-
Ị Maghị Ebe Ọ Ga-eme nke Ọma!Ụlọ Nche—2008 | Julaị 15
-
-
Ihe Atụ nke Ihe Iko Achịcha Ahụ
9, 10. (a) Olee ihe Jizọs mere ka ọ pụta ìhè n’ihe atụ nke ihe iko achịcha ahụ? (b) Na Baịbụl, gịnị ka ihe iko achịcha na-anọchikarị anya ya, oleekwa ajụjụ anyị ga-atụle banyere ihe iko achịcha Jizọs kwuru okwu ya n’ihe atụ a?
9 Ọ bụghị mgbe niile ka mmadụ na-ahụ otú ihe si eto. Jizọs mere ka nke a pụta ìhè n’ihe atụ ya nke sochirinụ. Ọ sịrị: “Alaeze eluigwe dị ka ihe iko achịcha, nke nwaanyị weere tinye n’ime ntụ ọka nke juru arịa atọ buru ibu, ruo mgbe ntụ ọka ahụ dum koro eko.” (Mat. 13:33) Gịnị ka ihe iko achịcha ahụ na-anọchi anya ya, oleekwa ihe jikọrọ ya na uto nke Alaeze ahụ?
10 Na Baịbụl, ihe iko achịcha na-anọchikarị anya mmehie. Pọl onyeozi kọwara mmehie dị ka ihe iko achịcha mgbe ọ na-ekwu otú onye mmehie nwere ike isi metụta ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ dị na Kọrịnt oge ochie. (1 Kọr. 5:6-8) Ihe iko achịcha Jizọs kwuru okwu ya ebe a ọ̀ na-anọchi anya uto nke ihe na-adịghị mma?
11. Olee ihe e ji ihe iko achịcha eme n’Izrel oge ochie?
11 Tupu anyị azaa ajụjụ ahụ, ọ dị mkpa ka anyị buru ihe atọ dị mkpa n’uche. Nke mbụ, ọ bụ eziokwu na Jehova ekweghị ka e jiri ihe iko achịcha mee ihe n’oge a na-eme Ememme Ngabiga, e nwere oge ndị ọzọ ọ nabatara àjà ndị e tinyere ihe iko achịcha. A na-etinye ihe iko achịcha n’àjà udo e ji enye Jehova ekele, bụ́ nke onye wetara ihe e ji chụọ àjà a na-eji obi ya eweta ya iji nye Jehova ekele maka ọtụtụ ụzọ o si gọzie ya. Nri a na-ewetara ndị so rie ya obi ụtọ.—Lev. 7:11-15.
12. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’otú e si eji ihe atụ akọwa ihe na Baịbụl?
12 Nke abụọ, ọ bụ ezie na otu ihe nwere ike ịnọchi anya ihe na-adịghị mma n’Akwụkwọ Nsọ, e nwekwara ebe ndị ọzọ o nwere ike ịnọchi anya ihe dị mma. Dị ka ihe atụ, na 1 Pita 5:8, e ji Setan tụnyere ọdụm, na-akọwa otú o si dị obi ọjọọ ma nwee ike ịdọgbu mmadụ. Ma ná Mkpughe 5:5, e ji Jizọs tụnyere ọdụm—“ọdụm nke si n’ebo Juda.” N’ebe a, ọdụm nọchiri anya iji obi ike ekpe ikpe ziri ezi.
13. Gịnị ka ihe atụ Jizọs banyere ihe iko achịcha na-egosi banyere otú mmadụ si aghọ onye na-eso ụzọ ya?
13 Nke atọ, n’ihe atụ ahụ Jizọs nyere, o kwughị na ihe iko achịcha ahụ mebiri ntụ ọka ahụ niile, nke na o nweghịzi ihe a ga-eji ntụ ọka ahụ mee. Naanị ihe ọ nọ na-ekwu okwu ya bụ otú e si eme bred. Nwaanyị na-eme bred ezinụlọ ya ga-ata na-ama ụma etinye ihe na-eko achịcha na ya, ọ na-emekwa ka bred ya dị mma. Ihe iko achịcha ahụ na-ezo ná ntụ ọka e ji eme bred ahụ. Ya bụ na nwaanyị ahụ adịghị ahụ ihe iko achịcha ahụ mgbe ọ nọ ná ntụ ọka ahụ. Nke a na-echetara anyị nwoke ahụ kụrụ mkpụrụ ma lakpuo ụra n’abalị. Jizọs kwuru, sị: “Mkpụrụ ndị ahụ wee pulite ma too ogologo, otú o si mee, [nwoke ahụ] amaghị.” (Mak 4:27) Nke a bụ ụzọ dị nnọọ mfe nghọta isi kọwaa otú a na-adịghị ahụ anya mmadụ si aghọ onye na-eso ụzọ Kraịst! O nwere ike ná mmalite anyị agaghị ahụ otú nke ahụ si na-aga, ma n’ikpeazụ, ọ na-apụta ìhè.
14. Olee ihe banyere ọrụ nkwusa anyị nke okuko ihe iko achịcha ahụ koro ntụ ọka niile ahụ na-anọchi anya ya?
14 Ọ bụghị naanị na a naghị ahụ uto a kamakwa a na-enwe uto a n’ụwa niile. Nke a bụ ihe ọzọ pụtara ìhè n’ihe atụ nke ihe iko achịcha ahụ. Ihe iko achịcha ahụ na-eko ntụ ọka ahụ niile, ya bụ “arịa atọ buru ibu.” (Luk 13:21) Dị ka ihe iko achịcha, ọrụ nkwusa Alaeze ahụ nke na-eme ka mmadụ ghọọ onye na-eso ụzọ Kraịst agbasaala ruo n’ókè nke na a na-ekwusa Alaeze ahụ ugbu a ruo “n’ebe kasị anya n’ụwa.” (Ọrụ 1:8; Mat. 24:14) Ọ bụ nnọọ ihe ùgwù magburu onwe ya iso na-eme ka ọrụ Alaeze a na-agbasa!
-
-
Ị Maghị Ebe Ọ Ga-eme nke Ọma!Ụlọ Nche—2008 | Julaị 15
-
-
20, 21. (a) Gịnị ka anyị mụtarala site n’ịtụle ihe atụ ndị Jizọs nyere banyere uto? (b) Gịnị ka i kpebisiri ike ime?
20 Olee ihe ndị anyị mụtara site ná ntụle a dị mkpirikpi anyị tụlere ihe atụ Jizọs nyere banyere uto? Nke mbụ, dị ka mkpụrụ mọstad si eto, e nweela uto dị ukwuu n’ihe ndị metụtara Alaeze ahụ n’ụwa a. Ọ dịghị ihe ọ bụla ga-egbochi ọrụ Jehova ịga n’ihu! (Aịza. 54:17) Tụkwasị na nke ahụ, a na-echebe ndị gara ‘biri na ndò nke osisi ahụ’ ka Setan na ụwa ọjọọ ya ghara inweta ha. Nke abụọ, ọ bụ Chineke na-eme ka a na-enwe uto. Dị nnọọ ka ihe iko achịcha zoro ezo na-eko ntụ ọka buru ibu, ọ bụghị mgbe niile ka a na-ahụ ma ọ bụ ghọta uto a nke ọma, ma ọ na-eto n’ezie. Nke atọ, ọ bụghị ndị niile kwere ịmụ ihe na-emecha ghọọ ndị dị mma. Ụfọdụ aghọọla azụ ndị ahụ na-adịghị mma e kwuru okwu ha n’ihe atụ Jizọs.
-