Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 6/1 p. 32
  • Oge Owuwe Ihe Ubi!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Oge Owuwe Ihe Ubi!
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 6/1 p. 32

Oge Owuwe Ihe Ubi!

N’IHI gịnị ka akụkọ ihe mere eme nke “Iso Ụzọ Kraịst” jiworo bụrụ nnọọ nke na-adịghị ka nke ndị Kraịst? Ọtụtụ ndị na-eche echiche na-ajụ ajụjụ a, ma Jisọs zara ya ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 2,000 afọ gara aga n’otu ilu. Ọ kọrọ banyere “mmadụ . . . ghara mkpụrụ ọma n’ubi ya.” Mgbe ahụ, “onye iro ya bịara wee ghaakwa ata n’etiti ọka.” Mgbe mkpụrụ ndị ahụ puru, ndị ọrụ hụrụ ata ndị ahụ wee chọọ ifopụ ha. Ma nwoke ahụ kwuru, sị: “Hapụnụ ha abụọ ka ha na-abakọta ụba ruo owuwe ihe ubi.” N’oge owuwe ihe ubi, a ga-ekewapụ ọka site n’ata ndị ahụ.​—⁠Matiu 13:​24-⁠30.

Jisọs, mgbe ọ na-akọwa ilu ahụ, kwuru na ya onwe ya bụ onye ahụ ghara “mkpụrụ ọma”​—⁠ezi ndị Kraịst. Onye iro ahụ bụ Setan, onye ghakwasịrị “ata”⁠—​na-eme ka ndị Kraịst ụgha gbebata n’ime ọgbakọ. Jisọs nyere ohere ka ezi ndị Kraịst na nke ụgha dịkọta​—⁠ma ọ bụ nanị ruo oge owuwe ihe ubi. Mgbe ahụ a ga-ekewa ha.​—⁠Matiu 24:​36-⁠44.

N’ihi ya, ọ bụghị ihe ijuanya mgbe anyị na-amụta na nzukọ dị iche iche nke “ndị Kraịst” n’ime ọtụtụ narị afọ elelịwo Chineke site n’ịnakwere ozizi dị iche iche nke ndị ọgọ mmụọ, na-eleghara omume rụrụ arụ anya, na-akwado agha mmeri dị iche iche, na-eduzikwa njụta okwukwe obi ọjọọ dị iche iche. Anyị na-amata na nke a mkpụrụ ọjọọ Setan kụrụ. Otú ọ dị, mgbe anyị gụrụ banyere ndị mmadụ tara ahụhụ n’ụlọ mkpọrọ ma ọ bụ nwụọ kama imebi ụkpụrụ Bible, anyị na-ahụ na e kpochapụghị mkpụrụ ọma.

Jisọs kwuru na owuwe ihe ubi ahụ bụ “ọgwụgwụ ihe nile.” Ebe ọ bụ na anyị na-ebi na mgbe ọgwụgwụ usoro ihe nile nke ụwa nke a, nke a aghaghị ịbụ oge owuwe ihe ubi! Ya mere ọ ghaghị ịbụ na nkewapụta ahụ ewerewo ọnọdụ n’etiti ezi ndị Kraịst na ndị ụgha. Taa, otu ndị aghaghị ịdị, ọ bụghị nanị ndị mmadụ dị n’ebe dị iche iche, ndị kwekọrọ ná nkọwa Jisọs kọwara ezi ndị Kraịst​—⁠ndị nọ n’okpuru Alaeze Chineke ma na-ekwusa ozi ọma banyere ya, ndị na-akwalite omume ọma nke dabeere na Bible ma jụ ozizi dị iche iche nke ndị ọgọ mmụọ iji nakwere eziokwu Bible, ndị na-eme ka aha Chineke pụta ìhè ma ghara ịbụ akụkụ nke ụwa.⁠—⁠Matiu 6:33; 24:14; Jọn 3:20; 8:32; 17:6, 16.

Anyị na-agwasi gị ike, ndị dị otú ahụ dị! Ị chọrọ ijere Chineke ozi n’ụzọ ọ na-anara? Mgbe ahụ chọpụta ndị a, sorokwa ha jeere Chineke ozi.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya