-
‘Ịchọta Nkume Pel Dị Nnọọ Oké Ọnụ Ahịa’Ụlọ Nche—2005 | Febụwarị 1
-
-
‘Ịchọta Nkume Pel Dị Nnọọ Oké Ọnụ Ahịa’
“Alaeze nke eluigwe bụ ihe mgbaru ọsọ nke ụmụ mmadụ na-achụsosi ike, ndị sikwara ọnwụ na-achọ ya na-enweta ya.”—MATIU 11:12.
1, 2. (a) Olee àgwà dị ụkọ Jizọs kwuru banyere ya n’otu n’ime ilu ndị ọ tụrụ banyere Alaeze? (b) Gịnị ka Jizọs kwuru n’ilu nke nkume pel dị oké ọnụ ahịa?
Ọ̀ DỊ ihe i ji kpọrọ ihe nke ukwuu nke na ị ga-enye ihe nile i nwere ma ọ bụ jiri ha chụọ àjà iji nweta ya? Ọ bụ ezie na ndị mmadụ na-ekwu na ha na-etinye onwe ha n’ịchụso ụfọdụ n’ime ihe mgbaru ọsọ ha—ego, ịbụ onye a ma ama, ikike, ma ọ bụ ọkwá—mmadụ ịhụ ihe masịrị ya nke ukwuu nke na ọ ga-adị njikere ịhapụ ihe nile o nwere iji nweta ya abụghị ihe a na-ahụkebe. Jizọs Kraịst zoro aka n’àgwà a a na-adịghị ahụkebe na nke dị oké ọnụ ahịa n’otu n’ime ọtụtụ ilu ya banyere Alaeze Chineke bụ́ ndị na-akpali iche echiche.
2 Ọ bụ ilu Jizọs tụụrụ ndị na-eso ụzọ ya ma ọ bụ ihe atụ o nyere ha mgbe nanị ya na ha nọ, bụ́ nke a na-akpọkarị ilu nkume pel dị oké ọnụ ahịa. Jizọs kwuru, sị: “Alaeze nke eluigwe dị ka onye ahịa nke na-achọ nkume pel ọma. Mgbe ọ hụrụ otu nkume pel dị nnọọ oké ọnụ ahịa, ọ lara ma jiri ọsọ ọsọ ree ihe nile o nwere wee zụọ ya.” (Matiu 13:36, 45, 46) Olee ihe Jizọs chọrọ ka ndị na-ege ya ntị mụta n’ilu a? Oleekwa otú anyị pụrụ isi rite uru n’ihe ahụ Jizọs kwuru?
Ịdị Oké Ọnụ Ahịa nke Nkume Pel
3. N’ihi gịnị ka nkume pel ọma ji dị oké ọnụ ahịa n’oge ochie?
3 Site n’oge ochie, a nọwo na-ele nkume pel anya dị ka ihe ịchọ mma dị oké ọnụ ahịa. Otu akwụkwọ na-ekwu na ọkà mmụta bụ́ onye Rom bụ́ Pliny nke Okenye kwuru na nkume pel “dị oké ọnụ ahịa karịa ihe ọ bụla ọzọ e ji kpọrọ ihe.” N’adịghị ka ọlaedo, ọlaọcha, ma ọ bụ ọtụtụ nkume ndị dị oké ọnụ ahịa, ọ bụ ihe ndị dị ndụ na-emepụta nkume pel. Ọ bụ ihe a maara nke ọma na ụdị eju mmiri ụfọdụ pụrụ ime ka ihe ndị bara n’okpokoro ha—dị ka iberibe nkume—ghọọ nkume pel ndị na-egbukepụ egbukepụ site n’ịwụsa ha ihe ndị na-esi ha n’ahụ́ apụta a maara dị ka nacre. N’oge ochie, ebe ndị bụ́ isi e si nweta nkume pel ndị kasị mma bụ Oké Osimiri Uhie, Ọwara Oké Osimiri Peasia na Oké Osimiri India—ebe ndị dị nnọọ anya site n’ala Izrel. Obi abụọ adịghị ya na ọ bụ ya mere Jizọs ji kwuo banyere “onye ahịa nke na-achọ nkume pel ọma.” Ịchọta nkume pel ndị dị oké ọnụ ahịa n’ezie chọrọ nnọọ mgbalị dị ukwuu.
4. Gịnị bụ isi ihe dị n’ilu Jizọs banyere onye ahịa na-achọ nkume pel?
4 Ọ bụ ezie na ọ dịla anya nkume pel ọma dịwara oké ọnụ, ihe àmà na-egosi na ọ bụghị ịdị oké ọnụ ya bụ isi ihe dị n’ilu Jizọs. N’ilu a, ihe Jizọs mere abụghị nanị iji Alaeze Chineke tụnyere nkume pel dị oké ọnụ ahịa; ọ dọọrọ uche gaa n’ebe “onye ahịa nke na-achọ nkume pel ọma” nọ na ihe o mere mgbe ọ chọtara ya. N’adịghị ka onye na-ere ihe n’ụlọ ahịa, onye ahịa na-achọ nkume pel, bụ onye a pụrụ ịkpọ aka ochie n’ahịa ahụ, onye maara anya ya ma ọ bụ nwee ike ịmata ịma mma na ihe ndị zoro ezo na-eme ka nkume pel gbapụ iche. Ọ ga-ama nkume pel ọma ma ọ hụ ya, onye na-ere nkume pel adịgboroja agaghịkwa aghọgbuli ya.
5, 6. (a) Olee ihe e kwesịrị nnọọ ịrịba ama banyere onye ahịa ahụ e kwuru banyere ya n’ilu Jizọs? (b) Gịnị ka ilu nke akụ̀ zoro ezo na-ekpughe banyere onye ahịa ahụ?
5 Ọ dị ihe ọzọ kwesịrị ịrịba ama banyere onye ahịa a. Onye ahịa nkịtị pụrụ ibu ụzọ chọpụta ego ole a na-ere nkume pel n’ahịa iji kpebie ego ole ọ ga-azụ ya ka o wee nweta uru na ya. Ọ pụkwara ịtụle ma ndị mmadụ hà chọrọ nkume pel dị otú ahụ ka o wee nwee ike irepụ ya ngwa ngwa. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ọ ga-enwe mmasị n’inweta uru ngwa ngwa site ná ngwá ahịa ya, ọ bụghị n’inwe nkume pel. Ma ọ bụghị otú ahụ ka ọ dị onye ahịa ahụ e kwuru banyere ya n’ilu Jizọs. Mkpa ya abụghị inweta uru ego ma ọ bụ ihe a na-ahụ anya. N’ezie, ọ dị njikere iji “ihe nile o nwere”—ikekwe ngwongwo ya nile—chụọ àjà iji nweta ihe ọ nọ na-achọ kemgbe.
6 N’anya ihe ka ọtụtụ ná ndị ahịa, ihe nwoke ahụ e kwuru banyere ya n’ilu Jizọs mere bụ, ma eleghị anya, ihe amamihe na-adịghị na ya. Ọchụ nta ego maara ahịa agaghị eche echiche itinye aka n’ụdị achụmnta ego ahụ a na-ejighị n’aka. Ma ihe onye ahịa ahụ e kwuru banyere ya n’ilu Jizọs ji akpọrọ ihe dị iche. Ihe ọ ga-enweta abụghị uru ego kama ọ bụ ọṅụ na afọ ojuju nke inwe ihe ka nnọọ ego baa uru. E mere ka isi ihe a pụta ìhè n’ilu yiri nke a Jizọs tụrụ. O kwuru, sị: “Alaeze nke eluigwe dị ka akụ̀ dị oké ọnụ ahịa nke e zoro n’ala, bụ́ nke otu nwoke hụrụ wee zobe; n’ihi ọṅụ o nwekwara ọ gara ree ihe ndị o nwere wee zụọ ala ahụ.” (Matiu 13:44) Ee, ọṅụ nke ịchọta na inweta akụ̀ ahụ dị oké ọnụ ahịa zuru ịkpali nwoke ahụ ịhapụ ihe nile o nwere. È nwere ndị dị otú ahụ taa? Ọ̀ dị akụ̀ dị oké ọnụ ahịa e kwesịrị ịchụrụ àjà dị otú ahụ?
Ndị Lere Ya Anya Dị Ka Ihe Dị Oké Ọnụ Ahịa
7. Olee otú Jizọs si gosi na ya lere nnọọ Alaeze ahụ anya dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa?
7 Ihe Jizọs na-ekwu banyere ya n’ilu ya bụ “alaeze nke eluigwe.” O lere nnọọ Alaeze ahụ anya dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa. Ihe ndekọ Oziọma ndị ahụ na-egosi nnọọ nke a. Mgbe e mesịrị ya baptizim na 29 O.A., Jizọs “bidoro ime nkwusa na-asị: ‘Chegharịanụ, n’ihi na alaeze nke eluigwe eruwo.’” O ji afọ atọ na ọkara kụziere ọtụtụ ìgwè mmadụ banyere Alaeze ahụ. Ọ gazuru ala ahụ nile, “site n’obodo ukwu ruo n’obodo ukwu, nakwa site n’obodo nta ruo n’obodo nta, na-ekwusa ma na-akpọsa ozi ọma banyere alaeze Chineke.”—Matiu 4:17; Luk 8:1.
8. Gịnị ka Jizọs mere iji gosi ihe Alaeze ahụ ga-arụzu?
8 Site n’ịrụ ọtụtụ ọrụ ebube—ndị gụnyere ịgwọ ọrịa, inye ndị agụụ na-agụ nri, ịchịkwa ikike ndị sitere n’okike, ọbụna ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ—n’ala ahụ nile, Jizọs gosikwara ihe Alaeze Chineke ga-arụzu. (Matiu 14:14-21; Mak 4:37-39; Luk 7:11-17) N’ikpeazụ, o gosipụtara iguzosi ike n’ihe ya nye Chineke na Alaeze ahụ site n’inye ndụ ya, nwụọ n’elu osisi ịta ahụhụ dị ka onye na-agba àmà banyere eziokwu ahụ. Dị nnọọ ka onye ahịa ahụ ji obi ya nile hapụ ihe nile o nwere iji nweta ‘nkume pel ahụ dị nnọọ oké ọnụ ahịa,’ Jizọs dịrị ndụ ma nwụọ n’ihi Alaeze ahụ.—Jọn 18:37.
9. Olee otu àgwà a na-adịghị ahụkebe a hụrụ n’etiti ndị na-eso ụzọ Jizọs nke oge mbụ?
9 Ọ bụghị nanị na Jizọs mere ka ndụ ya hiwe isi n’Alaeze ahụ kama ọ kpọkọtakwara otu obere ìgwè ịbụ ndị na-eso ụzọ ya. Ha onwe ha kwa lere Alaeze ahụ anya dị ka ihe dị nnọọ oké ọnụ ahịa. Andru, bụ́ onye na-esobu ụzọ Jọn Onye Na-eme Baptizim, bụ otu n’ime ha. Mgbe ha nụrụ akaebe Jọn gbara na Jizọs bụ “Nwa Atụrụ Chineke,” Andru na onye ọzọ na-eso ụzọ Jọn, onye o yikarịrị ka ọ̀ bụ otu n’ime ụmụ Zebedi nke aha ya bụkwa Jọn, bịara nwee mmasị n’ebe Jizọs nọ ma ghọọ ndị kwere ekwe. Ma ọ bụghị ebe ahụ ka okwu biri. Ozugbo, Andru gakwuuru nwanne ya nwoke bụ́ Saịmọn ma gwa ya, sị: “Anyị ahụwo Mezaịa ahụ.” N’egbughị oge ọ bụla, Saịmọn (onye ghọrọ Sifas, ma ọ bụ Pita), tinyere Filip na enyi ya bụ́ Nataniel bịakwara ghọta Jizọs dị ka Mezaịa ahụ. N’ezie, a kpaliri Nataniel ịgwa Jizọs, sị: “Ị bụ Ọkpara Chineke, ị bụ Eze Izrel.”—Jọn 1:35-49.
Ndị A Kpaliri Ime Ihe
10. Gịnị ka ndị na-eso ụzọ Jizọs mere mgbe ọ kpọrọ ha obere oge ka ya na ha zutesịrị nke mbụ?
10 A pụrụ iji obi ụtọ dị ukwuu nke Andru, Pita, Jọn na ndị ọzọ nwere mgbe ha chọtara Mezaịa ahụ tụnyere nke onye ahịa ahụ nwere mgbe ọ chọtara nkume pel ahụ dị oké ọnụ ahịa. Gịnịzi ka ha ga-eme? Oziọma anọ ahụ agwachaghị anyị ihe ha mere ozugbo ha zutesịrị Jizọs nke mbụ ya. Ihe àmà na-egosi na ihe ka ọtụtụ n’ime ha laghachiri n’otú ha sibu ebi ndụ. Otú ọ dị, n’agbata ihe dị ka ọnwa isii na otu afọ ka e mesịrị, Jizọs zutere Andru, Pita, Jọn na nwanne Jọn bụ́ Jems ọzọ n’ebe ha na-egbu azụ n’ụsọ Oké Osimiri Galili.a Mgbe Jizọs hụrụ ha, ọ gwara ha, sị: “Soronụ m, m ga-emekwa unu ndị na-akụta mmadụ.” Gịnị ka ha mere? Banyere Pita na Andru, ihe ndekọ Matiu na-ekwu, sị: “Ozugbo ahụ, ka ha gbahapụrụ ụgbụ ha, ha sooro ya.” Banyekwara Jems na Jọn, anyị na-agụ, sị: “Ozugbo ahụ, ka ha hapụrụ ụgbọ ahụ na nna ha, ha sooro ya.” Ihe ndekọ Luk na-agbakwụnye na ha ‘gbahapụrụ ihe nile ma soro ya.’—Matiu 4:18-22; Luk 5:1-11.
11. Olee ihe o yikarịrị ka ọ̀ bụ ya mere ndị ahụ na-eso ụzọ ji za òkù Jizọs n’egbughị oge?
11 Otú ndị ahụ na-eso ụzọ si za òkù Jizọs n’egbughị oge, ọ̀ na-egosi na ha mere mkpebi n’echeghị ya eche? Ọ dịghị ma ọlị! Ọ bụ ezie na ha laghachiri n’ọrụ ezinụlọ ha nke igbu azụ mgbe ha na Jizọs zutesịrị nke mbụ, obi abụọ adịghị ya na ihe ha hụworo ma nụ n’oge ahụ nwere mmetụta miri emi n’obi na n’uche ha. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu afọ gaferenụ nyere ha oge buru ibu ịtụgharị uche n’okwu ndị ahụ. Ugbu a, oge ime mkpebi eruola. Hà ga-adị ka onye ahịa ahụ nkume pel dị oké ọnụ ahịa ọ chọtara kpaliri obi ya nke na, dị ka Jizọs si kọwaa, “ọ lara ma jiri ọsọ ọsọ” mee ihe ọ na-aghaghị ime iji zụta nkume pel ahụ? Ee. Ihe ha hụrụ ma nụ akpaliela obi ha. Ha ghọtara na oge eruola ka ha mee ihe. N’ihi ya, dị ka ihe ndekọ ndị ahụ si gwa anyị, n’egbughị oge ọ bụla, ha hapụrụ ihe nile ma ghọọ ụmụazụ Jizọs.
12, 13. (a) Olee otú ọtụtụ n’ime ndị nụrụ ihe Jizọs kwuru si meghachi omume? (b) Gịnị ka Jizọs kwuru banyere ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ntụkwasị obi, gịnịkwa ka okwu ya gosiri?
12 Lee ka ndị a kwesịrị ntụkwasị obi si dị iche n’ebe ụfọdụ ndị ọzọ nọ, bụ́ ndị a kpọtụrụ aha ka e mesịrị n’Oziọma anọ ndị ahụ! Ọtụtụ n’ime ha bụ ndị Jizọs gwọrọ ọrịa ma ọ bụ nye nri, ma ha nọgidere n’ọrụ nke aka ha. (Luk 17:17, 18; Jọn 6:26) Ụfọdụ rịọrọ ọbụna ka a hapụ ha mgbe Jizọs kpọrọ ha ịghọ ụmụazụ ya. (Luk 9:59-62) N’ụzọ dị nnọọ iche, Jizọs mesịrị kwuo banyere ndị nke kwesịrị ntụkwasị obi, sị: “Malite n’ụbọchị Jọn Onye Na-eme Baptizim ruo ugbu a, alaeze nke eluigwe bụ ihe mgbaru ọsọ nke ụmụ mmadụ na-achụsosi ike, ndị sikwara ọnwụ na-achọ ya na-enweta ya.”—Matiu 11:12.
13 Ihe a “na-achụsosi ike” na ihe a ‘na-esiri ọnwụ’—gịnị ka okwu ndị a na-egosi? Banyere ngwaa Grik nke e si na ya nweta okwu ndị a, Vine’s Expository Dictionary of Old and New Testament Words na-ekwu, sị: “Ngwaa ahụ na-enye echiche nke itinye mgbalị siri ike.” Banyekwara amaokwu a, ọkà mmụta Bible bụ́ Heinrich Meyer na-ekwu, sị: “Ọ bụ otú a ka e si kọwaa mgbalị na ndọga siri ike a na-eme maka alaeze Mezaịa ahụ na-eru nso . . . A na-enwe oké mmasị na ịnụ ọkụ n’obi n’ihe ndị metụtara alaeze ahụ (ọ bụghịzi iji nwayọọ na-atụ anya ya).” Dị ka onye ahịa ahụ, mmadụ ole na ole a ghọtara ihe dị oké ọnụ ahịa n’ezie ozugbo, ha jikwa obi ha nile hapụ ihe nile ha nwere n’ihi Alaeze ahụ.—Matiu 19:27, 28; Ndị Filipaị 3:8.
Ndị Ọzọ Sonyere n’Ịchọ Ya
14. Olee otú Jizọs si kwadebe ndịozi ya maka ọrụ nkwusa Alaeze ahụ, gịnịkwa si na ya pụta?
14 Ka Jizọs nọgidere na-eje ozi ya, ọ zụrụ ma nyere ndị ọzọ aka iru eru maka Alaeze ahụ. O bu ụzọ họpụta mmadụ 12 n’etiti ndị na-eso ụzọ ya ma kpọọ ha ndịozi, ma ọ bụ ndị o zipụrụ. Jizọs nyere ndị a ntụziaka zuru ezu banyere otú ha ga-esi jee ozi ha, dọọkwa ha aka ná ntị banyere ihe ịma aka na ihe isi ike ndị ha ga-ezute. (Matiu 10:1-42; Luk 6:12-16) Ruo ihe dị ka afọ abụọ, ha sonyeere Jizọs na njem nkwusa ya n’ala ahụ nile, soro ya kpachie anya. Ha nụrụ ihe ndị o kwuru, hụ ọrụ ndị dị ike ọ rụrụ, hụkwa ihe nlereanya ya. (Matiu 13:16, 17) Obi abụọ adịghị ya na ihe a nile metụrụ ha n’ahụ́ nke ukwuu nke na, dị ka onye ahịa ahụ, ha ji ịnụ ọkụ n’obi na obi ha nile chụsoo Alaeze ahụ.
15. Gịnị ka Jizọs kwuru bụ́ isi ihe mere ụmụazụ ya ga-eji ṅụrịa ọṅụ?
15 Tụkwasị ná ndịozi 12 ahụ, Jizọs “họpụtara mmadụ iri asaa ọzọ ma zipụ ha abụọ abụọ ka ha buru ya ụzọ gaa n’obodo na n’ebe ọ bụla nke ya onwe ya gaje ịbịa.” Ọ gwakwara ha banyere ule na ihe isi ike ndị ha ga-ezute ma nye ha ntụziaka ka ha na-agwa ndị mmadụ, sị: “Alaeze Chineke abịaruwo unu nso.” (Luk 10:1-12) Mgbe mmadụ 70 ahụ laghachiri, ha ji oké ọṅụ kọọrọ Jizọs, sị: “Onyenwe anyị, a na-edo ọbụna ndị mmụọ ọjọọ n’okpuru anyị site n’iji aha gị eme ihe.” Ma, ikekwe n’ụzọ tụrụ ha n’anya, Jizọs kpugheere ha na ọbụna ọṅụ ka ukwuu na-echere ha n’ihi ịnụ ọkụ n’obi ha nwere maka Alaeze ahụ. Ọ gwara ha, sị: “Unu aṅụrịla ọṅụ n’ihi nke a, na a na-eme ka mmụọ dị iche iche nọrọ n’okpuru unu, kama ṅụrịanụ ọṅụ n’ihi na e dewo aha unu n’eluigwe.”—Luk 10:17, 20.
16, 17. (a) Gịnị ka Jizọs gwara ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi n’abalị ikpeazụ ya na ha nọrọ? (b) Olee ọṅụ na mmesi obi ike okwu Jizọs wetaara ndịozi ahụ?
16 Ka e mesịrị, n’abalị ikpeazụ Jizọs na ndịozi ya nọrọ, na Naịsan 14, 33 O.A., o guzobere ihe e mesịrị mara dị ka Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị ma nye ha iwu ịdị na-echeta ihe omume ahụ. N’abalị ahụ, Jizọs gwara ndịozi 11 fọdụrụnụ, sị: “Unu bụ ndị rapawooro m n’ahụ́ n’ọnwụnwa m dị iche iche; mụ na unu na-agbakwa ndụ, dị nnọọ ka mụ na Nna m gbaworo ndụ, maka alaeze, ka unu wee rie ma ṅụọ na tebụl m n’alaeze m, nọdụkwa n’ocheeze ikpe ebo iri na abụọ nke Izrel ikpe.”—Luk 22:19, 20, 28-30.
17 Lee ọṅụ na afọ ojuju ndịozi ahụ na-aghaghị inwewo mgbe ha nụrụ okwu Jizọs ndị ahụ! E nyere ha ihe ùgwù kasịnụ mmadụ pụrụ inwe. (Matiu 7:13, 14; 1 Pita 2:9) Dị ka onye ahịa ahụ, ha ahapụla ọtụtụ ihe iji soro Jizọs n’ịchụso Alaeze ahụ. Ugbu a, e mesiri ha obi ike na àjà ndị ha chụrụla alaghị n’iyi.
18. E wezụga ndịozi 11 ahụ, ole ndị ga-emesịkwa soro rite uru n’Alaeze ahụ?
18 Ọ bụghị nanị ndịozi ahụ ha na Jizọs nọ n’abalị ahụ ga-erite uru n’Alaeze ahụ. Ọ bụ uche Jehova na a ga-eme ka ngụkọta nke otu narị puku mmadụ na iri puku anọ na anọ baa n’ọgbụgba ndụ Alaeze ahụ dị ka ndị ha na Jizọs Kraịst ga-eso chịa n’ebube Alaeze eluigwe. Ọzọkwa, Jọn onyeozi hụrụ n’ọhụụ “oké ìgwè mmadụ, nke onye ọ bụla na-enweghị ike ịgụta ọnụ, . . . na-eguzo n’ihu ocheeze ahụ na n’ihu Nwa Atụrụ ahụ, . . . na-asị: ‘Nzọpụta anyị sitere n’aka Chineke anyị, bụ́ onye na-anọkwasị n’ocheeze ahụ, sitekwa n’aka Nwa Atụrụ ahụ.’” Ndị a bụ ndị Alaeze ahụ ga-achị n’ụwa.b—Mkpughe 7:9, 10; 14:1, 4.
19, 20. (a) Ohere dị aṅaa ka ndị nke mba nile nwere? (b) Olee ajụjụ a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?
19 Obere oge tupu Jizọs arịgoro eluigwe, o nyere ụmụazụ ya kwesịrị ntụkwasị obi iwu, sị: “Ya mere gaanụ mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptizim n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ, na-ezi ha ka ha debe ihe nile m nyeworo unu n’iwu. Ma, lee! m nọnyeere unu ụbọchị nile ruo ọgwụgwụ nke usoro ihe.” (Matiu 28:19, 20) N’ihi ya, ndị si ná mba nile ga-aghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst. Dị nnọọ ka onye ahịa ahụ tụkwasịrị obi na nkume pel ọma ahụ, ndị a kwa—ma hà ga-enweta ụgwọ ọrụ n’eluigwe ma ọ bụ n’ụwa—ga-atụkwasị obi n’Alaeze ahụ.
20 Okwu Jizọs gosiri na ọrụ ime ndị na-eso ụzọ ga-adịgide ruo ‘n’ọgwụgwụ nke usoro ihe a.’ Ya mere n’oge anyị, à ka nwere ndị dị ka onye ahịa ahụ, bụ́ ndị dị njikere ịhapụ ihe nile ha nwere iji chụsoo Alaeze Chineke? A ga-atụle ajụjụ a n’isiokwu na-esonụ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ọ pụrụ ịbụ na Jọn nwa Zebedi sooro Jizọs ma hụ ụfọdụ n’ime ihe ndị o mere mgbe ha na ya zutesịrị nke mbụ, bụ́ nke nyeere ya aka idekọ ha n’ụzọ doro nnọọ anya n’ihe ndekọ Oziọma ya. (Jọn, isi nke 2-5) Otú ọ dị, ọ laghachiri n’ọrụ ezinụlọ ya nke igbu azụ ruo oge ụfọdụ tupu Jizọs akpọọ ya.
b Iji nwetakwuo nkọwa zuru ezu, lee isi nke 10 nke akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.
-
-
Ịchọ “Nkume Pel Dị Oké Ọnụ Ahịa” taaỤlọ Nche—2005 | Febụwarị 1
-
-
Ịchọ “Nkume Pel Dị Oké Ọnụ Ahịa” taa
“A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà.”—MATIU 24:14.
1, 2. (a) Gịnị ka ndị Juu nke oge Jizọs chere banyere Alaeze Chineke? (b) Gịnị ka Jizọs mere iji mee ka a ghọta Alaeze ahụ nke ọma, oleekwa ihe ndị si na ya pụta?
ALAEZE CHINEKE bụ isiokwu na-ewu ewu n’etiti ndị Juu mgbe Jizọs bịara n’ụwa. (Matiu 3:1, 2; 4:23-25; Jọn 1:49) Otú ọ dị, na mbụ, ihe ka ọtụtụ n’ime ha aghọtachaghị otú ọchịchị ya ga-agbasaru na ike ọ ga-enwe; ha aghọtaghịkwa na ọ ga-abụ ọchịchị eluigwe. (Jọn 3:1-5) Ọbụna ụfọdụ ndị ghọrọ ụmụazụ Jizọs aghọtachaghị ihe Alaeze Chineke bụ ma ọ bụ ihe ha ga-emerịrị iji nweta ngọzi nke ịghọ ndị ha na Kraịst ga-eso chịa.—Matiu 20:20-22; Luk 19:11; Ọrụ 1:6.
2 Ka oge na-aga, Jizọs ji ndidi kụziere ndị na-eso ụzọ ya ọtụtụ ihe, gụnyere ilu banyere nkume pel dị oké ọnụ ahịa bụ́ nke anyị tụlere n’isiokwu bu ụzọ, na-eme ka ha ghọta ịdị mkpa nke itinyesi mgbalị ike ná nchụso nke Alaeze eluigwe. (Matiu 6:33; 13:45, 46; Luk 13:23, 24) Ọ ga-abụrịrị na nke a metụrụ ha n’obi nke ukwuu n’ihi na n’oge na-adịghị anya ha ji obi ike kpọsaa ozi Alaeze ahụ ruo n’akụkụ ndị dị anya nke ụwa n’adaghị mbà, akwụkwọ Ọrụ Ndịozi gbakwara akaebe ya.—Ọrụ 1:8; Ndị Kọlọsi 1:23.
3. N’ikwu maka oge anyị, gịnị ka Jizọs kwuru banyere Alaeze ahụ?
3 Oleekwanụ maka taa? A na-enye ọtụtụ nde mmadụ ohere inweta ngọzi nke paradaịs elu ala n’okpuru Alaeze ahụ. N’oké amụma ya banyere “ngwụsị nke usoro ihe a,” Jizọs kwuru kpọmkwem, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.” (Matiu 24:3, 14; Mak 13:10) Ọ kọwakwara na a ga-arụ nnukwu ọrụ a n’agbanyeghị ihe mgbochi na ihe ịma aka ndị siri ike, ọbụna mkpagbu. Otú o sina dị, o mesiri ha obi ike, sị: “Onye tachiworo obi ruo ọgwụgwụ bụ onye a ga-azọpụta.” (Matiu 24:9-13) Ihe a nile na-achọ ụdị ịchụ onwe onye n’àjà na nraranye onye ahịa ahụ e kwuru banyere ya n’ilu Jizọs gosipụtara. È nwere ndị na-egosipụta okwukwe na ịnụ ọkụ n’obi dị otú ahụ taa n’ịchụso Alaeze ahụ?
Ọṅụ nke Ịchọta Eziokwu Ahụ
4. Olee mmetụta eziokwu Alaeze ahụ na-enwe n’ahụ́ ụmụ mmadụ taa?
4 Onye ahịa ahụ e kwuru banyere ya n’ilu Jizọs nwere obi ụtọ dị ukwuu mgbe ọ chọtara ihe ọ ghọtara ịbụ “nkume pel dị oké ọnụ ahịa.” Ọṅụ ahụ kpaliri ya ime ihe nile o nwere ike ime iji nweta nkume pel ahụ. (Ndị Hibru 12:1) N’otu aka ahụ, eziokwu banyere Chineke na Alaeze ya na-adọta ma na-akpali ndị mmadụ taa. Nke a na-eme ka anyị cheta okwu Nwanna A. H . Macmillan, bụ́ onye dere banyere ọchịchọ ọ chọrọ Chineke na nzube Ya maka ihe a kpọrọ mmadụ n’akwụkwọ bụ́ Faith on the March. O kwuru, sị: “Kwa afọ, ọtụtụ puku mmadụ ka na-achọta ihe m chọtarala. Ha bụkwa ndị dị ka mụ na gị n’ihi na ha si ná mba nile, agbụrụ nile ma nọrọ n’ọnọdụ nile ná ndụ, ha bụkwa ndị nọ n’afọ ndụ nile. Ọ dịghị onye eziokwu ahụ sọ nsọ. Ọ na-adọta ụdị mmadụ nile.”
5. Olee ezi ihe ndị a rụzuru bụ́ ndị a na-ahụ n’akụkọ afọ ije ozi 2004?
5 A na-ahụ ịbụ eziokwu nke okwu ndị ahụ kwa afọ ka ozi ọma Alaeze Chineke na-akpali ọtụtụ narị puku ndị nwere obi eziokwu ịrara ndụ ha nye Jehova na ime uche ya. Afọ ije ozi 2004, bụ́ nke malitere na September 2003 ma kwụsị n’August 2004, adịghị iche. N’ime ọnwa 12 ndị ahụ, mmadụ narị puku abụọ, iri puku isii na abụọ, narị anọ na iri na isii gosipụtara nrara ha raara onwe ha nye Jehova n’ihu ọha site na baptizim ime mmiri. Nke a weere ọnọdụ na narị ala abụọ na iri atọ na ise, bụ́ ebe Ndịàmà Jehova na-eduzi ọmụmụ Bible ebe obibi dị nde isii, iri puku asatọ na ise, narị atọ na iri asatọ na asaa kwa izu iji nyere ndị nọ n’ọnọdụ nile ná ndụ, ndị sikwa ná mba, ebo na asụsụ nile aka ịnabata eziokwu ahụ na-enye ndụ sitere n’Okwu Chineke.—Mkpughe 7:9.
6. Gịnị mere e ji nọgide na-enwe mmụba n’afọ ndị gaferelanụ?
6 Gịnị mere ihe a nile ji kwe omume? Obi abụọ adịghị ya na ọ bụ Jehova na-adọtara onwe ya ndị a nwere ezi ọchịchọ obi. (Jọn 6:65; Ọrụ 13:48) Otú ọ dị, e kwesịghị ileghara mmụọ achọghị ọdịmma onwe onye nanị na mgbalị siri ike nke ndị tinyerela onwe ha n’ịchụso Alaeze ahụ anya. Mgbe ọ dị afọ 79, Nwanna Macmillan dere, sị: “Malite mgbe mbụ m nụrụ banyere nkwa ndị ahụ e kwere ihe a kpọrọ mmadụ na-arịa ọrịa, na-anwụkwa anwụ, olileanya m nwere n’ihe ozi Bible ahụ kpugherela ebelatabeghị. Ozugbo ahụ, ekpebiri m ịchọpụtakwu ihe Bible na-akụzi ka m wee nwee ike inyere ndị ọzọ dị ka m aka bụ́ ndị na-achọ ihe ọmụma banyere Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile, bụ́ Jehova, nakwa banyere nzube ọma ya dị iche iche maka ihe a kpọrọ mmadụ.”
7. Olee ahụmahụ na-egosi ọṅụ na mgbalị nke ndị na-achọ eziokwu Bible?
7 A na-ahụkwa ọchịchọ siri ike dị otú ahụ n’ebe ndị ohu Jehova nọ taa. Were Daniela bụ́ onye Vienna, Austria, dị ka ihe atụ. O kwuru, sị: “Site na mgbe m dị obere, mụ na Chineke abụrụla nnọọ ezigbo enyi. Achọrọ m nnọọ ịmata aha ya n’ihi na, nye m, ‘Chineke’ akọwatụghị ụdị onye ọ bụ. Ma ọ bụ mgbe m dị afọ 17 ka Ndịàmà Jehova bịara n’ụlọ anyị. Ha kọwara ihe nile m chọrọ ịma banyere Chineke. Emechaala m chọta eziokwu ahụ, obi tọkwara m ụtọ nke ukwuu! Ọṅụ juru m nnọọ obi nke na m bidoro ikwusara onye ọ bụla oziọma.” Ịnụ ọkụ n’obi ya mesịrị mee ka ụmụ klas ya kwawa ya emo. Daniela gara n’ihu ikwu, sị: “Otú ọ dị, nye m, ọ dị ka ịhụ ka amụma Bible na-emezu, n’ihi na Jizọs kwuru na a ga-akpọ ụmụazụ ya asị, kpagbuokwa ha n’ihi aha ya. Obi dị m nnọọ ụtọ, ọ tụkwara m n’anya.” N’oge na-adịghị anya, Daniela raara ndụ ya nye Jehova, e mee ya baptizim, ya ebidokwa ịchụso ihe mgbaru ọsọ nke ozi ala ọzọ. Mgbe ọ lụsịrị di, Daniela na di ya bụ́ Helmut malitere ikwusara ndị Africa, China, Philippines na ndị India bi na Vienna ozi ọma. Daniela na Helmut na-eje ozi ugbu a dị ka ndị ozi ala ọzọ na ndịda ebe ọdịda anyanwụ Africa.
Ha Adịghị Ada Mbà
8. Olee otu ụzọ na-eweta ụgwọ ọrụ ọtụtụ sirila gosipụta ịhụnanya ha n’ebe Chineke nọ na iguzosi ike n’ihe ha nye Alaeze ya?
8 N’ezie, ozi ala ọzọ bụ otu n’ime ụzọ ndị ndị Jehova taa si egosipụta ịhụnanya ha nwere n’ebe Chineke nọ na iguzosi ike n’ihe ha nye Alaeze ya. Dị ka onye ahịa ahụ e kwuru banyere ya n’ilu Jizọs, ndị na-abanye n’ozi a dị njikere ịga ebe ndị dị anya n’ihi Alaeze ahụ. N’ezie, ndị ozi ala ọzọ adịghị eme njem iji chọta ozi ọma Alaeze ahụ; ha na-ewegara ya ndị bi n’ebe ndị kasị dị anya nke ụwa, na-ezi ndị mmadụ ihe ma na-enyere ha aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst. (Matiu 28:19, 20) N’ọtụtụ ala, ha aghaghị ịtachi obi n’oké ihe isi ike. Ma ntachi obi ha na-eweta nnukwu ụgwọ ọrụ.
9, 10. Ahụmahụ ndị dị aṅaa na-akpali akpali ka ndị ozi ala ọzọ nọ n’ebe ndị dị ka Central African Republic na-enwe?
9 Were Central African Republic dị ka ihe atụ, bụ́ ebe ọnụ ọgụgụ ndị bịara Ememe Ncheta nke ọnwụ Kraịst n’afọ gara aga bụ puku mmadụ iri na isii, otu narị na iri asatọ na anọ, bụ́ nke ji okpukpu asaa karịa ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa Alaeze nọ n’ala ahụ. Ebe ọ bụ na ọkụ eletrik adịghị n’ọtụtụ akụkụ nke ala ahụ, ndị mmadụ na-anọkarị n’èzí arụ ọrụ ụbọchị ha n’okpuru osisi. Ya mere, ọ bụ nnọọ ihe dị otú o kwesịrị na ndị ozi ala ọzọ ahụ ga na-anọkwa ebe ndị dị otú ahụ arụ ọrụ ha—na-eduzi ọmụmụ Bible n’okpuru osisi. Ọ bụghị nanị na a na-ahụ ụzọ nke ọma karị n’èzí nakwa na ọ na-aka ajụ oyi n’ahụ́, kamakwa, e nwere uru ọzọ. Ndị ebe ahụ nwere nnọọ mmasị na Bible, a na-ekwukarịkwa banyere okpukpe dị nnọọ ka a na-ekwukarị banyere egwuregwu ma ọ bụ ọnọdụ ihu igwe n’ebe ndị ọzọ. Mgbe mgbe, ndị na-agafe agafe na-ahụ ihe na-emenụ ma sonye n’ọmụmụ ihe ahụ.
10 Ya mere, mgbe otu onye ozi ala ọzọ nọ na-eduzi ọmụmụ Bible n’èzí, otu nwa okorobịa nke bi n’ofe nke ọzọ nke okporo ámá ahụ bịara ma kwuo na ebe ọ bụ na ọ dịbeghị onye bịara na nke ya, na ọ ga-amasị ya ka onye ozi ala ọzọ ahụ bịa na nke ya ma duziekwara ya ọmụmụ Bible. N’ezie, onye ozi ala ọzọ ahụ ji obi ụtọ kweta, nwa okorobịa ahụ na-enwekwa ọganihu ngwa ngwa. Ná mba ahụ, ndị uwe ojii na-akwụsịkarị Ndịàmà n’ụzọ, ọ bụghị iji kpọọ ha òkù n’ụlọikpe ma ọ bụ iji rie ha nhá, kama iji jụọ ha ma hà nwere magazin Ụlọ Nche ma ọ bụ Teta! ndị kasị ọhụrụ, ma ọ bụ iji kelee ha maka isiokwu kasị masị ha.
11. N’agbanyeghị ule, olee mmetụta ndị nọterela aka n’ozi ala ọzọ na-enwe banyere ozi ha?
11 Ọtụtụ n’ime ndị banyeworo n’ozi ala ọzọ afọ 40 ma ọ bụ 50 gara aga ka ji ikwesị ntụkwasị obi eje ozi n’ubi. Lee ihe nlereanya nke ikwesị ntụkwasị obi na nnọgidesi ike n’ihe nke ahụ bụụrụ anyị nile! N’ime afọ 42 gara aga, otu di na nwunye ejekọọla ozi dị ka ndị ozi ala ọzọ ná mba atọ dị iche iche. Nke nwoke na-ekwu, sị: “Anyị enweela ọtụtụ ihe isi ike. Dị ka ihe atụ, anyị nagidere ọrịa ịba ruo afọ 35. Ma anyị akwatụghị ụta maka mkpebi anyị ịbụ ndị ozi ala ọzọ.” Nwunye ya na-agbakwunye, sị: “Ọ dịbeghị mgbe anyị na-enweghị ọtụtụ ihe anyị ga-enwe ekele maka ha. Ozi ubi na-enye nnọọ ọṅụ, ọ na-adịkwa mfe ịmalite ọmụmụ Bible. Mgbe ị hụrụ ka ndị ị na-amụrụ ihe na-abịa nzukọ ma na-amata onwe ha, ọ na-adị nnọọ ka nnọkọ ntụrụndụ ezinụlọ.”
Ha ‘Na-agụ Ihe Nile Dị Ka Mfu’
12. Olee otú mmadụ si egosi na ya na-ele nnọọ Alaeze ahụ anya dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa?
12 Mgbe onye ahịa ahụ hụrụ nkume pel dị oké ọnụ ahịa, “ọ lara ma jiri ọsọ ọsọ ree ihe nile o nwere wee zụọ ya.” (Matiu 13:46) Njikere a ọ dị ịhapụ ihe ndị a pụrụ iwere dị ka ihe ndị dị oké ọnụ ahịa bụ ihe e ji ama ndị na-ele nnọọ Alaeze ahụ anya dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa. Dị ka onye ga-eso Kraịst nweta ebube Alaeze, Pọl onyeozi kwuru, sị: “Ana m agụkwa ihe nile n’ezie dị ka mfu n’ihi abamuru na-enweghị atụ nke ihe ọmụma banyere Kraịst Jizọs Onyenwe m. N’ihi ya, ekwerewo m ka ihe nile funahụ m, ana m agụkwa ha dị ka ihe mkpofu dị ukwuu, ka m wee nweta Kraịst.”—Ndị Filipaị 3:8.
13. Olee otú otu onye Czech Republic si gosi ịhụnanya o nwere maka Alaeze ahụ?
13 N’otu ụzọ ahụ, ọtụtụ ndị taa dị njikere ime mgbanwe dị ukwuu ná ndụ ha iji nweta ngọzi Alaeze ahụ. Dị ka ihe atụ, n’October 2003, onyeisi nke otu ụlọ akwụkwọ dị na Czech Republic bụ́ onye dị afọ 60 hụrụ akwụkwọ e ji amụ Bible bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. Mgbe ọ gụchara ya, ọ kpọtụụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè ya ozugbo ka ha duziere ya ọmụmụ Bible. O nwere ezi ọganihu ime mmụọ, n’oge na-adịghịkwa anya, ọ malitere ịga nzukọ nile. Oleekwanụ maka atụmatụ ya ịzọ ọkwá onyeisi obodo ma mesịa zọọ ọkwá onye omeiwu? Ọ họọrọ nchụso dị iche—ịgba ọsọ nke ndụ dị ka onye nkwusa Alaeze. O kwuru, sị, “Enyefere m ụmụ akwụkwọ m ọtụtụ akwụkwọ ndị e ji amụ Bible.” O gosipụtara nrara ọ raara onwe ya nye Jehova site n’ịbụ onye e mikpuru ná mmiri ná mgbakọ ukwu e nwere na July 2004.
14. (a) Gịnị ka ozi ọma Alaeze ahụ kpalirila ọtụtụ nde mmadụ ime? (b) Ajụjụ ndị dị aṅaa na-akpali iche echiche ka onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ ịjụ onwe ya?
14 Ọtụtụ nde ndị ọzọ n’ụwa nile emeghachila omume n’ụzọ yiri nke ahụ n’ebe ozi Alaeze ahụ dị. Ha esila n’ụwa ajọ omume pụta, yipụ ụdị mmadụ ochie ha, hapụ ndị enyi mbụ ha na nchụso nke ihe nke ụwa. (Jọn 15:19; Ndị Efesọs 4:22-24; Jems 4:4; 1 Jọn 2:15-17) Olee ihe mere ha ji mee ihe a nile? Ọ bụ n’ihi na ha ji ngọzi Alaeze Chineke kpọrọ ihe karịa ihe ọ bụla usoro ihe a pụrụ inye. Ọ̀ bụ otu mmetụta ahụ ka ị na-enwe banyere ozi Alaeze ahụ? Ọ̀ na-akpali gị ime mgbanwe ndị dị mkpa iji mee ka ndụ gị, ihe ndị i ji akpọrọ ihe na ihe mgbaru ọsọ gị kwekọọ n’ihe ndị Jehova na-achọ? Ime otú ahụ ga-arụpụtara gị ngọzi dị ukwuu, ugbu a na n’ọdịnihu.
Owuwe Ihe Ubi Na-abịa ná Njedebe
15. Gịnị ka e buru n’amụma na ndị Chineke ga-eme n’oge ikpeazụ a?
15 Ọbụ abụ ahụ dere, sị: “Ndị gị bụ onyinye afọ ofufo n’ụbọchị usuu ndị agha gị.” Ndị nyerela onwe ha n’afọ ofufo na-agụnye “igirigi, bụ́ ụmụ okorobịa” na “usuu bara ụba” nke “ndị inyom ndị na-ezisa ozi ahụ.” (Abụ Ọma 68:11; 110:3) Gịnị sirila n’ịdị uchu na ịchụ onwe onye n’àjà nke ndị Jehova—ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị, ndị na-eto eto na ndị agadi—pụta n’oge ikpeazụ ndị a?
16. Nye ihe atụ nke otú ndị ohu Chineke si agbalị inyere ndị ọzọ aka ịmụta banyere Alaeze ahụ.
16 Otu onye ọsụ ụzọ, ma ọ bụ onye nkwusa Alaeze oge nile n’India, nọ na-eche otú e nwere ike isi nyere ihe karịrị nde ndị ogbi abụọ bi ná mba ahụ aka ịmụta banyere Alaeze ahụ. (Aịsaịa 35:5) O kpebiri ịbanye n’otu ụlọ akwụkwọ dị na Bangalore ịmụ asụsụ ndị ogbi. N’ebe ahụ, ọ gwara ọtụtụ ndị ogbi maka olileanya Alaeze ahụ, e guzobekwara ọtụtụ ìgwè ọmụmụ Bible. N’ime izu ole na ole, ihe karịrị mmadụ iri na abụọ malitere ịbịa nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ka e mesịrị, n’otu oriri agbamakwụkwọ, onye ọsụ ụzọ ahụ zutere nwa okorobịa bụ́ onye ogbi nke si Calcutta, bụ́ onye jụrụ ọtụtụ ajụjụ ma gosi ezi mmasị n’ịmatakwu banyere Jehova. Otú ọ dị, e nwere otu nsogbu. Nwa okorobịa ahụ na-alaghachi Calcutta, bụ́ nke dị ihe dị ka otu puku kilomita na narị isii iji banye n’ụlọ akwụkwọ kọleji, ọ dịghịkwa Ndịàmà maara asụ asụsụ ogbi n’ebe ahụ. Nwa okorobịa ahụ mere mgbalị dị ukwuu iji mee ka papa ya kweta itinye ya n’ụlọ akwụkwọ dị na Bangalore kama ya ịga nke dị na Calcutta ka o wee nwee ike ịga n’ihu n’ọmụmụ Bible ya. O nwere ezi ọganihu ime mmụọ, ka ihe dị ka otu afọ gasịkwara, ọ raara ndụ ya nye Jehova. Ya onwe ya kwa duziiri ọtụtụ ndị ogbi ọmụmụ Bible, gụnyere enyi ya nke ya na ya kpawara kemgbe ha dị obere. Alaka ụlọ ọrụ dị n’India na-ahazi ugbu a ka ndị ọsụ ụzọ mụọ asụsụ ndị ogbi iji nye aka n’akụkụ ahụ.
17. Kọọ ihe ị hụtara dị ka ihe na-agba ume karịsịa banyere akụkọ afọ ije ozi 2004 nke dị na peeji nke 19 ruo nke 22.
17 Na peeji nke 19 ruo nke 22 nke magazin a, ị ga-ahụ akụkọ ozi ubi Ndịàmà Jehova n’ụwa nile maka afọ ije ozi 2004. Were obere oge tụlee ya ma jiri anya gị hụrụ ihe na-egosi na ndị Jehova n’ụwa nile na-elekwasị nnọọ anya n’ịchọ ‘nkume pel ahụ dị oké ọnụ ahịa’ taa.
“Nọgidenụ Buru Ụzọ Na-achọ Alaeze Ahụ”
18. Olee ihe Jizọs na-ekwughị n’ilu ya banyere onye ahịa ahụ, n’ihi gịnịkwa?
18 N’ịlaghachi n’ilu Jizọs banyere onye ahịa ahụ, anyị na-ahụ na Jizọs ekwughị ihe ọ bụla banyere otú onye ahịa ahụ ga-esi na-elekọta onwe ya mgbe o resịrị ihe nile o nwere. N’ụzọ kwere nghọta, ụfọdụ pụrụ ịjụ, sị: ‘Olee otú onye ahịa ahụ ga-esi nweta ihe ọ ga-eri, uwe ọ ga-eyi na ụlọ ọ ga-ebi na ya ebe ọ bụ na o nweghịzi ihe fọdụụrụ ya? Olee uru nkume pel ahụ dị oké ọnụ ahịa ga-abara ya?’ Ezi uche dị n’ajụjụ ndị ahụ ma e lee ha anya n’ụzọ nkịtị. Ma, ọ̀ bụ na Jizọs agbaghị ndị na-eso ụzọ ya ume, sị: “Ya mere, nọgidenụ buru ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume ya, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ọzọ ndị a nile”? (Matiu 6:31-33) Isi ihe dị n’ilu ahụ bụ na ọ dị mkpa mmadụ iji obi ya nile rara onwe ya nye Chineke ma na-anụ ọkụ n’obi maka Alaeze ahụ. Ọ̀ dị ihe anyị ga-amụta na nke a?
19. Olee isi ihe anyị pụrụ ịmụta n’ilu Jizọs banyere nkume pel dị oké ọnụ ahịa?
19 Ma ànyị ka nụrụ ozi ọma ahụ dị ebube na nso nso a ma ànyị achụsoola Alaeze ahụ ma na-agwa ndị ọzọ banyere ngọzi ndị ọ ga-eweta ruo ọtụtụ iri afọ, anyị ga-anọgiderịrị na-enwe mmasị n’Alaeze ahụ ma na-etinye uche anyị na ya. Oge ndị a siri ike, ma anyị nwere ezi ihe ndị mere anyị ga-eji kwere na ihe anyị na-achụso bụ ihe dị adị na ihe na-enweghị atụ—dị ka nkume pel ahụ onye ahịa ahụ chọtara. Ihe ndị na-eme n’ụwa na amụma Bible ndị mezurulanụ na-enye ihe àmà doro anya na anyị na-ebi ná “ngwụsị nke usoro ihe a.” (Matiu 24:3) Dị ka onye ahịa ahụ, ka anyị jiri obi anyị nile na-anụ ọkụ n’obi maka Alaeze Chineke ma na-aṅụrị ọṅụ n’ihe ùgwù nke ikwusa ozi ọma ahụ.—Abụ Ọma 9:1, 2.
-