Anyị Nwere Akụ̀ Ndị Dị Oké Ọnụ Ahịa Ikesa
1 Akụ̀ ime mmụọ ndị dị oké ọnụ ahịa anyị ji kpọrọ ihe jupụtara n’Okwu Chineke. (Ọma 12:6; 119:11, 14) N’otu oge, Jizọs nyere ihe atụ ndị gosiri akụkụ dị iche iche nke Alaeze ahụ ma jụzie ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ùnu ghọtara ihe ihe ndị a niile pụtara?” Mgbe ha kwuchara na ha ghọtara ya, ọ gwara ha, sị: “Ọ bụrụ otú ahụ, onye ọ bụla bụ́ onye na-ezi ihe n’ihu ọha, mgbe e ziri ya ihe banyere alaeze eluigwe, yiri nwoke bụ́ onyeisi ezinụlọ, onye na-esi n’ụlọ akụ̀ ya ewepụta ihe ndị dị ọhụrụ na ndị mere ochie.”—Mat. 13:1-52.
2 Anyị nwere ike ile eziokwu Baịbụl ndị anyị mụtara mgbe anyị malitere ịmụ Baịbụl anya dị ka akụ̀ ndị merela ochie. Ka anyị nọgịdere na-amụ ihe ndị ka mie emie dị n’Okwu Chineke, anyị na-amụta eziokwu Baịbụl ndị ọzọ, bụ́ ndị anyị na-ewere dị ka akụ̀ ndị dị oké ọnụ ahịa anyị chọtara ọhụrụ. (1 Kọr. 2:7) Ọzọkwa, “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” na-enyere anyị aka ịchọta akụ̀ ndị ọhụrụ dị oké ọnụ ahịa.—Mat. 24:45.
3 Anyị ji nnọọ akụ̀ ime mmụọ ndị a dị oké ọnụ ahịa akpọrọ ihe, ma ndị ochie ma ndị ọhụrụ. Nke a na-akpali anyị ịchọ inweta ọzụzụ na ahụmahụ dị ka ndị na-akụzi Okwu Chineke ma jiri mmesapụ aka na-akụziri ndị ọzọ eziokwu ndị dị oké ọnụ ahịa anyị mụtara.
4 Mụta Ihe Site n’Ihe Nlereanya Jizọs: Iji gosi na Jizọs ji akụ̀ ndị a dị oké ọnụ ahịa kpọrọ ihe, ọ gbasiri mbọ ike ịkụziri ha ndị ọzọ. Ọbụna mgbe ike gwụrụ ya, ọ kwụsịghị isi “n’ụlọ nkwakọba ihe” ya na-ewepụta akụ̀ ndị dị oké ọnụ ahịa.—Jọn 4:6-14.
5 Ịhụnanya Jizọs nwere n’ebe ndị na-enweghị ezi ihe ọmụma banyere Chineke na nzube ya nọ kpaliri ya ikenye ha akụ̀ ndị na-enye ndụ, ya bụ, eziokwu Chineke. (Mat. 5:3) O nwere ọmịiko n’ahụ́ ndị agụụ na-agụ n’ụzọ ime mmụọ, nke a kpalikwara ya “izi ha ọtụtụ ihe.”—Mak 6:34.
6 Ṅomie Jizọs: Ọ bụrụ na anyị ejiri akụ̀ ndị dị oké ọnụ ahịa anyị nwere kpọrọ ihe, dị ka Jizọs, ọ ga na-agụ anyị agụụ igosi ha ndị mmadụ site na Baịbụl. (Ilu 2:1-5) Ọ bụ ezie na ike nwere ike ịgwụ anyị mgbe ụfọdụ, anyị ga-eji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwu banyere eziokwu ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ. (Mak 6:34) Obi ekele anyị nwere maka akụ̀ ndị dị oké ọnụ ahịa anyị nwere ga-akpali anyị ime ihe niile anyị nwere ike ime n’ozi anyị, na-agbalị mgbe niile ijechikwu ya anya.