-
Eze Alaeze Chineke Na-eme Ka Ndị Ya Dị ỌchaAlaeze Chineke Amalitela Ịchị!
-
-
Ụgbụ a a wụnyere n’oké osimiri nọchiri anya ozi ọma Alaeze a na-ezi ndị mmadụ n’ụwa niile (A kọwara ya na paragraf nke 18)
18 “Ụgbụ a wụnyere n’oké osimiri.” Ụgbụ a nọchiri anya ozi ọma Alaeze a na-ezi ndị mmadụ n’ụwa niile. ‘Ikpokọta ụdị azụ̀ niile.’ Ụdị mmadụ dị iche iche na-anụ ozi ọma ahụ taa. E nwere ndị a na-ezi ya ha emechaa ghọọ ezigbo Ndị Kraịst, nweekwa ndị a na-ezi ya, ha enwetụ mmasị, ma ha anaghị aghọ Ndị Kraịst.e Ịchịkọta ‘azụ̀ ndị dị mma wụnye ha n’arịa dị iche iche.’ A na-akpọbata ndị niile ọ na-agụ agụ ịmụta ihe banyere Chineke n’ọgbakọ dị iche iche nke Ndị Kraịst ka ha na-efe Jehova otú ọ chọrọ. Ịtụfu azụ̀ “ndị na-adịghị mma.” Kemgbe oge ikpeazụ a, Kraịst na ndị mmụọ ozi nọ na-ekewapụ “ndị ajọ omume n’etiti ndị ezi omume.”f Ọ bụ ya mere na ndị na-achọghị ịhapụ ozizi ụgha na omenala ndị na-adịghị mma enwebeghị ike imerụ ọgbakọ dị iche iche nke Ndị Kraịst.g
-
-
Eze Alaeze Chineke Na-eme Ka Ndị Ya Dị ỌchaAlaeze Chineke Amalitela Ịchị!
-
-
f Ịhọpụta azụ̀ ndị dị mma n’etiti azụ̀ ndị na-adịghị mma dị iche n’ikewapụta atụrụ n’ebe ewu nọ. (Mat. 25:31-46) Ọ bụ n’oké mkpagbu ka Jizọs ga-ekewapụta ndị bụ́ atụrụ n’etiti ndị bụ́ ewu. Tupu mgbe ahụ, ndị a yiri azụ̀ ndị na-adịghị mma nwere ike ịlọghachikwute Jehova, ma bata n’ọgbakọ dị iche iche nke Ndị Kraịst.—Mal. 3:7.
-