Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 1/1 p. 17-22
  • “Hụkwanụ Eziokwu na Udo n’Anya”!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Hụkwanụ Eziokwu na Udo n’Anya”!
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Ka Aka Unu Dị Ike”
  • “Unu Atụla Egwu”
  • “Kwuonụ, Onye Ọ Bụla Ọ Gwa Ibe Ya, Eziokwu”
  • “Obi Ụtọ na Ọṅụ”
  • ‘Ka Anyị Mee Ka Ihu Jehova Dajụọ’
  • ‘Ndị Ikom Iri Site n’Asụsụ Nile nke Mba Nile’
  • Jehova Na-enye Udo na Eziokwu n’Ụba
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Ka “Udo Nke Chineke” Chee Obi Unu Nche
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Hagaị na Zekaraịa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • “Anyị Anụwo na Chineke Nọnyeere Unu”
    Nlanarị Baa n’Ime Ụwa Ọhụrụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 1/1 p. 17-22

“Hụkwanụ Eziokwu na Udo n’Anya”!

“Okwu Jehova nke usuu nile nke ndị agha wee ruo m ntị, sị, . . . Hụkwanụ eziokwu na udo n’anya.”—ZEKARAỊA 8:18, 19.

1, 2. (a) Olee ihe ndekọ ụmụ mmadụ nwere n’ihe banyere udo? (b) N’ihi gịnị ka ụwa nke dị ugbu a na-adịghị mgbe ọ ga-ahụ ezi udo?

“ỌDỊBEGHỊ mgbe ụwa nwere udo. Ebe ụfọdụ—ọtụtụ mgbekwa n’ọtụtụ ebe n’otu mgbe ahụ—anọwo na-alụ agha mgbe nile.” Ọ bụ ihe Prọfesọ Milton Mayer nke Mahadum Massachusetts, U.S.A., kwuru. Lee aha okwu ọjọọ ọ bụ banyere ihe a kpọrọ mmadụ! N’eziokwu, ụmụ mmadụ achọwo udo. Ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị anwalewo ụdị ụzọ nile isi nọgide na-enwe ya, malite na Pax Romana nke oge ndị Rom ruo n’ụkpụrụ nke “Mkpochapụrịta E Ji n’Aka” n’oge Agha Nzuzo. Otú ọ dị, mgbalị ha nile danyụrụ anya. Dị ka Aịsaịa si kwuo ya ọtụtụ narị afọ gara aga, “ndị ozi udo na-akwakpọ anya.” (Aịsaịa 33:7) N’ihi gịnị?

2 Ọ bụ n’ihi na udo na-adịgide adịgide aghaghị ịbịa site n’enweghị ịkpọasị na anyaukwu; ọ ghaghị ịdaberesi ike n’eziokwu. Udo apụghị ịdabere n’ụgha. Ọ bụ ya mere Jehova ji kwuo mgbe ọ na-ekwe Israel oge ochie nkwa mweghachi na udo, sị: “Lee, M na-esetịru ya udo dị ka osimiri, na nsọpụrụ nke mba dị iche iche dị ka iyi nke na-erubiga ókè.” (Aịsaịa 66:12) Chi nke usoro ihe a, Setan bụ́ Ekwensu, bụ “ogbu mmadụ,” ogbu ọchụ, na “onye ụgha, bụrụkwa nna ya.” (Jọn 8:44; 2 Ndị Kọrint 4:4) Olee otú ụwa nke nwere ụdị chi dị otú ahụ pụrụ isi nwee udo mgbe ọ bụla?

3. Olee onyinye dị ịrịba ama nke Jehova nyeworo ndị ya, n’agbanyeghị na ha bi n’ime ụwa nke jupụtara ná nsogbu?

3 Otú ọ dị, n’ụzọ dị ịrịba ama, Jehova na-enye ndị ya udo ọbụna mgbe ha na-ebi n’ime ụwa Setan nke agha bibisịrị. (Jọn 17:16) Na narị afọ nke isii T.O.A., o mezuru nkwa ya nke sitere n’ọnụ Jeremaịa ma nye mba ya pụrụ iche “udo na eziokwu” mgbe o weghachiri ha n’ala nke aka ha. (Jeremaịa 33:6) Na mgbe ikpeazụ ndị a kwa, o nyewo ndị ya “udo na eziokwu” ‘n’ala’ ha, ma ọ bụ ógbè ime mmụọ nke elu ala, n’agbanyeghị na ha adịwo ndụ gabiga oge nsogbu kasị ukwuu nke ụwa a hụtụworo rute ugbu a. (Aịsaịa 66:8; Matiu 24:7-13; Mkpughe 6:1-8) Ka anyị na-aga n’ihu ná ntụle anyị na-atụle Zekaraịa isi nke 8, anyị ga-enweta nghọta ka mie emie nke udo na eziokwu a nke Chineke nyere wee hụ ihe anyị na-aghaghị ime iji chekwaa òkè anyị n’ime ya.

“Ka Aka Unu Dị Ike”

4. Olee otú Zekaraịa si gbaa Israel ume ime ihe ma ọ bụrụ na ha ga-enweta udo?

4 Ugboro nke isii na Zekaraịa isi nke 8, anyị na-anụ nkwupụta okwu na-akpali akpali site n’ọnụ Jehova: “Otú a ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị: Ka aka unu dị ike, unu ndị na-anụ n’ụbọchị ndị a okwu ndị a n’ọnụ ndị amụma ahụ, ndị nọ n’ụbọchị mgbe a tọrọ ntọala ụlọ Jehova nke usuu nile nke ndị agha, bụ́ ụlọ ukwu Ya, ka e wee wuo ya. N’ihi na tupu ụbọchị nile ahụ ụgwọ ọrụ mmadụ adịghị, ụgwọ ọrụ anụmanụ adịghịkwa; ọ dịghịkwa udo dịịrị onye na-apụ apụ ma ọ bụ onye na-abata abata site n’onye mkpagbu: ezigakwara m mmadụ nile, onye ọ bụla imegide ibe ya.”—Zekaraịa 8:9, 10.

5, 6. (a) N’ihi nkụda aka nke ndị Israel, gịnị bụ ọnọdụ dịrị n’Israel? (b) Mgbanwe dị aṅaa ka Jehova kwere Israel ná nkwa ma ọ bụrụ na o bute ofufe ya ụzọ?

5 Zekaraịa kwuru okwu ndị a mgbe a nọ na-ewughachi ụlọ nsọ ahụ na Jerusalem. Na mbụ, ndị Israel ahụ si Babilọn lọta ghọrọ ndị nwere nkụda aka ma kwụsị ọrụ iwu ụlọ nsọ ahụ. N’ihi na ha tinyere uche ha ná ntụsara ahụ nke onwe ha, ha enwetaghị ngọzi ọ bụla na udo ọ bụla site n’aka Jehova. N’agbanyeghị na ha kọrọ ala ha, lekọtakwa ubi vine ha, ha enweghị ọganihu. (Hagaị 1:3-6) O yiri ka ha na-arụ ọrụ n’enwetaghị “ụgwọ ọrụ” ọ bụla.

6 Ugbu a a na-ewughachi ụlọ nsọ ahụ, Zekaraịa gbara ndị Juu ume ka ha “dị ike,” iji obi ike bute ofufe Jehova ụzọ. Gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na ha mere otú ahụ? “Ugbu a ọ bụghị dị ka n’ụbọchị mbụ nile ka Mụ onwe m ga-adịrị ndị nke a fọdụrụ; (ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova nke usuu nile nke ndị agha pụta). N’ihi na mkpụrụ udo ga-adị; osisi vine ga-amị mkpụrụ ya, ala emeekwa ihe omume ya, eluigwe ga-enyekwa igirigi ha; M ga-emekwa ka ndị nke a fọdụrụ keta ihe ndị a nile. Ọ ga-erukwa na, dị ka unu bụrịị nkọcha [n’etiti] mba nile, unu ụlọ Juda na ụlọ Israel, otú a ka M ga-azọpụta unu, unu abụrụ ngọzi: unu atụla egwu, kama ka aka unu dị ike.” (Zekaraịa 8:11-13) Ọ bụrụ na Israel ga-eji mkpebisi ike mee ihe, ọ ga-enwe ọganihu. Na mbụ, mgbe mba dị iche iche chọrọ inye ihe atụ nke nkọcha, ha pụrụ izo aka n’Israel. Ugbu a Israel ga-abụ ihe atụ nke ngọzi. Lee ihe magburu onwe ya mere ha ga-eji mee ‘ka aka ha dị ike’!

7. (a) Olee mgbanwe ndị na-akpali akpali nke ndị Jehova nwetaworo, na-abịa n’ọ̀tụ̀tụ̀ ya kasị elu n’afọ ije ozi 1995? (b) N’ile anya n’akụkọ mgbaafọ, olee mba ndị ị hụrụ ndị nwere ihe ndekọ kwesịrị ịrịba ama ná ndị nkwusa, ndị ọsụ ụzọ, nkezi hour?

7 Gịnị banyere taa? N’afọ ndị dị tupu 1919, ndị Jehova enwechaghị ịnụ ọkụ n’obi. Ha anọpụchaghị iche kpam kpam n’Agha Ụwa Mbụ, ha nwekwara omume nke ịgbaso mmadụ kama ịgbaso Eze ha, bụ́ Jisọs Kraịst. N’ihi ya, a kụdara ụfọdụ aka n’ihi mmegide sitere n’ime nzukọ na nke sitere n’èzí. Mgbe ahụ, na 1919, site n’enyemaka Jehova ha mere ka aka ha dị ike. (Zekaraịa 4:6) Jehova nyere ha udo, ha nwekwara ọganihu n’ụzọ dị ike. A na-ahụ nke a n’ihe ndekọ ha nke 75 afọ gara aga, na-abịa n’ọ̀tụ̀tụ̀ ya kasị elu n’afọ ije ozi 1995. Dị ka otu ndị, Ndịàmà Jehova na-ajụ ịhụ mba n’anya, ịkpa ókè agbụrụ, inwe echiche na-ezighị ezi banyere ndị ọzọ, na isi iyi ndị ọzọ nile nke ịkpọasị. (1 Jọn 3:14-18) Ha ji ezi ịnụ ọkụ n’obi na-ejere Jehova ozi n’ụlọ nsọ ime mmụọ ya. (Ndị Hibru 13:15; Mkpughe 7:15) N’afọ gara aga nanị, ha tinyere ihe karịrị otu ijeri hour na-agwa ndị ọzọ okwu banyere Nna ha nke eluigwe! Kwa ọnwa, ha duziri 4,865,060 ọmụmụ Bible. Nkezi nke 663,521 keere òkè kwa ọnwa n’ozi ịsụ ụzọ. Mgbe ndị ozi nke Krisendọm chọrọ inye ihe atụ nke ndị nwere ịnụ ọkụ n’obi n’ezie n’ofufe ha, ha na-ezo aka mgbe ụfọdụ n’ebe Ndịàmà Jehova nọ.

8. Olee otú onye Kraịst ọ bụla pụrụ isi rite uru site ná “mkpụrụ udo” ahụ?

8 N’ihi ịnụ ọkụ n’obi ha, Jehova na-enye ndị ya “mkpụrụ udo.” Onye ọ bụla nke zụlitere mkpụrụ ahụ ga-ahụ na udo ga-eto n’obi ya na ná ndụ ya. Onye Kraịst ọ bụla kwere ekwe nke na-achọ ka ya na Jehova na ndị Kraịst ibe ya dị n’udo na-ekere òkè n’eziokwu na udo nke ndị a kpọkwasịrị aha Jehova. (1 Pita 3:11; tụlee Jemes 3:18.) Nke ahụ ọ́ dịghị ịtụnanya?

“Unu Atụla Egwu”

9. Mgbanwe dị aṅaa n’ụzọ o si na-emeso ndị ya ka Jehova kwere ná nkwa?

9 Ugbu a anyị na-agụ nkwupụta okwu nke asaa nke Jehova. Gịnị ka ọ bụ? “Otú a ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị: Dị ka M zubere ime unu ihe ọjọọ, mgbe nna unu hà kpasuru m iwe, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova nke usuu nile nke ndị agha pụta), ma echegharịghị m uche: otú a ka M zubewokwara ọzọ n’ụbọchị ndị a ime Jerusalem, imekwa ụlọ Juda, mma: unu atụla egwu.”—Zekaraịa 8:14, 15.

10. Ihe ndekọ dị aṅaa nke Ndịàmà Jehova na-egosi na egwu atụbeghị ha?

10 N’agbanyeghị na ndị Jehova gbasasịrị agbasasị n’ụzọ ime mmụọ n’oge Agha Ụwa Mbụ, n’ime obi ha, ha chọrọ ime ihe ziri ezi. N’ihi ya, Jehova, mgbe o nyesịrị ha ịdọ aka ná ntị ụfọdụ, gbanwere ụzọ o si na-emeso ha. (Malakaị 3:2-4) Taa, anyị na-eleghachi anya azụ ma na-ekelesi ya ike n’ihi ihe o meworo. N’eziokwu, anyị abụrụwo ndị “mba nile [kpọrọ] asị.” (Matiu 24:9) A tụwo ọtụtụ mkpọrọ, ọbụna ụfọdụ anwụwokwa n’ihi okwukwe ha. Anyị na-ezutekarị enweghị mmasị ma ọ bụ ịkpọasị. Ma egwu adịghị atụ anyị. Anyị maara na Jehova dị ike karịa mmegide ọ bụla, nke a pụrụ ịhụ anya na nke a na-apụghị ịhụ anya. (Aịsaịa 40:15; Ndị Efesọs 6:10-13) Anyị agaghị akwụsị ịṅa ntị n’okwu ndị ahụ bụ́: “Na-ele anya Jehova: dị ike, ka obi gị nweekwa ume.”—Abụ Ọma 27:14.

“Kwuonụ, Onye Ọ Bụla Ọ Gwa Ibe Ya, Eziokwu”

11, 12. Gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’uche n’otu n’otu ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ikere òkè n’ụzọ zuru ezu ná ngọzi nile Jehova na-enye ndị ya?

11 Iji kere òkè n’ụzọ zuru ezu ná ngọzi nile sitere n’aka Jehova, e nwere ihe ndị anyị kwesịrị icheta. Zekaraịa na-asị: “Ndị a bụ ihe unu ga-eme; Kwuonụ, onye ọ bụla ọ gwa ibe ya, eziokwu; kpeenụ ikpe eziokwu na ikpe udo n’ọnụ ụzọ ámá nile unu: unu echekwala ihe ọjọọ n’obi unu, onye ọ bụla megide ibe ya; unu ahụkwala ọgbụgba iyi ụgha n’anya: n’ihi na ihe ndị a nile bụ ihe nke M kpọworo asị; ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta.”—Zekaraịa 8:16, 17.

12 Jehova na-agba anyị ume ikwu eziokwu. (Ndị Efesọs 4:15, 25) Ọ dịghị anụ ekpere nke ndị na-echepụta ihe ọjọọ, na-ezochi eziokwu n’ihi uru onwe onye, ma ọ bụ na-aṅụ iyi ụgha. (Ilu 28:9) Ebe ọ bụ na ọ kpọrọ ndapụ n’ezi ofufe asị, ọ chọrọ ka anyị rapara n’eziokwu Bible. (Abụ Ọma 25:5; 2 Jọn 9-11) Ọzọkwa, dị ka ndị okenye ahụ nọ n’ọnụ ụzọ ámá nile nke Israel, ndị okenye na-ahụ maka okwu ikpe dị iche iche kwesịrị ime ka ndụmọdụ na mkpebi ha nile dabere na Bible, ọ bụghị n’echiche onwe onye. (Jọn 17:17) Jehova chọrọ ka ha chọọ “ikpe udo,” na-agbalị dị ka ndị Kraịst bụ́ ndị ọzụzụ atụrụ, ime ka udo dịghachi n’etiti ndị abụọ na-ese okwu na inyere ndị mmehie chegharịrịnụ aka ka ha na Chineke dịghachi n’udo. (Jemes 5:14, 15; Jud 23) N’otu oge ahụkwa, ha na-echebe udo nke ọgbakọ, jiri obi ike na-achụpụ ndị na-emebi udo ahụ site n’ịkpachara anya nọgide n’ime ihe ọjọọ.—1 Ndị Kọrint 6:9, 10.

“Obi Ụtọ na Ọṅụ”

13. (a) Mgbanwe dị aṅaa banyere ibu ọnụ ka Zekaraịa buru n’amụma? (b) Olee ibu ọnụ e buru n’Israel?

13 Ugbu a, anyị na-anụ nkwupụta okwu nke asatọ dị ike: “Otú a ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị: Obubu ọnụ nke ọnwa nke anọ, na obubu ọnụ nke ọnwa nke ise, na obubu ọnụ nke ọnwa nke asaa, na obubu ọnụ nke ọnwa nke iri, ga-aghọrọ ụlọ Juda obi ụtọ na ọṅụ, na mgbe a kara aka dị mma; hụkwanụ eziokwu na udo n’anya.” (Zekaraịa 8:19) N’okpuru Iwu Mosis, ndị Israel buru ọnụ n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie iji gosi mwute maka mmehie ha. (Levitikọs 16:29-31) O doro anya na e buru obubu ọnụ anọ ahụ Zekaraịa hotara iji ruo újú maka ihe ndị metụtara mmeri na mbibi nke Jerusalem. (2 Ndị Eze 25:1-4, 8, 9, 22-26) Otú ọ dị, ugbu a a na-ewughachi ụlọ nsọ ahụ ma na-ebijughachi na Jerusalem. A na-agbanwe iru újú gaa n’ịṅụrị ọṅụ, obubu ọnụ ndị ahụ pụkwara ịghọ oge ememe.

14, 15. (a) Olee otú Ememe Ncheta si bụrụ oké ihe ịṅụrị ọṅụ, gịnịkwa ka nke a kwesịrị ichetara anyị? (b) Dị ka a hụrụ n’akụkọ mgbaafọ, olee ala ndị nwere ọnụ ọgụgụ buru ibu bịara Ememe Ncheta?

14 Taa, anyị adịghị ebu ọnụ ndị ahụ Zekaraịa hotara ma ọ bụ obubu ọnụ nke Iwu ahụ tụziri. Ebe Jisọs nyere ndụ ya n’ihi mmehie nile anyị, anyị na-enweta ngọzi nile nke Ụbọchị Mkpuchi Mmehie ka ukwuu. A na-ekpuchi mmehie anyị nile, ọ bụghị nanị n’ụzọ dị nta, kama kpam kpam. (Ndị Hibru 9:6-14) N’ịgbaso iwu nke Onyeisi Nchụàjà ahụ nke eluigwe, bụ́ Jisọs Kraịst, anyị na-eme Ememe Ncheta ọnwụ ya dị ka nanị ememe dị mkpa nke ndị Kraịst na-eme. (Luk 22:19, 20) Ọ̀ bụ na anyị adịghị enwe “obi ụtọ na ọṅụ” mgbe anyị na-ezukọta kwa afọ maka ememe ahụ?

15 N’afọ gara aga, 13,147,201 zukọtara maka ime Ememe Ncheta ahụ, ihe ji 858,284 karịa ka ọ dị na 1994. Lee aha ìgwè mmadụ nke ahụ bụ! Jiri uche see onyinyo ịṅụrị ọṅụ dị na 78,620 ọgbakọ Ndịàmà Jehova ka ọnụ ọgụgụ dị ukwuu a na-ahụtụbeghị na-enubata n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ha maka ememe ahụ. N’ezie, a kpaliri ndị nile bịaranụ ‘ịhụ eziokwu na udo n’anya’ ka ha na-echeta ọnwụ nke Onye ahụ bụ́ “ụzọ, na eziokwu, na ndụ” bụ́ onye na-achị ugbu a dị ka “Onyeisi Udo” dị ukwuu nke Jehova! (Jọn 14:6; Aịsaịa 9:6) Ememe ahụ nwere ihe pụrụ iche ọ pụtara nye ndị nile mere ya n’ala ndị ọgba aghara na agha kpaworo aka ọjọọ. Ụfọdụ n’ime ụmụnna anyị nwetara ihe ụjọ ndị a na-apụghị iji ọnụ kọọ na 1995. Ma, ‘udo nke Chineke nke kachasị uche nile chekwara obi na echiche uche ha nche n’ime Kraịst Jisọs.’—Ndị Filipaị 4:7.

‘Ka Anyị Mee Ka Ihu Jehova Dajụọ’

16, 17. Olee otú ndị nke mba nile pụrụ isi ‘mee ka ihu Jehova dajụọ’?

16 Otú ọ dị, olee ebe ọtụtụ nde mmadụ ahụ bịara Ememe Ncheta ahụ si bịa? Nkwupụta okwu nke itoolu nke Jehova na-akọwa, sị: “Otú a ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị: Ọ ga-erukwa ọzọ na ndị dị iche iche na ndị bi n’ọtụtụ obodo ga-abịa: ndị bi n’otu obodo ga-ejekwurukwa obodo ọzọ, sị, Ka anyị jisie ike jee ime ka ihu Jehova dajụọ, na ịchọ Jehova nke usuu nile nke ndị agha: m ga-eje, ọbụna mụ onwe m. Ee, ọtụtụ ndị dị iche iche na mba dị iche iche dị ike ga-abịa ịchọ Jehova nke usuu nile nke ndị agha n’ime Jerusalem, na ime ka ihu Jehova dajụọ.”—Zekaraịa 8:20-22.

17 Ndị bịara Ememe Ncheta ahụ chọrọ “ịchọ Jehova nke usuu nile nke ndị agha.” Ọtụtụ n’ime ndị a bụ ndị ohu ya raara onwe ha nye, e mere baptism. Ọtụtụ nde ndị ọzọ bịaranụ erubeghị n’ọnọdụ ahụ. N’ala ụfọdụ, ndị bịara Ememe Ncheta ji okpukpu anọ ma ọ bụ ise karịa ọnụ ọgụgụ nke ndị nkwusa Alaeze. Ọtụtụ mmadụ a nwere mmasị chọrọ enyemaka iji nọgide na-enwe ọganihu. Ka anyị kụziere ha inwe obi ụtọ n’ihe ọmụma bụ́ na Jisọs nwụrụ maka mmehie nile anyị, ọ na-achịkwa achị ugbu a n’Alaeze Chineke. (1 Ndị Kọrint 5:7, 8; Mkpughe 11:15) Ka anyị gbaakwa ha ume ịrara onwe ha nye Jehova Chineke na ido onwe ha n’okpuru Eze ya ọ họpụtara. N’ụzọ dị otú a ha ‘ga-eme ka ihu Jehova dajụọ.’—Abụ Ọma 116:18, 19; Ndị Filipaị 2:12, 13.

‘Ndị Ikom Iri Site n’Asụsụ Nile nke Mba Nile’

18, 19. (a) Ná mmezu nke Zekaraịa 8:23, ònye taa bụ “onye Juu”? (b) Olee ndị taa bụ “ndị ikom iri” ndị ‘na-ejide ọnụ ọnụ ala uwe nwoke bụ onye Juu’?

18 Na nke ikpeazụ ya n’isi nke asatọ nke Zekaraịa, anyị na-agụ, sị: “Otú a ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị.” Gịnị bụ nkwupụta okwu ikpeazụ nke Jehova? “Na mgbe ahụ ka ndị ikom iri ga-esi n’asụsụ nile nke mba nile jide, ọbụna ijide ọnụ ọnụ ala uwe nwoke bụ onye Juu, sị, Anyị na unu ga-ayịkọ jee, n’ihi na anyị anụwo na Chineke nọnyeere unu.” (Zekaraịa 8:23) N’ụbọchị Zekaraịa, ndị Israel anụ ahụ bụ mba Chineke họọrọ. Otú ọ dị, na narị afọ mbụ, Israel jụrụ Mesaịa Jehova. N’ihi ya, Chineke anyị họọrọ “onye Juu”—Israel ọhụrụ—dị ka ndị ya pụrụ iche, “Israel nke Chineke” nke ihe mejupụtara ya bụ ndị Juu ime mmụọ. (Ndị Galetia 6:16; Jọn 1:11; Ndị Rom 2:28, 29) Ọnụ ọgụgụ ndị a n’ozuzu ha gaje ịbụ 144,000, ndị e si n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ họpụta iso Jisọs chịa achịa n’Alaeze eluigwe ya.—Mkpughe 14:1, 4.

19 Ihe ka ukwuu n’ime 144,000 ndị a anwụọlarị n’ikwesị ntụkwasị obi, ha agawokwa ná nkwụghachi eluigwe ha. (1 Ndị Kọrint 15:51, 52; Mkpughe 6:9-11) Ole na ole ka fọdụrụ n’ụwa, ndị a na-aṅụrịkwa ọṅụ ịhụ na “ndị ikom iri” ahụ ndị họọrọ isonyere “onye Juu” ahụ bụ n’ezie “oké ìgwè mmadụ . . . ndị si ná mba nile ọ bụla, na ebo nile, na ndị nile, na asụsụ nile, pụta.”—Mkpughe 7:9; Aịsaịa 2:2, 3; 60:4-10, 22.

20, 21. Ka ọgwụgwụ ụwa a na-abịawanye nso, olee otú anyị na Jehova pụrụ isi nọgide na-adị n’udo?

20 Ka ọgwụgwụ ụwa a na-abịawanye nso n’ụzọ a na-apụghị izere ezere, Krisendọm yiri Jerusalem n’ụbọchị Jeremaịa: “Anyị lere anya udo, ma ọ dịghị ezi ihe bịara; anyị lere anya mgbe ọgwụgwọ, ma, lee, oké egwu!” (Jeremaịa 14:19) Oké egwu ahụ ga-eru ọ̀tụ̀tụ̀ ya kasị elu mgbe mba dị iche iche ga-atụgharịkwuru okpukpe ụgha ma jiri ike weta ya ná njedebe. Ntakịrị oge mgbe nke ahụ gasịrị, mba nile n’onwe ha ga-enweta mbibi n’agha ikpeazụ nke Chineke, bụ́ Amagedọn. (Matiu 24:29, 30; Mkpughe 16:14, 16; 17:16-18; 19:11-21) Lee aha oge ọgba aghara nke ahụ ga-abụ!

21 Jehova ga-echebe ndị hụrụ eziokwu n’anya ma na-azụlite “mkpụrụ udo” gabiga ihe ahụ nile. (Zekaraịa 8:12; Zefanaịa 2:3) Ya mere, ka anyị nọgide ná nchebe n’ime ala nke ndị ya, jiri ịnụ ọkụ n’obi na-eto ya n’ihu ọha ma na-enyere ọtụtụ ndị ruo n’ókè o kwere mee aka “ime ka ihu Jehova dajụọ.” Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, anyị ga-enwe udo Jehova mgbe nile. Ee, “Jehova ga-enye ndị Ya ike; Jehova ga-eji udo gọzie ndị Ya.”—Abụ Ọma 29:11.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

◻ Olee otú ndị Chineke si mee ‘ka aka ha dị ike’ n’ụbọchị Zekaraịa? Taa?

◻ Olee otú anyị si emeghachi omume ná mkpagbu, ịkpọasị, na enweghị mmasị?

◻ Gịnị ka anyị ‘ikwu eziokwu onye ọ bụla ọ gwa ibe ya’ gụnyere?

◻ Olee otú mmadụ pụrụ isi ‘mee ka ihu Jehova dajụọ’?

◻ Gịnị bụ oké ihe na-akpata ịṅụrị ọṅụ nke a na-ahụ ná mmezu nke Zekaraịa 8:23?

[Foto dị na peeji nke 18]

N’afọ gara aga, Ndịàmà Jehova tinyere 1,150,353,444 hour na-agwa ndị mmadụ okwu banyere Alaeze Chineke

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya