Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • “Ndị Ezi Omume Ga-enwu Gbaa Dị Ka Anyanwụ”
    Ụlọ Nche—2010 | Mach 15
    • 2. Olee ndị ka mkpụrụ ọma ahụ na-anọchi anya ha n’ihe atụ ahụ Jizọs mere banyere ọka wit na ata?

      2 Ma, otu n’ime ihe atụ ndị Jizọs mere bụ banyere otú e si achịkọta ndị ga-eso ya achị n’Alaeze ya. A na-akpọkarị ya ilu ọka wit na ata, bụ́ nke e dere na Matiu isi iri na atọ. Ọ bụ ezie na n’ihe atụ ọzọ Jizọs mere, o kwuru na mkpụrụ ahụ a ghara bụ “okwu banyere alaeze ahụ,” n’ihe atụ nke a, o kwuru na mkpụrụ ọma ahụ na-anọchi anya ihe ọzọ dị iche, ya bụ, “ụmụ nke alaeze.” (Mat. 13:19, 38) Ndị a abụghị ndị Alaeze ahụ ga-achị, kama, ha bụ “ụmụ,” ma ọ bụ ndị nketa Alaeze ahụ.—Rom 8:14-17; gụọ Galeshia 4:6, 7.

  • “Ndị Ezi Omume Ga-enwu Gbaa Dị Ka Anyanwụ”
    Ụlọ Nche—2010 | Mach 15
    • 4. (a) Ònye bụ nwoke ahụ e kwuru okwu ya n’ihe atụ Jizọs mere? (b) Olee mgbe Jizọs malitere ịgha mkpụrụ a, oleekwa otú o si mee nke a?

      4 Ònye bụ nwoke ahụ kụrụ mkpụrụ ọma n’ubi ya? Jizọs mechara zaa ajụjụ a mgbe ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Onye ghara ezi mkpụrụ ahụ bụ Nwa nke mmadụ.” (Mat. 13:37) Jizọs, bụ́ “Nwa nke mmadụ,” kwadebere ubi ahụ ka e wee kụọ ya mkpụrụ mgbe o jere ozi afọ atọ na ọkara n’ụwa. (Mat. 8:20; 25:31; 26:64) Malitezie na Pentikọst nke afọ 33 O.A. gawa, o bidoro ịgha mkpụrụ ọma, ya bụ, “ụmụ nke Alaeze.” A malitere ịgha mkpụrụ a mgbe Jizọs, bụ́ onye nnọchiteanya Jehova, malitere ịwụsa ndị na-eso ụzọ ya mmụọ nsọ, si otú ahụ tee ha mmanụ ka ha bụrụ ụmụ Chineke.b (Ọrụ 2:33) Mkpụrụ ọma ahụ toro ghọọ ọka wit. Ya mere, ihe mere e ji ghaa mkpụrụ ọma ahụ bụ ka e nwee ike ịchịkọta ndị niile ga-eso Jizọs keta Alaeze wee soro ya chịa.

  • “Ndị Ezi Omume Ga-enwu Gbaa Dị Ka Anyanwụ”
    Ụlọ Nche—2010 | Mach 15
    • 5. Ònye bụ onye iro e kwuru okwu ya n’ihe atụ ahụ, oleekwa ndị bụ ata?

      5 Ònye bụ onye iro ahụ, oleekwa ndị bụ́ ata? Jizọs kwuru na onye iro ahụ “bụ Ekwensu.” O kwuru na ata ndị ahụ bụ “ụmụ ajọ onye ahụ.” (Mat. 13:25, 38, 39) Ikekwe ata Jizọs na-ekwu okwu ya bụ ụdị ata nke na-egbu ọka wit. Mgbe ata a na-eto, ọ na-eyi ọka wit. Nke a bụ nnọọ otú Ndị Kraịst adịgboroja dị, bụ́ ndị na-ekwu na ha bụ ụmụ Alaeze, ma, ha anaghị amị ezigbo mkpụrụ. Ndị Kraịst adịgboroja a, bụ́ ndị sị na ha bụ ndị na-eso ụzọ Kraịst, so ná “mkpụrụ” nke Setan bụ́ Ekwensu.—Jen. 3:15.

  • “Ndị Ezi Omume Ga-enwu Gbaa Dị Ka Anyanwụ”
    Ụlọ Nche—2010 | Mach 15
    • 7. Ọka wit ụfọdụ hà ghọrọ ata? Kọwaa.

      7 Jizọs ekwughị na ọka wit ga-aghọ ata, kama, ihe o kwuru bụ na a kụrụ ata n’etiti ọka wit. N’ihi ya, ihe atụ a anaghị ekwu banyere ezigbo Ndị Kraịst ndị hapụrụ eziokwu. Kama nke ahụ, ọ na-ekwu banyere mbọ Setan na-agba imebi ọgbakọ site n’ime ka ndị ọjọọ bata n’ime ya. A malitere ịhụ Ndị Kraịst adịgboroja a nke ọma mgbe onyeozi ikpeazụ fọdụrụ ndụ, bụ́ Jọn, mere agadi.—2 Pita 2:1-3; 1 Jọn 2:18.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya