Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Gịnị Ka Oké Ụgbụ na Azụ ahụ Pụtara Nye Gị?
    Ụlọ Nche—1992 | Jun 15
    • 3. Olee ụzọ ịghọta ilu Jisọs nile pụrụ isi wetara anyị ọtụtụ abamuru?

      3 Mgbe ahụ Jisọs webatara Aịsaịa 6:9, 10, bụ́ nke kọwara ndị ntị chiri na ndị kpuru ìsì n’ụzọ ime mmụọ. Otú ọ dị, ọ dịghị mkpa anyị ịdị otú ahụ. Ọ bụrụ na anyị aghọta ma na-eme ihe kwekọrọ n’ilu ya nile, anyị pụrụ inwe obi ụtọ dị ukwuu—ugbu a na n’ọdịnihu n’enweghị ọgwụgwụ. Jisọs na-ekwe anyị nkwa nke a na-ekpo ọkụ: “Ngọzi [“obi ụtọ,” NW] na-adịrị anya unu, n’ihi na ha na-ahụ ụzọ; na ntị unu, n’ihi na ha na-anụ ihe.” (Matiu 13:16) Nkwa ahụ metụtara ilu nile nke Jisọs, ma ka anyị lekwasị anya n’ihe atụ ahụ dị mkpirikpi nke oké ụgbụ, nke e dekọrọ na Matiu 13:47-50.

      Ilu nke Pụtara Ihe Dị Omimi

      4. Gịnị ka Jisọs kọrọ n’ụzọ okwu ilu, dị ka e dekọrọ ya na Matiu 13:47-50?

      4 “Alaeze eluigwe yiri oké ụgbụ a wụnyere n’ime oké osimiri, nke kpokọtakwara ụfọdụ n’aha azụ nile dị iche iche: nke, mgbe o juru, ha dọgotara ya n’otu; ha wee nọdụ, chịkọta azụ dị mma tinye n’ime ihe, ma ha tụfuru nke na-adịghị mma. Otú a ka ọ ga-adị n’ọgwụgwụ oge a: ndị mmụọ ozi ga-apụta, kewapụta ndị bụ ajọ mmadụ n’etiti ndị ezi omume, ha ga-atụbakwa ha n’oké ọkụ ahụ: n’ebe ahụ ka ịkwa ákwá na ịta ikikere eze ahụ ga-adị.”

  • Gịnị Ka Oké Ụgbụ na Azụ ahụ Pụtara Nye Gị?
    Ụlọ Nche—1992 | Jun 15
    • 7. Gịnị ka Jisọs na-eme ihe atụ ya mgbe o kwuru okwu banyere azụ?

      7 N’ụzọ kwekọrọ na nke ahụ, azụ nke ihe atụ nke a nọchiri anya ụmụ mmadụ. Ya mere, mgbe amaokwu nke 49 na-ekwu banyere ikewapụ ndị ọjọọ site ná ndị ezi omume, ọ na-ezo aka, ọ bụghị n’anụ ndị bi ná mmiri na-eme ezi omume ma ọ bụ ndị na-eme ajọ omume, kama n’ebe ụmụ mmadụ na-eme ezi omume ma ọ bụ ajọ omume nọ. N’otu aka ahụ, amaokwu nke 50 ekwesịghị ime ka anyị chee echiche banyere anụ ndị bi ná mmiri ndị na-akwa ákwá ma ọ bụ na-ata ikikere eze ha. Ee e. Ihe atụ nke a bụ banyere ịchịkọta ụmụ mmadụ na nkewapụ a ga-emesịa kewapụ ha, bụ́ nke dị oké mkpa, dị ka ihe si na ya pụta na-egosi.

      8. (a) Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta banyere ihe nke ahụ ga-apụtara azụ ndị na-ekwesịghị ekwesị? (b) N’ihi ihe e kwuru banyere azụ ndị na-ekwesịghị ekwesị, gịnị ka anyị pụrụ ikwubi banyere Alaeze ahụ?

      8 Rịba ama na azụ ndị na-ekwesịghị ekwesị, ya bụ, ndị ajọ omume, bụ ndị a ga-atụba n’oké ọkụ ahụ, bụ́ ebe ha ga-anọ kwaa ákwá, taakwa ikikere eze ha. N’ebe ọzọ, Jisọs jikọrọ ịkwa ákwá na ịta ikikere eze dị otú ahụ n’ịbụ ndị nọ n’èzí Alaeze ahụ. (Matiu 8:12; 13:41, 42) Na Matiu 5:22 na 18:9 (NW), ọ kpọtụrụ ọbụna “Gehena nke na-ere ọkụ” aha, na-ezo aka ná mbibi na-adịgide adịgide. Nke ahụ ọ́ naghị egosi otú o si dị oké mkpa ịghọta isi ilu nke a na ime ihe kwekọrọ na ya? Anyị nile matara na e nweghị ma ọ bụ na a gaghị enwe ndị ajọ omume n’Alaeze Chineke. N’ihi ya, mgbe Jisọs kwuru na “alaeze eluigwe yiri oké ụgbụ,” ihe ọ na-ekwu aghaghị ịbụ na n’ihe banyere Alaeze Chineke, e nwere ihe omume yiri oké ụgbụ nke a tụdara iji kpokọta ụdị azụ dị iche iche.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya