-
Uru Ọhụụ Zekaraya Baara AnyịỤlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2017 | Ọktoba
-
-
16. (a) Olee ihe ọzọ Zekaraya hụrụ mere nkata efa ahụ? (Lee ihe nke atọ e sere ná mmalite isiokwu a.) (b) Olee ebe ụmụ nwaanyị abụọ ahụ nwere nku bugara nkata ahụ?
16 Ihe ọzọ Zekaraya hụrụ n’ọhụụ ya bụ ụmụ nwaanyị abụọ nku ha siri ike ka nku ụgbala. (Gụọ Zekaraya 5:9-11.) Ụmụ nwaanyị abụọ a dị ezigbo iche na nwaanyị ajọ omume ahụ nọ n’ime nkata ahụ. Ha ji nku ha siri ike buru nkata ahụ “Ajọ Omume” nọ n’ime ya felie elu. Olee ebe ha bu ya na-aga? Ha bugara ya “n’ala Shaịna” ma ọ bụ Babịlọn. Ma, gịnị mere ha ji buga ya Babịlọn?
17, 18. (a) Gịnị mere Shaịna ji bụrụ ebe ‘kwesịrị ekwesị’ ibuga “Ajọ Omume”? (b) Gịnị ka anyị kpebisiri ike ime gbasara ihe ọjọọ?
17 Ndị Izrel dịrị ndụ n’oge Zekaraya ghọtara na “Ajọ Omume” ahụ e bugara Shaịna kwesịrị ekwesị. Zekaraya na ndị Juu ibe ya ma na arụrụala juru na Babịlọn n’oge ahụ. Ebe ọ bụ na ha toro n’obodo a ndị mmadụ na-eme omume rụrụ arụ ma na-ekpere arụsi, ha na-agbasi mbọ ike na-agbara omume ọjọọ ndị ahụ ọsọ. N’ihi ya, ọhụụ a mere ka ha mata na Jehova ga na-eme ka ọgbakọ ya dịrị ọcha.
18 Ọhụụ ahụ chetakwaara ndị Juu ka ha ghara itinye aka n’ihe ọjọọ. Ndị na-efe Jehova ekwesịghị ikwe ka ihe ọjọọ bata n’ọgbakọ ma ọ bụ kwe ka ọ nọgide. Taa, Jehova akpọbatala anyị n’ọgbakọ ya dị ọcha. Ọ na-echebe anyị ma na-egosi anyị na ọ hụrụ anyị n’anya. Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịgbasi mbọ ike na-eme ka nzukọ Jehova dịrị ọcha. E kwesịghị ikwe ka ndị na-eme ihe ọjọọ nọgide ná nzukọ Jehova.
-