-
“Ndị Ezi Omume Ga-enwu Gbaa Dị Ka Anyanwụ”Ụlọ Nche—2010 | Mach 15
-
-
3. Kọwaa nsogbu nwoke a a kọrọ akụkọ ya n’ihe atụ a nwere nakwa ihe o kpebiri ime banyere nsogbu ya.
3 Jizọs mere ihe atụ, sị: “Alaeze eluigwe dị ka nwoke ghara ezi mkpụrụ n’ubi ya. Mgbe ndị mmadụ nọ na-ehi ụra, onye iro ya bịara kụọ ata n’etiti ọka wit ahụ, ma pụọ. Mgbe akwụkwọ ya pulitere wee mịa mkpụrụ, ata ndị ahụ pulitekwara. Ya mere, ndị ohu nke onyeisi ezinụlọ ahụ bịara sị ya, ‘Nna anyị ukwu, ọ́ bụghị ezi mkpụrụ ka ị ghara n’ubi gị? Oleezi otú o si nwee ata?’ O wee sị ha, ‘Ọ bụ onye iro nke bụ́ mmadụ mere ihe a.’ Ha wee sị ya, ‘Ị̀ chọrọ ka anyị gaa fopụsịa ha? O wee sị, ‘Ee e; ka ọ ghara ịbụ na mgbe unu na-efopụ ata ahụ, unu efopụkọta ha na ọka wit ahụ. Hapụnụ ha abụọ ka ha tokọọ ruo n’oge owuwe ihe ubi; n’oge owuwe ihe ubi, m ga-agwa ndị na-ewe ihe ubi, sị, Burunụ ụzọ chịkọta ata ahụ ma kee ha n’ùkwù n’ùkwù ka e suo ha ọkụ, e mesia, unu agaa chịkọta ọka wit ahụ chịba n’ụlọ nkwakọba ihe m.’”—Mat. 13:24-30.