ ọzọ ahụ ọrụ a dum. Ọbụna nlekọta ụmụ mmadụ nke “ala” ahụ ga-adịzi n’aka atụrụ ọzọ ruru eru, ndị a kpọrọ n’akwụkwọ Ezikiel òtù ndị chiifu.—Ezikiel, isi nke 45, 46, NW.e

“Ala” ahụ Adịgide

17. Nkwadebe dịgasị aṅaa ka Jehova nọworo na-eme na mgbe ikpeazụ a dum?

17 Ee, ọ dịghị oké ìgwè mmadụ ahụ mkpa ịtụwa egwu! Jehova akwadebeworo ha ihe bara ụba. Otu ihe omume dị oké mkpa nke meworo n’elu ụwa a n’ime mgbe ikpeazụ a abụwo ịchịkọbata na ịka ndị e tere mmanụ akara. (Mkpughe 7:3) Ma, ka ọ na-ahụ na a na-eme nke a, Jehova ewebatawo atụrụ ọzọ ahụ ka ha sonyere ha n’ala ime mmụọ e weghachiri eweghachi. N’ebe ahụ e nyewo ha nri ime mmụọ ma zụọ ha n’ibi ndụ ndị Kraịst. Ọzọkwa, e wusiwo ha ike n’ije ozi dị nsọ, tinyere nlekọta. Maka nke a ha na-enwe ekele dị omimi nye Jehova na ụmụnna ha e tere mmanụ.

18. Gabiga ihe omume dịgasị aṅaa ka atụrụ ọzọ ahụ ga-anọgidesi ike n’ihe ‘n’ala’ Israel ime mmụọ ahụ?

18 Mgbe Gọg nke Megọg ga-eme mwakpo ikpeazụ ya n’ahụ ndị Chineke, atụrụ ọzọ ahụ ga-eguzosi ike ha na ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ n’ime “obodo na-enweghị mgbidi.” Atụrụ ọzọ ahụ ka ga-anọ ‘n’ala’ ahụ mgbe ha lanarịrị mbibi nke mba nile ma banye n’ụwa ọhụrụ Chineke. (Ezikiel 38:11; 39:12, 13; Daniel 12:1; Mkpughe 7:9, 14) N’ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi, ọ dịghị mgbe ha ga-ahapụ ebe ahụ mara mma.—Aịsaịa 11:9.

19, 20. (a) N’ụwa ọhụrụ ahụ, nlekọta dị aṅaa dị ebube ka ndị bi ‘n’ala’ ahụ ga-enwe? (b) Gịnị ka anyị ji oké atụmanya na-elepụ anya n’ihu maka ya?

19 Ndị eze bụ́ mmadụ chịrị Israel oge ochie, o nwekwara ndị nchụàjà Livaị. N’ụwa ọhụrụ ahụ, ndị Kraịst ga-enwe nlekọta dị ebube nke ukwuu karị. N’okpuru Jehova Chineke, ha ga-anọ n’okpuru Onye Isi Nchụàjà ukwu na Eze ahụ, Jisọs Kraịst, nakwa n’okpuru 144,000 ndị nchụàjà na ndị eze ibe ya—ndị ha mabu ụfọdụ n’ime ha dị ka ụmụnna ha ndị Kraịst bụ́ ndị ikom na ndị inyom n’elu ụwa. (Mkpughe 21:1) Ndị na-ekwesị ntụkwasị obi bi n’ala ime mmụọ ahụ ga-ebi n’ụwa nke e weghachiri ịbụ paradaịs nkịtị, na-enwe ọṅụ ná ngọzi nile nke ọgwụgwọ nke si na Jerusalem Ọhụrụ na-erudata.—Aịsaịa 32:1; Mkpughe 21:2; 22:1, 2.

20 Ka ụgbọ ịnyịnya eluigwe ukwu nke Jehova na-aga n’ihu n’enweghị nkwụsị iji mezuo nzube ya, anyị nile ji oké atụmanya na-elepụ anya n’ihu maka imezu òkè nke e kenyere anyị. (Ezikiel 1:1-28) Mgbe e mesịrị mezuo nzube ndị ahụ, chee banyere ọṅụ a ga-eji mee ememe mmeri nke ido Jehova nsọ! Mgbe ahụ ihe nile e kere eke ga-abụ oké abụ otuto ahụ e dekọrọ ná Mkpughe 5:13: “Ọ bụ onye ahụ Nke na-anọkwasị n’ocheeze ahụ, Ya na Nwa atụrụ ahụ, ka ngọzi nile na nsọpụrụ nile na otuto nile na ike nile dịịrị ruo mgbe nile ebighị ebi”! Ma ebe anyị ga-anọ ọ̀ bụ n’eluigwe ma ọ̀ bụ n’elu ụwa, ọ̀ bụ na ọ dịghị agụsi anyị ike ịnọ n’ebe ahụ, na-etinye olu anyị ná mkpu abụ otuto ahụ dị ebube?

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Lee akwụkwọ bụ́ “New Heavens and a New Earth,” nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara na 1953, peji nke 322-323.

b Maka ntụle zuru ezu, lee isiokwu bụ́ “Onyinye Jehova, ‘Ndị E Nyesịworo’” n’Ụlọ Nche nke April 15, 1992.

c Lee akwụkwọ bụ́ Paradise Restored to Mankind—By Theocracy!, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara na 1972, peji nke 264-269.

d Hibru: raʼ·shehʹ ʼal·phehʹ Yis·ra·ʼelʹ, nke a sụgharịrị khi·liʹar·khoi Is·ra·elʹ “ndị chịlịak nke Israel” na Septuagint.

e Lee akwụkwọ bụ́ “The Nations Shall Know That I Am Jehovah”—How?, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara na 1971, peji nke 401-407.

Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?

◻ “Ala” dị aṅaa ka e weghachiri na 1919, ò sikwa aṅaa jupụta ná mmadụ?

◻ Olee otú e siworo nye atụrụ ọzọ ibu ọrụ ndị ka ukwuu ‘n’ala’ ndị Chineke e weghachiri eweghachi?

◻ N’ụzọ dị aṅaa ka ndị òtù oké ìgwè mmadụ ahụ “dị ka onye Jebus”? ‘dị ka otu sheik na Juda’?

◻ Ogologo oge hà aṅaa ka atụrụ ọzọ na-ekwesị ntụkwasị obi ga-anọru ‘n’ala’ ahụ?

[Foto dị na peeji nke 23]

Onye Filistia nke oge a ‘ga-adị ka otu sheik na Juda’

[Foto ndị dị na peeji nke 24]

Ndị e tere mmanụ na atụrụ ọzọ ahụ na-ejekọ ozi n’ala ime mmụọ ahụ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya