-
“M Ga-eme Ka Unu Nwee Otu Obi”A Maliteghachila Ife Jehova Ezigbo Ofufe
-
-
11 N’ọtụtụ narị afọ Ndị Kraịst adịgboroja nọ na-akpa ike n’ụwa, e nwere ụfọdụ ezigbo Ndị Kraịst nọnụ, ndị bụ́ ọka wit Jizọs kwuru okwu ya n’ihe atụ ahụ. Ha mere ihe ndị Juu a dọọrọ n’agha mere, otú e kwuru n’Ezikiel 6:9. Ha chetara ezi Chineke. Ụfọdụ n’ime ha kpebisiri ike na ha agaghị ekweta ụgha Ndị Kraịst adịgboroja na-akụzi. E ji ha mere ihe ọchị, kpagbuokwa ha. Jehova ò bu n’obi ịhapụ ndị ya ka ha nọrọzie n’okpukpe ụgha? Mba. Jehova were iwe otú kwesịrị ekwesị, ruokwa oge kwesịrị ekwesị, otú o mere n’oge ndị Izrel. (Jere. 46:28) Jehova mekwara ka ndị ya nwee olileanya. Ka anyị laghachi n’akụkọ ndị Juu ahụ a dọọrọ n’agha laa Babịlọn n’oge ochie ma hụ otú Jehova si mee ka ha nwee olileanya na a ga-emecha hapụ ha ka ha laghachi n’obodo ha.
Babịlọn Ukwu ahụ kpagburu ezigbo Ndị Kraịst ruo ọtụtụ narị afọ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10, 11)
-