Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 4/15 p. 20-25
  • Ụbọchị ahụ nke “Na-ere Dị Ka Ite Ọkụ Ukwu”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụbọchị ahụ nke “Na-ere Dị Ka Ite Ọkụ Ukwu”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Anyanwụ” Awaa
  • Usoro Ihe Omume Nkụzi Dị Ukwuu
  • Ònye Ga-alanahụ Ụbọchị Jehova?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Malakaị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Ụbọchi ahụ Dị Egwu nke Jehova Dị Nso
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Ị̀ Ga-ekwesị Ntụkwasị Obi Dị Ka Elaịja?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 4/15 p. 20-25

Ụbọchị ahụ nke “Na-ere Dị Ka Ite Ọkụ Ukwu”

“Lee, ụbọchị ahụ na-abịa, ọ na-ere dị ka ite ọkụ ukwu.” —MALAKAỊ 4:1.

1. Ajụjụ ndị dị aṅaa na-ebilite banyere Malakaị 4:1?

N’IME ụbọchị ikpeazụ ndị a, obi ụtọ na-adịrị ndị Jehova họọrọ idebanye aha ha n’akwụkwọ ncheta ya. Ma gịnị banyere ndị na-erughị eru maka ihe ùgwù ahụ? Ma hà bụ ndị ọchịchị ma ọ bụ ndị mmadụ nkịtị, olee otú ọ ga-adịrị ha ma ha mesoo ndị na-akpọsa Alaeze Chineke na ozi ha ná nlelị? Malakaị na-ekwu banyere ụbọchị nke ime mpịazi. N’isi 4, amaokwu nke 1, anyị na-agụ, sị: “N’ihi na, lee, ụbọchị ahụ na-abịa, ọ na-ere dị ka ite ọkụ ukwu; ndị nganga nile na onye ọ bụla nke na-eme ihe mmebi iwu ga-abụkwa ahịhịa ọka: ụbọchị ahụ nke na-abịa ga-erechapụ ha, ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị, ọ gaghị ahapụkwara ha mkpọrọgwụ ma ọ bụ alaka.”

2. Nkọwa doro anya dị aṅaa nke ikpe Jehova ka Ezikiel nyere?

2 Ndị amụma ndị ọzọ jikwa ikpe Jehova ga-ekpe mba nile tụnyere oké okpomọkụ nke ite ọkụ ukwu. Lee ka Ezikiel 22:19-22 si zie ezi metụta Chineke ikpe òtù dị iche iche nke Krisendọm si n’ezi ofufe dapụ ikpe! Ọ na-agụ, sị: “Nke a ka Onyenwe anyị Jehova ji sị otú a: N’ihi na unu nile aghọwo afụrụ uzu, n’ihi nke a, lee, M gaje ịchịkọta unu . . . Dị ka e si achịkọta ọlaọcha na ọla na ígwè na opu na gbamgbam n’etiti oké ọkụ, ịfụnwu ya ọkụ, ịgbaze ya; otú a ka M ga-achịkọta unu n’iwe m na n’ọnụma m, tọgbọ unu n’ebe ahụ, gbazee unu. Ee, M ga-akpọkọta unu, were ọkụ, nke nrubiga ókè nke iwe m fụkwasị unu, unu ewee gbazee n’etiti ya. Dị ka e si agbaze ọlaọcha n’etiti oké ọkụ, otú a ka a ga-agbaze unu n’etiti ya; unu ewee mara na Mụ onwe m, bụ́ Jehova, awụkwasịwo unu ọnụma m.”

3, 4. (a) Nzọrọ ihu abụọ dị aṅaa ka ndị ụkọchukwu meworo? (b) Gịnị bụ ihe ndekọ rụrụ arụ nke okpukpe?

3 Ihe atụ dị ike n’ezie! Ndị ụkọchukwu ndị chọworo ịghara iji aha Jehova eme ihe, ọbụnadị na-ekwutọ aha nsọ ahụ, aghaghị iche ụbọchị ahụ nke mpịazi ihu. N’ụzọ nganga, ha na-azọrọ na ha na ndị ọchịchị ha so jikọọ aka ga-eguzobe Alaeze Chineke n’elu ụwa ma ọ bụ ma ọ dịghị ihe ọzọ mee ụwa ebe kwesịrị ekwesị maka Alaeze ahụ ịbịa.

4 Krisendọm si n’ezi ofufe dapụ na ndị isi ndọrọ ndọrọ ọchịchị ejikọwo aka n’ịlụ agha ndị dị egwu. E dekọwo akụkọ ihe mere eme nke Agha Ntụte dị iche iche nke mgbe ụwa na-emepechabeghị anya, ntọghata n’ike nke Njụta Okwukwe Spain, Agha Iri Afọ Atọ ahụ nke gburu ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ndị Europe na narị afọ nke 17, na Agha Obodo Spain nke afọ ndị 1930, ndị a lụrụ iji chebe Spain maka okpukpe Katọlik. Nkwafu ọbara kasị ukwuu weere ọnọdụ n’agha ụwa abụọ ndị ahụ nke narị afọ anyị, mgbe ndị Katọlik na ndị Protestant banyere ná mgburịta ndị kwere ekwe ibe ha na ndị nke okpukpe ndị ọzọ n’akpaghị ókè. N’isi nso a karị, e nwewo ọgụ ndị e gburu mmadụ na ha n’etiti ndị Katọlik na ndị Protestant na Ireland, n’etiti òtù okpukpe ndị dị n’India, na n’etiti òtù okpukpe ndị dị n’ebe bụbu Yugoslavia. Akụkọ ihe mere eme nile nke okpukpe jupụtakwara ná mwụfu ọbara nke ọtụtụ puku ndị àmà na-ekwesị ntụkwasị obi nke Jehova e gburu n’ihi okwukwe ha.—Mkpughe 6:9, 10.

5. Ikpe dị aṅaa na-echere okpukpe ụgha?

5 Anyị pụrụ nnọọ ịghọta ikpe ziri ezi nke mbibi na-eru nso Jehova ga-ewetara Babilọn Ukwu ahụ, alaeze ụwa nke okpukpe ụgha, ya na ndị na-akwado ya. A kọwara mbibi nke a ná Mkpughe 18:21, 24, sị: “Otu mmụọ ozi nke dị ike wee buru nkume, dị ka oké nkume igwe nri, wee tụba ya n’ime oké osimiri, sị, Otú a ka a ga-atụda Babilọn, bụ́ obodo ukwu ahụ, n’oké ọdịda, a gaghị ahụkwa ya ọzọ ma ọlị. Ọ bụkwa n’ime ya ka a hụrụ ọbara nke ndị amụma na nke ndị nsọ, na nke ndị nile e gbuworo n’elu ụwa.”

6. (a) Olè ndị ga-abụrịrị ahịhịa ọka, n’ihi gịnịkwa? (b) Nkwa dị aṅaa ka e nwere maka ndị na-atụ egwu Jehova?

6 Mgbe oge na-aga, ndị iro nile nke ezi omume, tinyere ndị na-akwado ha, “ga-abụkwa ahịhịa ọka.” Ụbọchị Jehova ga-ere ọkụ n’etiti ha dị ka ite ọkụ ukwu. “Ọ gaghị ahapụkwara ha mkpọrọgwụ ma ọ bụ alaka.” N’ụbọchị ahụ nke mpịazi, a ga-emeso ụmụaka, ma ọ bụ alaka, ihe n’ụzọ ezi ikpe dị ka ụzọ Jehova si tụọ mkpọrọgwụ ha, bụ́ ndị mụrụ ha, ndị lekọtara ụmụaka ndị a anya, n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀. Ndị nne na nna na-emebi iwu agaghị enwe ụmụ ndị ga-anọchi ha iji gaa n’ihu n’ụzọ ọjọọ nile ha. Ma ndị nwere okwukwe ná nkwa nile nke Alaeze Chineke agaghị eme mkpatụ. Ndị Hibru 12:28, 29 ji n’ihi ya na-agba ume, sị: “Ka anyị nwee amara, ka anyị wee site na ya were egwu Chineke na ụjọ kpee ekpere n’ụzọ nke ga-atọ Chineke ụtọ: n’ihi na Chineke anyị bụ ọkụ na-erechapụ.”

Jehova Ọ̀ Bụ Chineke Obi Ọjọọ?

7. Olee otú ịhụnanya Jehova si bata n’ikpe ya?

7 Nke a ọ̀ pụtara na Jehova bụ Chineke obi ọjọọ, nke na-abọ ọ́bọ̀? Ọ dịghị ma ọlị! Na 1 Jọn 4:8, onyeozi ahụ depụtara otu eziokwu gbara ọkpụrụkpụ: “Chineke bụ ịhụnanya.” Mgbe ahụ, n’amaokwu nke 16 ọ gbakwụnyere okwu imesi ihe ike, na-asị: “Chineke bụ ịhụnanya, onye na-anọgidekwa n’ịhụnanya, n’ime Chineke ka ọ na-anọgide, Chineke na-anọgidekwa n’ime ya.” Ọ bụ n’ihi ịhụnanya ya maka ihe a kpọrọ mmadụ ka Jehova ji zube ime ka ụwa nke a dị ọcha pụọ ná mmebi iwu nile. Chineke anyị na-ahụ n’anya, dịkwa obi ebere na-ekwu, sị: “Mụ onwe m na-adị ndụ, . . . ọnwụ nke onye na-emebi iwu adịghị atọ m ụtọ ma ọlị; kama ọ na-atọ m ụtọ mgbe onye na-emebi iwu si n’ụzọ ya chigharịa, wee dị ndụ: chigharịanụ, sinụ n’ụzọ ọjọọ nile unu chigharịa; ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka unu ga-anwụ?”—Ezikiel 33:11.

8. Olee otú Jọn si mesie ịhụnanya ike, ma gosikwa onwe ya ịbụ Nwa Égbè Eluigwe?

8 Jọn na-ezo aka n’a·gaʹpe, ịhụnanya ụkpụrụ na-achị, ọtụtụ ugbo karịa ndị dere Oziọma atọ ndị ọzọ ahụ ma a chịkọta ha n’otu, ma na Mak 3:17, Jọn n’onwe ya ka a kọwara dị ka ‘Nwa Égbè Eluigwe.’ Ọ bụ ná nduzi nke mmụọ nsọ Jehova ka Nwa Égbè Eluigwe a ji dee ozi nile nke apọkalips nke akwụkwọ ikpeazụ nke Bible, Mkpughe, nke gosipụtara Jehova dị ka Chineke nke na-emezu ihe e kpere n’ikpe. Akwụkwọ nke a jupụtara n’okwu ọmụma ikpe, ndị dị ka “ebe nzọcha mkpụrụ vine ahụ, nke dị ukwuu, bụ́ nke ọnụma Chineke,” “ọkwa asaa ahụ nke ọnụma Chineke,” na “iwe Chineke Onye pụrụ ime ihe nile.”—Mkpughe 14:19; 16:1; 19:15.

9. Ihe ndị dị aṅaa ka Jisọs kwuru banyere ikpe Jehova, oleekwa ụzọ e si mezuo amụma ya dị iche iche?

9 Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, onye bụ “onyinyo nke Chineke ahụ Nke a na-apụghị ịhụ anya,” ji atụghị egwu kpọsaa ikpe Jehova mgbe ọ nọ n’ebe a n’elu ala. (Ndị Kọlọsi 1:15) Dị ka ihe atụ, e nwere ahụhụ asaa nke Matiu isi 23 ndị ọ kpọsara megide ndị okpukpe ihu abụọ nke ụbọchị ya n’ezoghị ọnụ. O mechiri ọmụma ikpe ahụ n’okwu ndị a: “Jerusalem, Jerusalem, nke na-egbu ndị amụma, nke na-ewerekwa nkume atụ ndị e zitewooro ya! ọtụtụ mgbe olè ka M chọrọ ịchịkọ ụmụ gị, ọbụna dị ka nnekwu ọkụkọ na-achịkọ ụmụ ya n’okpuru nkù ya abụọ, ma unu achọghị! Lee, a na-ahapụrụ unu ụlọ unu ka ọ tọgbọrọ n’efu.” Iri afọ atọ na asaa n’ihu, ndị agha Rom n’okpuru Ọchịagha Titus mezuru ihe e kpere n’ikpe. Ọ bụ ụbọchị dị egwu, na-aghọ ihe amụma nke ihe ga-abụ ụbọchị kasị dị egwu n’ahụmahụ nile nke ụmụ mmadụ—ụbọchị Jehova, nke ga-etiwapụ n’isi nso.

“Anyanwụ” Awaa

10. Olee otú “anyanwụ nke ezi omume” si ewetara ndị Chineke ọṅụ?

10 Jehova na-eme ka a mara na a ga-enwe ndị nlanarị nke ụbọchị ya. Ọ na-ezo aka n’ebe ndị a nọ na Malakaị 4:2, na-asị: “Unu ndị na-atụ egwu aha m ka anyanwụ nke ezi omume ga-awara, ọgwụgwọ dịkwa ná nku ya.” Anyanwụ nke ezi omume ahụ abụghị onye ọzọ ma ọ́ bụghị Jisọs Kraịst n’onwe ya. Ọ bụ ya bụ “Ìhè nke ụwa” n’ụzọ ime mmụọ. (Jọn 8:12) Olee otú o si na-awa? Ọ na-ebili na-enwe ọgwụgwọ ná nku ya—nke mbụ ọgwụgwọ ime mmụọ, bụ́ nke anyị pụrụ inwe ahụmahụ ya ọbụna taa, e mesịakwa, n’ime ụwa ọhụrụ na-abịanụ, ọgwụgwọ anụ ahụ nke ndị si ná mba nile pụta. (Matiu 4:23; Mkpughe 22:1, 2) N’ụzọ ihe atụ, dị ka Malakaị kwuru, ndị a gwọrọ agwọ “ga-apụkwa, wụlie elu dị ka ụmụ ehi nke ụlọ ebe a na-eme ka anụ maa abụba” bụ́ nke a ka meghepụụrụ ogige. Lee aha ọṅụ nke ndị e si n’ọnwụ kpọlite bụ́ ndị a kpọlitere n’olileanya nke inweta izu okè nke mmadụ, ga-anụkwa ụtọ ya!

11, 12. (a) Gịnị na-echere ndị na-emebi iwu? (b) Olee otú ndị Chineke si ‘azọda ndị na-emebi iwu n’ala’?

11 Otú ọ dị, olee maka ndị na-emebi iwu? Na Malakaị 4:3, anyị na-agụ, sị: “Unu ga-azọdakwa ndị na-emebi iwu; n’ihi na ha ga-abụ ntụ n’okpuru ọbụ ụkwụ unu n’ụbọchị ahụ mgbe M ga-eme ihe, ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị.” Ka ọ na-echedo ndị na-ahụ ya n’anya, Chineke anyị Na-ebu Agha ga-azachapụworị ndị iro nile na-eme ka a maa jijiji, na-ekpochapụ ha. A ga-akpọchiworị Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya.—Abụ Ọma 145:20; Mkpughe 20:1-3.

12 Ndị Chineke enweghị òkè ọ bụla n’ibibi ndị na-emebi iwu. Mgbe ahụ, olee otú ha si ‘azọda ndị na-emebi iwu’? Nke a ka ha na-eme n’ụzọ ihe atụ site n’ikere òkè n’otu ememe mmeri ukwu. Ọpụpụ 15:1-21 kọwara ụdị ememe ahụ. O sochiri mbibi nke Fero na usuu ndị agha ya n’Osimiri Uhie. Ná mmezu nke Aịsaịa 25:3-9, mbipụ nke “ndị na-eme ka mmadụ maa jijiji” bụ nke oké oriri mmeri nke e jikọtara ya na nkwa Chineke ga-esochi: “O lodawo ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi; Onyenwe anyị Jehova ga-ehichapụkwa anya mmiri n’ihu nile; ịta ụta nke ndị Ya ka Ọ ga-ewezụgakwa n’elu ụwa nile: n’ihi na Jehova ekwuwo ya. A ga-asịkwa n’ụbọchị ahụ, Lee, Chineke anyị ka Nke a bụ . . . Nke a bụ Jehova; anyị elewo anya Ya, ka anyị tegharịa egwú ọṅụ ṅụrịakwa ná nzọpụta Ya.” E nwere n’ime ọṅụ nke a, ọ bụghị mmụọ ịbọ ọ́bọ̀ ma ọ bụ obi ụtọ arụrụala, kama egwú ọṅụ n’ịhụ ka e doro aha Jehova nsọ meekwa ka ụwa dị ọcha maka ebe obibi dị n’udo nke ihe a kpọrọ mmadụ dị n’otu.

Usoro Ihe Omume Nkụzi Dị Ukwuu

13. Nkụzi dị aṅaa ga-ewere ọnọdụ n’ime “ụwa ọhụrụ” ahụ?

13 Na Malakaị 4:4, a dụrụ ndị Juu ọdụ ‘icheta iwu Mosis.’ Otú ahụ taa ọ dị anyị mkpa ịgbaso “iwu Kraịst,” dị ka a kpọtụrụ uche ná Ndị Galetia 6:2. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na a ga-enyekwu ndị lanarịrị Amagedọn ntụziaka ndị ọzọ dabeere na nke a, a pụkwara nnọọ ide ndị a “n’akwụkwọ ahụ dị iche iche” nke Mkpughe 20:12, ndị a ga-asaghe n’oge mbilite n’ọnwụ. Lee nnọọ ụbọchị ukwu nke ahụ ga-abụ ka a na-ezi ndị ahụ e si ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite ịnakwere ụzọ ndụ nke “ụwa ọhụrụ” ahụ!—Mkpughe 21:1

14, 15. (a) Olee otú e si amata Elaịja nke oge a? (b) Ibu ọrụ dị aṅaa ka òtù Elaịja ahụ na-arụzu?

14 Nke ahụ ga-abụ mgbasapụwanye nke ọrụ nkụzi ahụ Jehova zoro aka na ya, dị ka e dekọrọ na Malakaị 4:5: “Lee, Mụ onwe m na-ezitere unu Elaịja, bụ́ onye amụma, tupu oké ụbọchị ahụ dị egwu nke Jehova abịa.” Ònye bụ Elaịja ahụ nke oge a? Dị ka e gosiri na Matiu 16:27, 28, n’izo aka ‘n’ọbịbịa ya n’alaeze ya,’ Jisọs sịrị: “Nwa nke mmadụ gaje ịbịa n’ebube nke Nna Ya, Ya na ndị mmụọ ozi Ya; mgbe ahụ ka Ọ ga-enyeghachikwa onye ọ bụla dị ka omume ya si dị.” Mgbe ụbọchị isii gasịrị, ka ya na Pita, Jemes, na Jọn nọ n’elu otu ugwu, “O wee nwoghaa n’ihu ha: ihu Ya wee na-enwupụ dị ka anyanwụ, uwe Ya nile wee na-acha ụcha dị ka ìhè.” Ọ̀ bụ nanị ya nọ n’ọhụụ a? Ee e, n’ihi na “lee, e mee ka ha hụ Mosis na Elaịja ka ha na Ya na-ekwurịta okwu.”—Matiu 17:2, 3.

15 Gịnị ka nke a pụrụ ịpụta? Ọ na-atụ Jisọs aka dị ka Mosis Ka Ukwuu e buru amụma ya n’oge ya nke ịbịa maka ikpe ikpe. (Deuterọnọmi 18:18, 19; Ọrụ 3:19-23) Mgbe ahụ a ga-ejikọta ya na Elaịja nke oge a iji rụzuo otu ọrụ dị oké mkpa, bụ́ ikwusa ozi ọma nke Alaeze n’elu ụwa dum tupu ụbọchị ahụ dị ukwuu ma dịkwa egwu nke Jehova etiwapụ. N’ịkọwa ọrụ nke “Elaịja” nke a, Malakaị 4:6 na-ekwu, sị: “Ọ ga-emekwa ka obi ndị bụ nna chigharịkwute ụmụ ha, ka obi ụmụ chigharịkwutekwa ndị bụ nna ha; ka M wee ghara ịbịa were iwezụga ka e bibie ya tigbuo ụwa.” Otú a a kọwara “Elaịja” dị ka òtù ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi nke nwekwara uche nke ndị Kraịst e tere mmanụ n’elu ụwa, onye Onyenwenụ ahụ, bụ́ Jisọs, nyefeworo ihe nile O nwere n’aka ilekọta. Nke a gụnyere inye ezinụlọ nke okwukwe ihe ime mmụọ dị mkpa “e ji azụ ha n’oge ya.”—Matiu 24:45, 46.

16. Ihe obi ụtọ ndị dị aṅaa ka ọrụ òtù Elaịja ahụ rụpụtaworo?

16 Gburugburu ụwa taa, anyị pụrụ ịhụ ihe obi ụtọ na-esi n’usoro ihe omume nke ọzụzụ ahụ apụta. Magazin Ụlọ Nche, nke a na-ebipụta 16,100,000 ná mbipụta ọ bụla n’ime 120 asụsụ, bụ́ nke 97 n’ime ndị a ka a na-ebipụtakọ ọnụ, na-eji “ozi ọma nke a nke alaeze” na-awụkwasị ụwa dị ka idei mmiri. (Matiu 24:14) Akwụkwọ ndị ọzọ n’ọtụtụ asụsụ ka e ji eme ihe n’akụkụ dị iche iche nke ọrụ nkwusa na nkụzi nke Ndịàmà Jehova. Òtù Elaịja ahụ, ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi nke nwekwara uche, mụ anya inye ‘ndị nile maara mkpa ime mmụọ ha’ ihe n’ụba. (Matiu 5:3, NW) Ọzọkwa, ndị nabatara olileanya Alaeze ahụ ma rụọ ọrụ maka ya ka e jikọtara n’ịdị n’otu dị ebube nke zuru ụwa ọnụ. Ọ gụnyere oké ìgwè mmadụ “si ná mba nile ọ bụla, na ebo nile, na ndị nile, na asụsụ nile, pụta.” (Mkpughe 7:9) Mgbe a rụzuworo ọrụ a ruo ókè Jehova chọrọ ya, mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa n’ụbọchị ya dị ukwuu dịkwa egwu.

17. Olee mgbe ụbọchị ahụ dị egwu nke Jehova ga-etiwapụ?

17 Olee nnọọ mgbe ụbọchị ahụ dị egwu ga-abịakwasị anyị? Pọl onyeozi na-aza: “Dị ka onye ohi na-abịa n’abalị, otú a ka ụbọchị nke Onyenwe anyị na-abịa. Mgbe ha na-asị [ma eleghị anya n’ụzọ pụrụ iche], Udo na ntụkwasị obi dị, mgbe ahụ na mberede ka mbibi na-abịakwasị ha, dị ka ime na-eme nwanyị nke dị ime; ha agaghị agbanarịkwa ya ma ọlị.”—1 Ndị Tesalọnaịka 5:2, 3.

18, 19. (a) Olee otú e si kpọsaa “udo na ntụkwasị obi”? (b) Olee mgbe ndị Jehova ga-enweta ahụ efe?

18 Olè ndị bụ “ha” n’amụma nke a? Ha bụ ndị ndú ndọrọ ndọrọ ọchịchị ndị na-azọrọ na ha pụrụ iwulite usoro ụwa ọhụrụ dị n’otu site n’akụkụ ndị kewasịrị ekewasị nke ụwa a na-eme ihe ike. Oké ihe ndị ha mepụtaworo, Njikọ Mba Nile na Mba Ndị Dị n’Otu, adawo ada na nke a. Dị ka onye amụma Jehova buru n’amụma, ọbụna ugbu a ha ‘na-asị, Udo, Udo, mgbe udo na-adịghị.’—Jeremaịa 6:14; 8:11; 14:13-16.

19 Ka ọ dị ugbu a, ndị Jehova ga na-atachi obi ná nrụgide na mkpagbu nile nke ụwa nke a na-adịghị asọpụrụ Chineke. Ma n’isi nso, dị ka e kwuru ná 2 Ndị Tesalọnaịka 1:7, 8, ha ga-achọta ahụ efe “n’ime mkpughe nke Onyenwe anyị Jisọs site n’eluigwe, Ya na ndị mmụọ ozi nke ike Ya, n’ime ọkụ na-ere ere, na-abọ ọ́bọ̀ n’ahụ ndị na-amataghị Chineke, ha na ndị na-aṅaghị ntị ozi ọma nke Onyenwe anyị Jisọs.”

20. (a) Gịnị ka Zefanaịa na Habakuk buru n’amụma banyere ụbọchị ahụ nke “na-ere dị ka ite ọkụ ukwu”? (b) Ndụmọdụ na agbamume dị aṅaa ka amụma ndị a na-enye?

20 Olee otú oge ahụ dịruru ná nso? Ọtụtụ n’ime anyị anọwo na-echere ruo ogologo oge. Ka ọ dị ugbu a, ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ndị dị umeala n’obi bụ́ ndị ga-alanarị na-aza òkù ahụ dị na Zefanaịa 2:2, 3: “Chọọnụ Jehova . . . chọọnụ ezi omume, chọọnụ umeala n’obi: eleghị anya a ga-ezobe unu n’ụbọchị iwe Jehova.” Mgbe ahụ, Zefanaịa 3:8 nwere okwu agbamume nke a: “N’ihi nke a cherenụ m, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta), cherenụ ụbọchị mgbe M ga-ebili ọtọ ịkwata ihe: n’ihi na ikpe m bụ ime ka mba nile zukọta, ka M wee chịkọta alaeze nile, ịwụsa ha oké iwe m, bụ́ ọnụma nile nke iwe m; n’ihi na a ga-eji ọkụ nke ekworo m ripịa ụwa nke a nile.” Ọgwụgwụ ahụ dị nso! Jehova maara ụbọchị na hour ahụ, ọ gaghịkwa agbanwe usoro ọgụgụ oge ya. Ka anyị jiri ndidi tachie obi. “N’ihi na ọhụụ ahụ na-adịru mgbe a kara aka, ọ na-ekusikwara ọgwụgwụ ya ume ike, ọ gaghị ekwukwa okwu ụgha: ọ bụrụ na ọ laa azụ, chere ya; n’ihi na ọ ghaghị ịbịa, ọ gaghị anọ ọdụ.” (Habakuk 2:3) Ụbọchị ahụ dị egwu nke Jehova ji oké ọsọ na-erute nso. Cheta, ụbọchị ahụ agaghị anọ ọdụ!

Ná Ntụleghachi:

◻ Olee otú ihe ga-adịrị ndị na-achị achị na ndị a na-achị n’ụbọchị ahụ dị egwu nke Jehova?

◻ Ụdị Chineke dị aṅaa ka Jehova bụ?

◻ Ụdị nkụzi dị aṅaa ka a kọwara maka ndị Chineke?

◻ Olee otú ndị amụma Chineke si agba anyị ume n’iburu n’uche ịdị nso nke mgbe ọgwụgwụ?

[Foto dị na peeji nke 21]

N’oge Njụta Okwukwe Spain a manyere ọtụtụ ịtọghata gaa n’okpukpe Katọlik

[Ebe E Si Nweta Foto]

The Complete Encyclopedia of Illustration/J. G. Heck

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya